Jiri Obi Gị Nile Na-arụ Ọrụ n’Ozi Ubi
1 Iji obi nile na-arụ ọrụ n’ozi na-esite n’ekele dị omimi maka Jehova na ihe nile o mewooro anyị. (2 Sam. 22:2, 3) Iji ọmịiko lee nsogbu nke ihe nile a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ anya kwesịrị ịkpali anyị ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ije ozi. (Mat. 9:36; 2 Kọr. 5:14, 15) Ka anyị na-enyefe Jehova onwe anyị karị na ka anyị na-echegbu onwe anyị karị banyere ndị mmadụ, otú a ka a ga-akpali anyị karị ikere òkè n’ụzọ na-ekpo ọkụ n’ozi ubi. (Mat. 22:27-39) Mgbe ahụ ozi anyị na-aghọ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. (2 Kọr. 4:7) Ma olee otú a pụrụ isi zụlite ekele dị otú ahụ maka ozi ahụ?
2 Ihe Ndị Bụ́ Isi n’Iwulite Ekele: Ọmụmụ Bible onwe onye na nke ọgbakọ tinyere iji ekpere atụgharị uche n’ihe na-enyere anyị aka iwulite mmekọrịta onwe onye n’ebe Jehova nọ. Anyị na-abịa ghọta ịma mma nke àgwà na ọdịdị ya wee wulite ekele sitere n’obi maka ịdị mma Chineke anyị nwere obi ọma na ndokwa ya maka ezi ofufe. (Abụ Ọma 27:4) Mgbe anyị mụtara banyere ịma mma nke nsọpụrụ nke ebube Jehova na ọrụ ya ndị dị ebube, a na-akpali anyị ikwusa ịdị ukwuu ya, anyị na-achọsikwa ike ịgbasa ozi Alaeze ahụ. (Abụ Ọma 145:5-7; Luk 6:45) Ọzọkwa, ntụle chiri anya na ịtụgharị uche n’ebe ndị ozi Chineke ndị ọzọ nọ bụ́ ndị ji obi ha nile na-eje ozi pụrụ ịmụbawanye ekele anyị. Ihe nlereanya ndị dị otú ahụ na-agụnye Jeremaịa, Jisọs, na Pọl onyeozi.—Jer. 20:9; Jọn 4:34; 1 Tim. 1:12, 13, 17.
3 Ime Nkwadebe Na-akpali Ịnụ Ọkụ n’Obi: Ozi anyị ji obi anyị nile na-eje na-achọ iwulite ịnụ ọkụ n’obi. Iji nweta nke a, ime nkwadebe dị mkpa. Nke a bụ n’ihi na ime nkwadebe na-akpali ịnụ ọkụ n’obi. Ọ na-adị mfe karị ịnụ ọkụ n’obi banyere ihe omume anyị nwere mmasị na ya, n’ozuzu ya kwa mmadụ na-enwe mmasị ime ihe ọ kwadebere maka ya. Mgbe ahụ olee otú anyị ga-esi dị uchu n’ime nkwadebe iji wulite ịnụ ọkụ n’obi maka ozi ahụ ka anyị wee ghọọ ndị ọrụ dị irè ma nweta afọ ojuju na-enye ọṅụ?—Jọn 2:17.
4 Ọ bara uru iwepụta oge ụfọdụ iji tụlee kpọmkwem isi ihe ụfọdụ a pụrụ iji kwuo okwu n’akwụkwọ ndị a na-eche n’ihu mmadụ. Nwee oge mmụgharị ihe. Imekọta nke a ọnụ dị ka ezinụlọ pụrụ inye aka. Akwụkwọ Reasoning abụrụwo ngwá ọrụ bara uru n’ime nkwadebe maka ozi ubi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye anyị zutere n’ozi ụlọ n’ụlọ ekwuo na ya bụ onye Alakụba, gịnị ka anyị pụrụ ikwu? Onye nkwusa kwadebere nke ọma pụrụ ịzaghachi, sị: “Nke ahụ dị mma. Agụwo m ihe banyere ozizi ole na ole nke okpukpe gị n’akwụkwọ a. [Sapeta peji nke 23 nke akwụkwọ Reasoning.] Ọ na-asị na unu kwere na Jisọs bụ onye amụma kama na Muḥammad bụ onye amụma ikpeazụ na nke kachasị mkpa. Ọ́ bụghị otú ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ùnu kwetakwara na Mosis bụ ezigbo onye amụma? [Nye ohere maka nzaghachi, nke yikarịrị ka ọ ga-abụ ee.] M̀ nwere ike igosi gị site n’Ihe Odide Dị Nsọ ihe Mosis mụtara site n’aka Chineke banyere aha onwe Ya?” Ị pụziri ịgụ Ọpụpụ 6:3. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka na-akpali mmasị.
5 Site n’ime obere nkwadebe na mmụgharị ihe, anyị pụrụ iji akụkụ a kpọrọ “Conversation Stoppers” (Ndị Na-akwụsị Mkparịta Ụka), n’akụkụ mmalite nke akwụkwọ Reasoning mee ihe iji nyere anyị aka ịzaghachi ndị na-ekwu na ha nọ n’otu okpukpe kpọmkwem.
6 Akwụkwọ Reasoning nwekwara akụkụ mara mma maka okwu mmalite. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịgbanwegharị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ anyị iji kwekọọ n’ọnọdụ dịnụ. Ná ngwụsị nke ọtụtụ n’ime isiokwu ndị dị n’akwụkwọ Reasoning, e nwere akụkụ bụ́ “If Someone Says” (Ọ Bụrụ na Mmadụ Ekwuo Sị), nke na-enye nnọọ ihe ndị a ga-eji zaa ajụjụ ụfọdụ kpọmkwem ma ọ bụ enweghị mmasị ndị metụtara isiokwu ahụ. Otú ọ dị, ngwá ọrụ ọma ndị a nile bara uru nanị ruo n’ókè anyị ji ha na-eme ihe n’ime nkwadebe anyị.
7 Nyere Ndị Ọzọ Aka Inwe Ọganihu: Anyị iji obi anyị nile na-arụ ọrụ n’ozi ubi chọrọ ka anyị na-enye aka n’ọganihu nke ndị ọzọ. Anyị pụrụ ime nke a site n’inye ndị ọzọ enyemaka na ọzụzụ dị ha mkpa. Mmekọrịta dị n’etiti nwanna nwoke ahụ meworo okenye bụ́ Pọl na nwa okoro ahụ raara onwe ya nye bụ́ Timoti na-enye ihe nlereanya dị mma nke inye ọzụzụ maka ozi ahụ. (1 Kọr. 4:17; 2 Tim. 2:1) N’ime ọgbakọ taa, mkpa nke inye ọzụzụ na-apụta ìhè mgbe anyị ghọtara na Nigeria, e nwekwuru ihe dị ka 40,000 ndị nkwusa ugbu a karịa ka e nwere n’afọ atọ gara aga. O yikarịrị ka ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a ga-erite uru site n’ọzụzụ nke ndị nkwusa nweworo ahụmahụ pụrụ inye. Otu nwanna nwanyị nke na-etinye nanị otu hour ma ọ bụ abụọ n’ozi ubi kwa ọnwa mụtara ikwu okwu n’ụzọ dị irè n’ọnụ ụzọ mgbe otu onye nkwusa nweworo ahụmahụ nyeere ya aka. Ịla azụ ọ na-enwebu n’ozi ahụ kwụsịrị, ọ ghọọkwa onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma ahụ. Ugbu a dị ka onye ọsụ ụzọ dị irè, ọ na-eleghachi anya azụ na-ekwu, sị: “Nanị ihe dịbu m mkpa bụ ka a kụziere m ihe m ga-ekwu, mgbe ahụkwa amalitere m ịnụ ụtọ nke ozi ahụ.”
8 Ọ bụrụ na ị bụ onye okenye, ohu na-eje ozi, onye ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa nke nweworo ahụmahụ, olee otú ị pụrụ isi na-enye aka n’ọganihu nke ndị ọzọ? Nzọụkwụ nke mbụ ga-abụ ịgwa onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị na ị ga-enwe mmasị inyere onye nkwusa ọzọ aka. Ma ọ dị gị mkpa inwe nhazi na ịdị njikere. Yie àgbà doro anya ịrụkọ ọrụ. Onye gị na ya na-arụkọ ọrụ pụrụ inwe ahụ erughị ala ma ọ bụ ghara ịtụkwasị onwe ya obi ná mmalite, ma ọ ga-enwe mmasị na o nwere onye ya na ya na-arụkọ ọrụ nke ga-enye aka mgbe mkpa ya bilitere.—Ekli. 4:9.
9 N’oge ọzụzụ ahụ na-aga n’ihu n’ihu, soro onye nkwusa ahụ na-enwechaghị ahụmahụ kwurịta otú e si eme nletaghachi ná mmasị a chọtara. Nke ahụ na-agụnyekwa ịtọ ntọala n’ọbịbịa nke mbụ site n’ịjụ onye nwe ụlọ ajụjụ nke a ga-aza mgbe ị laghachiri. Jide n’aka inyere onye nkwusa ahụ na-enwechaghị ahụmahụ aka ịkwadebe, mgbe ahụkwa soro ya gaa nleta ahụ. Ọ bụrụ na a malite ọmụmụ ihe ma onye nkwusa ahụ atụkwasịchabeghị ikike nke onwe ya obi, onye nkwusa nke ka nwee ahụmahụ pụrụ iduzi ọmụmụ ihe ahụ ugboro ole na ole ruo mgbe onye ọhụrụ ahụ ruru eru iweghara ya.
10 Nhazi na Ihe Mgbaru Ọsọ: Ozi anyị abụghị akụkụ nke ndụ anyị na-adịghị mkpa ma ọ bụ nke na-adapụta na mberede. Iji hazie ozi anyị n’ụzọ dị irè, anyị aghaghị iwepụta oge maka akụkụ ya dị iche iche, n’ahapụghịkwa ha maka mgbe oge dapụtara. (Efe. 5:15, 16) Ọ na-enye aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke hour ị ga-etinye n’ozi kwa ọnwa. Nke a ga-achọ ịhazi ihe omume gị dị ka nhazi oge e meworo atụmatụ ya si dị. Ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst kwesịrị inyere ụmụ ha aka ịhazi oge iji kere òkè mgbe nile n’akụkụ dị iche iche nke ozi ubi.—Deut. 6:7: Ilu 22:6.
11 Dị ka ihe atụ, ì nwere traktị zuru ezu? Ị̀ na-enweta ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke magazin ndị ọhụrụ, hà na-adịkwa n’ọnọdụ dị mma? Ị̀ na-eji ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ eme ihe nke ọma, na-eji otu edekọ mmasị e gosiri na nke ọzọ maka ndị na-anọghị n’ụlọ?
12 A Chọrọ Mgbalị Onwe Onye: Ókè ị na-anụru ụtọ uru ndị Chineke na-enye na-adabere n’ụzọ dị ukwuu ná mgbalị onwe onye gị ime uche Chineke. Banyere ozi ahụ, Pọl dere, sị: ‘Onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ nke aka ya, dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị.’ (1 Kọr. 3:8) Ya mere ka anyị kere òkè zuru ezu n’ozi ahụ ruo n’ókè ọ pụrụ ikwe anyị mee. Pọl onyeozi nwetara ụgwọ ọrụ onwe onye nke inyere ọtụtụ ndị aka, ọbụna ọgbakọ dị iche iche n’ozuzu ha, ịbịa mata Chineke. Lee aha ọṅụ o nwere n’ịhụ nguzosi ike ha n’okwukwe! (1 Tesa. 2:19, 20) Ma eleghị anya ọnọdụ gị agaghị ekwe gị itinye onwe gị n’ụzọ zuru ezu n’ozi ahụ dị ka Pọl tinyere onwe ya. Otú ọ dị, ọ́ gaghị abụ ngọzi bara ụba inyere otu onye ma ọ bụ ọbụna ezinụlọ nke ndị yiri atụrụ aka ịghọ ndị kwụsiri ike n’ụzọ nke ndụ? Lee aha ihe mkpali ọ bụ ịrụsi ọrụ ike n’ozi ụlọ n’ụlọ na iji nletaghachi na ọmụmụ Bible sochie ya!
13 Abamuru Ndị Ọzọ: Otu abamuru nke ozi e ji obi nile na-eje bụ́ nke a na-apụghị ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ bụ na, dị ka onye ya na mmadụ na-arụkọ ọrụ, a na-adọta mmadụ nso karị n’ebe Jehova na Jisọs Kraịst nọ. (Mat. 11:29, 30; 1 Kọr. 3:9) Lee aha ọṅụ dị n’inwe mmetụta nke mmụọ Chineke ka ọ na-enyere gị aka n’ozi ahụ! (Mat. 10:20; Jọn 14:26) Ọzọkwa, iji ịdị uchu soro ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-arụ ọrụ ụkwụ na ụkwụ na-eme ka ihe nkekọ nke ịhụnanya na ịdị n’otu anyị siwanye ike.
14 Anyị apụghị inweta abamuru zuru ezu site n’aka Jehova ọ gwụla ma anyị na-akwado ọgbakọ o ji na-arụ ọrụ imezu nzube ya n’ụbọchị ikpeazụ ndị a n’ụzọ zuru ezu. (Tụlee 2 Ndị Eze 10:15.) Mgbe anyị ji obi anyị nile gbasochie nduzi anyị na-enweta site n’ụzọ Chineke anya, na-etinyekwa onwe anyị n’ihe omume dị iche iche nke ọgbakọ, a na-echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ pụọ ná nchepụta aghụghọ dị iche iche nke Setan. A na-enyere anyị aka ikerekwu òkè n’ozi ahụ n’ụzọ na-amịpụta mkpụrụ.
15 Jehova na-achọ ka anyị bara onwe anyị uru site n’irubere ya isi. (Aịsa. 48:17) Ọzọkwa, abamuru nke ozi e ji obi nile na-eje na-erutere ndị na-aṅa gị ntị. (1 Tim. 4:15, 16) Ị pụrụ ijide n’aka na ka ị na-eji ịdị uchu na-etinye onwe gị n’ọrụ dị ugbu a, Jehova ga-ahụ nke a, ị ‘ga-anatakwa ihe nnyeghachi gị, bụ́ ihe nketa ahụ,’ bụ́ ndụ ebighị ebi.—Kọl. 3:23, 24.