Ọ̀ Dị Gị Mkpa N’ezie Ịrịọ Mgbaghara?
‘ADỊGHỊ m arịọ mgbaghara,’ ka George Bernard Shaw dere. ‘Ihe mere emewo,’ ka ndị ọzọ pụrụ ikwu.
Ikekwe anyị onwe anyị na-ala azụ ikwere mmejọ iji ghara ịbụ onye e mechuru ihu. Ma eleghị anya anyị na-eme ngọpụ na nsogbu ahụ dị n’ebe onye nke ọzọ nọ. Ma ọ bụ anyị pụrụ izube ịrịọ mgbaghara ma na-eyigharị ya ruo mgbe anyị chere na e legharawo okwu ahụ anya.
Mgbe ahụ, ịrịọ mgbaghara ọ̀ dị mkpa? Ọ̀ dị ihe ha pụrụ ịrụzu n’ezie?
Ịhụnanya Na-amanye Anyị Ịrịọ Mgbaghara
Ịhụnanya ụmụnna bụ akara e ji amata ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. O kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Akwụkwọ Nsọ na-agba ndị Kraịst ume ‘isite n’obi hụrịta onwe ha n’anya sie ike.’ (1 Pita 1:22) Ịhụnanya siri ike na-amanye anyị ịrịọ mgbaghara. N’ihi gịnị? N’ihi na ezughị okè mmadụ na-akpata iwe n’ụzọ a na-apụghị izere ezere nke na-egbochi ịhụnanya ma ọ bụrụ na e dozighị ha.
Dị ka ihe atụ, n’ihi nghọtahie anyị na otu onye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst nwere, anyị pụrụ ịhọrọ ịghara ikwusara ya okwu. Ọ bụrụ na anyị akpatawo iwe, olee otú anyị pụrụ isi weghachite mmekọrịta ịhụnanya? N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ, site n’ịrịọ mgbaghara ma na-emezi mgbalị ikwurịta okwu n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Anyị ji ndị kwere ekwe ibe anyị ụgwọ ịhụnanya, mgbe anyị kwukwara na o wutere anyị ịkpata iwe, anyị na-akwụ ụfọdụ ụgwọ ahụ.—Ndị Rom 13:8.
Iji maa atụ: Mari Carmen na Paqui bụ ndị inyom abụọ bụ́ ndị Kraịst nweworo ọbụbụenyi teworo aka. Otú ọ dị, n’ihi na Mari Carmen kwenyere n’otu asịrị na-emerụ ahụ, ọbụbụenyi ya na Paqui nyụrụ ọkụ. N’enyeghị nkọwa, ọ kwụsịrị ikwusara Paqui okwu kpam kpam. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ n’ihu, Mari Carmen chọpụtara na asịrị ahụ bụ ụgha. Gịnị bụ mmeghachi omume ya? Ịhụnanya kpaliri ya ịgakwuru Paqui ma jiri obi umeala kwupụta mwute ya dị ukwuu maka ịkpa àgwà ọjọọ otú ahụ. Ha abụọ bere ákwá nke ukwuu, ha abụwokwa ndị enyi siri ike kemgbe ahụ.
Ọ bụ ezie na o nwere ike anyị agaghị eche na anyị emewo ihe ọjọọ ọ bụla, ịrịọ mgbaghara pụrụ idozi nghọtahie. Manuel na-echeta: “Ọtụtụ afọ gara aga mụ na nwunye m nọrọ n’ụlọ otu n’ime ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị mgbe e nyere ya àkwà n’ụlọ ọgwụ. Anyị mere ihe nile anyị nwere ike iji nyere ya na ụmụ ya aka n’oge nrịanrịa ya. Ma mgbe ọ lọghachiri ụlọ, o kpesaara otu enyi ya na anyị elekọtaghị ego ezinụlọ ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
“Anyị jere leta ya ma kọwaa na ikekwe n’ihi ịbụ ndị ntorobịa na enweghị ahụmahụ, anyị elekọtaghị ihe otú ọ gaara eme. Ọ zaghachiri ozugbo site n’ịsị na ọ bụ ya ji anyị ụgwọ nakwa na o nwere obi ekele n’ezie maka ihe nile anyị mewooro ya. E doziri nsogbu ahụ. Ahụmahụ ahụ kụziiri m mkpa nke iji obi umeala arịọ mgbaghara mgbe nghọtahie bilitere.”
Jehova gọziri di na nwunye a maka igosi ịhụnanya na ‘ịgbaso ihe nile dịịrị udo.’ (Ndị Rom 14:19) Ịhụnanya gụnyekwara ịmata mmetụta nke ndị ọzọ. Pita na-adụ anyị ọdụ ‘iwere obi sorịta onwe anyị hụkọọ ahụhụ.’ (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na anyị na-esorịta onwe anyị na-ahụkọ ahụhụ, o yikarịrị ka anyị ga-amata ihe mgbu anyị kpataworo site n’okwu ma ọ bụ n’omume a na-echeghị eche, a ga-akpalikwa anyị ịrịọ mgbaghara.
“Were Obi Dị Umeala Kee Onwe Unu Dị Ka Ákwà”
Ọbụna ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị okenye pụrụ mgbe ụfọdụ inwe nrụrịta ụka kpụ ọkụ n’ọnụ. (Tụlee Ọrụ 15:37-39.) Ndị a bụ oge ịrịọ mgbaghara ga-aba uru nke ukwuu. Ma gịnị ga-enyere onye okenye ma ọ bụ onye Kraịst ọzọ ọ na-esiri ike ịrịọ mgbaghara aka?
Ịdị umeala n’obi bụ isi ihe dị na ya. Pita onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Unu nile were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịta ibe unu ozi.” (1 Pita 5:5) Ọ bụ ezie na ọ bụ eziokwu na n’ihe ka n’ọtụtụ arụmụka, a ga-ata mmadụ abụọ ahụ ụta, onye Kraịst ahụ dị umeala n’obi na-enwe nchegbu banyere mmejọ nke onwe ya ma dị njikere ịnakwere ha.—Ilu 6:1-5.
Onye ahụ a na-arịọ mgbaghara kwesịrị ịnakwere ya n’ụzọ obi umeala. Iji maa atụ, ka anyị were ya na mmadụ abụọ ọ dị mkpa ikwurịta okwu na-eguzo n’elu ugwu abụọ dị iche iche. Inwe mkparịta ụka gafere oghere ahụ kewara ha ghọrọ ihe na-agaghị ekwe omume. Otú ọ dị, mgbe otu n’ime ha gbaturu na ndagwurugwu dị n’ala, onye nke ọzọ agbasokwa ihe o mere, ọ pụrụ ịdịrị ha mfe ikwurịta okwu. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ọ dị ndị Kraịst abụọ mkpa idozi nghọtahie dị n’etiti ha, ka nke ọ bụla jiri obi umeala zute nke ọzọ na ndagwurugwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ma rịọ mgbaghara ndị kwesịrị ekwesị.—1 Pita 5:6.
Ịrịọ Mgbaghara Dị Oké Mkpa n’Alụmdi na Nwunye
Alụmdi na nwunye nke mmadụ abụọ na-ezughị okè na-enye ohere nke ịrịọ mgbaghara n’ụzọ a na-apụghị izere ezere. Ọ bụrụkwa na di na nwunye na-esorịta ibe ha ahụ ahụhụ, ọ ga-akpali ha ịrịọ mgbaghara ma ọ bụrụ na ha ekwuo okwu ma ọ bụ mee omume n’echebaraghị onye nke ọzọ echiche. Ilu 12:18 rụtụrụ aka, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha: ma ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” A pụghị iwepụ ‘ndụpu a na-echeghị eche,’ kama mgbaghara a rịọrọ site n’ezi obi pụrụ ịgwọ ha. Otú ọ dị, nke a chọrọ ịnọgide na-amara ihe na-aganụ ma na-etinye mgbalị.
N’ikwu banyere alụmdi na nwunye ya, Susana na-ekwu, sị: “Mụ na Jack* alụworị kemgbe afọ 24, ma anyị ka na-amụta ihe ndị ọhụrụ banyere onwe anyị. N’ụzọ dị mwute, n’otu oge gara aga, anyị kewara ma biri iche ruo izu ole na ole. Otú ọ dị, anyị gere ntị ná ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ sitere n’aka ndị okenye ma bịa bikọtakwa ọnụ ọzọ. Anyị na-aghọta ugbu a na ebe ọ bụ na anyị nwere ọdịdị dị iche iche, esemokwu yiri ka ọ ga-adapụta. Mgbe nke a mere, anyị na-arịọ mgbaghara ngwa ngwa ma gbalịsie ike n’ezie ịghọta echiche onye nke ọzọ. Obi dị m ụtọ ikwu na alụmdi na nwunye anyị adịwanyewo mma nke ukwuu.” Jack gbakwụnyere, sị: “Anyị amụtawokwa ịmara oge ndị ahụ mgbe anyị pụrụ iwe iwe. N’oge ndị ahụ anyị na-eji mmetụta ka ukwuu na-emeso ibe anyị.”—Ilu 16:23.
Ì kwesịrị ịrịọ mgbaghara ma ọ bụrụ na i chere na ọ bụghị gị ka o si n’aka? Mgbe ọ gụnyere mmetụta miri emi, o siri ike ikwu n’eziokwu onye a ga-ata ụta. Ma ihe dị mkpa bụ udo n’alụmdi na nwunye. Tụlee banyere Abigail, bụ́ nwanyị Israel nke di ya mesoro Devid omume ọjọọ. Ọ bụ ezie na a pụghị ịta ya ụta maka nzuzu di ya, ọ rịọrọ mgbaghara. “Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị,” ka ọ rịọrọ. Devid zaghachiri site n’imeso ya ihe n’ụzọ nchebara echiche, jiri obi umeala nakwere na a sị na ọ bụghị ya, ọ gaara awụfu ọbara ndị aka ha dị ọcha.—1 Samuel 25:24-28, 32-35.
N’otu aka ahụ, otu nwanyị onye Kraịst aha ya bụ June, onye lụworo di ruo afọ 45, na-eche na alụmdi na nwunye na-aga nke ọma chọrọ ịdị njikere ịbụ onye mbụ ga-arịọ mgbaghara. Ọ na-asị: “M na-agwa onwe m na alụmdi na nwunye anyị dị mkpa karịa mmetụta m dị ka otu onye. Ya mere mgbe m rịọrọ mgbaghara, ọ na-adị m ka m na-atụnye ụtụ n’alụmdi na nwunye a.” Otu agadi nwoke aha ya bụ Jim na-ekwu, sị: “M na-arịọ nwunye m mgbaghara ọbụna n’ihe ndị dị nta. Kemgbe a wara ya ahụ dị ukwuu, ọ na-enwe nkụda mmụọ ngwa ngwa. Ya mere m na-ekonyekarị ya aka ma sị, ‘Ewela iwe, Nke m. Ọ bụghị obi m ịkpasu gị iwe.’ Dị ka ihe ọkụkụ a kwọsara mmiri, ọ na-enwe ihu ọchị ozugbo.”
Ọ bụrụ na anyị akpasuwo onye anyị hụkarịsịrị n’anya iwe, ịrịọ mgbaghara ngwa ngwa dị irè nke ukwuu. Milagros kwetara nnọọ, na-asị: “Adịghị m enwe obi ike onwe onye, okwu di m ji olu ike kwuo na-akpasukwa m iwe. Ma mgbe ọ rịọrọ mgbaghara, ahụ na-adajụ m ozugbo.” N’ụzọ dabara nke ọma, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ, nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.”—Ilu 16:24.
Nwee Omume Ịrịọ Mgbaghara
Ọ bụrụ na anyị mee ya omume anyị ịrịọ mgbaghara mgbe ọ dịrị mkpa, o yiri ka anyị ga-achọpụta na ndị mmadụ ga-azaghachi nke ọma. Ikekwe ha ga-arịọkwa mgbaghara ọbụna n’onwe ha. Mgbe ọ dị anyị ka anyị akpasuwo mmadụ iwe, gịnị ma anyị mee ya àgwà anyị ịrịọ mgbaghara kama ịgbalị izere ịnakwere mmejọ ọ bụla? Ụwa pụrụ iche na ịrịọ mgbaghara bụ akara nke adịghị ike, ma ọ na-enye n’ezie ihe àmà nke ntozu okè onye Kraịst. N’ezie, anyị agaghị achọ ịdị ka ndị na-anakwere ụfọdụ njehie ma melata ibu ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dị mgbe anyị na-asị ndo na-esighị anyị n’obi? Ọ bụrụ na anyị abịarute n’azụ oge ma rịọ nnọọ mgbaghara, ànyị na-ekpebisi ike imeziwanye ịbịa n’oge anyị?
Ya mere, mgbe ahụ, ọ̀ dị anyị mkpa n’ezie ịrịọ mgbaghara? Ee, ọ dị anyị mkpa. Anyị ji ya onwe anyị na ndị ọzọ dị ka ụgwọ ime otú ahụ. Ịrịọ mgbaghara pụrụ inye aka imelata ihe mgbu nke ezughị okè kpatara, ọ pụkwara idozi mmekọrịta e mebiri emebi. Mgbaghara ọ bụla anyị rịọrọ bụ ihe mmụta n’ịdị umeala n’obi ma na-azụ anyị ịmara mmetụta nke ndị ọzọ. N’ihi ya, ndị kwere ekwe ibe anyị, di ma ọ bụ nwunye, na ndị ọzọ ga-ele anyị anya dị ka ndị kwesịrị ịnata ịhụnanya na ntụkwasị obi ha. Anyị ga-enwe udo nke uche, Jehova Chineke ga-agọzikwa anyị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ezi aha ha.
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Mgbaghara ndị a rịọrọ n’ezi obi na-akwalite ịhụnanya ndị Kraịst