Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 13 p. 118-129
  • Ihe Mere Ịdị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke Ji Eweta Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Ịdị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke Ji Eweta Obi Ụtọ
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊKWỤWA AKA ỌTỌ NA-ARỤPỤTA OBI ỤTỌ
  • MMESAPỤ AKA NA-EWETA OBI ỤTỌ
  • IHE NDỊ ỌZỌ NA-AKWALITE OBI ỤTỌ
  • OBI ỤTỌ N’ALỤMDI NA NWUNYE
  • “ESITEGHỊ N’ỤWA”
  • ỊTỤLE EMEME NDỊ A NA-EME KWA AFỌ
  • ỌRỤ NA NTỤRỤNDỤ
  • NKWANYE ÙGWÙ MAKA NDỤ NA ỌBARA
  • Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Alụmdi na Nwunye Ọ̀ Bụ Nanị Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 13 p. 118-129

Isi nke 13

Ihe Mere Ịdị Ndụ nke Nsọpụrụ Chineke Ji Eweta Obi Ụtọ

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ụzọ nke Jehova na-eweta obi ụtọ?

JEHOVA bụ “Chineke obi ụtọ,” ọ chọkwara ka ị nụ ụtọ ndụ. (1 Timoti 1:11, NW) Site n’ijegharị n’ụzọ ya, ị pụrụ iritere onwe gị uru ma nwee obi iru ala nke miri emi ma na-adịgide adịgide, dị ka osimiri nke na-eru mgbe nile. Ijegharị n’ụzọ Chineke na-akwalikwa mmadụ ịnọgide na-arụ ọrụ ezi omume, “dị ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.” Nke a na-eweta ezi obi ụtọ.​—⁠Aịsaịa 48:​17, 18.

2. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi nwee obi ụtọ n’agbanyeghị na a na-emeso ha mmeso ọjọọ mgbe ụfọdụ?

2 Ụfọdụ pụrụ ịgbagha ya sị, ‘Mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ihi ime ihe ziri ezi.’ Ọ bụ eziokwu, nke ahụ bụkwa ihe mere ndị ozi Jisọs. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na a kpagburu ha, ha ṅụrịrị ọṅụ ma gaa n’ihu “izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:​40-⁠42) Anyị pụrụ inweta ihe mmụta ndị dị mkpa site na nke a. Otu bụ na anyị ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke adịghị ekwe nkwa na a ga-emeso anyị n’ụzọ dị mma mgbe nile. “Ee,” ka Pọl onyeozi dere, “a ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 3:12) Ihe kpatara nke a bụ na Setan na ụwa ya na-emegide ndị na-adị ndụ n’ụzọ nsọpụrụ Chineke. (Jọn 15:18, 19; 1 Pita 5:8) Ma ezigbote obi ụtọ adabereghị n’ihe ndị a na-ahụ anya. Kama nke ahụ, ọ na-abịa site n’obi ike na anyị na-eme ihe ziri ezi wee si otú ahụ nwee nnwapụta Chineke.​—⁠Matiu 5:​10-⁠12; Jemes 1:2, 3; 1 Pita 4:​13, 14.

3. Olee otú ofufe Jehova kwesịrị isi metụta ndụ mmadụ?

3 E nwere ndị na-eche na ha pụrụ ịrụta ihu ọma Chineke n’ọrụ site n’ọrụ nraranye a rụrụ site n’oge ruo n’oge ma na ha pụrụ ichezọ banyere ya n’oge ndị ọzọ. Ezi ofufe nke Jehova Chineke adịghị otú ahụ. Ọ na-emetụta àgwà mmadụ n’oge nile ọ mụ anya, site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, site n’afọ ruo n’afọ. Nke ahụ bụ ihe mere e ji akpọkwa ya “Ụzọ.” (Ọrụ 19:9; Aịsaịa 30:21) Ọ bụ ụzọ nsọpụrụ Chineke isi dịa ndụ nke na-achọ ka anyị na-ekwu okwu ma na-eme ihe n’ikwekọ n’Okwu Chineke.

4. N’ihi gịnị ka o ji aba uru ime mgbanwe iji dịa ndụ kwekọrọ n’ụzọ Chineke?

4 Mgbe ndị ọhụrụ na-amụ Bible hụrụ na ọ dị ha mkpa ime mgbanwe ụfọdụ iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, ha pụrụ ịtụgharị uche sị, ‘Uru ọ̀ dị ya n’ezie n’ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke?’ Ị pụrụ ijide n’aka na ọ dị ya. N’ihi gịnị? N’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya,” ya mere e zubere ka ụzọ ya nile baara anyị uru. (1 Jọn 4:8) Chineke nwekwara amamihe ma mara ihe kasị mma maka anyị. Ebe Jehova Chineke nwere ike ime ihe nile, o nwere ike inye anyị ume imezu ọchịchọ anyị ime ihe na-atọ ya ụtọ site n’ịkwụsị àgwà ọjọọ. (Ndị Filipaị 4:13) Ka anyị tụlee ụkpụrụ ụfọdụ ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke na-agụnye wee hụ ụzọ itinye ha n’ọrụ si eweta obi ụtọ.

ỊKWỤWA AKA ỌTỌ NA-ARỤPỤTA OBI ỤTỌ

5. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ịgha ụgha na izu ohi?

5 Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị chọrọ ịgbaso ihe nlereanya ya wee bụrụ onye a maara dị ka onye eziokwu. Ịkwụwa aka ọtọ na-eduba n’ùgwù onwe onye na mmetụta nke ahụ ịdị mma. Otú ọ dị, n’ihi na akwụwaghị aka ọtọ jupụtara n’ụwa mmehie nke a, ndị Kraịst nwere mkpa maka ihe ncheta nke a: “Na-ekwunụ eziokwu onye ọ bụla n’ebe onye agbata obi ya nọ . . . Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ . . . ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.” (Ndị Efesọs 4:​25, 28) Ndị Kraịst e were n’ọrụ na-arụ ọrụ ụbọchị n’ụzọ zuru ezu. Ọ gwụla ma onye were ha n’ọrụ ò nyere ikike, ha adịghị ewere ihe dịịrị ya. Ma ọ̀ bụ n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ụlọ, onye na-efe Jehova aghaghị “ibi obi nke ọma n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Onye ọ bụla nwere àgwà nke ịgha ụgha ma ọ bụ izu ohi apụghị inwe ihu ọma Chineke.​—⁠Deuterọnọmi 5:19; Mkpughe 21:8.

6. Olee otú ịkwụwa aka ọtọ nke onye na-asọpụrụ Chineke pụrụ isi wetara Jehova otuto?

6 Ịkwụwa aka ọtọ na-arụpụta ọtụtụ ngọzi. Selina bụ nwanyị onye Africa di ya nwụrụ nke nọ ná mkpa nke hụrụ Jehova Chineke na ụkpụrụ ezi omume ya nile n’anya. Otu ụbọchị, ọ chọtara otu akpa akwụkwọ ụlọ akụ̀ na nnukwute ùkwù ego dị n’ime ya. Na-eji akwụkwọ ndepụta nọmba telifon eme ihe, o nwere ike ịchọta onye nwe ya​—⁠onye nwere ụlọ ahịa nke e zuworo ohi. Nwoke ahụ apụghị ikweta ihe anya ya hụrụ mgbe Selina, ọ bụ ezie na ọ na-arịasi ọrịa ike, letara ya ma weghachi ihe dum dị n’ime akpa ahụ. “Ịkwụwa aka ọtọ dị otú ahụ aghaghị ịbụ nke e nyere ụgwọ ọrụ,” ka o kwuru ma nye ya ùkwù ego. Nke ka mkpa, nwoke a toro okpukpe Selina. Ee, omume ịkwụwa aka ọtọ na-achọ nkụzi Bible mma, na-eto Jehova Chineke, ma na-ewetara ndị na-efe ya ofufe n’ịkwụwa aka ọtọ obi ụtọ.​—⁠Taịtọs 2:10; 1 Pita 2:12.

MMESAPỤ AKA NA-EWETA OBI ỤTỌ

7. Gịnị dị njọ n’ịgba chaa chaa?

7 Obi ụtọ dị n’imesapụ aka, ebe ndị anyaukwu na-agaghị “eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:10) Otu ụdị anyaukwu juru ebe nile bụ ịgba chaa chaa, nke bụ mgbalị inweta uru site ná mfu nke ndị ọzọ. Jehova adịghị akwado ndị ‘akpịrị uru na-eweta ihere na-akpọ nkụ.’ (1 Timoti 3:8) Ọbụna n’ebe iwu na-akwado ịgba chaa chaa, mmadụ na-agbakwa chaa chaa dị ka ihe egwuregwu, ọ pụrụ ịbụ onye o riri ahụ ma na-akwado omume nke laworo ndụ ọtụtụ ndị n’iyi. Ịgba chaa chaa na-ewetakarịrị ezinụlọ onye na-agba chaa chaa, bụ́ ndị a pụrụ ịhapụworo ego dị nta iji zụta ihe ndị dị mkpa dị ka nri na uwe, ihe isi ike.​—⁠1 Timoti 6:10.

8. Olee otú Jisọs si setịpụ ezi ihe nlereanya n’imesapụ aka, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi na-emesapụ aka?

8 N’ihi mmesapụ aka ha n’ịhụnanya, ndị Kraịst na-achọta ọṅụ n’inyere ndị ọzọ aka, karịsịa ndị kwere ekwe ibe ha nọ ná mkpa. (Jemes 2:​15, 16) Tupu Jisọs abịa n’ụwa, o kiriri mmesapụ aka Chineke n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. (Ọrụ 14:​16, 17) Jisọs n’onwe ya nyere oge ya, nkà ya, na ọbụna ndụ ya n’ihi agbụrụ mmadụ. N’ihi ya, o ruru eru nke ọma ikwu, sị: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Jisọs kwukwara okwu ọma banyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke ji mmesapụ aka tinye mkpụrụ ego nta abụọ n’igbe akụ̀ ụlọ nsọ ahụ, n’ihi na o nyere “ihe dum o ji biri.” (Mak 12:​41-⁠44) Ndị Israel oge ochie na ndị Kraịst narị afọ mbụ na-enye ihe atụ nke mmesapụ aka n’ọṅụ n’inye ọgbakọ na ọrụ Alaeze ahụ nkwado ihe onwunwe. (1 Ihe Emere 29:9; 2 Ndị Kọrint 9:​11-⁠14) Tinyere inye onyinye ihe onwunwe maka nzube ndị a, ndị Kraịst n’oge a na-eji obi ụtọ enye Chineke otuto ma na-eji ndụ ha eme ihe n’ije ozi ya. (Ndị Rom 12:1; Ndị Hibru 13:15) Jehova na-agọzi ha n’ihi iji oge, ume, na ihe ndị ọzọ ha nwere, tinyere ego ha eme ihe, iji kwado ezi ofufe ma na-akwalite ọrụ nkwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ nke zuru ụwa ọnụ.​—⁠Ilu 3:​9, 10.

IHE NDỊ ỌZỌ NA-AKWALITE OBI ỤTỌ

9. Gịnị dị njọ n’ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya ókè?

9 Iji nwee obi ụtọ, ndị Kraịst aghaghịkwa ‘idebe izuzu ha.’ (Ilu 5:​1, 2) Nke a na-achọ ka ha na-agụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke na n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị dị mma. Ma e nwere ihe ndị a ga-ezere. Dị ka ihe atụ, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè pụrụ ime ka mmadụ ghara inwekwa nchịkwa nke izuzu ya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọtụtụ ndị na-adabanye n’omume rụrụ arụ, mee ihe ike, ma kpata ihe ọghọm ndị na-eweta ọnwụ. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji kwuo na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè agaghị eketa Alaeze Chineke! (1 Ndị Kọrint 6:10) Ikpebisi ike inwe “uche zuru okè,” ezi ndị Kraịst na-ezere ịṅụbiga mmanya ókè, nke a na-enyekwa aka ịkwalite obi ụtọ n’etiti ha.​—⁠Taịtọs 2:​2-⁠6.

10. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-adịghị eji ụtaba eme ihe? (b) Olee uru ndị na-abịa site n’ịkwụsị àgwà na-eri ahụ?

10 Anụ ahụ dị ọcha na-etinye ihe n’obi ụtọ. Ma, ọtụtụ na-aghọ ndị ihe ndị na-emerụ ahụ riri ahụ. Dị ka ihe atụ, tụlee iji ụtaba eme ihe. Òtù Ahụ Ike Ụwa na-akọ na ise siga “na-egbu nde mmadụ atọ kwa afọ.” Ịkwụsị àgwà ise ụtaba pụrụ isi ike n’ihi mgbaàmà nkwụsị bụ́ ndị na-adịru nwa oge. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị na-esebu siga na-achọpụta na ha nwere ahụ ike ka mma na ego ka ukwuu maka mkpa ezinụlọ. Ee, imeri àgwà ise ụtaba ma ọ bụ iri ahụ nke ihe ndị ọzọ na-emerụ ahụ ga-etinye ihe n’anụ ahụ dị ọcha, akọ na uche dị ọcha, na ezi obi ụtọ.​—⁠2 Ndị Kọrint 7:1.

OBI ỤTỌ N’ALỤMDI NA NWUNYE

11. Gịnị ka a chọrọ iji nwee alụmdi na nwunye iwu kwadoro na nke na-adịgide adịgide?

11 Ndị na-ebikọ ọnụ dị ka di na nwunye kwesịrị ijide n’aka na alụmdi na nwunye ha abụwo nke e debanyere n’akwụkwọ ndị ọchịchị obodo n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Mak 12:17) Ọ dịkwa ha mkpa ile alụmdi na nwunye anya dị ka ibu ọrụ dị mkpa. N’eziokwu, nkewa pụrụ ịdị mkpa n’ọnọdụ nke ịma ụma jụ inye nkwado, ajọ mmetọ, ma ọ bụ oké ntinye ọnọdụ ime mmụọ n’ihe ize ndụ. (1 Timoti 5:8; Ndị Galetia 5:​19-⁠21) Ma okwu Pọl onyeozi ná 1 Ndị Kọrint 7:​10-⁠17 na-agba ndị nọ n’alụmdi na nwunye ume ka ha dịgide n’otu. Ma, maka ezi obi ụtọ, ha aghaghị ikwesị ntụkwasị obi nye ibe ha. Pọl dere, sị: “Ka ịlụ di na nwunye bụrụ ihe a na-asọpụrụ n’etiti unu nile, ka ihe ndina unu bụrụkwa ihe a dịghị emerụ emerụ: n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Okwu ahụ bụ́ “ihe ndina” na-enye echiche nke mmekọahụ n’etiti nwoke na nwanyị ndị nọ n’alụmdi na nwunye dị ka iwu kwadoro. Ọ dịghị mmekọrịta mmekọahụ ọzọ, dị ka ịlụ karịa otu nwunye, nke a pụrụ ịkọwa dị ka nke “a na-asọpụrụ n’etiti unu nile.” Ọzọkwa, Bible na-akagbu inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye na ndina ụdị onwe.​—⁠Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:18.

12. Olee mkpụrụ ọjọọ ụfọdụ ndị ịkwa iko na-amịpụta?

12 Ịkwa iko pụrụ iweta mkpirikpi oge ụfọdụ nke ihe ụtọ anụ ahụ, ma ọ dịghị arụpụta ezi obi ụtọ. Ọ na-ewute Chineke, nweekwa ike imebi akọ na uche mmadụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:​3-⁠5) Ihe ilu ndị na-esite ná mmekọahụ na-ezighị ezi pụrụ ịbụ ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ a na-ebufe site ná mmekọahụ. “E mewo atụmatụ na ihe karịrị 250 nde mmadụ gburugburu ụwa na-ebute ọrịa gonorrhoea kwa afọ, ihe dịkwa ka 50 nde na-ebute ọrịa syphilis,” ka otu akụkọ nkà ọgwụ na ahụ ike na-ekwu. E nwekwara nsogbu nke ịtụrụ ime a na-achọghị. Òtù Mba Dị Iche Iche nke Atụmatụ Ịbụ Nne ma ọ bụ Nna na-akọ na, gburugburu ụwa, ihe karịrị nde ụmụ agbọghọ 15 nọ n’agbata afọ ndụ 15 na 19 na-atụrụ ime kwa afọ, otu ụzọ n’ụzọ atọ n’ime ha na-esikwopụkwa afọ ime. Otu nchọpụta gosiri na n’otu mba Africa, nsogbu dị iche iche nke nsikwopụ afọ ime na-eduba na 72 pasent nke ọnwụ nile n’etiti ụmụ agbọghọ nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu. Ụfọdụ ndị na-akwa iko pụrụ ịgbanarị ọrịa na afọ ime ma ọ bụghị mbibi nke mmetụta uche. Ọtụtụ na-atụfu ùgwù onwe onye ha na ọbụna kpọọ onwe ha asị.

13. Olee nsogbu ndị ọzọ ịkwa iko di ma ọ bụ nwunye na-akpata, gịnị na-echerekwa ndị nọgidere na-akwa iko?

13 Ọ bụ ezie na a pụrụ ịgbaghara ịkwa iko ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ọ bụ ihe ndabere ruru eru n’echiche Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm n’akụkụ nke onye aka ya dị ọcha. (Matiu 5:32; tụlee Hosea 3:​1-⁠5.) Mgbe omume rụrụ arụ dị otú ahụ dubara ná nkewa nke alụmdi na nwunye, nke a pụrụ ịhapụ àpà mmetụta uche miri emi n’ime onye ahụ nke aka ya dị ọcha na n’ime ụmụaka. Maka ọdịmma nke ezinụlọ mmadụ, Okwu Chineke na-egosipụta na ajọ ikpe ọmụma ya ga-abịakwasị ndị na-akwa iko n’enweghị nchegharị. Ọzọkwa, ọ na-egosi n’ụzọ doro anya na ndị nwere àgwà mmekọahụ rụrụ arụ “agaghị eketa alaeze Chineke.”​—⁠Ndị Galetia 5:​19, 21.

“ESITEGHỊ N’ỤWA”

14. (a) Olee ụdị ụfọdụ nke ikpere arụsị bụ́ ndị onye na-asọpụrụ Chineke na-ezere? (b) Nduzi dị aṅaa ka e nyere na Jọn 17:14 na Aịsaịa 2:4?

14 Ndị na-achọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na ịnụ ụtọ ngọzi Alaeze ya nile na-ezere ikpere arụsị n’ụdị ọ bụla. Bible na-egosi na o zighị ezi ime na ife ihe oyiyi ofufe, tinyere ndị nke Kraịst, ma ọ bụ nke nne Jisọs, bụ́ Meri. (Ọpụpụ 20:4, 5; 1 Jọn 5:21) Ya mere, ezi ndị Kraịst adịghị edo ihe ọkpụkpụ okpukpe, obé, na ihe oyiyi dị iche iche nsọ. Ha na-ezerekwa ụdị ikpere arụsị ndị zoro ezo, dị ka omume nsọpụrụ ofufe nye ọkọlọtọ na ịgụ abụ ndị na-eto mba. Mgbe a rụgidere ha ime ihe ndị dị otú ahụ, ha na-echeta okwu Jisọs gwara Setan: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:​8-⁠10) Jisọs sịrị na ụmụazụ ya “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Nke a pụtara ịnọpụ iche n’ihe omume nile nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ibi ndụ n’udo n’ikwekọ n’Aịsaịa 2:4, nke na-asị: “Ọ [Jehova Chineke] ga-ekpekwa ikpe n’etiti mba nile, doziekwara ọtụtụ ndị dị iche iche okwu ha: ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”

15. Gịnị bụ Babilọn Ukwu ahụ, gịnịkwa ka ọtụtụ ndị na-amụ Bible ọhụrụ na-eme iji si n’ime ya pụta?

15 “Esiteghị n’ụwa” pụtakwara ikewapụ ná mkpakọrịta nile nke “Babilọn Ukwu ahụ,” alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ofufe na-adịghị ọcha gbasara site na Babilọn oge ochie ruo mgbe o nwere nchịkwa ime mmụọ nke na-emerụ ahụ n’elu ndị mmadụ gburugburu ụwa. “Babilọn Ukwu ahụ” na-agụnye okpukpe nile ndị ozizi na omume ha na-ekwekọghị n’ihe ọmụma Chineke. (Mkpughe 17:​1, 5, 15) Ọ dịghị onye na-efe Jehova n’ikwesị ntụkwasị obi nke ga-etinye aka n’ihe omume nke ngwakọrịta okwukwe site n’isoro okpukpe dị iche iche kere òkè n’ofufe ma ọ bụ site n’inwe mmekọrịta ime mmụọ ya na akụkụ ọ bụla nke Babilọn Ukwu ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-⁠9; 2 Ndị Kọrint 6:14) N’ihi ya, ọtụtụ ndị ọhụrụ na-amụ Bible na-eziga akwụkwọ ozi nkewapụ nye òtù okpukpe ha nọ na ya. Nke a ewetawo ha nso karị n’ebe ezi Chineke ahụ nọ, dị ka e kwere ná nkwa, sị: “Sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka; Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu.” (2 Ndị Kọrint 6:17; Mkpughe 18:​4, 5) Ọ́ bụghị nnabata dị otú ahụ nke Nna anyị nke eluigwe bụ ihe ị na-achọsi ike?

ỊTỤLE EMEME NDỊ A NA-EME KWA AFỌ

16. N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst na-adịghị agba Krismas?

16 Ndụ nsọpụrụ Chineke na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ime ememe ụbọchị ezumike dị iche iche nke ụwa bụ́ ndị na-abụkarị ibu arọ. Dị ka ihe atụ, Bible ekpugheghị kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jisọs. ‘Echere m na a mụrụ Jisọs na December 25!’ ka ụfọdụ pụrụ iti ná mkpu. Nke a apụghị ikwe omume n’ihi na ọ nwụrụ n’oge opupu ihe ubi nke 33 O.A. n’afọ ndụ 33 1/2. Ọzọkwa, n’oge ọmụmụ ya, ndị ọzụzụ atụrụ “na-anọ n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha n’abalị.” (Luk 2:8) N’ala Israel, ngwụsị December bụ oge oyi, udu mmiri mgbe a na-edebe atụrụ n’ụlọ n’abalị dum iji chebe ha pụọ n’ọnọdụ ihu igwe nke oge oyi. N’ezie, ndị Rom setịpụrụ December 25 iche dị ka ụbọchị ọmụmụ chi anyanwụ ha. Ọtụtụ narị afọ mgbe Jisọs nọsịrị n’elu ụwa, ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ nabatara ụbọchị a maka ime ncheta ọmụmụ Kraịst. N’ihi ya, ezi ndị Kraịst adịghị agba Krismas ma ọ bụ ụbọchị ezumike ọ bụla ọzọ dabeere ná nkwenkwe okpukpe ụgha. N’ihi na ha na-enye Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa, ha adịghịkwa edebe ụbọchị ezumike ọ bụla nke na-eme ka ụmụ mmadụ na-emehie emehie ma ọ bụ mba dị iche iche bụrụ chi.

17. N’ihi gịnị ka ndị na-asọpụrụ Chineke na-adịghị eme ememe ncheta ọmụmụ, n’ihi gịnịkwa ka ụmụaka ndị Kraịst ji enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nke ahụ?

17 Bible hotara kpọmkwem ememe ncheta ọmụmụ abụọ, ha abụọ metụtachara ndị ikom na-ejereghị Chineke ozi. (Jenesis 40:​20-⁠22; Matiu 14:​6-⁠11) Ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ ekpugheghị ụbọchị ọmụmụ nke nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst, n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji lebara ụbọchị ọmụmụ nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè anya n’ụzọ pụrụ iche? (Eklisiastis 7:1) Otú ọ dị, ndị nne na nna na-asọpụrụ Chineke adịghị echere maka ụbọchị pụrụ iche iji gosi ụmụ ha ịhụnanya. Otu nwa agbọghọ dị afọ 13 bụ́ onye Kraịst kwuru, sị: “Mụ na ezinụlọ m na-egwuri egwu nke ukwuu. . . . Mụ na ndị mụrụ m nwere mmekọrịta chiri nnọọ anya, mgbe ụmụaka ndị ọzọ jụkwara m ihe mere na mụ adịghị edebe ụbọchị ezumike dị iche iche, m na-agwa ha na ụbọchị ọ bụla bụ oriri nye m.” Otu ntorobịa bụ́ onye Kraịst nke gbara afọ 17 kwuru, sị: “N’ụlọ anyị, inye onyinye na-ewere ọnọdụ n’afọ dum.” Obi ụtọ ka ukwuu na-abịa mgbe e nyere onyinye ndị a na-atụghị anya ha.

18. Olee otu ememe mgbaafọ nke Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu ime, gịnịkwa ka ọ na-echetara anyị?

18 Nye ndị na-agbaso ndụ nke nsọpụrụ Chineke, e nwere otu ụbọchị kwa afọ nke a ga-edebe n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, nke a na-akpọkarị Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Banyere ya, Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:​23-⁠25) Mgbe Jisọs guzobere nri a n’anyasị nke Nisan 14, 33 O.A., o jiri achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha uhie uhie mee ihe, na-eme ihe atụ nke anụ ahụ mmadụ ya nke mmehie na-adịghị ya na ọbara ya zuru okè. (Matiu 26:​26-⁠29) Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ Chineke tee mmanụ na-ekere òkè n’ihe nnọchianya ndị a. E webawo ha n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ na n’ọgbụgba ndụ maka Alaeze, ha nwekwara olileanya nke eluigwe. (Luk 12:32; 22:20, 28-⁠30; Ndị Rom 8:​16, 17; Mkpughe 14:​1-⁠5) Ka o sina dị, ndị nile nọ ya n’uhuruchi ahụ kwekọrọ na Nisan 14 na kalenda ndị Juu oge ochie na-erite uru. A na-echetara ha ịhụnanya nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst gosiri n’àjà mgbapụta ahụ na-ekpuchi mmehie nke na-eme ka ndụ agwụghị agwụ kwe omume nye ndị nwere ihu ọma Chineke.​—⁠Matiu 20:28; Jọn 3:16.

ỌRỤ NA NTỤRỤNDỤ

19. Olee ihe ịma aka ndị Kraịst na-eche ihu n’inweta ihe e ji ebi ndụ?

19 Ezi ndị Kraịst nwere ibu ọrụ nke ịrụsi ọrụ ike na igbo mkpa ha. Ịrụzu nke a na-ewetara ndị isi ezinụlọ mmetụta nke afọ ojuju. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:​11, 12) Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọrụ onye Kraịst na-emegide Bible, nke a ga-anapụ ya obi ụtọ. Ma, mgbe ụfọdụ ọ na-esiri onye Kraịst ike ịchọta ọrụ nke kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Dị ka ihe atụ, a na-achọ ka ndị ụfọdụ e were n’ọrụ ghọgbuo ndị ahịa. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị were mmadụ n’ọrụ ga-eme ihe iji nabata akọ na uche nke onye ọrụ na-akwụwa aka ọtọ, ghara ịchọ ka onye ọrụ a pụrụ ịtụkwasị obi funahụ ha. Ma, n’agbanyeghị ihe merenụ, ị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-agọzi mgbalị gị nile iji chọta ọrụ nke ga-enye gị akọ na uche dị ọcha.​—⁠2 Ndị Kọrint 4:2.

20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-eme nhọrọ n’ịhọrọ ntụrụndụ?

20 Ebe ọ bụ na Chineke chọrọ ka ndị ohu ya nwee obi ụtọ, ọ dị anyị mkpa itinye ịrụsi ọrụ ike na oge ntụsara ahụ nke ntụrụndụ na izu ike n’ọnọdụ kwesịgasịrị ha. (Mak 6:31; Eklisiastis 3:​12, 13) Ụwa Setan na-akwalite ntụrụndụ asọpụrụghị Chineke. Ma iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị aghaghị ịdị na-eme nhọrọ banyere akwụkwọ ndị anyị na-agụ, ihe omume redio na egwú ndị anyị na-ege, na sinima, ihe nkiri, egwuregwu, ihe omume telivishọn, na vidio ndị anyị na-ekiri. Ọ bụrụ na ntụrụndụ anyị na-ahọrọ na mbụ na-emegide ịdọ aka ná ntị ndị dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Deuterọnọmi 18:​10-⁠12, Abụ Ọma 11:5, na Ndị Efesọs 5:​3-⁠5, anyị ga-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ ma nwee obi ụtọ karị ma ọ bụrụ na anyị emee mgbanwe.

NKWANYE ÙGWÙ MAKA NDỤ NA ỌBARA

21. Olee otú nkwanye ùgwù maka ndụ kwesịrị isi metụta echiche anyị banyere isikwopụ afọ ime, nakwa banyere àgwà na omume anyị?

21 Maka ezi obi ụtọ, ọ dị anyị mkpa ile ndụ mmadụ anya dị ka ihe dị nsọ, ọbụna dị ka Jehova na-eme. Okwu ya na-amachibido anyị igbu mmadụ. (Matiu 19:​16-⁠18) N’ezie, Iwu Chineke nyere Israel na-egosi na ọ na-ele nwa e bu n’afọ anya dị ka ndụ dị oké ọnụ ahịa​—⁠ọ bụghị ihe a ga-ebibi ebibi. (Ọpụpụ 21:​22, 23) N’ihi ya, anyị agaghị emeso ndụ ma ọlị dị ka ihe dị ọnụ ala site n’iji ụtaba eme ihe, iji ọgwụ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-emetọ ahụ anyị, ma ọ bụ na-eme ihe ndị dị ize ndụ na-enweghị isi. Anyị agaghịkwa etinye aka ná nchụso ndị na-eyi ndụ egwu, anyị ekwesịghịkwa ileghara ime ihe nchebe dị iche iche anya, bụ́ nke pụrụ iduba n’ikpe ọmụma ọbara.​—⁠Deuterọnọmi 22:8.

22. (a) Gịnị bụ echiche Chineke banyere ọbara na iji ya eme ihe? (b) Nanị ọbara ònye na-azọpụta ndụ n’ezie?

22 Jehova gwara Noa na ezinụlọ ya na ọbara nọchitere anya mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ. Ya mere, Chineke machibidoro ha iri ọbara ọ bụla. (Jenesis 9:​3, 4) Ebe anyị bụ ụmụ ha, iwu ahụ dịkwasịrị anyị nile. Jehova gwara ndị Israel na a ga-awụsị ọbara n’ala, a gaghị ejikwa ya mee ihe maka nzube dị iche iche nke mmadụ. (Deuterọnọmi 12:​15, 16) E kwughachikwara iwu Chineke banyere ọbara mgbe ndị Kraịst narị afọ mbụ nyere ntụziaka, sị: “Hapụ . . . ọbara.” (Ọrụ 15:​28, 29) N’ihi nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke ndụ, ndị na-asọpụrụ Chineke adịghị anakwere mmịnye ọbara, ọbụna ma ọ bụrụ na ndị ọzọ esie ọnwụ na usoro ime ihe dị otú ahụ ga-azọpụta ndụ. Ọtụtụ nhọrọ ndị ọzọ nke nlekọta ọgwụ na ahụ ike bụ́ ndị Ndịàmà Jehova na-anakwere anwapụtawo na ha dị irè nke ukwuu, ha adịghịkwa ekpughepụ mmadụ nye ihe ize ndụ dị iche iche nke mmịnye ọbara. Ndị Kraịst maara na nanị ọbara Jisọs a wụsịrị na-azọpụta ndụ n’ezie. Okwukwe na ya na-eweta mgbaghara na atụmanya nke ndụ agwụghị agwụ.​—⁠Ndị Efesọs 1:7.

23. Olee ụgwọ ọrụ ụfọdụ nke ụzọ ịdị ndụ nke nsọpụrụ Chineke?

23 N’ụzọ doro anya, ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke na-achọ mgbalị. Ọ pụrụ ịrụpụta ịkwa emo site n’ọnụ ndị òtù ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi. (Matiu 10:32-⁠39; 1 Pita 4:4) Ma ụgwọ ọrụ ndị dị n’ịdị ndụ dị otú ahụ karịrị ule ọ bụla nke ukwuu. Ọ na-arụpụta akọ na uche dị ọcha ma na-eme ka e soro ndị ọzọ na-efe Jehova nwee mkpakọrịta na-ewuli elu. (Matiu 19:​27, 29) Mgbe ahụkwa, cheedị banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. (Aịsaịa 65:​17, 18) Leekwa aha ọṅụ dị n’ime ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Bible wee si otú ahụ na-eme ka obi Jehova ṅụrịa! (Ilu 27:11) Ka a sịkwa ihe mere ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke ji eweta obi ụtọ!​—⁠Abụ Ọma 128:​1, 2.

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Olee ihe ụfọdụ mere ibi ndụ nsọpụrụ Chineke ji eweta obi ụtọ?

Ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke pụrụ ịchọ mgbanwe dịgasị aṅaa?

N’ihi gịnị ka i ji chọọ ịdị ndụ nsọpụrụ Chineke?

[Foto dị na peeji nke 124, 125]

Ọrụ ime mmụọ ndị a haziri ha na oge ntụsara ahụ na-etinye ihe n’obi ụtọ nke ndị na-adị ndụ nsọpụrụ Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya