-
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
-
-
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?
“Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya.”—MATIU 25:31.
1-3. Gịnị mere anyị ga-eji nwee olileanya dị mma banyere ikpe ziri ezi?
‘IKPE Ọ̀ MARA GỊ KA AKA GỊ Ọ̀ DỊ ỌCHA?’ Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya mgbe ha na-anụ akụkọ banyere ikpe ụfọdụ nke ụlọikpe. Ndị ikpe na ndị òtù ikpe pụrụ ịgbalị ịkwụwa aka ọtọ, ma à na-enwekarị ikpe ziri ezi? Ọ̀ bụ na ị nụbeghị banyere ikpe na-ezighị ezi na akwụwaghị aka ọtọ n’usoro ikpe ikpe? Ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ, dị ka anyị na-ahụ n’ihe atụ Jisọs nke dị na Luk 18:1-8.
2 N’agbanyeghị ahụmahụ i nweworo banyere ikpe ziri ezi nke ụmụ mmadụ, rịba nkwubi okwu Jisọs ama: “Chineke, Ọ́ gaghị ekpepụta ndị nke Ya a họpụtara, ndị na-akpọku Ya ehihie na abalị . . . ? Asị m unu, na Ọ ga-ekpepụta ha ọsọ ọsọ. Otú ọ dị, mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”
3 Ee, Jehova ga-ahụ na ndị ohu ya ga-emesịa nweta ikpe ziri ezi. O metụtakwara Jisọs, karịsịa ugbu a n’ihi na anyị na-ebi “na mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe ọjọọ nke dị ugbu a. N’isi nso Jehova ga-eji Ọkpara ya dị ike mee ihe iji hichapụ ajọ omume n’elu ala. (2 Timoti 3:1; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8; Mkpughe 19:11-16) Anyị pụrụ ịghọta òkè Jisọs site n’otu n’ime ihe atụ ndị ikpeazụ o nyere, bụ́ nke a na-akpọkarị ilu atụrụ na ụmụ ewu.
4. Olee otú anyị siworo ghọta oge ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ ga-emezu, ma n’ihi gịnị ka anyị ga-eji leba anya n’ilu ahụ ugbu a? (Ilu 4:18)
4 Anyị anọwo na-aghọta eri ogologo oge na ilu ahụ gosiri nnọdụ ala nke Jisọs dị ka Eze na 1914, kemgbe ahụkwa na-enye mkpebi ikpe dị iche iche—ndụ ebighị ebi maka ndị na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị yiri atụrụ, ọnwụ na-adịgide adịgide maka ụmụ ewu. Ma ntụleghachi nke ilu ahụ na-ezo aka ná nghọta a gbanwere agbanwe banyere oge ọ ga-eme na ihe ọ na-egosi. Mmezigharị nke a na-emesi ike ịdị mkpa nke ọrụ nkwusa anyị na ihe mmeghachi omume nke ndị mmadụ pụtara. Iji hụ ebe mgbakwasị ụkwụ maka nghọta a ka mie emi nke ilu ahụ, ka anyị tụlee ihe Bible na-egosi banyere Jehova na Jisọs, ha abụọ dị ka Ndị Eze na Ndị Ikpe.
Jehova Dị Ka Onye Ikpe Kasị Ukwuu
5, 6. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ile Jehova anya dị ka ma Eze ma Onye Ikpe?
5 Jehova na-achị eluigwe na ala, na-enwe ike n’elu ihe nile. N’enweghị mmalite na ọgwụgwụ, ọ bụ “Eze nke mgbe nile.” (1 Timoti 1:17; Abụ Ọma 90:2, 4; Mkpughe 15:3) O nwere ikike inye ụkpụrụ iwu, ma ọ bụ iwu, na ịhụ na e debere ndị a. Ma ikike ya gụnyere ịbụ Onye Ikpe. Aịsaịa 33:22 na-asị: “Jehova bụ onye ikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị; Ya onwe ya ga-azọpụta anyị.”
6 Ndị ohu Chineke amatawo Jehova eri ogologo oge dị ka Onye Ikpe nke okwu ikpe na esemokwu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, mgbe “Onye ikpe ụwa nile” tụlesịworo ihe àmà e nwere banyere ajọ omume nke Sọdọm na Gọmọra, o kpebiri na ndị bi n’obodo ndị ahụ kwesịrị mbibi ma hụkwa na e mezuru ikpe ezi omume ahụ. (Jenesis 18:20-33; Job 34:10-12) Lee ka o kwesịrị isi mesie anyị obi ike ịmara na Jehova bụ Onye Ikpe ezi omume onye pụrụ imezu ikpe ya mgbe nile!
7. Olee otú Jehova si rụọ ọrụ dị ka Onye Ikpe n’imeso Israel ihe?
7 N’Israel oge ochie, mgbe ụfọdụ Jehova nyere mkpebi ikpe ozugbo. Ọ̀ bụ na a gaghị akasiworị gị obi laa azụ n’oge ahụ ịmara na Onye Ikpe zuru okè na-ekpebi okwu? (Levitikọs 24:10-16; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36; 27:1-11) Chineke nyekwara “ikpe” ndị dị mma n’ozuzu ha ịbụ ụkpụrụ maka ikpe ikpe. (Levitikọs 25:18, 19; Nehemaịa 9:13; Abụ Ọma 19:9, 10; 119:7, 75, 164; 147:19, 20) Ọ bụ “Onye ikpe nke ụwa nile,” ya mere o metụtara anyị nile.—Ndị Hibru 12:23.
8. Ọhụụ dị aṅaa metụtara ihe a na-ekwu ka Daniel hụrụ?
8 N’okwu a, anyị nwere akaebe nke “onye ji anya ya hụ ihe merenụ.” E nyere Daniel onye amụma ọhụụ nke ajọ anụ ọhịa ndị nọchitere anya ọchịchị ma ọ bụ alaeze ukwu dị iche iche. (Daniel 7:1-8, 17) O kwukwasịrị: “A tụdasịrị ocheeze dị iche iche, otu Onye ochie wee nọdụ ala: uwe Ya dị ọcha dị ka snow.” (Daniel 7:9) Rịba ama na Daniel hụrụ ocheeze dị iche iche ‘Onye ochie [Jehova] wee nọdụ ala.’ Jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe Daniel na-ahụ n’ebe a ọ̀ bụ ka Chineke na-aghọ Eze?’
9. Gịnị bụ otu n’ime ihe ‘ịnọdụ ala’ n’ocheeze pụtara? Nye ihe atụ.
9 Otú ọ dị, mgbe anyị gụrụ na mmadụ ‘nọdụrụ ala’ n’ocheeze, anyị pụrụ iche echiche banyere ya ịghọ eze, n’ihi na Bible na-eji okwu dị otú ahụ eme ihe mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ: “Mgbe [Zimri] malitere ịbụ eze, mgbe ọ nọkwasịrị n’ocheeze ya, na o . . .” (1 Ndị Eze 16:11; 2 Ndị Eze 10:30; 15:12; Jeremaịa 33:17) Otu amụma banyere Mesaịa ahụ kwuru, sị: ‘Ọ ghaghị ịnọdụ ala na-achị n’ocheeze ya.’ N’ihi ya, ‘ịnọdụ n’ocheeze’ pụrụ ịpụta ịghọ eze. (Zekaraịa 6:12, 13) A kọwara Jehova dị ka Eze nke na-anọkwasị n’ocheeze. (1 Ndị Eze 22:19; Aịsaịa 6:1; Mkpughe 4:1-3) Ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” Ma, ka o gosipụtara akụkụ ọhụrụ nke ọkaaka, a pụrụ ikwu na ọ ghọọla Eze, dị ka a ga-asị na ọ na-anọkwasịghachi ọhụrụ n’ocheeze ya.—1 Ihe Emere 16:1, 31; Aịsaịa 52:7; Mkpughe 11:15-17; 15:3, NW; 19:1, 2, 6.
10. Gịnị bụ ọrụ bụ isi nke ndị eze Israel? Mee ihe atụ.
10 Ma e nwere otu isi ihe n’ebe a: Ọrụ bụ isi nke ndị eze oge ochie bụ ịnụrụ okwu ikpe na inye mkpebi ikpe. (Ilu 20:8; 29:14) Cheta mkpebi ikpe amamihe dị na ya nke Solomọn nyere mgbe ụmụ nwanyị abụọ na-azọ otu nwa ọhụrụ. (1 Ndị Eze 3:16-28; 2 Ihe Emere 9:8) Otu n’ime ihe owuwu nke ọchịchị ya bụ “ụzọ mbata nke ocheeze ebe ọ ga na-ekpe ikpe,” bụ nke a na-akpọkwa “ụzọ mbata ikpe.” (1 Ndị Eze 7:7) A kọwara Jerusalem dị ka ebe “e doworo ocheeze nile ikpe ikpe.” (Abụ Ọma 122:5) N’ụzọ doro anya, ‘ịnọkwasị n’ocheeze’ pụkwara ịpụta iji ike ikpe mee ihe.—Ọpụpụ 18:13; Ilu 20:8.
11, 12. (a) Gịnị ka Jehova ịnọdụ ala, bụ́ nke e hotara na Daniel isi nke 7, pụtara? (b) Olee otú akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ si akwado na Jehova na-anọdụ ala ikpe ikpe?
11 Ugbu a ka anyị laghachi n’ebe ahụ Daniel hụrụ ‘Onye ochie ahụ ka ọ nọdụrụ ala.’ Daniel 7:10 na-ekwukwasị: “Onye ikpe ahụ nọdụrụ ala, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.” Ee, Onye Ochie ahụ na-anọdụ ala inye mkpebi ikpe banyere ọchịchị ụwa na ikwupụta Nwa nke mmadụ dị ka onye ruru eru ịchị achị. (Daniel 7:13, 14) Mgbe ahụ anyị na-agụ na ‘Onye ochie ahụ bịara, ikpe lakwaara ndị nsọ ahụ,’ bụ́ ndị e kwupụtara na ha ruru eru isoro Nwa nke mmadụ chịa achị. (Daniel 7:22) N’ikpeazụ “Onye ikpe ahụ ga-anọdụ ala” wee nye mkpebi ikpe na-agaghị adịrị ike ụwa ikpeazụ mma.—Daniel 7:26.a
12 Ya mere, Daniel ịhụ ka Chineke ‘nọkwasịrị n’ocheeze’ pụtara Ya ịbịa nye mkpebi ikpe. Tupu mgbe ahụ Devid bụrụ abụ, sị: “I [Jehova] kpewo ikpe m ziri ezi na okwu ikpe m; Ị nọdụrụ n’ocheeze, bụrụ onye ikpe na-eme ezi omume.” (Abụ Ọma 9:4, 7) Joel dekwara, sị: “Ka mba nile teta, rịgota na ndagwurugwu Jehoshafat: n’ihi na n’ebe ahụ ka M [Jehova] ga-anọdụ ikpe mba nile bi gburugburu ikpe.” (Joel 3:12; tụlee Aịsaịa 16:5.) Ma Jisọs ma Pọl bara n’ọnọdụ ikpe bụ́ ebe mmadụ weere oche ịnụrụ okwu ikpe na inye mkpebi ikpe.b—Jọn 19:12-16; Ọrụ 23:3; 25:6.
Ọkwá Jisọs
13, 14. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka ndị Chineke nwere na Jisọs gaje ịghọ Eze? (b) Olee mgbe Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze ya, n’echiche dịkwa aṅaa ka ọ malitere ịchị na 33 O.A. gaa n’ihu?
13 Jehova bụ ma Eze ma Onye Ikpe. Olee banyere Jisọs? Mmụọ ozi nke na-ama ọkwa ọmụmụ ya kwuru, sị: “Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: . . . alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.” (Luk 1:32, 33) Jisọs gaje ịbụ onye nketa na-adịgide adịgide nke ọbụbụeze Devid. (2 Samuel 7:12-16) Ọ gaje ịchị site n’eluigwe, n’ihi na Devid sịrị: “Ihe nke si n’ọnụ Jehova pụta na-asị onyenwe m [Jisọs], Nọdụ ala n’aka nri m. Ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ dịịrị ụkwụ gị abụọ. Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.”—Abụ Ọma 110:1-4.
14 Olee mgbe nke ahụ ga-eme? Jisọs achịghị dị ka Eze n’oge ọ bụ mmadụ. (Jọn 18:33-37) Na 33 O.A., ọ nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, ọ rịgookwa n’eluigwe. Ndị Hibru 10:12 na-asị: “Onye ahụ, mgbe O chererị otu àjà n’ihu Chineke n’ihi mmehie, O wee nọdụ n’aka nri Chineke mgbe nile.” Olee ikike Jisọs nwere? “[Chineke] meekwa ka Ọ nọdụ n’aka nri Ya n’ebe dị n’eluigwe, kachasị ha nile elu, bụ́ ịbụ onye isi, na ịchịisi, na ike, na ịbụ onyenwe mmadụ . . . O mere ka Ọ bụrụ isi n’elu ihe nile n’ebe nzukọ Ya nọ.” (Ndị Efesọs 1:20-22) N’ihi na Jisọs nwere n’oge ahụ ikike eze n’elu ndị Kraịst, Pọl pụrụ ide na Jehova “dọpụtara anyị n’ike nke ọchịchịrị, wee webiga anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya Ya.”—Ndị Kọlọsi 1:13; 3:1.
15, 16. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo na Jisọs aghọghị Eze nke Alaeze Chineke na 33 O.A.? (b) Olee mgbe Jisọs malitere ịchị n’Alaeze Chineke?
15 Otú ọ dị, n’oge ahụ Jisọs emeghị ihe dị ka Eze na Onye Ikpe n’elu mba nile. Ọ nọdụrụ ala na-esote Chineke, na-echere oge ime ihe dị ka Eze nke Alaeze Chineke. Pọl dere banyere ya, sị: “Ọ̀ bụ ònye n’etiti ndị mmụọ ozi ka O kwuworo okwu banyere ya mgbe ọ bụla, sị, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro Gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ Gị abụọ?”—Ndị Hibru 1:13.
16 Ndịàmà Jehova ebipụtawo ihe àmà dị ukwuu na oge nchere nke Jisọs gwụsịrị na 1914, mgbe ọ ghọrọ onye ọchịchị nke Alaeze Chineke n’eluigwe nke anya na-adịghị ahụ. Mkpughe 11:15, 18 na-asị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst Ya: Ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” “Mba nile wee wee iwe, iwe Gị wee bịa.” Ee, mba nile wesoro ibe ha iwe n’oge Agha Ụwa Mbụ. (Luk 21:24) Agha, ala ọma jijiji, ajọ ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na ihe ndị yiri ha ndị anyị hụworo kemgbe 1914 na-akwado na Jisọs na-achị achị ugbu a n’Alaeze Chineke, ọgwụgwụ ikpeazụ nke ụwa dịkwa nso.—Matiu 24:3-14.
17. Isi ihe ndị dị aṅaa ka anyị meworo ka ọ pụta ìhè rute ugbu a?
17 Ná ntụleghachi dị mkpirikpi: A pụrụ ikwu na Chineke na-anọkwasị n’ocheeze dị ka Eze, ma n’echiche ọzọ ọ pụrụ ịnọkwasị n’ocheeze ya ikpe ikpe. Na 33 O.A., Jisọs nọdụrụ ala n’aka nri Chineke, ọ bụkwa Eze nke Alaeze ahụ ugbu a. Ma Jisọs, nke na-achị ugbu a dị ka Eze, ọ̀ na-ejekwa ozi dị ka Onye Ikpe? N’ihi gịnịkwa ka nke a kwesịrị iji gbasa anyị, karịsịa n’oge a?
18. Olee ihe àmà e nwere na Jisọs ga-abụkwa Onye Ikpe?
18 Jehova, onye nwere ikike ịhọpụta ndị ikpe, họọrọ Jisọs dị ka Onye Ikpe nke ruru ụkpụrụ ndị Ọ chọrọ. Jisọs gosipụtara nke a mgbe ọ na-ekwu banyere ndị mmadụ ịghọ ndị dị ndụ n’ụzọ ime mmụọ: “Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama O werewo ikpe nile nye Ọkpara Ya.” (Jọn 5:22) Ma, ọrụ ikpe ikpe nke Jisọs karịrị ụdị ikpe ikpe ahụ, n’ihi na ọ bụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ 10:42; 2 Timoti 4:1) Pọl kwuru n’otu oge, sị: “[Chineke edebewo] otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu Nwoke [Jisọs] Ọ kara aka; O nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe O mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Ọrụ 17:31; Abụ Ọma 72:2-7.
19. N’ihi gịnị ka o ji zie ezi ikwu banyere Jisọs dị ka onye na-anọdụ ala dị ka Onye Ikpe?
19 Ànyị si otú a zie ezi ikwubi na Jisọs na-anọdụ ala n’ocheeze ebube kpọmkwem n’ọkwá nke Onye Ikpe? Ee. Jisọs gwara ndị ozi ahụ, sị: “Ná nkegharị ahụ, mgbe Nwa nke mmadụ nọkwasịrị n’ocheeze ya dị ebube, unu ndị sowooro m, unu onwe unu kwa ga-anọkwasị n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Matiu 19:28, NW) Ọ bụ ezie na Jisọs bụ ugbu a Eze nke Alaeze ahụ, ọrụ ya ọzọ e hotara na Matiu 19:28 ga-agụnye ịnọkwasị n’ocheeze iji kpee ikpe na Narị Afọ Iri ahụ. N’oge ahụ ọ ga-ekpe ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Ọrụ 24:15) Ọ na-enye aka iburu nke a n’uche ka anyị na-eche ihu n’otu n’ime ilu Jisọs nke metụtara oge anyị na ndụ anyị.
Gịnị Ka Ilu ahụ Na-ekwu?
20, 21. Gịnị ka ndị ozi Jisọs jụrụ nke na-emetụta oge anyị, na-eduje n’ajụjụ dị aṅaa?
20 Ntakịrị oge tupu Jisọs anwụọ, ndị ozi ya jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Jisọs buru amụma banyere oké ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ n’ụwa tupu ‘ọgwụgwụ ahụ eruo.’ Ntakịrị oge tupu ọgwụgwụ ahụ eruo, mba nile “ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:14, 29, 30.
21 Otú ọ dị, olee otú ihe ga-adịrị ndị nọ ná mba ndị ahụ mgbe Nwa nke mmadụ bịara n’ebube ya? Ka anyị chọpụta site n’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ, nke ji okwu ndị a malite: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ.”—Matiu 25:31, 32.
22, 23. Isi ihe ndị dị aṅaa na-egosi na ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ amaliteghị mmezu ya na 1914?
22 Ilu nke a ò mezuru mgbe Jisọs nọdụrụ ala n’ike eze na 1914, dị ka anyị nọworo na-aghọta eri ogologo oge? Ọ dị mma, Matiu 25:34 na-ekwu banyere ya dị ka Eze, ya mere n’ụzọ ezi ìzù dị na ya ilu ahụ na-enwe mmezu ya kemgbe Jisọs ghọrọ Eze na 1914. Ma ikpe ikpe dị aṅaa ka o kpere ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị? Ọ bụghị ikpe “mba nile” ikpe. Kama nke ahụ, o chere ihu ya n’ebe ndị ahụ na-azọrọ na ha bụ ‘ụlọ Chineke’ dị. (1 Pita 4:17) N’ikwekọ na Malakaị 3:1-3, Jisọs, dị ka onye ozi nke Jehova, nyochara ndị Kraịst e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala n’ụzọ ikpe ikpe. Ọ bụkwa oge ịma Krisendọm ikpe, bụ́ ndị zọọrọ n’ụzọ ụgha ịbụ ‘ụlọ Chineke.’c (Mkpughe 17:1, 2; 18:4-8) Ma ọ dịghị ihe na-egosi na n’oge ahụ, ma ọ bụkwanụ, eri oge ahụ, na Jisọs nọdụrụ ala ikpe ndị nke mba nile ikpe n’ikpeazụ dị ka atụrụ ma ọ bụ ụmụ ewu.
23 Ọ bụrụ na anyị enyochaa ọrụ Jisọs n’ilu ahụ, anyị na-ahụ ya ka ọ na-ekpe mba nile ikpe n’ikpeazụ. Ilu ahụ adịghị egosi na ikpe ikpe dị otú ahụ ga-aga n’ihu ruo ogologo oge nke ọtụtụ afọ, dị ka a ga-asị na onye ọ bụla nke na-anwụ n’ime afọ iri ndị a gara aga bụ onye e kpebiri na o ruru eru inweta ọnwụ ebighị ebi ma ọ bụ ndụ ebighị ebi. O yiri ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nwụworo n’ime afọ iri ndị na-adịbeghị anya agaala n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 6:8; 20:13) Otú ọ dị, ilu ahụ na-egosi oge mgbe Jisọs ga-ekpe ndị nke “mba nile” ikpe bụ́ ndị nọ ndụ mgbe ahụ ma na-eche mmezu nke amamikpe ya ihu.
24. Olee mgbe ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ gaemezu?
24 N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ilu ahụ na-ezo aka n’ọdịnihu mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya. Ọ ga-anọdụ ala ikpe ndị dị ndụ n’oge ahụ ikpe. Mkpebi ikpe ya ga-adabere n’ihe ha gosipụtaworo na ha bụ n’onwe ha. N’oge ahụ, a ga-emeworị ka “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu” pụta ìhè. (Malakaị 3:18) A ga-emezu ịma ikpe ahụ na mmezu ya kpọmkwem n’ime mkpirikpi oge. Jisọs ga-enye mkpebi ikpe ndị ziri ezi dabere n’ihe ndị pụtaworo ìhè banyere ndị mmadụ n’otu n’otu.—Leekwa 2 Ndị Kọrint 5:10.
25. Gịnị ka Matiu 25:31 na-egosi n’ikwu banyere Nwa nke mmadụ ịnọkwasị n’ocheeze ebube?
25 Nke a pụtaziri na Jisọs ‘ịnọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya’ maka ikpe ikpe, bụ́ nke e hotara na Matiu 25:31, ga-emezu n’ọdịnihu mgbe Eze a dị ike ga-anọdụ ala ịma mba nile ikpe na imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ha. Ee, ọnọdụ ikpe ahụ metụtara Jisọs nke dị na Matiu 25:31-33, 46 bụ nke a pụrụ iji tụnyere ọnọdụ dị na Daniel isi nke 7, bụ́ ebe Eze ahụ na-achị achị, Onye Ochie ahụ, nọdụrụ ala ịrụ ọrụ ya dị ka Onye Ikpe.
26. Nkọwa ọhụrụ dị aṅaa nke ilu ahụ na-apụta ìhè?
26 Ịghọta ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ n’ụzọ dị otú a na-egosi na inye mkpebi ikpe banyere atụrụ na ụmụ ewu ahụ bụ n’ọdịnihu. Ọ ga-ewere ọnọdụ mgbe “mkpagbu” ahụ e hotara na Matiu 24:29, 30 tiwapụsịrị, Nwa nke mmadụ ‘bịakwa n’ebube ya.’ (Tụlee Mak 13:24-26.) Mgbe ahụ, ebe ajọ usoro ihe dum bịaworo ná njedebe ya, Jisọs ga-enwe nnọkọ ikpe ma nye mkpebi ikpe, mezuokwa ha.—Jọn 5:30; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7-10.
27. Gịnị ka anyị kwesịrị inwe mmasị ịmara banyere ilu ikpeazụ Jisọs?
27 Nke a na-eme ka nghọta anyị banyere oge ilu Jisọs ga-emezu dowanye anya, bụ́ nke na-egosi mgbe a ga-ekpe atụrụ na ụmụ ewu ahụ ikpe. Ma olee otú o si emetụta anyị bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ? (Matiu 24:14) Ọ̀ na-eme ka ọrụ anyị ghara ịdịchakwa mkpa, ka ọ̀ na-eweta ibu ọrụ ka ukwuu? Ka anyị lee n’isiokwu na-esonụ otú o si emetụta anyị.
-
-
Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?Ụlọ Nche—1995 | Ọktoba 15
-
-
Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
“Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.”—MATIU 25:32.
1, 2. N’ihi gịnị ka ilu nke atụrụ na ụmụ ewu kwesịrị iji dọrọ mmasị anyị?
JISỌS KRAỊST n’ezie bụ Onye Ozizi kasị ukwuu n’ụwa. (Jọn 7:46) Otu n’ime ụzọ izi ihe ya bụ iji ilu, ma ọ bụ ihe atụ, eme ihe. (Matiu 13:34, 35) Ndị a dị mfe ma dị ike n’inye eziokwu ime mmụọ na nke amụma ndị dị omimi.
2 N’ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Jisọs zoro aka n’oge ọ ga-eme ihe n’ọkwá pụrụ iche: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na . . .” (Matiu 25:31) Nke a kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị n’ihi na ọ bụ ihe atụ nke Jisọs ji mechie azịza ya nye ajụjụ ahụ bụ́: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Ma gịnị ka nke a pụtara nye anyị?
3. Ná mmalite okwu ya, gịnị ka Jisọs kwuru ga-eme ngwa ngwa mkpagbu ukwu ahụ malitesịrị?
3 Jisọs buru amụma ihe omume ndị dị ịrịba ama ndị ga-abịa “ngwa ngwa” mkpagbu ukwu ahụ tiwapụsịrị, bụ́ ihe omume ndị anyị na-echere. Ọ sịrị na mgbe ahụ ka “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” ga-apụta. Nke a ga-emetụta “ebo nile nke ụwa” n’ụzọ dị ukwuu bụ́ ndị ga-ahụ “Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nke eluigwe n’ike na oké ebube.” Nwa nke mmadụ na “ndị mmụọ ozi Ya” ga-eso. (Matiu 24:21, 29-31)a Gịnị banyere ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ? Bible ndị nke oge a na-etinye ya n’isi nke 25, ma, ọ bụ akụkụ nke nzaghachi Jisọs, na-enyekwu nkọwa banyere ọbịbịa ya n’ebube ma na-elekwasị anya na ya ikpe “mba nile” ikpe.—Matiu 25:32.
Ndị Dị n’Ilu Ahụ
4. Nhota dị aṅaa ka e hotara Jisọs ná mmalite nke ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, oleekwa onye ọzọ e hotara?
4 Jisọs malitere ilu ahụ site n’ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa.” Ikekwe ị maara onye “Nwa nke mmadụ” ahụ bụ. Ndị dere Oziọma ahụ jiri okwu ahụ mee ihe ọtụtụ mgbe n’ebe Jisọs nọ. Ọbụna Jisọs n’onwe ya mere otú a, n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na-eburu n’uche ọhụụ Daniel banyere “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” nke na-abịakwute Onye Ochie ahụ ịnata “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” (Daniel 7:13, 14; Matiu 26:63, 64; Mak 14:61, 62) Ọ bụ ezie na ọ bụ Jisọs bụ onye bụ isi n’ilu a, ọ nọghị nanị ya. Ná mmalite ntụle nke a, dị ka e hotara na Matiu 24:30, 31, ọ sịrị na mgbe Nwa nke mmadụ ‘ga-abịa n’ike na oké ebube,’ ndị mmụọ ozi ya ga-arụ ọrụ dị mkpa. N’otu aka ahụ, ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ na-egosi ka Jisọs na ndị mmụọ ozi nọ mgbe ọ ‘na-anọdụ n’ocheeze ebube ya’ ikpe ikpe. (Tụlee Matiu 16:27.) Ma Onye Ikpe ahụ na ndị mmụọ ozi ya nọ n’eluigwe, ọ̀ bụ otu ihe ahụ banyere ndị mmadụ e kwuru maka ha n’ilu ahụ?
5. Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị bụ “ụmụnna” Jisọs?
5 Otu nle anya n’ilu ahụ na-ekpughe ìgwè atọ ndị ọ dị anyị mkpa ịmata. Tụkwasị n’atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Nwa nke mmadụ na-atụkwasị ìgwè nke atọ ndị ịmata ndị ha bụ dị oké mkpa n’ịmata atụrụ na ụmụ ewu ahụ. Jisọs na-akpọ ìgwè nke atọ nke a ụmụnna ime mmụọ ya. (Matiu 25:40, 45) Ha aghaghị ịbụ ndị na-efe ezi ofufe, n’ihi na Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-eme ihe Nna m . . . na-achọ, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.” (Matiu 12:50; Jọn 20:17) N’ịkpọkwu okwu aha, Pọl dere maka ndị Kraịst bụ akụkụ nke “mkpụrụ Abraham,” ndị bụkwa ụmụ Chineke. Ọ kpọrọ ndị a “ụmụnna” Jisọs na “ndị nketa nke ọkpụkpọ eluigwe.”—Ndị Hibru 2:9–3:1; Ndị Galetia 3:26, 29.
6. Olee ndị bụ “ndị dịkarịsịrị nta” n’ime ụmụnna Jisọs?
6 N’ihi gịnị ka Jisọs ji hota ‘onye dịkarịsịrị nta’ n’ime ụmụnna ya? Okwu ndị ahụ bụ nkwughachi nke ihe ndị ozi ahụ nụrụ o kwuru tupu mgbe ahụ. Mgbe o ji Jọn Baptist, bụ́ onye bu Jisọs ụzọ nwụọ, n’ihi ya kwa nwee olileanya elu ala, na-atụnyere ndị na-enweta ndụ eluigwe, Jisọs sịrị: “N’etiti ndị ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Baptist ukwuu: ma onye dịkarịrị nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwuu.” (Matiu 11:11) Ụfọdụ ndị na-eje eluigwe pụrụ ịbụworị ndị a ma ama n’ọgbakọ, dị ka ndị ozi ahụ, ndị ọzọ abụrụkwa ndị a na-amachaghị otú ahụ, ma ha nile bụ ụmụnna ime mmụọ Jisọs. (Luk 16:10; 1 Ndị Kọrint 15:9; Ndị Efesọs 3:8; Ndị Hibru 8:11) Ya mere, a sịgodị na ụfọdụ yiri ndị na-adịghị mkpa n’ụwa, ha bụ ụmụnna ya, e kwesịkwara imeso ha ihe n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ.
Olee Ndị Bụ Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
7, 8. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere atụrụ ahụ, ya mere gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere ha?
7 Banyere ikpe atụrụ ahụ ikpe anyị na-agụ, sị: ‘Jisọs ga-asị ndị nọ n’aka nri Ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa: n’ihi na agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe M ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee kuru mmiri nye m: abụ m ọbịa, unu wee kpọbata m; agbara m ọtọ, unu wee gbokwasị m ákwà: ahụ adịghị m ike, unu wee leta m: anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu wee bịakwute m. Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-aza Ya, sị, Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ Gị ka agụụ na-agụ Gị, anyị wee zụọ Gị? ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, anyị wee kuru mmiri nye Gị? Olee mgbe anyị hụkwara Gị ka Ị bụ ọbịa, anyị wee kpọbata Gị? ma ọ bụ ka Ị na-agba ọtọ, anyị wee gbokwasị Gị ákwà? Olee mgbe anyị hụkwara Gị ka ahụ na-adịghị ike, ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ, anyị wee bịakwute Gị? Eze ahụ ga-azakwa, sị ha, N’ezie asị m unu, Ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu mere ya nye.’—Matiu 25:34-40.
8 N’ụzọ doro anya, atụrụ ahụ e kpebiri na ha ruru eru ịnọ n’aka nri nsọpụrụ na nke ihu ọma nke Jisọs na-anọchite anya otu òtù nke ụmụ mmadụ. (Ndị Efesọs 1:20; Ndị Hibru 1:3) Gịnị ka ha mere, olee mgbekwa? Jisọs na-asị na ha ji obi ọma, nkwanye ùgwù, na afọ ofufo nye ya ihe oriri, ihe ọṅụṅụ, na ákwà, na-enyere ya aka mgbe ọ na-arịa ọrịa ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe atụrụ ahụ sịrị na ha emeghịrị Jisọs nke a n’onwe ya, o zoro aka na ha kwadoro ụmụnna ime mmụọ ya, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ, ya mere n’echiche ahụ ha mere ya nye ya.
9. N’ihi gịnị ka ilu ahụ na-adịghị emezu na Narị Afọ Iri ahụ?
9 Ilu ahụ adịghị emezu na Narị Afọ Iri ahụ, n’ihi na n’oge ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ agaghị abụ mmadụ na-ata ahụhụ agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, ọrịa, ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ha enwewo ahụmahụ dị otú ahụ n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Kemgbe a chụdara Setan n’elu ụwa, o mewo ndị ahụ fọdụrụnụ ndị ọ na-eweso iwe ya n’ụzọ pụrụ iche, na-ewetara ha ịkwa emo, mmekpọ ọnụ, na ọnwụ.—Mkpughe 12:17.
10, 11. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ezi uche dị na ya iche na atụrụ ahụ gụnyere onye ọ bụla nke meere ụmụnna Jisọs ihe ọma? (b) Ole ndị ka atụrụ ahụ na-anọchite anya ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
10 Jisọs ọ̀ na-ekwu na onye ọ bụla na-emere otu n’ime ụmụnna ime mmụọ ya ntakịrị ihe ọma, dị ka inye ha otu ógbè achịcha ma ọ bụ otu iko mmiri, ruru eru ịbụ otu n’ime atụrụ ndị a? N’eziokwu, ime ihe ọma ndị dị otú ahụ pụrụ igosi obi ọma mmadụ, ma n’ezie, o yiri ka a gụnyere ihe karịrị nke ahụ n’ebe atụrụ dị n’ilu a dị. O doro anya na Jisọs adịghị ezo aka, dị ka ihe atụ, n’ebe ndị na-ekweghị na Chineke ma ọ bụ n’ebe ndị ụkọchukwu nọ, bụ́ ndị meere otu n’ime ụmụnna ime mmụọ ya ihe ọma. N’ụzọ megidere nke ahụ, ugboro abụọ Jisọs kpọrọ atụrụ ahụ “ndị ezi omume.” (Matiu 25:37, 46) Ya mere, atụrụ ahụ aghaghị ịbụ ndị gbatawooro ụmụnna Kraịst ọsọ enyemaka ruo ogologo oge—na-enye nkwado pụtara ìhè—ma gosipụta okwukwe ruo n’ókè nke inweta nguzo ezi omume n’ihu Chineke.
11 N’ime narị afọ ndị gara aga, ọtụtụ ndị, dị ka Abraham, enwewo nguzo ezi omume. (Jemes 2:21-23) Noa, Abraham, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ ndị ga-eketa ndụ n’ime Paradaịs n’okpuru Alaeze Chineke. N’oge ndị na-adịbeghị anya ọtụtụ nde ndị ọzọ amalitewo ife ezi ofufe dị ka atụrụ ọzọ ma soro ndị ahụ e tere mmanụ ghọọ “otu ìgwè atụrụ.” (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) Ndị a nwere olileanya elu ala matara ụmụnna Jisọs dị ka ndị nnọchianya Alaeze ahụ, n’ihi ya kwa nyere ha aka—n’ụzọ nkịtị na n’ụzọ ime mmụọ. Jisọs na-ewere ihe atụrụ ọzọ ahụ na-emere ụmụnna ya nọ n’elu ala dị ka ihe a na-emere ya. A ga-ekwupụta ndị dị otú ahụ nọ ndụ mgbe ọ ga-abịa ikpe mba nile ikpe dị ka atụrụ.
12. N’ihi gịnị ka atụrụ ahụ pụrụ iji jụọ otú ha siworo meere Jisọs ihe ọma?
12 Ọ bụrụ na atụrụ ọzọ ahụ so ndị ahụ e tere mmanụ na-ekwusa ozi ọma ahụ ugbu a ma na-enyere ha aka, n’ihi gịnị ka ha ga-eji jụọ, sị: “Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ Gị ka agụụ na-agụ Gị, anyị wee zụọ Gị? ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, anyị wee kuru mmiri nye Gị?” (Matiu 25:37) A pụrụ inwe ọtụtụ ihe kpatara ya. Ihe a bụ ilu. Jisọs ji ya gosi nchegbu dị omimi o nwere maka ụmụnna ime mmụọ ya; o so ha na-enwe mmetụta ha, soro ha na-ata ahụhụ. Jisọs ekwuolarị na mbụ, sị: “Onye na-anara unu nke ọma, ọ bụ Mụ onwe m ka ọ na-anara nke ọma, onye na-anarakwa Mụ onwe m nke ọma na-anara Onye zitere m nke ọma.” (Matiu 10:40) N’ihe atụ a, Jisọs na-agbatịpụ ụkpụrụ ahụ, na-egosi na ihe e meere (ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ) ụmụnna ya na-eru ọbụna n’eluigwe; ọ dị ka a ga-asị na e meere ya n’eluigwe. Ọzọkwa, n’ebe a Jisọs na-emesi ụkpụrụ Jehova maka ikpe ikpe ike, na-eme ka o doo anya na ikpe Chineke, ma ọ bụ nke dị mma ma ọ bụ nke ịma ikpe, dị irè ma zie ezi. Ụmụ ewu ahụ apụghị inye ihe ngọpụ bụ́, ‘A sị nnọọ na anyị hụrụ gị ihu na ihu.’
13. N’ihi gịnị ka ndị yiri ụmụ ewu pụrụ iji kpọọ Jisọs “Onyenwe anyị”?
13 Ozugbo anyị ghọtara oge e jiri nye mkpebi ikpe ahụ e gosiri n’ilu a, anyị ga-enwe nghọta ka doo anya banyere ndị ụmụ ewu ahụ bụ. Mmezu ya bụ mgbe ‘ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụta ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa . . . n’ike na oké ebube.’ (Matiu 24:29, 30) Ndị ga-alanarị mkpagbu ahụ ga-abịakwasị Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ ndị mesoworo ụmụnne Eze ahụ ihe n’ụzọ ịsọ oyi pụrụ ugbu a ịdị na-akpọ Onye Ikpe ahụ “Onyenwe anyị” n’ọnwụ ọnwụ na-atụ anya ịzọpụta ndụ ha.—Matiu 7:22, 23; tụlee Mkpughe 6:15-17.
14. Dabere na gịnị ka Jisọs ga-ekpe atụrụ na ụmụ ewu ahụ ikpe?
14 Ikpe Jisọs agaghị adabere ná nzọrọ ọnwụ ọnwụ nke ndị na-ejebu chọọchị, ndị na-ekweghị na Chineke, ma ọ bụ ndị ọzọ. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:8) Kama nke ahụ, onye ikpe ahụ ga-atụleghachi ọnọdụ obi na omume ndị mmadụ mesoro “otu onye n’ime [ụmụnna ya] ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta,” n’oge gara aga. N’ụzọ a pụrụ ịnakwere, ọnụ ọgụgụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ fọrọ n’elu ala na-adalata. Otú ọ dị, ruo ogologo oge ndị ahụ e tere mmanụ ndị na-emejupụta “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nọgidere na-enye nri ime mmụọ na nduzi, ndị gaje ịghọ atụrụ nwere ohere nke imere òtù ohu ahụ ihe ọma, dị nnọọ ka ‘oké ìgwè mmadụ ahụ sitere mba nile, na ebo nile, na ndị nile’ meworo.—Mkpughe 7:9, 14.
15. (a) Olee otú ọtụtụ ndị siworo gosipụta onwe ha ịbụ ndị yiri ụmụ ewu? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ikwu ma mmadụ ọ̀ bụ atụrụ ma ọ bụ ewu?
15 Olee otú e siworo mesoo ụmụnna Kraịst na ọtụtụ nde atụrụ ọzọ ndị sonyeere ha dị ka otu ìgwè atụrụ? Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị awakpobeghị n’onwe ha ndị nnọchiteanya Kraịst, ma ọ dịbeghịkwa mgbe ha mesoro ndị ya n’ụzọ ịhụnanya. N’ịhọrọ ụwa ajọ omume, ndị ahụ yiri ụmụ ewu na-ajụ ozi Alaeze ahụ, ma ha na-anụ ya n’onwe ha ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. (1 Jọn 2:15-17) Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ọ bụ Jisọs bụ onye a họpụtara inye mkpebi ikpe. Ọ dịghịrị anyị ikpebi ndị bụ atụrụ na ndị bụ ụmụ ewu.—Mak 2:8; Luk 5:22; Jọn 2:24, 25; Ndị Rom 14:10-12; 1 Ndị Kọrint 4:5.
Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ìgwè nke Ọ Bụla?
16, 17. Ọdịnihu dị aṅaa ka atụrụ ahụ ga-enwe?
16 Jisọs nyere mkpebi ikpe ya banyere atụrụ ahụ, sị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” Lee aha ọkpụkpọ òkù na-ekpo ọkụ nke ahụ bụ—“Bịanụ”! Na gịnị? Ná ndụ ebighị ebi, dị ka o kwupụtara ya ná nchịkọta, sị: “Ndị ezi omume ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:34, 46.
17 N’ilu nke talent ndị ahụ, Jisọs gosiri ihe a chọrọ n’aka ndị ga-eso ya chịa achịa n’eluigwe, ma n’ilu nke a, ọ na-egosi ihe a na-atụ anya ya n’aka ndị Alaeze ahụ ga-achị. (Matiu 25:14-23) N’ịkpọ okwu aha, n’ihi nkwado ha ji obi ha dum kwadoo ụmụnna Jisọs, atụrụ ahụ na-enweta ọnọdụ na gburugburu elu ala n’Alaeze ya. Ha ga-enwe ndụ n’elu ala paradaịs—olileanya nke Chineke kwadebeere ha “site na ntọala nke ụwa” nke ụmụ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta.—Luk 11:50, 51.
18, 19. (a) Jisọs ga-enye mkpebi ikpe dị aṅaa banyere ụmụ ewu ahụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ụmụ ewu ahụ agaghị eche ịta ahụhụ ebighị ebi ihu?
18 Lee ka ikpe a mara ụmụ ewu ahụ si dị iche! “Mgbe ahụ Ọ ga-asịkwa ndị nọ n’aka ekpe Ya, Pụọnụ n’ihu m, ndị a na-abụ ọnụ, gaa n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye ekwensu na ndị mmụọ ozi ya: n’ihi na agụụ gụrụ m, ma unu enyeghị m ihe M ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, ma unu ekughị mmiri nye m: abụ m ọbịa, ma unu akpọbataghị m; agbara m ọtọ, ma unu egbokwasịghị m ákwà; ahụ adịghị m ike, anọkwa m n’ụlọ mkpọrọ, ma unu eletaghị m. Mgbe ahụ ndị ahụ ga-azakwa, sị, Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ Gị ka agụụ na-agụ Gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, ma ọ bụ ka Ị bụ ọbịa, ma ọ bụ ka Ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ ka ahụ na-adịghị Gị ike, ma ọ bụ ka Ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ma anyị ejereghị Gị ozi? Mgbe ahụ Ọ ga-aza ha, sị, N’ezie asị m unu, Ka ọ hà, bụ otú unu na-emeghị ya nye otu onye n’ime ndị a dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu na-emeghị ya nye.”—Matiu 25:41-45.
19 Ndị na-amụ Bible maara na nke a apụghị ịpụta na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke ndị yiri ụmụ ewu ga-ata ahụhụ n’ime ọkụ ebighị ebi. Ee e, n’ihi na ụmụ mmadụ bụ mkpụrụ obi; ha enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. (Jenesis 2:7; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Site n’ịma ụmụ ewu ahụ ikpe gaa “n’ọkụ ebighị ebi,” Onye Ikpe ahụ bu n’uche mbibi nke na-enweghị olileanya ọdịnihu, bụ́ nke ga-abụkwa ọgwụgwụ na-adịgide adịgide nye Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpughe 20:10, 14) N’ihi ya, Onye Ikpe nke Jehova na-esetịpụ amamikpe abụọ na-emegide ibe ha. Ọ na-agwa atụrụ ahụ, sị, “Bịanụ”; ụmụ ewu ahụ, “Pụọnụ n’ihu m.” Atụrụ ahụ ga-enweta “ndụ ebighị ebi.” Ụmụ ewu ahụ ga-anata ‘ahụhụ ebighị ebi.’—Matiu 25:46.b
Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Anyị?
20, 21. (a) Ndị Kraịst nwere ọrụ dị aṅaa dị mkpa ịrụ? (b) Nkewa dị aṅaa na-aga n’ihu ugbu a? (ch) Gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị mmadụ mgbe ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ malitere imezu?
20 Ndị ozi anọ ahụ bụ́ ndị nụrụ nzaghachi Jisọs banyere ihe àmà nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a nwere ọtụtụ ihe ịtụle. Ọ ga-adị ha mkpa ịmụrụ anya na ịnọ na nche. (Matiu 24:42) Ọ ga-adịkwa ha mkpa ịrụ ọrụ ịgba àmà ahụ e hotara na Mak 13:10. Ndịàmà Jehova ji ume nile na-ekere òkè n’ọrụ ahụ taa.
21 Otú ọ dị, gịnị ka nghọta ọhụrụ a banyere ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ pụtara nye anyị? Ndị mmadụ amalitelarị isonyere akụkụ dị iche iche. Ụfọdụ nọ ‘n’ụzọ ahụ sara mbara nke na-eduje n’ịla n’iyi,’ ebe ndị ọzọ na-agbalị ịnọgide ‘n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi.’ (Matiu 7:13, 14) Ma oge Jisọs ga-ekwupụta mkpebi ikpe ikpeazụ banyere atụrụ na ụmụ ewu ahụ e gosiri n’ilu ahụ ka dị n’ihu. Mgbe Nwa nke mmadụ bịara n’ọkwá nke Onye Ikpe, ọ ga-ekpebi na ọtụtụ ezi ndị Kraịst—n’ezie “oké ìgwè mmadụ” nke atụrụ raara onwe ha nye—ga-eru eru ịgabiga akụkụ ikpeazụ nke ‘oké mkpagbu’ ahụ wee banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Olileanya ahụ kwesịrị ịbụ isi iyi nke ọṅụ ugbu a. (Mkpughe 7:9, 14) N’aka nke ọzọ, ọnụ ọgụgụ bara ụba ndị si ná “mba nile” ga-egosipụtaworị onwe ha ịbụ ndị yiri ụmụ ewu na-akpọ ekwo nkụ. Ha “ga-apụ jee baa n’ahụhụ ebighị ebi.” Lee ahụ efe ọ ga-abụrụ ụwa!
22, 23. Ebe ọ bụ na mmezu nke ilu ahụ ka dị n’ihu, n’ihi gịnị ka ọrụ nkwusa anyị taa ji dị mkpa?
22 Ọ bụ ezie na ikpe ikpe ahụ dị ka a kọwara ya n’ilu ahụ bụ n’ọdịnihu dị nso, ọbụna ugbu a ihe dị mkpa na-ewere ọnọdụ. Anyị bụ ndị Kraịst na-ekere òkè n’ọrụ na-azọpụta ndụ nke ịkpọsa ozi na-akpata nkewa n’etiti ndị mmadụ. (Matiu 10:32-39) Pọl dere, sị: “N’ihi na, Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha a ka ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha a ka anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?” (Ndị Rom 10:13, 14) Ozi ihu ọha anyị na-eji aha Chineke na ozi nzọpụta ya erute ndị mmadụ n’ihe karịrị 230 ala. Ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ka na-ebutekwa ụzọ n’ọrụ a. Ihe dị ka nde ise nke atụrụ ọzọ ahụ esonyewokwara ha ugbu a. Ndị mmadụ gburugburu ụwa na-aṅakwa ntị n’ozi ahụ ụmụnna Jisọs na-akpọsa.
23 A na-ekpughe ọtụtụ ndị nye ozi anyị ka anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ na mberede. Ndị ọzọ pụrụ ịnụ banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị anyị na-ekwusa n’ụzọ ndị anyị na-amaghị. Mgbe oge ikpe ruru, ruo n’ókè ha aṅaa ka Jisọs ga-atụleru ibu ọrụ e nwekọrọ ọnụ na iru eru nke ezinụlọ? Anyị apụghị ikwu, ọ baghịkwa uru ịkọ nkọ. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:14.) Ọtụtụ ndị ugbu a na-ama ụma leghara anya, kwaa emo, ma ọ bụ kere òkè ná mkpagbu pụtara ìhè nke ndị Chineke. N’ihi ya, ugbu a bụ oge dị oké mkpa; ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị na-aghọ ndị Jisọs ga-ama ikpe dị ka ụmụ ewu.—Matiu 10:22; Jọn 15:20; 16:2, 3; Ndị Rom 2:5, 6.
24. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị mmadụ n’otu n’otu zaghachi n’ụzọ dị mma? (b) Ọmụmụ ihe a enyeworo gị aka n’onwe gị inwe àgwà dị aṅaa n’ebe ozi gị dị?
24 Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ndị na-aṅa ntị, mụọ Okwu Chineke, ma ghọọ Ndịàmà nke Jehova. Ụfọdụ ndị yiri ụmụ ewu ugbu a pụrụ ịgbanwe ma ghọọ ndị yiri atụrụ. Ihe dị mkpa bụ na ndị na-aṅa ntị ma na-akwado ihe fọdụrụ n’ime ụmụnna Kraịst n’ụzọ pụtara ìhè si otú a ugbu a na-enye ihe àmà nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ iji debe ha n’aka nri Jisọs mgbe ọ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya inye mkpebi ikpe. A na-agọzi ndị a, a ga-anọgidekwa na-agọzi ha. Ya mere, ilu a kwesịrị ịkpali anyị ịrụ ọrụ ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu n’ozi ndị Kraịst. Tupu oge agafee, anyị chọrọ ime ihe nile anyị pụrụ ime iji kpọsaa ozi ọma Alaeze ahụ wee si n’ụzọ dị otú ahụ nye ndị ọzọ ohere ịṅa ntị. Ọ dịziiri Jisọs inye mkpebi ikpe, nke ịma ikpe ma ọ bụ nke dị mma.—Matiu 25:46.
-