ISI NKE 34
Gịnị Mere M Ga-eji Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?
Ka e were ya na gị na ụmụ agbọghọ abụọ gara ebe a na-ere nri n’ụlọ akwụkwọ unu iri nri ehihie, otu nwa okorobịa bịara ọhụrụ n’ụlọ akwụkwọ unu abata.
Otu n’ime ha asị gị: “Ị̀ ma na Emeka hụrụ gị n’anya? Ị̀ hụkwara ụdị anya ọ na-ele gị? Anya ya ekweghị apụ apụ n’ebe ị nọ!”
Nwa agbọghọ nke ọzọ abịakwuo nso, takwunyere gị, sị: “Ị̀ makwa na o nwebeghị enyi nwaanyị?”
Ị ma na ha kwuru eziokwu. A sị ka e kwuwe, Emeka kpọrọ gị n’ụbọchị gara aga ka ị bịa rie oriri n’ụlọ ya. Ma i kweghị aga, n’agbanyeghị na ọ gụrụ gị agụụ ịga za òkù ahụ.
Nwa agbọghọ mbụ ahụ agwa gị okwu ọzọ mgbe ị ka na-atụgharị uche.
Ya asị gị: “A sị na enweghị m enyi nwoke, o nweghị ihe gaara eme ka m ghara imeta Emeka enyi.”
Ya eju ya anya, ya ana-ele gị. Ị ma ihe ọ chọrọ ikwu.
Ya asị gị: “Bịadị, gịnị mere i nweghị enyi nwoke?”
Ị naghị achọ ka a jụọ gị ajụjụ ahụ! Nke bụ́ eziokwu bụ na ị chọrọ inwe enyi nwoke. Ma a gwara gị na ọ kacha mma ka i chere ruo mgbe i jikeere ịlụ di tupu gị na nwoke akpawa. A sị nnọọ na ọ bụghị . . .
Nwa agbọghọ nke ọzọ asị gị: “Ọ̀ kwa n’ihi chọọchị unu ahụ?”
Gị asị n’obi gị: ‘Olee otú o si mara ihe dị m n’obi?’
Ya achịa gị ọchị, sị: “Mgbe niile gị na Baịbụl! Gịnị mere na ị gaghị ahapụtụ Baịbụl kporitụkwanụ ndụ mgbe ụfọdụ?”
Ò NWETỤLA mgbe a chịrị gị ọchị n’ihi na ị na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru? Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ike na-eche na e nwere uru ị na-anaghị erite n’ihi ime ihe Baịbụl kwuru. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Deborah chere otú ahụ. O kwuru, sị: “Amalitere m iche na iwu Baịbụl na-eke mmadụ agbụ. Otú ndị enyi m n’ụlọ akwụkwọ si na-eme ihe ọ bụla sọrọ ha masịrị m.”
Ihe Ga-eme Ka Anya Doo Gị
Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ ga-echere ka ihe mee ya tupu ya amụta ihe. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na mmadụ kwesịrị ịmụta ihe n’ihe mere ndị ọzọ, otú ahụ ọbụ abụ bụ́ Esaf mere. O nwere mgbe Esaf chere na iwu Chineke na-eke mmadụ agbụ. Ma anya doro ya mgbe o leruru ndụ ndị hapụrụ ụzọ Chineke anya. Esaf mechara chọpụta na ha nọ “n’ala na-amị amị.”—Abụ Ọma 73:18.
Buru nke ahụ n’uche tụlee ihe ụfọdụ n’ime ndị na-eto eto ndị hapụtụrụ iwu Baịbụl gaa kwaa iko kwuru.
● Gịnị mebiri echiche gị na omume gị?
Deborah: “Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ, ahụrụ m na onye ọ bụla nwere enyi nwoke na enyi nwaanyị. O yikwara ka hà na-enwe obi ụtọ. Mụ na ha nọrọ, m na-ahụ ka ha na-esusu ọnụ, na-amakụkwa ibe ha. Ọ na-adị m ka m̀ bịara nke m iche, dịkwa m ka m bụrụ ha. M na-ejikarị ọtụtụ awa mụrụ anya na-arọ nrọ ebe mụ na otu nwa okorobịa ihe ya dị mụ mma na-enwe mmekọahụ. O mere ka ọ gụsikwuo m ike ka mụ na ya nwee mmekọahụ.”
Mike: “M na-agụbu akwụkwọ ndị na-ekwu na mmekọahụ bụ ndụ, na-elekwa ihe na-akwado ya na TV. Iso ndị enyi m na-akọ banyere mmekọahụ mere ka ọ na-agụsi m agụụ ike. Naanị mụ na nwa agbọghọ nọrọ, m na-eche na anyị nwere ike na-adịda ibe anyị aka n’enweghị mmekọahụ, na m nwere ike ịkwụsị mgbe ọ bụla m chọrọ.”
Andrew: “Ile foto ndị gba ọtọ n’Ịntanet riri m isi. M malitere ịṅụ oké mmanya. M na-esokwa ndị ntorobịa na-adịghị eme ihe Baịbụl kwuru aga oriri na nkwari.”
Tracy: “N’ime obi m, ama m na inwe mmekọahụ mgbe m na-alụbeghị di adịghị mma, ma, akpọghị m ya asị. Ebughị m n’obi ịmalite inwe mmekọahụ mgbe m na-alụbeghị di, ma ejidelighị m onwe m. Mgbe m malitere, akọnuche m anaghị ama m ikpe.”
● Ụdị ndụ ahụ i biri ò mere ka i nwee obi ụtọ?
Deborah: “Ná mmalite, obi dịrị m ezigbo mma na mụ enwerela onwe m. Obi tọkwara m ụtọ na ụmụ agbọghọ ibe m na-elezi m anya ọma. Ma obi ụtọ ahụ adịteghị aka. Onwe m sọwara m oyi, dịzie m ka onye gara mụọ ihe ọjọọ, na onye tọgbọ chakoo. Akwara m mmakwaara na abụkwaghị m nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.”
Andrew: “O mere ka ọ dịkwuoro m mfe ime ihe ọjọọ ọ bụla batara m n’obi. Ma, obi m nọkwa na-ama m ikpe. Onwe m gwụkwara m ike.”
Tracy: “Ịkwa iko mebiri oge agbọghọbịa m. Echere m na mụ na enyi m nwoke ga na-ekpori ezigbo ndụ. Ma anyị ekporighị ndụ. Anyị kpataara ibe anyị mwute, obi ọjọọ, na obi mgbawa. Kwa abalị, m na-ebe ezigbo ákwá n’ihe ndina m, na-ekwu na a sị na m ma, m gaara eme ihe Jehova kwuru.”
Mike: “Ọ malitere ịdị m ka ò nwere ihe nwụrụ n’ime m. M gbalịrị ileghara nsogbu omume m na-enye ndị ọzọ anya, ma o kweghị m. O wutere m na m nọ na-eme ihe na-agbawa ndị ọzọ obi n’ihi ndụ m na-ekpori.”
● Olee ndụmọdụ ị ga-enye ndị ntorobịa ndị chere na iwu Baịbụl na-eke mmadụ agbụ?
Tracy: “Na-eme ihe Jehova kwuru, ka ndị enyi gị bụrụkwa ndị na-eme otú ahụ. Ọ ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ.”
Deborah: “Ọ bụghị naanị gị ka ihe ị na-eme gbasara. Ọ gbasara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i leghara ndụmọdụ Chineke anya, ị ga-emebi onwe gị.”
Andrew: “Mgbe ị na-amabeghị ihe, ị ga-eche na otú ụmụaka ibe gị si ebi ndụ na-atọgbu onwe ya. Ọ ga-eme ka ị mụta àgwà ha. N’ihi ya, kpachara anya ná ndị ị na-emeta enyi. Tụkwasị Jehova obi, ị gaghịkwa akwa mmakwaara.”
Mike: “Ụfọdụ n’ime akụ̀ kacha akụ̀ Jehova nyere gị bụ ùgwù gị na ịbụ onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Ọ bụrụ na ị tụfuo onyinye ndị ahụ n’ihi na i jidelighị onwe gị, i reela ùgwù gị. Gwa papa gị na mama gị nakwa ndị ọzọ tozuru okè nsogbu gị. I mejọọ ihe, gwa ha ozugbo ma mezie ya. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Jehova kwuru, obi ga-eru gị ala.”
Iwu Baịbụl Ọ̀ Na-eke Mmadụ Agbụ, ka Ọ̀ Na-echebe Mmadụ?
Jehova bụ ‘Chineke obi ụtọ,’ ọ chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ. (1 Timoti 1:11; Ekliziastis 11:9) E dere iwu ndị dị na Baịbụl ka ha baara gị uru. N’ezie, i nwere ike iche na ha kere gị agbụ n’ekweghị gị megharịa ahụ́. Ma n’eziokwu, iwu Baịbụl na-echebe gị ka ị ghara imerụ ahụ́, otú ahụ belt oche ụgbọala na-echebe mmadụ.
N’eziokwu, Baịbụl bụ akwụkwọ ị ga-atụkwasị obi. Ọ bụrụ na i kpebie ime ihe o kwuru, ọ bụghị naanị na ị ga-eme ka obi dị Jehova ụtọ, kamakwa, ọ ga-abara gị uru.—Aịzaya 48:17.
I nwere ike ịbụ enyi Chineke. Chọpụta otú ị ga-esi abụ ya.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.”—Aịzaya 48:17.
NDỤMỌDỤ
Chee echiche otú ị ga-esi gosi nwanne gị ị tọrọ na amamihe dị n’iwu Baịbụl. Ịgwa ndị mmadụ ihe i kweere bụ otu ụzọ bara uru ị ga-esi mee ka ọ gbanye mgbọrọgwụ n’obi gị.
Ị̀ MA NA . . . ?
Imebi adịm ná mma gị na Jehova anaghị egbu oge, ma imezi ya nwere ike iwe gị ọtụtụ afọ.
IHE M GA-EME!
Ihe m ga-eme nke ga-enyere m aka ịghọta amamihe dị n’iwu Baịbụl bụ ․․․․․
Ọ bụrụ na ọ dịwa m ka m bụrụ ndị na-ebi ndụ ndị ụwa, ihe m ga-eme bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● A bịa ná nsogbu imebi iwu Chineke na-akpata, gịnị mere mmadụ ichere ka ihe mee ya abụghị ụzọ kacha mma ọ ga-esi amụta ihe?
● Gịnị ka ị mụtara n’ihe Deborah, Mike, Andrew, na Tracy kwuru?
● Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ ndị chee na iwu Baịbụl na-eke mmadụ agbụ, ma gịnị mere ụdị echiche ahụ abaghị uru?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 285]
“Obi erughị ala mmadụ na-enwe mgbe ọ na-agbalị izochi ihe ọjọọ o mere na-aka mwute ọ ga-enwe mgbe a dọrọ ya aka ná ntị njọ.”—Donna
[Foto dị na peeji nke 288]
Iwu Baịbụl anaghị eme ka ị ghara inwe obi ụtọ; ọ na-echebe gị