Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 10/15 p. 4-7
  • Ihe Isi Ike Ezinụlọ Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Isi Ike Ezinụlọ Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ego na Ọrụ
  • Nkekọ Alụmdi na Nwunye nke E Mere Ka Ọ Ghara Isi Ike
  • A Na-awakwasị Ndị Ntorobịa
  • Mkpọrọgwụ Dị Iche Iche nke Ihe Isi Ike Ezinụlọ
  • Ezinụlọ Ndị Na-eme Nke Ọma
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 10/15 p. 4-7

Ihe Isi Ike Ezinụlọ Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ndị A

IHE isi ike ezinụlọ—ọtụtụ ndị na-ele ya anya dị ka ihe àmà nke na-egosi na ụkpụrụ nduzi ọdịnala nke alụmdi na nwunye na nke ịbụ nne na nna aghọwo ihe ochie. Ndị ọzọ na-ele ya anya dị ka ihe si ná mgbanwe nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ na ụba, na mmekọrịta nke ọha mmadụ pụta. Ndị ọzọkwa na-ele ya anya dị ka nanị ihe ọdachi ọzọ nke sitere na nkà na ụzụ nke oge ọgbara ọhụrụ a. N’ikwu eziokwu, ọtụtụ nsogbu nke ezinụlọ dị iche iche na-agbaso mgba taa na-ezo aka n’otu ihe nke nwere ezi ọdịmkpa ka ukwuu. Rịba ama okwu ndị ahụ nke Bible na 2 Timoti 3:1-4:

“Mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa ná mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.”

Ọ̀ bụ na okwu ndị a adịghị eru ná mkpọrọgwụ nke nsogbu dị iche iche nke taa? Ihe isi ike ezinụlọ nke taa bụ n’ụzọ doro anya ihe si kpọmkwem n’ọnọdụ dị iche iche e buru n’amụma pụta, bụ́ nke e kwuru gaje iwere ọnọdụ n’ime mgbe ikpeazụ nke ụwa nke a. E nwekwara ihe àmà na-arụgide arụgide ikwere na ya na oge nke a nke ihe isi ike malitere n’afọ 1914.a Kemgbe ahụ, mmetụta nke mmụọ ahụ e kere eke nke karịrị mmadụ ike, bụ́ Setan Ekwensu abụrụwo n’ezie nke na-eweta ọnwụ.—Matiu 4:8-10; 1 Jọn 5:19.

Ebe a kpawooro ya ókè na gburugburu elu ala kemgbe 1914, Setan nwere “oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:7-12) Ebe Setan bụ onye iro ṅụrụ iyi megide Chineke “onye e sitere na ya gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha,” ọ̀ bụ ihe iju anya na elu ala aghọwo ebe dị ihe ize ndụ maka ezinụlọ dị iche iche? (Ndị Efesọs 3:15) Setan kpebisiri ike ichigharị ihe nile a kpọrọ mmadụ pụọ n’ebe Chineke nọ. Olee ụzọ ka mma ọ ga-esi mezuo nke a karịa iji nsogbu dị iche iche wakwasị ezinụlọ dị iche iche?

Ọ ga-ewe ihe karịrị ozizi na-aga were were n’ọnụ nke ndị a sị na ha bụ ndị ọkachamara iji chebe ezinụlọ dị iche iche pụọ ná mwakwasị dị otú ahụ nke onye ahụ karịrị mmadụ ike. Otú o sina dị, Bible na-ekwu banyere Setan, sị: “Anyị abụghị ndị na-amaghị ihe nile ọ na-echepụta.” (2 Ndị Kọrint 2:11) E nwere ọ̀tụ̀tụ̀ nke nchebe n’ịmara kpọmkwem ụzọ ụfọdụ nke o si eme mwakwasị ya.

Ego na Ọrụ

Ihe nrụgide nke akụ na ụba bụ otu n’ime ihe agha ndị kasị dịrị irè nke Setan ji eme mwakwasị. Ndị a bụ “oge dị oké egwu,” ma ọ bụ dị ka Revised Standard Version si dee ya na 2 Timoti 3:1, “oge ahụhụ.” Ná mba ndị ka na-emepe emepe, nsogbu ndị dị ka enweghị ọrụ, ego ụgwọ ọnwa dị ala, na ụkọ nke ihe ndị bụ isi dị mkpa na-akpatara ezinụlọ dị iche iche ihe isi ike dị ukwuu. Otú ọ dị, ọbụna ná mba ahụ batụrụ ọgaranya bụ́ United States, ihe nrụgide nke akụ na ụba na-enwe mmetụta dị ike. Otu ihe nnyocha e mere na U.S. na-ekpughe na otu n’ime ihe ndị kasị akpata nsogbu ezinụlọ bụ ego. Akwụkwọ bụ́ Secrets of Strong Families na-akọwa na “oge, nlebaranya, [na] ike” a na-etinye n’imezu ihe ọrụ ego na-achọ n’aka mmadụ pụrụ ịbụkwa otu “onye iro dị aghụghọ” nke na-erichapụ ihe nkegide nke alụmdi na nwunye.

Ọnọdụ dị iche iche a manyewo ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndi inyom ịchọ ọrụ ego. Onye ode akwụkwọ bụ́ Vance Packard na-akọ, sị: “Ka ọ dị ugbu a, ọ dịkarịa nta, otu ụzọ n’ime ụzọ anọ nke ụmụaka na ndị na-amụ ije ije nọ n’America, bụ́ ndị na-agafebeghị afọ atọ nwere ndị nne na-arụ ụdị ọrụ ụfọdụ n’ebe na-abụghị ebe obibi ha.” Ilekọta mkpa ndị fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị a na-apụghị igbocha egbocha nke ụmụaka ndị dị nta tinyere ọrụ ego pụrụ ịbụ mgbalị na-amịkọrọ ume, nke na-agwụ ike nke ukwuu—nke na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ebe ma nne ma ụmụaka nọ. Packard kwukwara na n’ihi ụkọ nke ihe ndị eji elekọta ụmụaka n’ime United States, “ihe dị nnọọ ka nde ụmụaka ole na ole taa bụ ndi a na-anapụ ihe ruuru ha nke ezi nlekọta mgbe ha nọ n’afọ ndụ ndị mbụ ha.”—Our Endangered Children.

Ebe ọrụ n’onwe ya na-emekarị ka ịdị n’otu nke ezinụlọ na-adakasị adakasị. A na-adọba ọtụtụ ndị ọrụ na ndị ọrụ ibe ha ná mmekọrịta rụrụ arụ. Ndị ọzọkwa na-etinye aka ná nchụso na-enweghị isi maka inwe ọganihu ma jiri ndụ ezinụlọ ha chụọ àjà maka ọganihu n’ọrụ ha. (Tụlee Eklisiastis 4:4.) Otu nwoke tinyere onwe ya dum n’ọrụ ya dị ka onye na-erere otu ụlọ ọrụ ahịa nke na nwunye ya kọwara onwe ya dị ka “nne nanị ya na-azụ ụmụ n’ezie.”

Nkekọ Alụmdi na Nwunye nke E Mere Ka Ọ Ghara Isi Ike

Ndokwa alụmdi na nwunye n’onwe ya abụrụwokwa nke a wakwasịrị. Akwụkwọ bụ́ The Intimate Environment na-ekwu, sị: “N’oge gara aga, ihe a na-atụ anya ya bụ na di na nwunye ga-anọgide n’ọlụlụ di na nwunye ha ọ gwụlakwa ma otu onye n’ime ha ò mere mmehie dị oké njọ megide alụmdi na nwunye ahụ—ịkwa iko, obi ọjọọ, nleghara anya gabigara ókè. Ugbu a ihe ka n’ọtụtụ ndị na-ele nzube nke alụmdi na nwunye anya dị ka mmezu nke ọchịchọ onwe onye.” Ee, a na-emeso alụmdi na nwunye dị ka ihe e ji agwọta enweghị obi ụtọ, ike ọgwụgwụ, ma ọ bụ owu ọmụma—ọ bụghị dị ka ihe na-ekegide mmadụ n’ebe onye ọzọ nọ ruo ogologo ndụ ya nile. Ihe a na-elekwasị anya ugbu a bụ ihe ị na-erita n’alụmdi na nwunye, ọ bụghị ihe ị na-etinye n’ime ya. (Tụlee ọdịiche dị n’Ọrụ Ndị Ozi 20:35.) ‘Oké mgbanwe nke a n’omume gbara alụmdi na nwunye gburugburu’ emewo n’ụzọ dị ukwuu ka ihe nkekọ nke alụmdi na nwunye ghara isi ike. Mgbe ha na-apụghị inwetakwa mmezu nke ọchịchọ onwe onye ha, ọtụtụ mgbe ndị di na nwunye na-echigharikwuruzi ịgba alụkwaghịm dị ka ihe ngwọta dị ngwa.

Ndị mmadụ ná “mgbe ikpeazụ” ndị a bụ ndị a kọwara n’ụzọ amụma n’ime Bible dị ka ndị “na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke ma ha agọwo ike ya.” (2 Timoti 3:4, 5) Ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na ọdịda nke okpukpe arụwo ọrụ n’ime ka alụmdi na nwunye jiri nke nta nke nta ghara ịdị ike. N’akwụkwọ ya bụ́ The Case Against Divorce, Dr. Diane Medved dere, sị: “Dị ka ihe ka n’ọtụtụ okpukpe kwuru, Chineke kwuru na alụmdi na nwunye gaje ịdịgide adịgide. Mgbe ị na-ejighị ihe banyere Chineke n’aka ma ọ bụ i kweghị na Ya, mgbe ahụ ị na-eme ihe ị chọrọ.” Dị ka ihe si na nke a pụta, mgbe alụmdi na nwunye nwere nsogbu, ndị di na nwunye adịghị achọ ihe ngwọta kwesịrị ekwesị. “Ha na-eji oké ọsọ ọsọ weta alụmdi na nwunye ahụ ná njedebe.”

A Na-awakwasị Ndị Ntorobịa

Ihe nrụgide akụ na ụba nke oge a na-eme ka ụmụaka na-enwe nsogbu. Ọnụ ọgụgụ na-ama ahụ jijiji nke ụmụaka bụ ndị ndị mụrụ ha n’onwe ha na-emeso ihe ike site n’iti ha ihe n’ụzọ siri oké ike, jirikwa okwu ọnụ na-akparị ma ọ bụ na-emetọ ha n’ụzọ mmekọahụ. Site n’ịgba alụkwaghịm, a na-anapụ ọtụtụ nde ndị ọzọ inwe mmetụta ịhụnanya nke nne na nna, nakwa ihe mgbu nke nne na nna ịgba alụkwaghịm na-adịrukarị ogologo ndụ nile.

Mmetụta dị iche iche ndị dị ike anọwo na-awakwasị ndị ntorobịa. Mgbe onye ntorobịa bụ́ onye America na-agbala 14 afọ ná nkezi, ọ ga-ejiworị anya ya hụ 18,000 igbu mmadụ na ụdị ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke ime ihe ike, mmekọahụ rụrụ arụ, inweta obi ụtọ n’ịkpatara ndị ọzọ ihe mgbu, na imempụ nanị site n’ikiri telivishọn. Egwú na-enwekwa ike dị ukwuu n’ebe ndị ntorobịa nọ, ihe ka ukwuu n’ime ya bụkwa nke adịghị ọcha ya na-ama ahụ jijiji, nke na-akọwapụta ihe banyere mmekọahụ, ma ọ bụ ọbụna nke ihe dị n’ime ya bụ ihe banyere ofufe Setan. Ụlọ akwụkwọ na-ekpughe ndị ntorobịa nye ozizi ndị dị ka evolushọn bụ́ nke na-eme ka okwukwe e nwere n’ebe Chineke na Bible nọ ghara isi ike. Nrụgide nke ndị ọgbọ na-akpali ọtụtụ ikere òkè n’inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di na nwunye ma ọ bụ iji ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.

Mkpọrọgwụ Dị Iche Iche nke Ihe Isi Ike Ezinụlọ

N’ihi ya, mwakwasị a na-awakwasị ezinụlọ dị iche iche hiri nne n’ihe ndị o metụtara, ọ pụkwara ibibi ihe. Olee ihe pụrụ inyere ezinụlọ dị iche iche aka ịlanarị? Onye na-enye ndụmọdụ maka ndụ ezinụlọ bụ́ John Bradshaw na-atụ aro, sị: “Ụkpụrụ nduzi anyị nke ndị mụrụ ụmụ bụ nke a na-emebeghị n’ụzọ siri ike ka o kwekọọ n’ihe ọmụma ndị dị ọhụrụ n’ime 150 afọ. . . . Ihe m kwetara bụ na ụkpụrụ nduzi ndị ochie ahụ adịghịzi arụ ọrụ.” Otú ọ dị, inwekwu ụkpụrụ nduzi ndị mmadụ mere abụghị ihe ngwọta ya. Jehova Chineke bụ Onye Malitere ezinụlọ. Ọ maara ọrụ dị mkpa nke ndụ ezinụlọ na-arụ n’obi ụtọ nke onwe anyị na ihe dị mkpa maka ime ka ezinụlọ nwee obi ụtọ ma sie ike karịa onye ọ bụla ọzọ. Ò kwesịrị ịbụrụ anyị ihe iju anya na Okwu ya, bụ́ Bible, na-enye ihe ngwọta maka ihe isi ike ezinụlọ?

Akwụkwọ ochie ahụ na-akọwa otú ndụ ezinụlọ si gbagọọ pụọ n’ụzọ a chọrọ ka o si dịrị. E debere di na nwunye mbụ bụ mmadụ, Adam na Iv, n’ogige mara mma, ma nye ha ihe ịma aka na-akwụghachi ụgwọ nke ịgbanwe elu ala ka ọ ghọọ paradaịs zuru ụwa ọnụ. Chineke nyere iwu na Adam gaje ịbụ isi nke ezinụlọ ahụ. Iv gaje ịkwado ịbụ isi ya dị ka “onye inye aka,” ma ọ bụ onye “kwesịrị” ya. Ma Iv nupụụrụ ndokwa nke a isi. Ọ pụnaara ịbụ isi nke di ya ma nupụrụ nanị otu ihe mgbochi nke Chineke tụkwasịrị ha isi. Mgbe ahụ Adam gbahapụrụ ịbụ isi ya ma sonyere ya ná nnupụisi nke a.—Jenesis 1:26–3:6.

Mmetụta na-ebibi ihe nke nhapụ nke a pụọ ná ndokwa nke Chineke pụtara ìhè ozugbo ahụ. N’adịghịzi ọcha na n’abụghịzi ndị aka ha dị ọcha, Adam na Iv jiri ihere na ikpe ọmụma meghachi omume. Adam, bụ́ onye jiri okwu ọma, ndị dị n’ụdị nke abụ kọwaa nwunye ya ná mbụ, zoro aka n’ebe ọ nọ ugbu a n’ụzọ na-adịghị ekpo ọkụ dị ka “nwanyị ahụ nke i nyere m.” Okwu ahụ na-ezighị ezi bụ nnọọ mmalite nke oké enweghị obi ụtọ nke alụmdi na nwunye. Mgbalị na-enweghị isi nke Adam inwetakwa ịbụ isi ya ọzọ ga-arụpụta na ya ‘ịchị ya.’ Iv, n’aka nke ya, ga-enwe “ọchịchọ” ya n’ebe dị ya nọ, ma eleghị anya n’ụzọ gabigara ókè ma ọ bụ n’ụzọ n’eguzozighị eguzo.—Jenesis 2:23; 3:7-16.

N’ụzọ na-abụghị ihe iju anya, nsogbu alụmdi na nwunye nke Adam na Iv, nwere mmetụta na-emebi ihe n’ebe ụmụ ha nọ. Nwa nwoke mbụ ha, bụ́ Ken, ghọrọ ogbu mmadụ nke nwere oké obi ọjọọ. (Jenesis 4:8) Lemek, onye sitere na Ken, tụkwasịrị ihe ná ndakpọ nke ndụ ezinụlọ site n’ịbụ onye mbụ e nwere n’ihe ndekọ nke lụrụ ihe karịrị otu nwanyị. (Jenesis 4:19) Otú a Adam na Iv nyefere ọ bụghị nanị ihe nketa nke mmehie na ọnwụ kama usoro ezinụlọ nke na-arịa ọrịa nke bụworo ọnọdụ nke agbụrụ mmadụ kemgbe ahụ. Ná mgbe ikpeazụ ndị a, adịghị n’otu nke ezinụlọ eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu.

Ezinụlọ Ndị Na-eme Nke Ọma

Otú ọ dị, ọ bụghị ezinụlọ nile na-agbagọ n’ihi ihe nrụgide nke ụbọchị taa. Dị ka ihe atụ, otu onye bụ di, na nwunye ya na ụmụ ha ndị inyom abụọ bi n’otu ógbè dị nta na United States. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị agbata obi ha nwere nsogbu nke enweghị mkparịta ụka n’etiti ndị nne na nna na ụmụ ha, ya na nwunye ya enweghị, ha enweghịkwa nsogbu nke ma ụmụ ha ndị inyom hà ga-anwale iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị ma ọ bụ mmekọahụ. N’uhuruchi Monday nile, mgbe ndị ntorobịa ndị ọzọ na-arapagide anya ha na TV, ezinụlọ ha dum na-agba gburugburu na table dị n’ụlọ ebe ha na-anọ eri ihe maka mkparịta ụka nke Bible. “Abalị Monday bụ abalị anyị pụrụ iche ịbịakọta ọnụ iji kwurịta okwu,” ka ọ na-akọwa. “Ụmụ anyị ndị inyom na-enwere onwe ha ikwupụtara anyị ihe bụ nsogbu ha dị iche iche.”

N’aka nke ọzọ, e nwere otu nne nke nanị ya na-azụ nwa na New York City onye na-anụkwa ụtọ nke ịdị n’otu ezinụlọ a na-adịghị ahụkebe, ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ. Olee otú o si mee ya? “Anyị na-agbanyụ TV ruo ọgwụgwụ izu,” ka ọ na-akọwa. “Anyị na-enwe mkparịta ụka nke otu akụkụ Bible kwa ụbọchị. Anyị na-ewepụtakwa otu uhuruchi maka mkparịta ụka Bible nke ezinụlọ.”

Ezinụlọ abụọ ahụ bụ Ndịàmà Jehova. Ha na-agbaso ndụmọdụ dịịrị ezinụlọ nke e depụtara na Bible—ọ na-arụkwa ọrụ. Ma ha abụghị ndị ọnọdụ ha pụrụ iche. E nwere ọtụtụ narị puku ezinụlọ dị iche iche dịkwa nnọọ ka ha, bụ́ ndị na-enweta ezi ihe ndị ọ rụpụtara site n’itinye ụkpụrụ nduzi dịịrị ezinụlọ bụ́ ndị a na-achọta n’akwụkwọ ahụ n’ọrụ.b Gịnị kpọmkwem bụ ụkpụrụ nduzi ndị ahụ? Olee otú ha pụrụ isi baara gị na ezinụlọ gị uru? N’ịza ya, anyị na-akpọku gị ịtụle isiokwu ndị na-amalite na peji na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka inwetakwu ihe àmà nke na-egosi na mgbe ikpeazụ malitere na 1914, lee isi 18 nke akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Site n’ọmụmụ Bible ebe obibi nke a na-adịghị ana ego maka ya, Ndịàmà Jehova na-enye enyemaka onwe onye n’itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ n’ime ezinụlọ. A pụrụ inweta ha site n’idere ndị na-ebipụta magazin nke a akwụkwọ.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ọnọdụ akụ na ụba dị njọ na-akpatara ezinụlọ dị iche iche ihe isi ike ná mba ndị ka na-emepe emepe

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto U.S. Navy

[Foto dị na peeji nke 7]

Site n’itinye ụkpụrụ dị iche iche nke Bible n’ọrụ, ọtụtụ ezinụlọ na-eguzogide ihe nrụgide nke taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya