32 N’ikpeazụ ọ sịrị: “Biko, ka Jehova ghara iwe iwe dị ọkụ,+ kama ka m kwuo okwu naanị otu ugboro a:+ Ka e were ya na a hụrụ mmadụ iri n’ebe ahụ.”+ O wee sị: “Agaghị m ala ya n’iyi n’ihi mmadụ iri ahụ.”
29 Ndị ala ahụ akpawo nkata irigbu mmadụ,+ ha apụnarawo mmadụ ihe,+ megbuo onye nọ n’ahụhụ na ogbenye,+ ha erigbuwokwa onye mbịarambịa n’ekpeghị ya ikpe ziri ezi.’+
2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+