Aịzaya 59:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ọnyà ududo ha agaghị abụrụ ha uwe, ha agaghịkwa eji ọrụ aka ha kpuchie onwe ha.+ Ọrụ ha bụ ọrụ ọjọọ, ọbụ aka ha jupụtara n’ime ihe ike.+ Jeremaya 6:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Dị ka olulu mmiri si echekwa mmiri nke dị n’ime ya, otú ahụ ka o si chekwaa ihe ọjọọ ya. A na-anụ mkpọtụ ime ihe ike na ibukọrọ ihe ndị mmadụ n’ime ya;+ ọrịa na ihe otiti dị n’ihu m mgbe niile. Maịka 6:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 N’ihi na ndị ọgaranya ya ejupụtawo n’ime ihe ike, ndị bi na ya ekwuwokwa okwu ụgha,+ ire dị ha n’ọnụ na-aghọkwa aghụghọ.+
6 Ọnyà ududo ha agaghị abụrụ ha uwe, ha agaghịkwa eji ọrụ aka ha kpuchie onwe ha.+ Ọrụ ha bụ ọrụ ọjọọ, ọbụ aka ha jupụtara n’ime ihe ike.+
7 Dị ka olulu mmiri si echekwa mmiri nke dị n’ime ya, otú ahụ ka o si chekwaa ihe ọjọọ ya. A na-anụ mkpọtụ ime ihe ike na ibukọrọ ihe ndị mmadụ n’ime ya;+ ọrịa na ihe otiti dị n’ihu m mgbe niile.
12 N’ihi na ndị ọgaranya ya ejupụtawo n’ime ihe ike, ndị bi na ya ekwuwokwa okwu ụgha,+ ire dị ha n’ọnụ na-aghọkwa aghụghọ.+