-
E Ji Imesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Gụọ Akwụkwọ NsọRite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
-
-
IHE ỌMỤMỤ NKE 21
E Ji Imesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Gụọ Akwụkwọ Nsọ
MGBE ị na-agwa ndị ọzọ banyere nzube Chineke, mgbe nanị unu nọ ma ọ bụ site n’elu ikpo okwu, okwu gị kwesịrị ihiwe isi n’ihe dị n’Okwu Chineke. Nke a na-agụnyekarị ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ site n’ime Bible, bụ́ nke e kwesịrị ịgụ nke ọma.
Mmesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Na-agụnye Mmetụta. E kwesịrị iji mmetụta gụọ Akwụkwọ Nsọ. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Mgbe ị na-agụpụta Abụ Ọma 37:11, ụda olu gị kwesịrị igosi atụmanya na-enye obi ụtọ maka udo e kwere nkwa ya n’ebe ahụ. Mgbe ị na-agụ Mkpughe 21:4 banyere njedebe nke ịta ahụhụ na ọnwụ, ụda olu gị kwesịrị igosipụta ezi obi ekele maka nnwere onwe magburu onwe ya a na-ebu amụma ya. E kwesịrị iji olu nke ịdị ngwa gụọ Mkpughe 18:2, 4, 5, na òkù ọ na-akpọ ka e si na “Babilọn Ukwu ahụ” jupụtara ná mmehie pụta. N’ezie, mmetụta a na-egosipụta kwesịrị isite n’obi ma a gaghị emebiga ya ókè. Ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’onwe ya na ụzọ e si jiri ya na-eme ihe na-ekpebi ọ̀tụ̀tụ̀ mmetụta uche kwesịrị ekwesị.
Mesie Okwu Ndị Kwesịrị Ekwesị Ike. Ọ bụrụ na ihe ị ga-ekwu banyere otu amaokwu dabeere nanị n’otu akụkụ ya, i kwesịrị ime ka akụkụ ahụ pụta ìhè mgbe ị na-agụ amaokwu ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-agụ Matiu 6:33, i kwesịghị imesi “ezi omume ya” ma ọ bụ “ihe ọzọ ndị a nile” ike karị ma ọ bụrụ na i bu n’obi ịtụle ihe “buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ” pụtara.
N’okwu a ga-ekwu ná Nzukọ Ije Ozi, ị pụrụ ime atụmatụ ịgụ Matiu 28:19. Olee okwu ndị i kwesịrị imesi ike? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgba ume ka a dị uchu n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, mesie okwu bụ́ ‘mee ndị na-eso ụzọ’ ike. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịtụle ibu ọrụ Onye Kraịst nwere iso ndị si mba ọzọ kwabata kerịta eziokwu Bible ma ọ bụ na ị chọrọ ịgba ụfọdụ ndị nkwusa ume ije ozi n’ebe mkpa ka ukwuu, ị pụrụ imesi “ndị nke mba nile” ike.
Ọtụtụ mgbe, a na-agụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ iji zaa ajụjụ ma ọ bụ iji kwadoo otu echiche nke ndị ọzọ na-ewere dị ka ihe na-akpata arụmụka. Ọ bụrụ na e mesie echiche nile dị n’amaokwu ahụ ike n’ụzọ ha nhata, ndị na-ege gị ntị nwere ike ha agaghị ahụ otú o si metụta ihe a na-ekwu. Isi ihe dị na ya nwere ike ido gị anya ma o doghị ha anya.
Dị ka ihe atụ mgbe ị na-agụ Abụ Ọma 83:18 na Bible nwere aha Chineke, ọ bụrụ na mmesi okwu ike gị nile abụrụ n’okwu bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu,” onye nwe ụlọ nwere ike ọ gaghị aghọta eziokwu ahụ yiri ihe doro anya nke bụ́ na Chineke nwere aha aka. I kwesịrị imesi aha ahụ bụ́ “Jehova” ike. Otú ọ dị, mgbe i ji otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-eme ihe ná mkparịta ụka banyere ọbụbụeze Jehova, i kwesịrị imesi okwu bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu” ike karịsịa. N’otu aka ahụ, mgbe i ji Jems 2:24 na-egosi mkpa ọ dị ijikọta okwukwe na ọrụ, imesi “kpọọ mmadụ onye ezi omume” ike karịsịa kama imesi “ọrụ” ike karịsịa pụrụ ime ka ụfọdụ ndị na-ege gị ntị ghara ịghọta isi ihe ị na-ekwu.
A pụrụ ịhụ ihe atụ ọzọ na-enye aka ná Ndị Rom 15:7-13. Nke a bụ akụkụ nke akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara otu ọgbakọ nke ma ndị Jentaịl ma ndị Juu anụ ahụ́ mejupụtara. N’ebe a onyeozi ahụ na-ekwusi ike na ozi Kraịst jere baara ọ bụghị nanị ndị Juu e biri úgwù uru kamakwa ndị mba ọzọ, ka “ndị mba ọzọ wee nye Chineke otuto maka ebere ya.” Pọl hotaziri ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ anọ, na-adọrọ uche gaa n’ohere ahụ e nyere ndị mba ọzọ. Olee otú i kwesịrị isi gụọ ihe ndị a e hotara iji mesie isi ihe Pọl bu n’uche ike? Ọ bụrụ na ị na-akanye akara n’okwu ndị ị ga-emesi ike, ị pụrụ ịkanye ihe ná “ndị mba ọzọ” Ro 15 n’amaokwu nke 9, “unu ndị mba ọzọ” Ro 15 n’amaokwu nke 10, “unu ndị mba ọzọ nile” nakwa “ndị nile” Ro 15 n’amaokwu nke 11, na “mba nile” Ro 15 n’amaokwu nke 12. Gbalịa iji imesi okwu ike ahụ gụọ Ndị Rom 15:7-13. Ka ị na-eme otú ahụ, ihe dum Pọl na-ekwu ga-edokwu anya ma dịkwuo mfe ịghọta.
Ụzọ Dị Iche Iche nke Isi Emesi Okwu Ike. A pụrụ iji ọtụtụ ụzọ mesie okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu, ndị ị chọrọ ka ha pụta ìhè, ike. Ụzọ ị ga-esi mee ya kwesịrị ikwekọ n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ nakwa n’ọnọdụ okwu ahụ. A na-atụ aro ole na ole n’ebe a.
Iji ụda olu mesie okwu ike. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla nke ụda olu bụ́ nke na-eme ka okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu guzopụ iche n’ahịrịokwu. A pụrụ imesi okwu ike site n’ịgbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụda olu—site n’iwelikwu ya elu ma ọ bụ iwetulata ya. N’ọtụtụ asụsụ, ịgbanwe ọdịdị ụda olu na-emesikwu okwu ike. Otú ọ dị, n’asụsụ ụfọdụ, nke ahụ pụrụ ịgbanwe ihe ọ pụtara kpam kpam. Mgbe e ji nwayọọ nwayọọ kwuo okwu ndị bụ́ isi, nke a na-emesikwu ha ike. N’asụsụ ndị na-adịghị eji ụda olu emesi okwu ụfọdụ ike, ọ ga-adị mkpa ime ihe ọ bụla a na-emekarị n’asụsụ ahụ iji mezuo ihe a chọrọ.
Nkwụsịtụ. A pụrụ ime nke a tupu a gụọ ma ọ bụ mgbe a gụsịrị akụkụ bụ́ isi nke otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ—ma ọ bụ ha abụọ. Ịkwụsịtụ kpọmkwem tupu ị gụpụta otu echiche bụ́ isi na-eme ka a tụọ anya ihe; ịkwụsịtụ mgbe ị gụsịrị ya na-eme ka mmetụta ya bamikwuo abami. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a kwụsịbiga ókè, ọ dịghị ihe ga-eguzopụ iche.
Nkwughachi. Ị pụrụ imesi otu isi ihe ike site n’ịkwụsị ma gụghachi okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ahụ. Otu ụzọ a na-esikarị eme ya bụ ịgụcha amaokwu ahụ, mgbe ahụ gụghachi okwu bụ́ isi.
Mmegharị ahụ́. Ọtụtụ mgbe, imegharị ahụ́ nakwa ọdịdị ihu mmadụ pụrụ ịgbakwụnye mmetụta uche n’otu okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu.
Ụda olu. N’asụsụ ụfọdụ, mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịgụ okwu n’ụda olu ga-emetụta ihe ha pụtara ma mee ka ha guzopụ iche. N’ebe a kwa, e kwesịrị iji akọ mee ihe, karịsịa mgbe e ji olu ịkwa emo na-eme ihe.
Mgbe Ndị Ọzọ Gụrụ Akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbe onye nwe ụlọ gụrụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ọ pụrụ imesi okwu ndị na-ezighị ezi ike ma ọ bụ ghara imesi nke ọ bụla ike. Gịnịzi ka ị pụrụ ime? Ọ na-akasịkarị mma ime ka ihe ọ pụtara doo anya site n’otú ị ga-esi kọwaa ya. Mgbe ị kọwasịrị ya, ị pụrụ ilekwasị anya karịsịa n’okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu bụ́ ndị dị n’ime Bible ahụ.
-
-
E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri EziRite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
-
-
IHE ỌMỤMỤ NKE 22
E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi
MGBE anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, a chọrọ ihe karịrị nanị ịgụpụta amaokwu dị iche iche site na Bible. Pọl onyeozi degaara onye òtù ya bụ́ Timoti, sị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Tim. 2:15.
Ime nke a pụtara na otú anyị si akọwa Akwụkwọ Nsọ aghaghị ikwekọ n’ihe Bible n’onwe ya na-akụzi. Nke a na-achọ ka anyị buru n’uche ihe ndị gbara ya gburugburu, kama nanị ịhọrọ okwu ndị masịrị anyị na ịgbakwụnye echiche ndị nke anyị. Site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, Jehova dọrọ aka ná ntị banyere ndị amụma ahụ na-asị na ha na-ekwu ihe si n’ọnụ Jehova pụta ma n’ezie na-ekwu “ọhụụ nke obi ha.” (Jer. 23:16) Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere iji nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ merụọ Okwu Chineke mgbe o dere, sị: “Anyị ajụwo ihe nzuzo ndị a ga-emere ihere, n’adịghị eje ije n’aghụghọ, n’adịghịkwa agwagbu okwu Chineke.” N’oge ahụ ndị ahịa mmanya na-adịghị eme ihe n’eziokwu na-agwagbu mmanya ha ka o bukwuo ibu ma nyekwuo ha uru. Anyị adịghị agwagbu Okwu Chineke site n’ịgwakọta ya na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ. “Anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke dị ka ọtụtụ ndị bụ,” ka Pọl kwuru, “kama site n’izi ezi nke obi, ee, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị e si n’ebe Chineke nọ zipụ, n’ihu anya Chineke, ná mmekọrịta anyị na Kraịst.”—2 Kọr. 2:17; 4:2.
Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ihota ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwuru iji mee ka otu ụkpụrụ pụta ìhè. Bible jupụtara n’ụkpụrụ ndị na-enye ezi nduzi n’ime ihe banyere ọnọdụ dị iche iche. (2 Tim. 3:16, 17) Ma i kwesịrị ijide n’aka na ụzọ i si jiri ya na-eme ihe ziri ezi nakwa na i jighị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-eme ka o yie ka ọ na-ekwu ihe ị chọrọ ka o kwuo. (Ọma 91:11, 12; Mat. 4:5, 6) Ụzọ e si jiri ya mee ihe aghaghị ikwekọ ná nzube Jehova, kwekọọ n’Okwu Chineke dum.
‘Ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ na-agụnyekwa ịghọta echiche dị n’ihe Bible na-ekwu. Ọ bụghị “okpiri” a ga-eji na-emenye ndị ọzọ ụjọ. Ndị ozizi okpukpe, bụ́ ndị megidere Jizọs Kraịst hotara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ma ha nọ na-eleghara ihe ndị ka mkpa anya—ihe ndị metụtara ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi—bụ́ ihe ndị Chineke chọrọ. (Mat. 22:23, 24; 23:23, 24) Mgbe ọ na-akụzi Okwu Chineke, Jizọs gosipụtara àgwà Nna ya. Jizọs jikọtara ịnụ ọkụ n’obi ya maka eziokwu ahụ na ịhụnanya dị omimi o nwere n’ebe ndị o ziri ihe nọ. Anyị kwesịrị ịgbalị iṅomi ihe nlereanya ya.—Mat. 11:28.
Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị na-eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị? Ịgụchi Bible anya ga-enye aka. Ọ dịkwa mkpa ka anyị nwee ekele maka onyinye Jehova nyere anyị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bụ́ ìgwè Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị o si n’aka ha na-enye ezinụlọ nke okwukwe nri ime mmụọ. (Mat. 24:45) Ọmụmụ ihe onwe onye tinyere ịgachi na ikerechi òkè anya ná nzukọ ọgbakọ ga-enyere anyị aka irite uru ná ntụziaka a na-enye site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.
Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures n’asụsụ unu, ọ bụrụkwa na ị mụta iji ya eme ihe nke ọma, ọ ga-adịrị gị mfe inweta nduzi dị gị mkpa iji jiri ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-ejikarị eme ihe n’ozi mee ihe n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ iji otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-amachaghị nke ọma mee ihe, ịma otú ikike gị hà ga-akpali gị ime nnyocha dị mkpa ka i wee nwee ike ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi mgbe ị na-ekwu okwu.—Ilu 11:2.
Mee Ka Nkọwa Ya Doo Anya. Mgbe ị na-ezi ndị ọzọ ihe, jide n’aka na ha hụrụ n’ụzọ doro anya ihe jikọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị i ji eme ihe na isiokwu unu na-atụle. Ọ bụrụ na ị jụrụ ajụjụ dugara n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, ndị na-ege gị ntị kwesịrị ịhụ otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ si zaa ajụjụ ahụ. Ọ bụrụ na i ji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-akwado ihe i kwuru, jide n’aka na onye ahụ a na-amụrụ ihe hụrụ n’ụzọ doro anya otú amaokwu ahụ si kwadoo isi ihe ahụ.
Nanị ịgụpụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ—ọbụna iji imesi okwu ike gụọ ya—adịghị ezukebe. Cheta na ọtụtụ ndị amaghị Bible ma eleghịkwa anya ha agaghị ahụ isi ihe ị na-ewepụta nanị site n’ịgụ ya otu ugboro. Dọrọ uche gaa n’akụkụ metụtara ihe unu na-ekwu kpọmkwem n’amaokwu ahụ.
Nke a na-achọkarị ka i mee ka okwu ndị bụ́ isi, ndị metụtara isi ihe a na-atụle kpọmkwem, pụta ìhè. Ụzọ kasị mfe isi mee ya bụ ikwughachi okwu ndị ahụ na-ewepụta echiche dị n’okwu. Ọ bụrụ na ị na-agwa otu onye okwu, ị pụrụ ịjụ ya ajụjụ ndị ga-enyere ya aka ịmata okwu ndị bụ́ isi. Mgbe ha na-agwa ìgwè mmadụ okwu, ndị ọkà okwu ụfọdụ na-ahọrọ imezu ebumnobi ha site n’iji okwu ndị ha na okwu ndị ha ji mee ihe pụtara otu ihe mee ihe ma ọ bụ ikwughachi echiche okwu ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na i kpebie ime nke a, lezie anya ka ndị na-ege ntị ghara ichefu otú ihe a na-ekwu si kwekọọ n’okwu e ji mee ihe n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ.
Ebe i meworo ka okwu ndị bụ́ isi pụta ìhè, ị tọwo ezigbo ntọala. Gazie n’ihu. Ì webatara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ site n’ịkọwa n’ụzọ doro anya ihe mere i ji jiri ya na-eme ihe? Ọ bụrụ otú ahụ, kọwapụta ihe jikọrọ okwu ndị i mere ka ha pụta ìhè na ihe i mere ka ndị na-ege gị ntị tụọ anya ya. Kwuo n’ụzọ doro anya ihe ahụ jikọrọ ha. Ọ bụrụgodị na i webataghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ụzọ dị otú ahụ doro anya, i kwesịrị inyekwu nkọwa ụfọdụ.
Ndị Farisii jụrụ Jizọs ajụjụ ha chere na o siri ike, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?” Jizọs dabeere na Jenesis 2:24 zaa ya. Rịba ama na o lekwasịrị anya nanị n’otu akụkụ ya, mgbe ahụ o nyere nkọwa a chọrọ. Ebe ọ kọwapụtaworo na nwoke na nwunye ya ga-aghọ “otu anụ ahụ́,” Jizọs kwubiri, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Mat. 19:3-6.
Nkọwa ha aṅaa ka i kwesịrị inye iji mee ka otú a pụrụ isi jiri otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe doo anya? Ndị so ná ndị na-ege gị ntị na otú isi ihe ahụ a na-atụle dịruru ná mkpa kwesịrị ịbụ ihe ga-ekpebi ya. Ka nzube gị bụrụ ime ka ọ dị mfe na ikwu ihe a chọrọ kpọmkwem.
Tụgharịa Uche Site n’Akwụkwọ Nsọ. Banyere ozi Pọl onyeozi jere na Tesalonaịka, Ọrụ 17:2, 3 na-agwa anyị na ọ ‘tụgharịrị uche site n’Akwụkwọ Nsọ.’ Nke a bụ nkà onye ọ bụla na-ejere Jehova ozi kwesịrị ịgbalị ịzụlite. Dị ka ihe atụ, Pọl kọrọ ihe ndị mere eme banyere ndụ na ije ozi Jizọs, gosi na e buru ihe ndị a n’amụma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, wee mechizie n’ụzọ dị ike site n’ikwu, sị: “Onye a bụ Kraịst ahụ, Jizọs nke a onye m na-ekwusara unu.”
Mgbe ọ na-edegara Ndị Hibru akwụkwọ, ugboro ugboro, Pọl hotara ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Iji mesie otu isi ihe ike ma ọ bụ iji mee ka o doo anya, ọ na-emekarị ka otu okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu pụta ìhè mgbe ahụ gosizie ihe ọ pụtara. (Hib. 12:26, 27) N’ihe ndekọ dị ná Ndị Hibru isi 3, Pọl hotara ihe e kwuru n’Abụ Ọma 95:7-11. Rịba ama na ọ kọwakwuziri akụkụ atọ na ya: (1) aka e zoro n’ebe obi dị (Hib. 3:8-12), (2) ihe okwu bụ́ “Taa” pụtara (Hib. 3:7, 13-15; 4:6-11), na (3) ihe okwu bụ́: “Ha agaghị abanye n’izu ike m,” pụtara (Hib. 3:11, 18, 19; 4:1-11). Gbalịa iṅomi ihe nlereanya ahụ ka ị na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla eme ihe.
Rịba ama otú Jizọs si tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị irè n’ihe ndekọ ahụ dị na Luk 10:25-37. Otu nwoke nke maara Iwu jụrụ ya, sị: “Onye Ozizi, site n’ime gịnị ka m ga-eji keta ndụ ebighị ebi?” Ná nzaghachi Jizọs bu ụzọ jụọ nwoke ahụ ihe bụ uche ya n’okwu ahụ, mgbe ahụzi, Jizọs mesiri ike mkpa ọ dị ime ihe Okwu Chineke na-ekwu. Mgbe o doro anya na nwoke ahụ aghọtaghị isi ihe ọ na-ekwu, Jizọs tụlere n’ụzọ sara mbara nanị otu nkebi ahịrịokwu sitere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ—“onye agbata obi.” Kama nanị ịkọwa ihe ọ pụtara, o ji ihe atụ nyere nwoke ahụ aka iru ná nkwubi okwu kwesịrị ekwesị n’onwe ya.
O doro anya na mgbe ọ na-aza ajụjụ, Jizọs ehotaghị nanị ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị nyere azịza ndị doro anya, ndị gara n’ihe a chọrọ kpọmkwem. Ọ kọwara ihe ha kwuru ma jiri ha mee ihe n’ịza ajụjụ a jụrụ.
Mgbe ndị Sadusii na-agbagha olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ, Jizọs lekwasịrị anya n’otu akụkụ kpọmkwem n’Ọpụpụ 3:6. Ma ọ kwụsịghị mgbe o hotasịrị ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Ọ tụgharịrị uche na ya iji gosi n’ụzọ doro anya na mbilite n’ọnwụ so ná nzube Chineke.—Mak 12:24-27.
Ịmụta nkà nke ịtụgharị uche n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ dị irè site n’Akwụkwọ Nsọ ga-abụ isi ihe dị mkpa na gị ịghọ onye ozizi dị irè.
-
-
E Mere Ka Uru Ọ Bara Doo AnyaRite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
-
-
IHE ỌMỤMỤ NKE 23
E Mere Ka Uru Ọ Bara Doo Anya
MA Ị̀ na-agwa otu onye okwu ma ị na-agwa ìgwè buru ibu karị okwu, ọ bụghị ihe amamihe dị na ya bụ iwere ya na onye (ndị) na-ege gị ntị ga-enwe mmasị n’isiokwu gị nanị n’ihi na i nwere mmasị na ya. Ozi gị dị mkpa, ma ọ bụrụ na i nweghị ike ime ka uru ọ bara doo anya, ikekwe ị gaghị enwe ike ime ka ha nọgide na-ege gị ntị ruo ogologo oge.
Nke a bụ eziokwu ọbụna banyere ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha nwere ike ige ntị mgbe i ji ihe atụ ha na-anụtụbeghị mee ihe ma ọ bụ na-akọ ahụmahụ ha na-anụtụbeghị. Ma, ha pụrụ ịkwụsị ige ntị mgbe ị na-ekwu banyere ihe ndị ha marawooro, karịsịa ma ọ bụrụ na ị kọwakwughị ihe ndị ahụ. Ọ dị gị mkpa inyere ha aka ịhụ ihe mere ihe ị na-ekwu ji baara ha uru n’ezie na otú o si baara ha uru.
Bible na-agba anyị ume iche echiche n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Ilu 3:21) Jehova ji Jọn Onye Na-eme Baptizim duzie ndị mmadụ gaa “n’ezi amamihe nke ndị ezi omume.” (Luk 1:17) Nke a bụ amamihe nke gbanyere mkpọrọgwụ n’egwu ziri ezi nke Jehova. (Ọma 111:10) A na-enyere ndị ji amamihe a kpọrọ ihe aka inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ ugbu a nakwa ijide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie n’aka, bụ́ ndụ ebighị ebi nke gaje ịbịa.—1 Tim. 4:8; 6:19.
Ime Ka Okwu Baa Uru. Ọ bụrụ na okwu gị gaje ịba uru, ị ghaghị ichebara ọ bụghị nanị ihe ị ga-ekwu echiche kamakwa ndị ga-ege gị ntị. Ewela ha nanị dị ka otu ìgwè. Ihe mejupụtara ìgwè ahụ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ezinụlọ dị iche iche. A pụrụ inwe ndị bụ́ nnọọ ụmụaka, ndị nọ n’afọ iri na ụma, ndị toruworo ogo mmadụ, na ụfọdụ ndị meworo agadi. A pụrụ inwe ndị ọhụrụ nwere mmasị nakwa ndị malitere ijere Jehova ozi tupu a mụọ gị. Ụfọdụ pụrụ ịbụ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ; ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị àgwà na omume ụfọdụ nke ụwa ka na-enwe mmetụta siri ike n’ahụ́ ha. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ihe m na-aga ịtụle pụrụ isi baara ndị ga-ege ntị uru? Olee otú m pụrụ isi nyere ha aka ịghọta isi ihe dị na ya?’ Ị pụrụ ikpebi ilekwasị anya nanị n’ebe otu ìgwè ma ọ bụ abụọ n’ime ìgwè ndị a kpọtụrụ aha n’ebe a dị. Otú ọ dị, echefula ndị nke ọzọ kpam kpam.
Gịnị ma ọ bụrụ na e kenyere gị ịtụle otu ozizi bụ́ isi nke Bible? Olee otú ị pụrụ isi mee ka okwu dị otú ahụ baara ndị ga-ege ntị, bụ́ ndị kwetawororị n’ozizi ahụ, uru? Gbalịsie ike ime ka nkwenye ha na ya sikwuo ike. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịtụgharị uche n’ihe àmà sitere n’Akwụkwọ Nsọ nke na-akwado ya. Ị pụkwara ime ka ha ghọtakwuo ozizi ahụ dabeere na Bible. A pụrụ ime nke a site n’igosi otú ozizi ahụ si kwekọọ n’eziokwu ndị ọzọ nke Bible na n’ụdị onye Jehova bụ. Jiri ihe atụ—ahụmahụ ndị mere eme mee ihe ma o kwe mee—ndị na-egosi otú ịghọta ozizi a kpọmkwem siworo baara ndị mmadụ uru ma gbanwee otú ha si ele ọdịnihu anya.
Ya abụla nanị okwu ole na ole ị ga-ekwu ná mmechi okwu ka ị ga-eji kọwaa otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe. Site nnọọ ná mmalite, onye ọ bụla na-ege gị ntị kwesịrị iche na “nke a metụtara m.” Ebe ị tọworo ntọala ahụ, nọgide na-egosi otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe ka ị na-akọwapụta nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị dị n’okwu ahụ nakwa ná mmechi ya.
Mgbe ị na-akọwa otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe, jide n’aka na ị na-eme ya n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara ime ya n’ịhụnanya, na-egosikwa mmetụta ọmịiko. (1 Pita 3:8; 1 Jọn 4:8) Ọbụna mgbe ọ na-ekwu okwu banyere nsogbu ndị siri ike dị na Tesalonaịka, Pọl onyeozi hụrụ na o mere ka akụkụ ndị dị mma n’ọganihu ime mmụọ nke ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ pụta ìhè. O kwupụtakwara obi ike o nwere na ha ga-achọ ime ihe ziri ezi banyere okwu a nọ na-atụle n’oge ahụ. (1 Tesa. 4:1-12) Lee ụkpụrụ dị mma iṅomi ọ bụ!
È zubere ka okwu gị kpalie ikere òkè n’ọrụ ikwusa na ịkụziri ndị ọzọ ozi ọma ahụ? Mee ka e nwee ịnụ ọkụ n’obi na ekele maka ihe ùgwù ahụ. Otú ọ dị, ka ị na-eme otú ahụ, buru n’uche na otú ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ikereru òkè na nke a na-adị iche iche, Bible rịbakwara nke a ama. (Mat. 13:23) Ejila mmetụta nke obi amamikpe mee ka ike gwụ ụmụnna gị. Ndị Hibru 10:24 na-agba anyị ume ‘ịkpali inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ Ọ bụrụ na anyị akpalie inwe ịhụnanya, ọrụ ndị sitere n’ezi ebumnobi ga-esochi. Kama ịchọ ịmanye mmadụ nile ime ihe n’otu ụzọ ahụ, mata na ihe Jehova chọrọ bụ ka anyị kwalite “nrubeisi site n’okwukwe.” (Rom 16:26) N’iburu nke a n’uche, anyị na-achọ iwusi okwukwe ike—ma nke anyị ma nke ụmụnna anyị.
Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịghọta Ihe A Na-ekwu. Ka ị na-agbara ndị ọzọ àmà, ahapụla ime ka uru ozi ọma ahụ bara pụta ìhè. Ime otú ahụ ga-achọ ka ị tụlee ihe ndị mmadụ nọ n’ókèala unu na-eche. Olee otú ị pụrụ isi chọpụta? Gee ntị n’akụkọ a na-akọ na redio ma ọ bụ na telivishọn. Lee anya n’ihu akwụkwọ akụkọ. Ọzọkwa, gbalịa ime ka ndị mmadụ soro gị nwee nkwurịta okwu, ṅaakwa ntị mgbe ha na-ekwu okwu. Ị pụrụ ịchọpụta na ha na-agbaso nsogbu siri ike mgba—enwekwaghị ọrụ, ịkwụ ụgwọ ụlọ, ọrịa, ọnwụ nke onye òtù ezinụlọ, ihe ize ndụ n’ihi mpụ, ikpe na-ezighị ezi site n’aka onye nwere ikike, ntisa alụmdi na nwunye, ịchịkwa ụmụaka, na ihe ndị ọzọ. Bible ọ̀ pụrụ inyere ha aka? N’ezie ọ pụrụ.
Mgbe ị na-amalite mkparịta ụka, o yikarịrị ka ị ga-ebu otu isiokwu n’uche. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ egosi na ọ dị isiokwu ọzọ na-echegbu ya mgbe ahụ, egbula oge iso ya kwurịta nke ahụ ma ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ime otú ahụ, ma ọ bụ kwee nkwa iji ihe ọmụma ga-enye aka gaghachi. N’ezie, anyị na-ezere ‘itinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị anyị,’ ma anyị na-eji obi ụtọ esoro ndị ọzọ atụle ndụmọdụ bara uru Bible na-enye. (2 Tesa. 3:11) O doro anya na ihe ga-akasị masị ndị mmadụ bụ ndụmọdụ Bible nke na-emetụta ndụ ha.
Ọ bụrụ na ndị mmadụ apụghị ịhụ otú ozi anyị si metụta ha, ha pụrụ igbubi nkwurịta okwu ahụ ngwa ngwa. Ọ bụrụgodị na ha ekwe anyị kwuo okwu, ọ bụrụ na anyị enweghị ike igosi ha uru isiokwu ahụ bara ọ pụrụ ịpụta na ozi anyị agaghị enwekebe mmetụta ná ndụ ha. N’ụzọ dị iche, ọ bụrụ na anyị emee ka uru ozi ahụ bara doo anya, nkwurịta okwu anyị pụrụ ime ka ndụ ndị mmadụ gbanwee.
Mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible, nọgide na-eme ka otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe pụta ìhè. (Ilu 4:7) Nyere ndị ị na-amụrụ ihe aka ịghọta ndụmọdụ, ụkpụrụ, na ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi ha ụzọ isi na-aga ije n’ụzọ Jehova. Mesie uru ndị a na-enweta site n’ime otú ahụ ike. (Aịsa. 48:17, 18) Nke a ga-akpali ndị a na-amụrụ ihe ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha. Kụbanye n’ime ha ịhụnanya maka Jehova na ọchịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ, kwekwa ka mkpali itinye ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ si ha n’obi.
-