16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
10 “Ole ndị ka m ga-agwa okwu, dọọkwa aka ná ntị, ka ha wee nụ? Lee! Ntị ha bụ ntị a na-ebighị úgwù, ọ bụ ya mere ha enweghị ike ịṅa ntị.+ Lee! Ha na-akọcha okwu Jehova,+ nke bụ́ okwu na-adịghị atọ ha ụtọ.+
15 Gị onwe gị maara.+ Jehova, biko, cheta m+ ma chee ihu n’ebe m nọ ma bọọrọ m ọbọ n’ahụ́ ndị na-akpagbu m.+ Ewepụla ndụ m n’ihi eweghị iwe ọsọ ọsọ gị.+ Mara na mụ onwe m eburuwo nkọcha n’ihi gị.+