Ịkpasu Ịhụnanya na Ọrụ Ọma Dị Iche Iche—N’ụzọ Dị Aṅaa?
“Ka anyị na-eche banyere ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche, . . . na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa nke a karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-abịaru nso.”—NDỊ HIBRU 10:24, 25, NW.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na ndị Kraịst oge mbụ nwetara nkasi obi na agbamume ná nzukọ ha? (b) Ndụmọdụ Pọl dị aṅaa kwuru banyere mkpa ọ dị izukọ ọnụ?
HA ZUKỌRỌ ná nzuzo, kpụkọta ọnụ n’ime ụlọ a gbachiri agbachi. N’èzí, ihe ize ndụ dị ebe nile. Ọ dịbeghị anya e gburu Onye Ndú ha, bụ́ Jisọs, n’ihu ọha, ọ dọwokwa ụmụazụ ya aka ná ntị na omume a ga-emeso ha agaghị aka ihe e mere ya mma. (Jọn 15:20; 20:19) Ma ka ha na-ekwu banyere Jisọs ha hụrụ n’anya nke ukwuu n’olu dị ala, ma ọ dịghị ihe ọzọ ịnọkọ ọnụ aghaghị inyeworị ha mmetụta nke ịnọ ná nchebe.
2 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ndị Kraịst chere ụdị nile nke ule na mkpagbu ihu. Dị ka ndị na-eso ụzọ mbụ ahụ, ha nwetara nkasi obi na agbamume site n’izukọ ọnụ. Ya mere, Pọl onyeozi dere ná Ndị Hibru 10:24, 25, sị: “Ka anyị na-eche banyere ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche, ghara ịdị na-ahapụ mgbakọta nke onwe anyị, dị ka ọ bụ omenala ụfọdụ, kama na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa nke a karị ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-abịaru nso.”
3. N’ihi gịnị ka ị ga-eji asị na Ndị Hibru 10:24, 25 bụ ihe karịrị nanị iwu ka ndị Kraịst zukọọ ọnụ?
3 Okwu ndị ahụ karịrị nanị iwu nke ịnọgide na-ezukọ ọnụ. Ha na-enye ụkpụrụ sitere n’aka Chineke maka nzukọ ndị Kraịst nile—n’eziekwa, maka oge ọ bụla mgbe ndị Kraịst na-anọkọ ọnụ. Taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ, mgbe anyị na-ahụ nke ọma ụbọchị Jehova ka ọ na-eru nso, nrụgide na ihe ize ndụ dị iche iche nke ajọ usoro ihe a na-eme ka ọ dịrị mkpa na nzukọ anyị nile ga-adị ka ebe obi ụtọ na-adịghị ize ndụ, isi iyi nke ume na agbamume nye mmadụ nile. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji jide n’aka na nke a ga-adị otú ahụ? Ọ dị mma, ka anyị jiri nlezianya nyochaa okwu Pọl, na-ajụ ajụjụ atọ bụ isi: Gịnị ka ọ pụtara ‘iche banyere ibe anyị’? Gịnị ka ọ pụtara ‘ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma n’ahụ ibe anyị’? N’ikpeazụ, olee otú anyị pụrụ isi “na-agbarịta ibe anyị ume” n’oge ndị a siri ike?
“Na-eche Banyere Ibe Anyị”
4. Gịnị ka ọ pụtara ịdị “na-eche banyere ibe anyị”?
4 Mgbe Pọl gbara ndị Kraịst ume ‘iche banyere ibe ha,’ o ji ngwaa Grik bụ́ ka·ta·no·eʹo mee ihe, bụ́ ụdị siri ike nke okwu nkịtị ahụ bụ́ “ịghọta ihe.” Akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament sịrị na ọ bụ “mmadụ itinye uche ya nile n’otu ihe.” Dị ka W. E. Vine si kwuo, ọ pụkwara ịpụta “ịghọtazu, ịtụlechi anya.” Ya mere mgbe ndị Kraịst ‘na-eche banyere ibe ha,’ ọ bụghị nanị na ha na-aghọta ihe elu elu kama ha na-eji ikike uche ha nile eme ihe ma na-agbalị ịhụ ihe n’ụzọ miri emi karị.—Tụlee Ndị Hibru 3:1.
5. Olee akụkụ ụfọdụ nke mmadụ nke e nwere ike a gaghị ahụta ozugbo, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ịtụle ndị a?
5 Ọ dị anyị mkpa icheta na ihe mmadụ bụ karịrị ihe ile ya anya elu elu n’elu ahụ, ọrụ ya, ma ọ bụ ọdịdị ya pụrụ ikpughe. (1 Samuel 16:7) Ọtụtụ mgbe elu ahụ dị jụụ na-ekpuchi mmetụta miri emi ma ọ bụ echiche ime ihe ọchị dị mma. Ọzọkwa, nzụlite na-enwe ọdịiche dị ukwuu. Ụfọdụ enwewo nsogbu dị oké njọ ná ndụ ha; ndị ọzọ na-edi ugbu a ọnọdụ ndị ọ ga-esiri anyị ike icheli n’echiche. Lee ka ọ na-esi emekarị na iwe anyị na-ewesa àgwà ụfọdụ dị n’ime nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị na-adajụ mgbe anyị mụtakwuru banyere nzụlite ma ọ bụ ọnọdụ onye ahụ.—Ilu 19:11.
6. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi amarịta ibe anyị nke ọma karị, ihe ọma dị aṅaa pụrụ isi na ya pụta?
6 N’ezie, nke a apụtaghị na anyị kwesịrị inyoba anya n’okwu onwe onye nke onye ọzọ ma ọ bụrụ na a kpọghị anyị. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11) Ma, n’ezie anyị pụrụ igosi mmasị onwe onye n’ebe ibe anyị nọ. Nke a gụnyere ihe karịrị nanị ikele ekele n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Gịnị ma ị họpụta otu onye ị ga-achọ ịma nke ọma karị ma zube inwe nkwurịta okwu ruo minit ole na ole tupu ma ọ bụ mgbe nzukọ ahụ gasịrị? N’ụzọ kakwa mma, ‘na-agbaso ọrụ ile ndị ọbịa nke ọma’ site n’ịkpọ otu enyi ma ọ bụ abụọ òkù n’ụlọ gị maka ntakịrị ntụrụndụ. (Ndị Rom 12:13) Gosi mmasị. Gee ntị. Nanị ịjụ otú mmadụ si bịa mara ma hụ Jehova n’anya pụrụ ikpughe ihe dị ukwuu. Otú ọ dị, ị pụrụ ịmụtakwu ihe site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ n’ozi ụlọ n’ụlọ. Iche banyere ibe anyị n’ụzọ ndị dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịzụlite ezi mmetụta maka ibe anyị, ma ọ bụ ọmịiko.—Ndị Filipaị 2:4; 1 Pita 3:8.
‘Ịkpasu Ibe Anyị’
7. (a) Olee ụzọ ozizi Jisọs si metụta ndị mmadụ? (b) Gịnị mere ka ozizi ya bụrụ ihe nwere ike otú ahụ?
7 Mgbe anyị na-eche banyere ibe anyị, anyị na-adị njikere karị ịkpasu mmadụ, ịkpali ibe anyị ime ihe. Ndị okenye bụ́ ndị Kraịst karịsịa na-ekere òkè bụ isi n’akụkụ nke a. Banyere otu oge mgbe Jisọs kwusịrị okwu n’ihu ọha, anyị gụrụ, sị: “Ibobo ozizi Ya nwụrụ ìgwè mmadụ nile n’ahụ.” (Matiu 7:28) N’oge ọzọ ọbụna ụfọdụ ndị soja e zitere ijide ya si n’ebe ọ nọ pụọ na-asị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.” (Jọn 7:46) Gịnị mere ka ozizi Jisọs bụrụ ihe dị ike otú a? Ọ̀ bụ ngosipụta na-enweghị isi nke mmetụta uche? Ee e; Jisọs ji ùgwù kwuo okwu. Ma, o zubere mgbe nile iru n’obi nke ndị na-ege ya ntị. N’ihi na ọ na-eche banyere ndị mmadụ, ọ maara kpọmkwem otú ọ ga-esi akwali ha. O jiri ihe atụ dị mfe, doro anya nke na-egosipụta ihe ndị dị adị ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị mee ihe. (Matiu 13:34) N’otu aka ahụ, ndị na-eme ihe omume ná nzukọ anyị kwesịrị iṅomi Jisọs site n’ikwu okwu ndị na-ekpo ọkụ, na-akpali akpali bụ́ ndị na-akwali mmadụ. Dị ka Jisọs, anyị pụrụ itinye uche anyị n’ịchọta ihe atụ ndị ga-ekwekọ n’ọnọdụ ndị na-ege anyị ntị ma ruo ha n’obi.
8. Olee otú Jisọs si na-akpasu mmadụ site n’ihe nlereanya, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya n’akụkụ nke a?
8 N’ijere Chineke anyị ozi, anyị nile pụrụ ịkpasu ibe anyị site n’ihe nlereanya. N’ezie Jisọs kpasuru ndị na-ege ya ntị. Ọ hụrụ ọrụ nke ozi ndị Kraịst n’anya ma bulie ozi ahụ elu. Ọ sịrị na ọ dị ka ihe oriri nye ya. (Jọn 4:34; Ndị Rom 11:13) Ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ pụrụ ịdị na-efe efe. Ị̀ pụrụ n’otu aka ahụ ime ka ọṅụ gị n’ozi ahụ pụta ìhè? Ka i ji nlezianya na-ezere itu ọnụ, soro ndị ọzọ n’ime ọgbakọ kerịta ezi ahụmahụ ndị i nwere. Mgbe ị kpọrọ ndị ọzọ òkù isoro gị rụọ ọrụ, lee ma ị pụrụ inyere ha aka ịchọta ezi obi ụtọ n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Onye Okike anyị Kasị Ukwuu, bụ́ Jehova.—Ilu 25:25.
9. (a) Olee ụzọ ụfọdụ e si akpasu ndị ọzọ nke anyị ga-achọ izere, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị kwesịrị ịkpali anyị inyefe onwe anyị n’ije ozi Jehova?
9 Otú ọ dị, kpachara anya ka ị ghara ịkpasu ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ. Dị ka ihe atụ, n’amaghị ama anyị pụrụ ime ka ha nwee obi ọmụma ikpe banyere emekwughị ihe. N’amaghị ama anyị pụrụ imenye ha ihere site n’iji ha atụnyere ndị ọzọ na-arụsi ọrụ ike n’ụzọ na-adịghị mma, ma ọ bụ anyị pụrụ ọbụna iguzobe ụkpụrụ siri ike ma wetuo ndị na-erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ala. Nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a pụrụ ịkwali ụfọdụ ime ihe ruo nwa oge, ma Pọl edeghị, ‘Kpasuo inwe obi ọmụma ikpe na ọrụ ọma dị iche iche.’ Ee e, anyị aghaghị ịkpasu ịhụnanya, mgbe ahụ ọrụ ndị ahụ ga-esochi site n’ezi nzube. Ọ dịghị onye e kwesịrị ịkpali n’ụzọ bụ isi site ná ntụle nke ihe ndị ọzọ n’ọgbakọ ga-eche banyere ya ma ọ bụrụ na o ruchaghị ihe a tụrụ anya n’aka ya.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 9:6, 7.
10. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị icheta na anyị abụghị ndị nwe okwukwe nke ndị ọzọ?
10 Ịkpasu ibe anyị apụtaghị ịchịkwa ibe anyị. Ọ bụ ezie na o nwere ikike dị ukwuu Chineke nyere ya, Pọl onyeozi n’obi umeala chetaara ọgbakọ ndị Kọrint, sị: ‘Anyị abụghị ndị nwe okwukwe unu.’ (2 Ndị Kọrint 1:24) Ọ bụrụ na dị ka ya, anyị aghọta n’obi umeala na ọ bụghị ọrụ anyị ikpebi ókè ndị ọzọ ga-eme n’ije ozi nye Jehova, ma ọ bụ ịchịkwa akọ na uche ha ná mkpebi onwe onye nke ndị ọzọ, anyị ga-ezere ‘ịbụbiga ndị ezi omume ókè,’ ndị na-enweghị ọṅụ, ndị na-adịghị eme mgbanwe, ndị na-ahụtakarị ebe mmadụ mejọrọ, ma ọ bụ ndị nwebigara mmasị ókè n’ụkpụrụ iwu. (Eklisiastis 7:16) Àgwà ndị dị otú ahụ adịghị akpasu akpasu; ha na-akpagbu akpagbu.
11. Gịnị kpaliri inye onyinye n’oge a na-ewu ụlọikwuu nke ndị Israel, oleekwa otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ eziokwu n’oge anyị?
11 Anyị chọrọ ka e mee mgbalị nile n’ozi Jehova n’otu ụdị mmụọ ahụ dị ka n’Israel oge ochie mgbe a chọrọ onyinye maka owuwu nke ụlọikwuu ahụ. Ọpụpụ 35:21 na-agụ, sị: “Ha wee bịa, onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya, na onye ọ bụla nke mmụọ ya mere ka o nwee afọ ofufo, ha wee weta àjà mbuli Jehova iji jee ozi.” Onye ọzọ amanyeghị ha kama a kpaliri ha site n’ime, site n’obi. N’ezie, asụsụ Hibru ya na-agụ n’ebe a n’ụzọ nkịtị na “onye ọ bụla e buliri obi ya elu” nyere ụdị onyinye ahụ. (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ịgakwu n’ihu ka anyị gbalịsie ike ibuli obi ibe anyị elu mgbe ọ bụla anyị nọkọrọ ọnụ. Mmụọ Jehova pụrụ ime nke fọdụrụnụ.
“Na-agbarịta Ibe Anyị Ume”
12. (a) Gịnị bụ ụfọdụ ihe okwu Grik ahụ a sụgharịrị “ịgba ume” pụtara? (b) Olee ụzọ ndị enyi Job si daa ada n’ịgba ya ume? (ch) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ikpe ibe anyị ikpe?
12 Mgbe Pọl dere na anyị kwesịrị ‘ịgbarịta ibe anyị ume,’ o ji otu ụdị okwu Grik bụ́ pa·ra·ka·leʹo mee ihe, nke pụrụ ịpụtakwa ‘iwusi ike, ịkasi obi.’ Ná nsụgharị Septuagint nke Grik, e ji otu okwu a mee ihe na Job 29:25, ebe a kọwara Job dị ka onye na-akasi ndị na-eru újú obi. N’ụzọ megidere nke ahụ, mgbe Job n’onwe ya nọ n’okpuru ule siri ike, ọ nataghị ụdị agbamume ahụ. “Ndị nkasi obi” ya atọ ji nnọọ ọrụ n’aka n’ikpe ya ikpe na ịwụkwasị ya ọtụtụ okwu nke na ha aghọtaghị ya ma ọ bụ nwee ọmịiko n’ahụ ya. N’ezie, n’okwu nile ha kwuru, ọ dịghị otu ugbo ha kpọtụrụ aha Job. (Tụlee Job 33:1, 31.) O doro anya na ha hụrụ ya dị ka nsogbu karịa dị ka mmadụ. Ka a sịkwa ihe mere Job ji kwupụtara ha ná nkụda mmụọ, sị: “Ọ bụrụ na mkpụrụ obi unu adị n’ọnọdụ mkpụrụ obi m”! (Job 16:4) N’otu aka ahụ taa, ọ bụrụ na ị chọrọ ịgba mmadụ ume, tinye onwe gị n’ọnọdụ ya! Ekpela ikpe. Dị ka Ndị Rom 14:4 sịrị, “gị onwe gị nke na-ekpe onye na-ejere onye ọzọ ozi, ị̀ bụ onye? ọ bụ n’ebe Onyenwe ya onwe ya nọ ka ọ na-eguzo ma ọ bụ na-ada. Ma a ga-eme ya ka o guzo; n’ihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ya ka o guzo.”
13, 14. (a) Banyere eziokwu bụ isi dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ime ka ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị kwere iji gbaa ha ume? (b) Olee otú otu mmụọ ozi si wusie Daniel ike?
13 A sụgharịkwara otu ụdị nke pa·ra·ka·leʹo na mkpọaha yiri ya ịbụ “nkasi obi” ná 2 Ndị Tesalọnaịka 2:16, 17: “Ma ka Ya onwe ya, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na Chineke, bụ́ Nna anyị, Onye hụrụ anyị n’anya nyekwa anyị nkasi obi ebighị ebi na ezi olileanya n’ime amara, ka Ọ kasie obi unu, meekwa ka ha guzosie ike n’ezi ọrụ na ezi okwu nile ọ bụla.” Rịba ama na Pọl jikọrọ echiche nke ịkasi obi anyị na eziokwu bụ́ isi nke bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ya mere anyị pụrụ ịgbarịta ibe anyị ume na ịkasi ha obi site n’ikwughachi eziokwu ahụ dị mkpa.
14 N’otu oge onye amụma bụ́ Daniel nwere nsogbu n’obi mgbe ọ hụsịrị otu ọhụụ na-atụ egwu nke na o kwuru, sị: “Ebube m gbanwere ghọọ ihe mbibi n’ahụ m, m wee ghara ịnagide ike ọ bụla.” Jehova zijere otu mmụọ ozi nke chetaara Daniel ọtụtụ mgbe na ọ bụ “ihe a na-achọsi ike nke ukwuu” n’anya Chineke. Gịnị si na nke ahụ pụta? Daniel gwara mmụọ ozi ahụ: “I mewo ka m dị ike.”—Daniel 10:8, 11, 19.
15. Olee otú ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị kwesịrị isi nye ịja mma na mgbazi olu n’ụzọ ziri ezi?
15 Lezie ụzọ ọzọ e si agba ndị ọzọ ume. Jaa ha mma! Ọ dị nnọọ mfe ịdabanye ná mmụọ nke nkatọ n’olu ike. Ọ bụ ihe mere eme na e nwere oge ụfọdụ mgbe mgbazi olu pụrụ ịdị mkpa, karịsịa site n’aka ndị okenye na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ma ha ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na a ga-echeta ha maka agbamume ha na-ekpo ọkụ kama ịbụ maka àgwà nke ikpe mmadụ ikpe.
16. (a) Mgbe a na-agba onye dara mbà ume, n’ihi gịnị ka ọ na-eji abụkarị ihe na-ezughị ezu nanị ịgwa ha ka ha mekwuo ihe n’ije ozi Jehova? (b) Olee otú Jehova si nyere Elaịja aka mgbe ọ dara mbà?
16 Ndị dara mbà n’obi chọrọ agbamume karịsịa, Jehova tụkwara anyị anya dị ka ndị Kraịst ịbụ isi iyi nke enyemaka—karịsịa ọ bụrụ na anyị bụ ndị okenye. (Ilu 21:13) Gịnị ka anyị pụrụ ime? Azịza ya pụrụ ịbụ nke na-adịghị mfe dị ka ịgwa ha ka ha mekwuo ihe n’ije ozi Jehova. N’ihi gịnị? N’ihi na nke ahụ pụrụ ịpụta na ịda mbà ha bụ n’ihi na ha emeghị ihe zuru ezu. Nke ahụ anaghị adịcha otú ahụ. Onye amụma bụ́ Elaịja n’otu mgbe dara mbà nke ukwuu nke na ọ chọrọ ịnwụ; ma nke a bịara n’oge o ji nnọọ ọrụ n’aka n’ijere Jehova ozi. Olee otú Jehova si meso ya omume? O zijere otu mmụọ ozi inye enyemaka dị irè. Elaịja kwupụtaara Jehova obi ya, na-ekpughe na o chere na ya abaghị uru dị ka ndị nna nna ya nwụrụ anwụ, na ọrụ ya abụrụwo ihe efu, nakwa na ya nọ nnọọ nanị ya. Jehova gere ntị ma kasie ya obi site ná ngosipụta ndị na-atụ egwu nke ike Ya na site n’imesi ya obi ike na ọ nọghị nanị ya ma ọlị nakwa na a ga-arụcha ọrụ ọ maliteworo. Jehova kwekwara nkwa inye Elaịja onye ya na ya ga-eso nke ọ ga-azụ bụ́ onye ga-emesịa nọchie ya.—1 Ndị Eze 19:1-21.
17. Olee otú onye okenye pụrụ isi nyere onye na-akatọ onwe ya n’ụzọ fere ókè aka?
17 Lee ka nke a si bụrụ ihe agbamume! Ka anyị sikwa otú ahụ na-agba ndị nọ n’etiti anyị nwere nsogbu mmetụta uche ume. Gbalịa ịghọta ha site n’ige ntị! (Jemes 1:19) Nye nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ e mere ka o kwekọọ ná mkpa ha n’otu n’otu. (Ilu 25:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Iji gbaa ndị na-akatọ onwe ha n’ụzọ fere ókè ume, ndị okenye n’obi ọma pụrụ inye ihe àmà dị n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na Jehova hụrụ ha n’anya ma ji ha kpọrọ ihe.a Ịtụle ihe mgbapụta ahụ pụrụ ịbụ ụzọ siri ike isi gbaa ndị na-eche na ha abaghị uru ume. Onye mmehie o mere n’oge gara aga na-ewute pụrụ ịbụ onye ọ dị mkpa igosi na ihe mgbapụta ahụ ehichawo ya ma ọ bụrụ na o chegharịwo n’ezie ma chigharịa site n’ụdị omume ahụ.—Aịsaịa 1:18.
18. Olee otú a pụrụ isi jiri ozizi nke ihe mgbapụta ahụ gbaa onye onye ọzọ merụrụ ahụ, dị ka site ná ndina n’ike, ume?
18 N’ezie, onye okenye ga-echebara ọnọdụ ọ bụla echiche ka o wee jiri ozizi ahụ mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Tụlee otu ihe atụ: Àjà mgbapụta Kraịst bụ nke àjà ụmụ anụmanụ nke Iwu Mosis mere ihe atụ ya, bụ́ ndị a chọrọ maka mkpuchi nke mmehie nile. (Levitikọs 4:27, 28) Otú ọ dị, e kwughị kpọmkwem na onye e dinara n’ike aghaghị ịchụ àjà mmehie dị otú ahụ. Iwu ahụ kwuru na ‘ọ dịghị ihe ha ga-eme’ iji nye ya ntaramahụhụ. (Deuterọnọmi 22:25-27) Otú ahụ ka ọ dị taa, ọ bụrụ na a wakpowo nwanna nwanyị ma dinaa ya n’ike, nke a emewokwa ka o nwee mmetụta iru unyi na abaghị uru, ọ̀ ga-ekwesị ekwesị imesi ike mkpa o nwere maka ihe mgbapụta ahụ iji hichapụ ya mmehie ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. O meghị mmehie n’ịbụ onye a wakporo. Ọ bụ onye ahụ na-edina mmadụ n’ike mere mmehie ma nwee mkpa nke ịbụ onye e hichara. Otú ọ dị, a pụrụ iji ịhụnanya Jehova na Kraịst gosiworo n’inye ihe mgbapụta ahụ mee ihe dị ka ihe àmà nke na-egosi na mmehie onye ọzọ mere emerụbeghị ya n’anya Chineke kama na ọ dị oké ọnụ ahịa n’ebe Jehova nọ ma nọgide n’ịhụnanya ya.—Tụlee Mak 7:18-23; 1 Jọn 4:16.
19. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji tụọ anya na mkpakọrịta nile nke anyị na ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ga-abụ ihe na-agba ume, ma gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?
19 Ee, ihe ọ bụla ọ masịrị ọnọdụ mmadụ ná ndụ ya bụrụ, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị na-egbu mgbu ndị pụrụ ime ka oge ndụ ya ndị gara aga bụrụ ihe iru újú, o kwesịrị inwe ike ịchọta agbamume n’ọgbakọ nke ndị Jehova. Otú ahụkwa ka ọ ga-enweta ya ma ọ bụrụ na anyị nile n’otu n’otu agbalịa iche banyere ibe anyị, ịkpasu ibe anyị, na ịgba ibe anyị ume mgbe ọ bụla anyị na-anọkọ ọnụ. N’ezie, n’ịbụ ndị na-ezughị okè, anyị nile anaghị eme nke ahụ mgbe ụfọdụ. N’ụzọ a na-apụghị izere ezere, anyị adịghị emezu ihe ibe anyị tụrụ anya ya, ọbụnakwa na-ewetara ibe anyị ihe mgbu site n’oge ruo n’oge. Gbalịa ịghara ilekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-adịghị emezi n’akụkụ nke a. Ọ bụrụ na i lekwasị anya ná njehie dị iche iche, ị nọ n’ihe ize ndụ nke ịdị na-akatọ ọgbakọ n’ụzọ fere ókè, ọbụna nweekwa ike ịdaba n’ọnyà ahụ Pọl chọsiri ike inyere anyị aka izere, ya bụ, ịhapụ nzukọ nke onwe anyị. Chineke ekwela! Ka usoro ihe ochie nke a na-abụwanye ihe dị ize ndụ ma na-akpagbu akpagbu, ka anyị kpebisie ike ime ihe anyị nwere ike ya iji mee ka mmekọrịta anyị ná nzukọ nile na-ewuli elu—na-emekwa nke a karị ka anyị na-ahụ ụbọchị Jehova ka ọ na-abịaru nso.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Onye okenye pụrụ ịhọrọ isoro onye dị otú ahụ mụọ isiokwu Ụlọ Nche na Teta! ndị na-agba ume—dị ka ihe atụ, “Ị̀ Ga-erite Uru Site n’Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ?” na “Imeri n’Agha A Na-ebuso Obi Ịda Mbà.”—Ụlọ Nche, February 15 na March 1, 1990.
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa na nzukọ na mkpakọrịta anyị nile ga na-agba ume ná mgbe ikpeazụ ndị a?
◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ iche banyere ibe anyị?
◻ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịkpasu ibe anyị?
◻ Gịnị ka ịgbarịta ibe anyị ume gụnyere?
◻ Olee otú a pụrụ isi gbaa ndị dara mbà n’obi ume?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ile ọbịa nke ọma na-enyere anyị aka ịma ibe anyị nke ọma karị
[Foto dị na peeji nke 18]
Mgbe Elaịja dara mbà n’obi, Jehova kasiri ya obi n’obi ọma