Isi nke 4
Jisọs Kraịst Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ọmụma Chineke
1, 2. Olee otú okpukpe nile nke ụwa siworo kpaa mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma Chineke aka ọjọọ?
I GUZO n’ọnụ ụzọ, gị na ugodi gị a na-alụ ọgụ. Oyi na-atụ, ọchịchị gbakwara, ọ na-agụsikwa gị ike ịbanye n’ime ụlọ—ma mkpịsị ugodi ahụ akpọpelighị ụzọ ahụ. O yiri ka ọ bụ mkpịsị ugodi nke kwesịrị ekwesị, ma ugodi ahụ ekweghị agbape. Lee ihe mgbakasị ahụ ọ bụ! I leekwa mkpịsị ugodi gị anya ọzọ. Ì ji nke kwesịrị ekwesị na-eme ihe? Ọ̀ dị onye mebiworo mkpịsị ugodi gị?
2 Nke ahụ bụ ihe atụ dị mma nke ihe ọgba aghara okpukpe dị n’ụwa a meworo ihe ọmụma Chineke. Ya bụ, ọtụtụ ndị akpawo mkpịsị ugodi na-akpọghe ya ka anyị wee ghọta—Jisọs Kraịst—aka ọjọọ. Okpukpe ụfọdụ ewepụwo mkpịsị ugodi ahụ, na-elefuru Jisọs anya kpam kpam. Ndị ọzọ agwagbuwo ọkwá Jisọs, na-efe ya ofufe dị ka Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ka o sina dị, ihe ọmụma Chineke mechiri emechi nye anyị ma ọ bụrụ na anyị enweghị ezi nghọta nke onye a bụ́ isi, Jisọs Kraịst.
3. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ Jisọs mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma Chineke?
3 Ị pụrụ icheta na Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’ikwu nke a, Jisọs adịghị etu ọnụ. Ugboro ugboro Akwụkwọ Nsọ na-emesi ike mkpa nke ezi ihe ọmụma banyere Kraịst. (Ndị Efesọs 4:13; Ndị Kọlọsi 2:2; 2 Pita 1:8; 2:20) “Onye ahụ [Jisọs Kraịst] ka ndị amụma nile na-agbara àmà,” ka Pita onyeozi rịbara ama. (Ọrụ 10:43) Pọl onyeozi dekwara, sị: “Akụ̀ nile nke amamihe na ihe ọmụma dị n’ime Ya, bụ́ ihe zoro ezo n’ime [Jisọs].” (Ndị Kọlọsi 2:3) Pọl ọbụna kwuru na nkwa nile nke Jehova na-emezu n’ihi Jisọs. (2 Ndị Kọrint 1:20) Ya mere Jisọs Kraịst bụ kpọmkwem mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma Chineke. Ihe ọmụma anyị banyere Jisọs aghaghị ịbụ nke ngwagbu ọ bụla na-adịghị ya banyere ọdịdị ya na ọkwá ya ná ndokwa Chineke. Ma n’ihi gịnị ka ụmụazụ Jisọs ji lee ya anya dị ka onye dị oké mkpa ná nzube nile nke Chineke?
MESAỊA AHỤ E KWERE NÁ NKWA
4, 5. Olileanya dịgasị aṅaa dabeere na Mesaịa ahụ, oleekwa otú ndị na-eso ụzọ Jisọs si lee ya anya?
4 Site n’ụbọchị nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ebel, ndị ohu Chineke atụsiwo anya ike maka Mkpụrụ ahụ Jehova Chineke n’onwe ya kwuru banyere ya. (Jenesis 3:15; 4:1-8; Ndị Hibru 11:4) E kpughewo na Mkpụrụ ahụ ga-emezu nzube Chineke dị ka Mesaịa ahụ, nke pụtara “Onye E Tere Mmanụ.” Ọ ‘ga-eme ka mmehie gwụsịa,’ e kwukwara banyere ebube nile nke Alaeze ya n’abụ ọma ndị ahụ. (Daniel 9:24-26; Abụ Ọma 72:1-20) Ònye ga-aghọ Mesaịa ahụ?
5 Cheedị banyere mkpali otu nwa okorobịa bụ́ onye Juu aha ya bụ Andru nwere mgbe ọ ṅara ntị n’okwu Jisọs onye Nazaret. Andru ji ọsọ gbakwuru nwanne ya nwoke bụ́ Saịmọn Pita ma gwa ya, sị: “Anyị ahụwo Mesaịa anyị.” (Jọn 1:41) Obi siri ndị na-eso ụzọ Jisọs ike na ọ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Matiu 16:16) Ezi ndị Kraịst adịwokwa njikere ịtọgbọ ndụ ha ná nkwere nke na Jisọs bụ n’ezie Mesaịa ahụ e buru n’amụma, ma ọ bụ Kraịst. Olee ihe nnwapụta ha nweworo? Ka anyị tụlee usoro ihe àmà atọ.
IHE ÀMÀ NKE NA JISỌS BỤ MESAỊA AHỤ
6. (a) Usoro ọmụmụ dị aṅaa ga-ewepụta Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, oleekwa otú anyị si mata na Jisọs sitere n’usoro ezinụlọ ahụ? (b) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ ihe na-apụghị ime eme onye ọ bụla dị ndụ mgbe 70 O.A. gasịrị ịnwapụta nzọrọ nke ịbụ Mesaịa ahụ?
6 Osuso ọmụmụ Jisọs na-eguzobe ihe ndabere mbụ maka ịmata ya dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Jehova agwabuwo ohu Ya bụ́ Abraham na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esite n’ezinụlọ ya. Nwa Abraham bụ́ Aịsak, nwa Aịsak bụ́ Jekọb, na nwa Jekọb bụ́ Juda nwetachara otu ụdị nkwa ahụ n’otu n’otu. (Jenesis 22:18; 26:2-5; 28:12-15; 49:10) A kapịtụrụ usoro ọmụmụ Mesaịa ahụ ọnụ ọtụtụ narị afọ n’ihu mgbe a gwara Eze Devid na usoro ezinụlọ ya ga-ewepụta Onye a. (Abụ Ọma 132:11; Aịsaịa 11:1, 10) Ihe ndekọ Oziọma Matiu na Luk nwapụtara na Jisọs sitere n’usoro ezinụlọ ahụ. (Matiu 1:1-16; Luk 3:23-38) Ọ bụ ezie na Jisọs nwere ọtụtụ ajọ ndị iro, ọ dịghị nke gbaghara usoro ọmụmụ ya a kpọsara nke ukwuu. (Matiu 21:9, 15) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, osuso ọmụmụ ya enweghị mgbagha. Otú ọ dị, e bibiri ihe ndekọ ezinụlọ ndị Juu mgbe ndị Rom tikpọsịrị Jerusalem na 70 O.A. N’oge ndị sochiri, ọ dịghị onye pụrụ ma ọlị ịzọrọ na ya bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa.
7. (a) Gịnị bụ usoro ihe àmà nke abụọ nke na Jisọs bụ Mesaịa ahụ? (b) Olee otú Maịka 5:2 si mezuo n’ihe banyere Jisọs?
7 Amụma e mezuru bụ usoro ihe àmà nke abụọ. Ọtụtụ amụma nke Akwụkwọ Nsọ Hibru kọwara akụkụ dị iche iche nke ụzọ ndụ Mesaịa ahụ. Na narị afọ nke asatọ T.O.A., Maịka onye amụma kwuru na a ga-amụ onye ọchịchị ukwu a n’obodo ahụ a na-amaghị ama bụ́ Betlehem. A na-akpọ obodo abụọ n’Israel Betlehem, ma amụma nke a kapịrị nke ọ bụ ọnụ: Betlehem Efrata, ebe a mụrụrịị Eze Devid. (Maịka 5:2) Nne na nna Jisọs, bụ́ Josef na Meri, biri na Nazaret, ihe dị ka 150 kilomita n’ebe ugwu nke Betlehem. Otú ọ dị, mgbe Meri dị ime, onye ọchịchị Rom bụ́ Siza Ọgọstọs nyere ndị ahụ nile iwu ka ha debanye aha n’akwụkwọ n’obodo nna ha dị iche iche.a Ya mere ọ dị mkpa ka Josef kpọrọ nwunye ya dị ime gaa Betlehem, ebe a mụrụ Jisọs.—Luk 2:1-7.
8. (a) Olee mgbe, sitekwa n’ihe omume dị aṅaa ka 69 “izu” ahụ malitere? (b) Olee otú 69 “izu” ahụ hà n’ogologo, gịnị mekwara mgbe ha gwụsịrị?
8 Na narị afọ nke isii T.O.A., Daniel onye amụma kwuru na “onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú” ga-apụta n’ime 69 “izu” mgbe e nyesịrị iwu ka e weghachi ma wughachi Jerusalem. (Daniel 9:24, 25) Nke ọ bụla n’ime “izu” ndị a dị afọ asaa n’ogologo.b Dị ka akụkọ ihe mere eme nke Bible na nke ụwa na-egosi, e nyere iwu ahụ bụ́ ka e wughachi Jerusalem na 455 T.O.A. (Nehemaịa 2:1-8) Ya mere Mesaịa ahụ ga-apụta 483 (e jiri 7 mụbaa 69) afọ mgbe 455 T.O.A. gasịrị. Nke ahụ na-eweta anyị na 29 O.A., afọ ahụ kpọmkwem Jehova ji mmụọ nsọ tee Jisọs mmanụ. Jisọs si otú ahụ ghọọ “Kraịst” (nke pụtara “Onye E Tere Mmanụ”), ma ọ bụ Mesaịa.—Luk 3:15, 16, 21, 22.
9. (a) Olee otú e si mezuo Abụọ Ọma 2:2? (b) Olee ụfọdụ amụma ndị ọzọ e mezuru na Jisọs? (Lee chaatị.)
9 Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nakweere Jisọs dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa, Akwụkwọ Nsọ bukwa ụzọ kwuo nke a. Dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 2:2, e nyere Eze Devid mmụọ nsọ ikwu, sị: “Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa izu, imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ.” Amụma nke a gosiri na ndị ndú sitere n’ihe karịrị otu ala ga-ejikọ aka ịwakpo Onye Jehova E Tere Mmanụ, ma ọ bụ Mesaịa. Otú ahụ ka o mekwara. Ndị ndú okpukpe ndị Juu, Eze Herọd, na onye ọchịchị bụ́ onye Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet kerechaara òkè n’igbu Jisọs. Herọd na Paịlet bụbu ndị iro ghọrọ nnukwute enyi site na mgbe ahụ gaa n’ihu. (Matiu 27:1, 2; Luk 23:10-12; Ọrụ 4:25-28) Iji nwetakwuo ihe nnwapụta nke na Jisọs bụ Mesaịa ahụ, biko lee chaatị a gbakwụnyere nke a kpọrọ “Amụma Ụfọdụ Gbara Ọkpụrụkpụ Banyere Mesaịa.”
10. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si gbaa akaebe na Jisọs bụ Onye E Tere Mmanụ nke ya e kwere ná nkwa?
10 Akaebe nke Jehova Chineke bụ usoro ihe àmà nke atọ na-akwado ịbụ Mesaịa nke Jisọs. Jehova zigara ndị mmụọ ozi ka ha mee ka ndị mmadụ mara na Jisọs bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Luk 2:10-14) N’ezie, n’oge ndụ elu ala Jisọs, Jehova n’onwe ya kwuru okwu site n’eluigwe, na-ekwupụta na ya nwapụtara Jisọs. (Matiu 3:16, 17; 17:1-5) Jehova Chineke nyere Jisọs ike ịrụ ọrụ ebube. Nke ọ bụla n’ime ndị a bụ ihe nnwapụta ọzọ nke Chineke na Jisọs bụ Mesaịa ahụ, n’ihi na Chineke agaghị enye onye adịgboroja ike ịrụ ọrụ ebube. Jehova jikwara mmụọ nsọ ya mee ka e dee ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ, ka ihe àmà dị iche iche nke ịbụ Mesaịa Jisọs wee ghọọ akụkọ nke Bible, bụ́ akwụkwọ a kasị na-asụgharị ma na-ekesa n’akụkọ ihe mere eme.—Jọn 4:25, 26.
11. Ihe àmà hà aṅaa ka e nwere na Jisọs bụ Mesaịa ahụ?
11 Ná nchịkọta, usoro ihe àmà ndị a gụnyere ọtụtụ narị ihe merenụ ndị na-eme ka a mata Jisọs dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Mgbe ahụ, o doro anya na ezi ndị Kraịst elewo ya anya n’izi ezi dị ka ‘onye ndị amụma nile gbaara àmà’ na mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma Chineke. (Ọrụ 10:43) Ma a ka nwere ihe a ga-amụta banyere Jisọs Kraịst karịa eziokwu bụ na ọ bụ Mesaịa. Olee ebe o sitere? Olee ihe ọ dị ka ya?
ỊDỊ ADỊ JISỌS TUPU Ọ GHỌỌ MMADỤ
12, 13. (a) Olee otú anyị si mara na Jisọs dịrị adị n’eluigwe tupu ọ bịa n’ụwa? (b) Ònye bụ “Okwu ahụ,” gịnịkwa ka o mere tupu ọ ghọọ mmadụ?
12 A pụrụ ikewa oge ndụ Jisọs gaa n’agba atọ. Nke mbụ malitere ogologo oge tupu a mụọ ya n’elu ụwa. Maịka 5:2 sịrị na mmalite Mesaịa ahụ sitere na “mgbe ochie, site n’ụbọchị nile nke mgbe ebighị ebi gara aga.” Jisọs kwukwara hoo haa na ya sitere “n’ebe dị elu,” ya bụ, site n’eluigwe. (Jọn 8:23; 16:28) Ogologo oge hà aṅaa ka ọ dịworo n’eluigwe tupu ọ bịa n’ụwa?
13 A kpọrọ Jisọs ‘Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya’ n’ihi na Jehova ji aka ya kee ya. (Jọn 3:16) Dị ka “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke,” Chineke jizi Jisọs kee ihe ndị ọzọ nile. (Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14) Jọn 1:1 na-asị na “Okwu ahụ” (Jisọs n’ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ) na Chineke dịkwara “na mbụ.” Ya mere Okwu ahụ na Jehova nọ mgbe e kere “eluigwe na ụwa.” Chineke na-agwa Okwu ahụ okwu mgbe Ọ sịrị: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị.” (Jenesis 1:1, 26) N’otu aka ahụ, Okwu ahụ aghaghị ịbụwo “onye ọkà” a hụrụ n’anya nke Chineke, nke a kọwara n’Ilu 8:22-31 dị ka amamihe e ji mere onye, na-arụsi ọrụ ike n’akụkụ Jehova n’imepụta ihe nile. Mgbe Jehova mesịrị ka ọ malite ịdị adị, Okwu ahụ nọnyeere Chineke ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ n’eluigwe tupu ọ ghọọ mmadụ n’elu ụwa.
14. N’ihi gịnị ka e ji akpọ Jisọs “onyinyo nke Chineke ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya”?
14 Ka a sịkwa ihe mere Ndị Kọlọsi 1:15 ji akpọ Jisọs “onyinyo nke Chineke ahụ Nke a na-apụghị ịhụ anya”! Site n’ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgbakọtali nke mmekọrịta chiri anya, Ọkpara ahụ na-erube isi bịara dị nnọọ ka Nna ya, bụ́ Jehova. Nke a bụ ihe ọzọ mere Jisọs ji bụrụ mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma na-enye ndụ nke Chineke. Ihe ọ bụla Jisọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa bụ kpọmkwem ihe Jehova gaara eme. N’ihi ya, ịmara Jisọs pụtakwara ịmụba ihe ọmụma anyị banyere Jehova. (Jọn 8:28; 14:8-10) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ọ dị oké mkpa ịmụtakwu ihe banyere Jisọs Kraịst.
OGE NDỤ JISỌS N’ELU ỤWA
15. Olee otú Jisọs si bụrụ onye a mụrụ dị ka nwa zuru okè?
15 Agba nke abụọ nke oge ndụ Jisọs bụ n’elu ụwa ebe a. O ji ọchịchọ obi ya doo onwe ya n’okpuru mgbe Chineke bufere ndụ ya site n’eluigwe gaa n’akpa nwa nke otu nwanyị onye Juu nke na-ekwesị ntụkwasị obi nke na-amaghị nwoke nke aha ya bụ Meri. Mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ dị ike nke Jehova, ‘kpuchiri’ Meri, na-eme ka ọ tụrụ ime ma mesịa mụọ nwa zuru okè. (Luk 1:34, 35) Jisọs eketaghị ezughị okè ọ bụla, ebe ndụ ya sitere n’Isi Iyi zuru okè. A zụlitere ya n’ezinụlọ na-abụghị nke ndị ukwu dị ka nwa ọ̀kwá nkà bụ́ Josef kuchiri, bụrụkwa nwa mbụ n’ime ọtụtụ ụmụaka n’ezinụlọ ahụ.—Aịsaịa 7:14; Matiu 1:22, 23; Mak 6:3.
16, 17. (a) Olee ebe Jisọs nwetara ike ịrụ ọrụ ebube, oleekwa ụfọdụ n’ime ha? (b) Olee àgwà ụfọdụ Jisọs gosipụtara?
16 Nraranye miri emi nke Jisọs n’ebe Jehova Chineke nọ apụtaworị ìhè mgbe ọ gbara afọ 12. (Luk 2:41-49) Mgbe o tolitesịrị ma malite ozi ya n’afọ ndụ nke 30, Jisọs gosipụtakwara ịhụnanya ya dị ukwuu maka ndị mmadụ ibe ya. Mgbe mmụọ nsọ Chineke nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube, o ji ọmịiko gwọọ ndị ahụ na-adịghị ike, ndị ngwụrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị ekpenta. (Matiu 8:2-4; 15:30) Jisọs zụrụ ọtụtụ puku ndị agụụ na-agụ nri. (Matiu 15:35-38) O mere ka otu ebili mmiri dajụọ bụ́ nke tinyere ndị enyi ya n’ihe ize ndụ. (Mak 4:37-39) N’ezie, ọbụna na ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 11:43, 44) Ọrụ ebube ndị a bụ ihe akụkọ ndị mere eme n’ezie. Ọbụna ndị iro Jisọs kwenyere na o ‘mere ọtụtụ ihe ịrịba ama.’—Jọn 11:47, 48.
17 Jisọs gazuru ala a mụrụ ya dum, na-akụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. (Matiu 4:17) O setịpụkwara ihe nlereanya kasị mma nke ndidi na inwe ezi uche. Ọbụna mgbe ndị na-eso ụzọ ya mechuru ya ihu, o ji ọmịiko kwuo, sị: “Mmụọ nke mmadụ dị ọkụ n’ezie, ma anụ ahụ adịghị ike.” (Mak 14:37, 38) Ma, Jisọs nwere obi ike ma na-ekwuwa okwu gwa ndị na-elelị eziokwu ma na-emegbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. (Matiu 23:27-33) Karịsịa, o ṅomiri ihe nlereanya Nna ya nke ịhụnanya n’ụzọ zuru okè. Ọbụna na Jisọs dị njikere ịnwụ ka ihe a kpọrọ mmadụ na-ezughị okè wee nwee olileanya maka ọdịnihu. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere anyị pụrụ iji zoo nnọọ aka n’ebe Jisọs nọ dị ka mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma Chineke! Ee, ọ bụ mkpịsị ugodi nke dị ndụ! Ma n’ihi gịnị ka anyị ji sị mkpịsị ugodi dị ndụ? Nke a na-eweta anyị n’agba nke atọ nke oge ndụ ya.
JISỌS TAA
18. Olee otú anyị kwesịrị isi were Jisọs Kraịst taa?
18 Ọ bụ ezie na Bible na-akọ banyere ọnwụ Jisọs, ọ dị ndụ ugbu a! N’ezie, ọtụtụ narị mmadụ dị ndụ na narị afọ mbụ O.A. ji anya ha hụ na ọ bụ eziokwu na a kpọlitewo ya. (1 Ndị Kọrint 15:3-8) Dị ka e buru n’amụma, o mesịrị nọdụ ala n’aka nri Nna ya ma chere ka ọ nata ike ịbụ eze n’eluigwe. (Abụ Ọma 110:1; Ndị Hibru 10:12, 13) Ya mere olee otú anyị kwesịrị isi were Jisọs taa? Ànyị kwesịrị iche banyere ya dị ka nwa ọhụrụ na-enweghị ka ọ hà ya n’ụlọ anụ? Ma ọ̀ bụ dị ka nwoke na-ata ahụhụ nke a na-egbu egbu? Ee e. Ọ bụ Eze ukwu, nke na-achị achị! N’isi nso kwa nnọọ site n’ugbu a, ọ ga-egosipụta ịchịisi ya n’elu ụwa anyị nọ ná nsogbu.
19. Olee ihe Jisọs ga-eme n’ọdịnihu dị nso?
19 Ná Mkpughe 19:11-15, a kọwara Eze ahụ bụ́ Jisọs Kraịst nke ọma dị ka onye ji ike dị ukwuu na-abịa ibibi ndị ọjọọ. Lee ka ọ na-aghaghị isi dị Onye Ọchịchị eluigwe nke a na-ahụ n’anya ọkụ n’obi iweta nhụjuanya n’eti ọtụtụ nde mmadụ ihe otiti taa ná njedebe! Ọ na-anụkwa ya ọkụ n’obi n’otu aka ahụ inyere ndị na-agbalịsi ike iṅomi ihe nlereanya zuru okè o setịpụrụ mgbe ọ nọ n’elu ụwa aka. (1 Pita 2:21) Ọ chọrọ ichebe ha gabiga “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” nke a na-akpọkarị Amagedọn, bụ́ nke ji ọsọ na-erute, ka ha wee dịa ndụ ebighị ebi dị ka ndị Alaeze eluigwe nke Chineke ga-achị n’elu ụwa.—Mkpughe 7:9, 14; 16:14, 16.
20. Gịnị ka Jisọs ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ n’oge Ọchịchị Puku Afọ ya?
20 N’oge Ọchịchị Puku Afọ Jisọs nke udo nke e buru n’amụma, ọ ga-arụ ọrụ ebube maka ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-10; Mkpughe 20:6) Jisọs ga-agwọ ọrịa nile ma weta ngwụsị nye ọnwụ. Ọ ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ n’ọnwụ ka ha onwe ha kwa nwee ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. (Jọn 5:28, 29) Ọ ga-atọ gị ụtọ ịmụtakwu ihe banyere Alaeze Mesaịa ya n’otu isiokwu dị n’ihu. Ka nke a doo gị anya: Anyị apụghịdị iche n’echiche otú ndụ anyị ga-adịru ebube n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ. Lee ka o si dị mkpa ịmatakwu Jisọs Kraịst nke ọma! Ee, ọ dị oké mkpa na ọ dịghị mgbe anyị chezọrọ Jisọs, bụ́ mkpịsị ugodi dị ndụ nke ihe ọmụma Chineke nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndebanye aha nke a mere ka o kwe Alaeze Ukwu Rom omume karị ịnakọta ụtụ. N’ihi ya, Ọgọstọs n’amaghị ama nyere aka imezu otu amụma banyere onye ọchịchị nke ‘ga-eme ka onye nke na-achị n’ihe ike gabiga n’alaeze ahụ.’ Otu amụma ahụ kwukwara na ‘a ga-etipịa’ “onye ndú nke ọgbụgba ndụ,” ma ọ bụ Mesaịa, n’ụbọchị onye ga-esochi onye ọchịchị nke a. E gburu Jisọs n’oge ọchịchị onye nọchiri Ọgọstọs, bụ́ Taịberiọs.—Daniel 11:20-22.
b Ndị Juu oge ochie na-echekarị echiche banyere izu nke afọ. Dị ka ihe atụ, dị nnọọ ka ụbọchị nke asaa ọ bụla bụ Ụbọchị Izu Ike, afọ nke asaa ọ bụla bụkwa Afọ Izu Ike.—Ọpụpụ 20:8-11; 23:10, 11.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Olee otú osuso ọmụmụ Jisọs si akwado nzọrọ ya ịbụ Mesaịa?
Olee ụfọdụ n’amụma Mesaịa ndị e mezuru na Jisọs?
Olee otú Chineke si jiri aka ya gosi na Jisọs bụ Onye E Tere Mmanụ nke ya?
N’ihi gịnị ka Jisọs ji bụrụ mkpịsị ugodi dị ndụ nke ihe ọmụma Chineke?
[Chaatị dị na peeji nke 37]
AMỤMA ỤFỌDỤ GBARA ỌKPỤRỤKPỤ BANYERE MESAỊA
AMỤMA IHE MERE MMEZU
MMALITE NDỤ YA
Aịsaịa 7:14 Nwa agbọghọ na-amaghị Matiu 1:18-23
nwoke mụrụ ya
Jeremaịa 31:15 E gburu ụmụ ọhụrụ Matiu 2:16-18
mgbe a mụsịrị ya
OZI YA
Aịsaịa 61:1, 2 Ọrụ ya sitere na Chineke Luk 4:18-21
Aịsaịa 9:1, 2 Ozi ya mere ka ndị mmadụ Matiu 4:13-16
hụ ìhè ukwu
Abụ Ọma 69:9 Ọ nụrụ ọkụ n’obi maka Jọn 2:13-17
ụlọ Jehova
Aịsaịa 53:1 E kwenyeghị na ya Jọn 12:37, 38
Zekaraịa 9:9; Mbanye na Jerusalem Matiu 21:1-9
Abụ Ọma 118:26 n’elu nwa ịnyịnya ibu;
e toro ya dị ka eze na
dị ka onye ahụ nke
na-abịa n’aha Jehova
NRARANYE NA ỌNWỤ YA
Abụ Ọma 41:9; Otu onyeozi ekwesịghị Ọrụ 1:15-20
109:8 ntụkwasị obi; rara Jisọs
nye, e mesịakwa dochie ya
Zekaraịa 11:12 A raara ya nye n’ọnụ ahịa Matiu 26:14, 15
30 ego ọlaọcha
Abụ Ọma 27:12 E ji ndị àmà ụgha mee Matiu 26:59-61
ihe megide ya
Abụ Ọma 22:18 E fere nza maka uwe ya Jọn 19:23, 24
Aịsaịa 53:12 Gụnye ya ná ndị mmehie Matiu 27:38
Abụ Ọma 22:7, 8 A chịrị ya ọchị mgbe Mak 15:29-32
ọ na-anwụ
Abụ Ọma 69:21 E nyere ya mmanya gbara ụka Mak 15:23, 36
Aịsaịa 53:5; A mapuru ya ahụ Jọn 19:34, 37
Aịsaịa 53:9 E likọrọ ya na ndị bara Matiu 27:57-60
ọgaranya
Abụ Ọma 16:8-11 A kpọlitere ya tupu Ọrụ 2:25-32;
o ree ure Ọrụ 13:34-37
[Foto dị na peeji nke 35]
Chineke nyere Jisọs ike ịgwọ ndị ọrịa