17 “Agụụ ụlọ mmadụ ibe gị agụla gị. Agụụ nwunye mmadụ ibe gị,+ ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị ma ọ bụ ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, agụla gị.”+
21 “‘Agụụ nwunye mmadụ ibe gị agụla gị.+ Ka ịchọ ọdịmma onwe gị naanị ghara ime ka ụlọ mmadụ ibe gị, ubi ya ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị, ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, gụọ gị agụụ.’+