Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị “Kwa Ụbọchị”
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-achọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị ma nọgide na-eso m.”—LUK 9:23, NW.
1. Gịnị bụ otu ụzọ anyị pụrụ isi tụọ ihe ịga ọma anyị dị ka ndị Kraịst n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀?
“ÀNYỊ bụ ndị raara onwe anyị nye n’ezie?” Dị ka John F. Kennedy, bụ́ President nke 35 nke United States kwuru, azịza ajụjụ nke a bụ ihe a na-eji atụ ihe ịga nke ọma nke ndị na-arụ ọrụ gọọmenti n’ọ̀tụ̀tụ̀. Ajụjụ ahụ pụrụ ije ozi dị oké mkpa dị ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ maka ihe ịga nke ọma anyị dị ka ndị ozi ndị Kraịst.
2. Olee otú otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kọwaa okwu ahụ bụ́ “nraranye”?
2 Otú ọ dị, gịnị bụ nraranye? Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary kọwara ya dị ka “omume ma ọ bụ ememe okpukpe nke ịrara ihe nye chi ma ọ bụ maka iji mee ihe dị nsọ,” “ịrara nye ma ọ bụ isetịpụ iche maka otu nzube kpọmkwem,” “nraranye nke iji onwe onye achụ àjà.” O yiri ka John F. Kennedy na-eji okwu ahụ eme ihe ịpụta “nraranye nke iji onwe onye achụ àjà.” Nye onye Kraịst, nraranye pụtara ihe karịrị nke ahụ.
3. Gịnị bụ nraranye ndị Kraịst?
3 Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o so m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ ya, NW], na-esokwa m.” (Matiu 16:24) Ịbụ onye e setịpụrụ iche maka Chineke iji ya mee ihe agụnyeghị nanị ime omume nke ofufe na Sunday ma ọ bụ mgbe a na-eje eleta ebe ụfọdụ a na-anọ efe ofufe. Ọ gụnyere ụzọ ndụ nile nke mmadụ. Ịbụ onye Kraịst pụtara ịjụ onwe onye ma ọ bụ ịgọnarị onwe onye mgbe a na-ejere Chineke ahụ Jisọs Kraịst jeere ozi, bụ́ Jehova, ozi. Tinyere nke ahụ, onye Kraịst na-ebuli “osisi ịta ahụhụ” ya site n’ịtachi obi n’okpuru ahụhụ ọ bụla nke a pụrụ inweta n’ihi ịbụ onye na-eso Kraịst.
Ihe Nlereanya Zuru Okè
4. Gịnị ka baptism Jisọs mere ihe atụ ya?
4 Mgbe ọ nọ n’elu ụwa, Jisọs gosipụtara ihe ịrara onwe onye nye Jehova gụnyere. Echiche ya bụ: “Àjà na ihe e chere n’ihu Gị, Ị chọghị ha, ma ahụ ka Ị kwadebere nye m.” Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, sị: “Lee, abịawo m (n’akwụkwọ mpịakọta ka e deworo ihe banyere m) ime ihe Ị na-achọ, Chineke.” (Ndị Hibru 10:5-7) Dị ka onye òtù nke mba a raara nye, a raara ya nye Jehova n’ọmụmụ. Ma, ná mmalite nke ozi elu ala ya, o nyefere onwe ya maka baptism dị ka ihe atụ nke iwepụta onwe ya ime uche Jehova, nke nye ya, ga-agụnye inye ndụ ya dị ka àjà mgbapụta. O si otú a setịpụ ihe nlereanya maka ndị Kraịst ime ihe ọ bụla nke bụ uche Jehova.
5. Olee otú Jisọs si gosipụta ihe nlereanya n’ụzọ a ga-esi na-ele ihe onwunwe anya?
5 Mgbe baptism ya gasịrị, Jisọs gbasoro ụzọ ndụ nke mesịrị duje n’ọnwụ ịchụ àjà. O nweghị mmasị n’ịkpa ego ma ọ bụ n’ibi ndụ ntụsara ahụ. Kama nke ahụ, ndụ ya gbara gburugburu ozi ya. Ọ dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha ‘buru ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya,’ ya onwe ya bikwara ndụ kwekọrọ n’okwu ndị a. (Matiu 6:33) Leenụ, ọbụna n’otu mgbe o kwuru, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ha na-edina, anụ ufe nke eluigwe nwekwara ebe ha na-arahụ ụra; ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ịtọgbọ isi Ya.” (Matiu 8:20) Ọ pụrụ imeworịị ka ozizi ya dị n’ụdị ọ ga-eji hịọnara ndị na-eso ya ego. Ebe ọ bụ onye ọkwa nkà ọ pụrụ ịhapụtụ ozi ya ma were oge ahụ rụọ ihe mara mma ọ ga-ere ka o wee nweta mkpụrụ ego ọlaọcha ole na ole. Ma o jighị nkà ndị o nwere chọọ ụba ihe onwunwe. Dị ka ndị ohu Chineke raara onwe ha nye, ànyị na-eṅomi Jisọs n’ile ihe onwunwe anya n’ụzọ ziri ezi?—Matiu 6:24-34.
6. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jisọs n’ịbụ ndị ohu Chineke na-eji onwe ha achụ àjà, ndị raara onwe ha nye?
6 N’itinye ozi ọ na-ejere Chineke n’ọnọdụ mbụ, Jisọs achọghị ọdịmma nke onwe ya nanị. Ndụ ya n’afọ atọ na ọkara nke ozi ihu ọha ya bụ nke iji onwe onye achụ àjà. N’otu oge mgbe ọ rụsịrị ọrụ ụbọchị, n’ewereghị ọbụna oge iji rie nri, Jisọs dị njikere izi ndị mmadụ ihe bụ́ ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’ (Matiu 9:36; Mak 6:31-34) Ọ bụ ezie na “ike gwụrụ Ya n’ije Ya,” o butere ụzọ n’ịgwa nwanyị Sameria bụ́ onye bịara n’isi iyi Jekọb na Saịka okwu. (Jọn 4:6, 7, 13-15) Ọ na-etinye ọdịmma nke ndị ọzọ n’ihu tupu nke ya onwe ya mgbe nile. (Jọn 11:5-15) Anyị pụrụ iṅomi Jisọs site n’iji mmesapụ aka chụọ ọdịmma ndị nke onwe anyị n’àjà iji jeere Chineke na ndị ọzọ ozi. (Jọn 6:38) Site n’iche banyere otú anyị pụrụ isi n’ezie mee ihe na-atọ Chineke ụtọ kama ime nanị ihe dịkarịsịrị nta a chọrọ, anyị ga na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị.
7. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jisos n’inye Jehova nsọpụrụ mgbe nile?
7 Jisọs adịghị agbalị n’ụzọ ọ bụla ịdọta uche ndị mmadụ n’ebe onwe ya nọ site n’inyere ndị mmadụ aka. Ọ raara onwe ya nye Chineke ime uche Ya. Ya mere ọ na-ejide n’aka mgbe nile na Jehova, bụ́ Nna ya, naara otuto nile maka ihe ọ bụla a rụzuru. Mgbe otu onye ọchịchị kpọrọ ya “Ezi Onye ozizi,” na-eji okwu ahụ bụ́ “ezi” eme ihe dị ka utu aha, Jisọs gbaziri ya olu site n’ịsị: “Ọ dịghị onye ọ bụla bụ ezi onye, ma ọ bụghị otu Onye, bụ́ Chineke.” (Luk 18:18, 19; Jọn 5:19, 30) Dị ka Jisọs, ànyị na-adị ngwa iwepụ nsọpụrụ n’ebe anyị onwe anyị nọ gaa na Jehova?
8. (a) Dị ka nwoke raara onwe ya nye, olee otú Jisọs si setịpụ onwe ya iche site n’ụwa? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi ṅomie ya?
8 N’ụzọ ndụ a raara nye nke elu ala ya nile, Jisọs gosipụtara na ya esetịpụwo onwe ya iche maka ije ozi Chineke. O debere onwe ya ọcha ka o wee nwee ike inye onwe ya dị ka “nwa atụrụ nke ọrụ ma ọ bụ ntụpọ na-adịghị ya n’ahụ” ịbụ àjà mgbapụta ahụ. (1 Pita 1:19; Ndị Hibru 7:26) O debere ụkpụrụ nile nke Iwu Mosis, si otú ahụ na-emezu Iwu ahụ. (Matiu 5:17; 2 Ndị Kọrint 1:20) O biri ndụ kwekọrọ n’ozizi nke ya onwe ya banyere omume. (Matiu 5:27, 28) Ọ dịghị onye pụrụ izi ezi n’ibo ya ebubo inwe ebumnobi ọjọọ. N’ezie, ọ ‘kpọrọ mmebi iwu asị.’ (Ndị Hibru 1:9) Dị ka ndị ohu Chineke, ka anyị ṅomie Jisọs n’idebe ndụ anyị na ọbụna ebumnobi anyị ọcha n’anya Jehova.
Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị Dị Iche Iche
9. Ihe atụ ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl zoro aka na ya, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ịtụle ihe atụ nke a?
9 N’ụzọ megidere ihe atụ Jisọs, anyị nwere ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke ụmụ Israel. Ọbụna mgbe ha kwupụtasịrị na ha ga-eme ihe nile Jehova gwara ha mee, ha emeghị uche ya. (Daniel 9:11) Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume ka ha mụta ihe site n’ihe dakwasịrị ụmụ Israel. Ka anyị nyochaa ụfọdụ ihe Pọl zoro aka na ha n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint wee hụ ọnyà ndị ọ ga-adị mkpa ka ndị ohu raara onwe ha nye nke Chineke n’oge anyị zere.—1 Ndị Kọrint 10:1-6, 11.
10. (a) Olee otú ụmụ Israel si ‘bụrụ ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ’? (b) N’ihi gịnị ka ụmụ Israel ji bụrụ ndị ụta dịịrị karị n’oge nke abụọ ha tamuru banyere nri, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị ha?
10 Na mbụ, Pọl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịbụ “ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ.” (1 Ndị Kọrint 10:6) Nke ahụ pụrụ ichetara gị oge ụmụ Israel mere mkpesa banyere inwe nanị manna dị ka ihe oriri. Jehova ziteere ha nnụnụ quail. Ihe yiri nke ahụ emeworị ihe dị ka otu afọ tupu mgbe ahụ n’ọzara Sin, kpọmkwem tupu ụmụ Israel ekwupụta nrara ha raara onwe ha nye Jehova. (Ọpụpụ 16:1-3, 12, 13) Ma ọnọdụ ha abụchaghị otu ihe ahụ. Mgbe Jehova nyere nnụnụ quail na nke mbụ ya, ọ taghị ụmụ Israel ụta maka ntamu ha. Ma, na nke ugbu a, ọnọdụ ya dị iche. “Anụ ahụ na-adị n’etiti eze ha ugbu a, tupu a tabie ya, iwe Jehova wee dị ọkụ megide ndị Israel, Jehova wee were ihe otiti hiri nne nke ukwuu tie ndị Israel.” (Ọnụ Ọgụgụ 11:4-6, 31-34) Gịnị gbanweworo? Dị ka mba a raara nye, a tara ha ụta ugbu a, ha apụghịkwa ịgbanahụ ntaramahụhụ. Enweghị ekele ha maka onyinye Jehova dujere ha n’ime mkpesa megide Jehova, n’agbanyeghị nkwa ha kweworo ime ihe nile Jehova kwuworo! Ime mkpesa banyere table Jehova taa yiri nke ahụ. Ụfọdụ adịghị enwe ekele maka nri ime mmụọ Jehova site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Otú ọ dị, cheta na nraranye anyị chọrọ anyị n’aka iji obi ekele buru n’uche ihe Jehova mewooro anyị ma nara nri ime mmụọ nke Jehova na-enye.
11. (a) Olee otú ụmụ Israel si jiri ikpere arụsị metọọ ofufe ha na-efe Jehova? (b) Olee otú otu ụdị ikpere arụsị pụrụ isi metụta anyị?
11 Ọzọ, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu aghọkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha ghọrọ.” (1 Ndị Kọrint 10:7) N’ebe a ihe àmà na-egosi na onyeozi ahụ na-ezo aka n’ofufe nwa ehi nke weere ọnọdụ kpọmkwem mgbe ụmụ Israel basịrị n’ọgbụgba ndụ ha na Jehova n’Ugwu Saịnaị. Ị pụrụ ịsị, ‘Dị ka ohu Jehova raara onwe ya nye, agaghị m etinye onwe m n’ikpere arụsị ma ọlị.’ Otú ọ dị, rịba ama na n’echiche ụmụ Israel, ha akwụsịghị ife Jehova; ma, ha webatara omume nke ofufe nwa ehi—ihe Chineke kpọrọ asị. Gịnị ka ụdị ofufe nke a gụnyere? Ndị Israel ahụ chụrụ àjà n’ihu nwa ehi ahụ, ha wee “nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwú.” (Ọpụpụ 32:4-6) Taa, ụfọdụ pụrụ ịzọrọ na ha na-efe Jehova. Ma ndụ ha pụrụ ihiwe isi, ọ bụghị n’ofufe Jehova, kama n’ịnụ ụtọ nke ihe nke ụwa, ha na-agbalịkwa itinye ozi ha na-ejere Jehova gburugburu ihe ndị a. N’eziokwu, nke a agafeghị ókè dị ka ịkpọ isiala nye nwa ehi ọlaedo, ma ọ dịchaghị iche n’ụkpụrụ. Mmadụ ime ọchịchọ onwe onye chi dị iche nke ukwuu n’ebe ibi ndụ kwekọrọ ná nrara onwe onye nye Jehova dị.—Ndị Filipaị 3:19.
12. Site n’ahụmahụ nke ụmụ Israel n’ebe Beal nke Peoa dị, gịnị ka anyị na-amụta banyere ịjụ onwe anyị?
12 Otu ụdị nke ntụrụndụ dịkwa n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị ọzọ nke Pọl kpọtụrụ aha. “Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [puku iri abụọ na atọ].” (1 Ndị Kọrint 10:8) N’ịbụ ndị ihe ụtọ rụrụ arụ nke ụmụ ndị inyom Moab nyere dọọrọ, e dubara ụmụ Israel n’ofufe Beal nke Peoa na Shitim. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-3, 9) Ịjụ onwe anyị iji mee uche Jehova gụnyere ịnabata ụkpụrụ ya maka ihe dị ọcha n’omume. (Matiu 5:27-30) N’ọgbọ a nke ụkpụrụ ndị na-eretọ eretọ, a na-echetara anyị mkpa ọ dị idebe onwe anyị ọcha pụọ n’ụdị nile nke omume rụrụ arụ, na-anọ n’okpuru ikike Jehova nwere ikpebi ihe ọma na ihe ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
13. Olee otú ihe atụ Fineas si enyere anyị aka ịghọta ihe ịrara onwe onye nye Jehova gụnyere?
13 Ọ bụ ezie na ọtụtụ dabara n’ọnyà nke ịkwa iko na Shitim, ụfọdụ biri ndụ kwekọrọ ná nrara nke a raara mba ahụ nye Jehova. Banyere ha, Fineas pụrụ iche n’ịnụ ọkụ n’obi. Mgbe o ji anya gwuru otu onye isi Israel na-akpọbata onye Midian n’ụlọ ntu ya, Fineas n’egbughị oge weere ube n’aka ya ma mapuo ha ahụ. Jehova gwara Mosis, sị: “Fineas . . . emewo ka ọnụma m si n’ahụ ụmụ Israel laghachi, n’iwere ekworo m kwoo ekworo n’etiti ha, M wee ghara ime ka ụmụ Israel gwụsịa n’ekworo m.” (Ọnụ Ọgụgụ 25:11) Iwere ekworo kwoo ekworo n’ebe Jehova nọ—nke ahụ bụ ihe nraranye pụtara. Anyị apụghị inye ihe ọ bụla ohere iwere ọnọdụ nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova kwesịrị iwere n’obi anyị. Ịnụ ọkụ n’obi anyị maka Jehova na-akpalikwa anyị idebe ọgbakọ ọcha site n’ịkọrọ ndị okenye omume rụrụ arụ dị oké njọ, n’anabataghị ya.
14. (a) Olee otú ụmụ Israel si tinye Jehova n’ule? (b) Olee otú ịrara onwe onye nye Jehova n’ụzọ zuru ezu na-esi enyere anyị aka ịghara ịbụ ndị ‘ike gwụrụ’?
14 Pọl zoro aka n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị ọzọ: “Ka anyị gharakwa ịnwa Onyenwe anyị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha nwara, agwọ wee laa ha n’iyi.” (1 Ndị Kọrint 10:9) N’ebe a Pọl na-ekwu banyere oge ụmụ Israel mere mkpesa megide Chineke nye Mosis mgbe ha ‘na-enweghị ntachi obi n’ụzọ ahụ.’ (Ọnụ Ọgụgụ 21:4) Ị̀ na-eme ụdị njehie ahụ? Mgbe ị raara onwe gị nye Jehova, ì chere na Amagedọn dị nnọọ ezi nso? Ndidi Jehova ọ̀ dịwo ogologo oge karịa ka ị tụrụ anya ya? Cheta, anyị araraghị onwe anyị nye Jehova nanị maka oge ụfọdụ ma ọ bụ nanị ruo Amagedọn. Nraranye anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, mgbe ahụ, ka “ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—Ndị Galetia 6:9.
15. (a) Megide olè ndị ka ụmụ Israel tamuru? (b) Olee otú nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova si akpali anyị ịkwanyere ịchịisi ọchịchị Chineke ùgwù?
15 N’ikpeazụ, Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ịbụ ‘ndị ntamu’ megide ndị ohu Jehova a họpụtara ahọpụta. (1 Ndị Kọrint 10:10) Ụmụ Israel tamuru n’ụzọ siri ike megide Mosis na Erọn mgbe 10 n’ime ndị nledo obodo 12 e zipụrụ inyocha ala Kenean weghachiri akụkọ ọjọọ. Ha kwuru ọbụna banyere idochi Mosis dị ka onye isi ha ma laghachi Ijipt. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4) Taa, ànyị na-anakwere idu ndú nke a na-enye anyị site n’ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ Jehova? Site n’ịhụ table ụba ihe ime mmụọ nke òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche na-enye, o doro anya onye Jisọs ji enye ‘nri n’oge ya.’ (Matiu 24:45) Nrara nye Jehova e ji obi nile mee chọrọ n’aka anyị ịkwanyere ndị ohu ya a họpụtara ahọpụta ùgwù. Ka anyị ghara ịdị ma ọlị ka ndị ntamu oge ugbu a ndị chigharịkwuwooro onye isi ọhụrụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, idubaghachi ha n’ime ụwa.
Ọ̀ Bụ Ihe Nile M Nwere Ike Ime?
16. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị ohu raara onwe ha nye nke Chineke ga-achọ ịjụ onwe ha?
16 Ụmụ Israel agaraghị adaba ná njehie ahụ dị oké njọ a sị na ha chetara na nrara ha raara onwe ha nye Jehova abụghị nke a kpaara ókè. N’adịghị ka ndị Israel ahụ na-enweghị okwukwe, Jisọs Kraịst biri ndụ kwekọrọ ná nraranye ya ruo ọgwụgwụ. Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị na-eṅomi ihe atụ ya nke ofufe sitere n’obi dum, ghara ịdị na-ebi ndụ anyị “ime ihe ọjọọ dị iche iche na-agụ mmadụ, kama ime ihe Chineke na-achọ.” (1 Pita 4:2; tụlee 2 Ndị Kọrint 5:15.) Ihe Jehova na-achọ taa bụ ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Iji mee nke ahụ, anyị ga-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze” tupu ọgwụgwụ abịa. (Matiu 24:14) Mgbalị hà aṅaa ka anyị na-etinye n’ozi a? Anyị pụrụ ịchọ ịjụ onwe anyị, ‘Ọ̀ bụ ihe nile m nwere ike ime?’ (2 Timoti 2:15) Ọnọdụ na-adịrịta iche. Obi na-adị Jehova ụtọ ịbụ onye e jeere ozi “dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị.” (2 Ndị Kọrint 8:12; Luk 21:1-4) Ọ dịghị onye kwesịrị ikpe ịdị omimi na obi eziokwu nke nraranye nke onye ọzọ ikpe. Onye nke ọ bụla kwesịrị n’onwe ya ịtụle ókè nke nrara ọ raara onwe ya nye Jehova. (Ndị Galetia 6:4) Ịhụnanya anyị n’ebe Jehova nọ kwesịrị ịkpali anyị ịjụ, ‘Olee otú m pụrụ isi mee Jehova obi ụtọ?’
17. Olee ihe jikọrọ nraranye na nghọta? Mee ihe atụ ya.
17 Ofufe anyị na-efe Jehova na-adịwanye omimi ka anyị na-eto ná nghọta anyị na-aghọta ya. Otu nwa okoro gbara afọ 14 na Japan raara onwe ya nye Jehova ma gosipụta nraranye nke a site na baptism ime mmiri. Mgbe oge na-aga, ọ chọrọ ịchụso agụmakwụkwọ dị elu ma ghọọ onye ọkà mmụta sayensị. O chetụdịghị echiche banyere ozi oge nile, ma dị ka onye ohu raara onwe ya nye, ọ chọghị ịhapụ Jehova na nzukọ ya a na-ahụ anya. Iji nweta aka ọrụ ọ na-achụso, ọ gara mahadum. N’ebe ahụ ọ hụrụ ndị gụsịrị akwụkwọ na mahadum ahụ ka a na-amanye ha ịrara ndụ ha nile nye ụlọ ọrụ ha dị iche iche ma ọ bụ ọmụmụ akwụkwọ. O chere, ‘Gịnị ka m na-eme n’ebe a? M̀ pụrụ n’ezie ịchụso ụzọ ndụ ha ma raara onwe m nye ọrụ ego? Ọ̀ bụ na mụ ebughị ụzọ rara onwe m nye Jehova?’ Site ná nghọta e mere ka ọ dighachi ọhụrụ, ọ ghọrọ onye ọsụ ụzọ oge nile. Nghọta o nwere banyere nraranye ya dịwanyere omimi ma kpalie ya ikpebi n’obi ya ịga ebe ọ bụla a chọrọ ya. Ọ gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ma nata ọrụ ịga jee ozi dị ka onye ozi ala ọzọ ná mba ọzọ.
18. (a) Ihe hà aṅaa ka nraranye anyị nye Jehova gụnyere? (b) Ụgwọ ọrụ dị aṅaa ka anyị pụrụ ịghọrọ site ná nraranye anyị nye Jehova?
18 Nraranye gụnyere ndụ anyị nile. Anyị aghaghị ịjụ onwe anyị ma “kwa ụbọchị” na-eso ihe nlereanya ọma Jisọs. (Luk 9:23) Ebe anyị jụworo onwe anyị, anyị adịghị ana Jehova oge ezumike, oge nkwụsịtụ ọrụ. Ndụ anyị na-ekwekọ n’ụkpụrụ ndị Jehova na-esetịpụrụ ndị ohu ya. Ọbụna n’akụkụ ndị anyị pụrụ ime nhọrọ onwe onye, anyị ga-eme nke ọma ile ma anyị na-eme ike anyị nile ibi ndụ nke a raara nye Jehova. Ka anyị na-ejere ya ozi kwa ụbọchị, na-eme ihe nile anyị nwere ike ime iji mee ya obi ụtọ, anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma dị ka ndị Kraịst, a ga-agọzikwa anyị site ná nnwapụta nke Jehova, Onye kwesịrị ịnara nraranye anyị e ji obi dum mee.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị ka nraranye gụnyere maka Jisọs Kraịst?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ịtamu ntamu megide Jehova?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi zere ikwe ka ikpere arụsị jiri ụzọ aghụghọ gbebata ná ndụ anyị?
◻ Icheta gịnị ga-enyere anyị aka ịghara ‘inwe ike ọgwụgwụ’ n’ime uche Chineke?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị Kraịst raara onwe ha nye adịghị enwe ‘ike ọgwụgwụ n’obi ime ihe ọma’