10 “Ole ndị ka m ga-agwa okwu, dọọkwa aka ná ntị, ka ha wee nụ? Lee! Ntị ha bụ ntị a na-ebighị úgwù, ọ bụ ya mere ha enweghị ike ịṅa ntị.+ Lee! Ha na-akọcha okwu Jehova,+ nke bụ́ okwu na-adịghị atọ ha ụtọ.+
27 N’ihi na obi nke ndị a adịkwaghị anabata ihe, ha ejiriwokwa ntị ha nụ ihe ma ha emeghị ihe ọ bụla, ha emechiwokwa anya ha; ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji ntị ha nụ ihe ma jiri obi ha ghọta ihe wee chigharịa, ka m wee gwọọ ha.”’+