10 Mee ka obi ndị a ghara ịnabata ihe,+ meekwa ka ntị ha kpọchie akpọchie,+ nyachiekwa anya ha, ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe, ka obi ha gharakwa ịghọta ihe, ka ha wee ghara ichegharị, e wee gwọọ ha.”+
51 “Ndị na-ekwesi olu ike na ndị a na-ebighị úgwù n’obi+ na ná ntị, unu na-eguzogide mmụọ nsọ mgbe niile; dị ka nna nna unu hà mere, otú ahụ ka unu na-eme.+