Ikpughe “Onye Ahụ Na-emebi Iwu”
“Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.”—MKPUGHE 18:4.
1, 2. (a) Olee otú a pụrụ isi mata onye ahụ na-emebi iwu? (b) Olee otú Chineke si ele ndị ahụ anya bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-efe ya ma bụrụ ndị ikpe ọbara mara? (Matiu 7:21-23)
OKWU Chineke buru amụma banyere ọbịbịa nke otu ‘onye na-emebi iwu.’ O bukwara n’amụma na onye mmebi iwu nke a ga-abụ onye ‘e gburu ma mee ka ọ ghara ịdị irè’ site n’aka Onye Agha eluigwe nke Chineke, bụ́ Kraịst Jisọs. (2 Ndị Tesalonaịka 2:3-8) Dị ka isiokwu ndị bu ụzọ gosiworo, onye ahụ nke na-emebi iwu bụ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. N’oge dịworo anya gara aga, ha hapụrụ eziokwu nile nke Okwu Chineke ma weghara ozizi nile nke ndị ọgọ mmụọ, dị ka Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, na anwụ-ghị anwụ nke mkpụrụ obi. Tụkwasị na nke a, ha rụrụ ọrụ ndị megidere iwu nile nke Chineke. Dị ka ndị ahụ Pọl dọrọ Taịtọs aka ná ntị banyere ha, “ha na-ekwupụta na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnarị ya, ebe ha bụ ihe arụ, ndị na-adịghị ekwenyekwa, bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ n’ebe ezi ọrụ nile ọ bụla dị.”—Taịtọs 1:16.
2 Jisọs kwuru, sị: “Na-ezenụ ndị amụma ụgha, ndị na-abịakwute unu n’ihe oyiyi atụrụ, ma n’ime ha bụ agụ na-apụnara atụrụ. Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” Ndị amụma ụgha ga-amịpụta “ajọ mkpụrụ.” (Matiu 7:15-17) Otu ihe àmà nke ajọ mkpụrụ ndị ụkọchukwu na-amị bụ oké ikpe ọmụma ọbara mara ha. Ruo ọtụtụ narị afọ ha akwadowo agha ntụte, njụta okwukwe, na agha ndị wụsiworo ọbara nke ọtụtụ nde ndị mmadụ. Ha ekpeworo ma gọzie akụkụ abụọ ndị na-alụ agha bụ́ nke ọ bụ n’ime ha ka ndị òtù nke okpukpe ha nọworo gburịta ibe ha. N’ụzọ dị iche, Pọl onyeozi nwere ike ikwu, sị: “Adị m ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị.” (Orụ 20:26) Ndị ụkọchukwu adịghị. Nye ndị dị otú ahụ Chineke kwupụtara, sị: “Ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, m gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.” —Aịsaịa 1:15.
3. Ihe omume ndị dị aṅaa nke zuru ụwa ọnụ ji ọsọ na-abịaru nso?
3 Ọge mgbe Chineke ga-eme ihe o kpere n’ikpe megide onye mmebi iwu ahụ ji ọsọ na-abịaru nso. N’oge na-adịghị anya, dị ka Jisọs buru n’amụma, “mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Oge nsogbu ahụ nke ihe yiri ya na-akadịghị mgbe ọ bụla ga-amalite site ná mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, nke gụnyere okpukpe nile nke Krisendọm. Ndị ọchịchị “ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” (Mkpughe 17:16) Mkpagbu ukwu ahụ ga-akwụsị ná mbibi nke ihe fọdụrụ n’ụwa Setan n’Amagedọn, bụ́ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Ọnye pụrụ ime ihe nile.” —Mkpughe 16:14, 16; 19:11-21.
Ibu Ọrụ Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya
4. Gịnị ka ndị ahụ na-efe Chineke “n’ime mmụọ na eziokwu” na-aghaghị iburu n’uche?
4 Ebe ọ bụ na ihe omume ndị a ndị ga-eme ka ụwa mee mkpatụ gaje ịbịa n’elu ụwa nke mmadụ bi n’oge na-adịghị anya, ibu ọrụ ndị dị aṅaa ka ndị ahụ nwere bụ́ ndị ‘na-akpọ isiala nye Nna ahụ n’ime mmụọ na eziokwu’? (Jọn 4:23) Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha aghaghị iburu n’uche na Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m; dị ka mụ onwe m debeworo ihe nile Nna m nyere n’iwu, nọgidekwa n’ịhụnanya ya. . . . Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya. Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu eme ihe mụ onwe m na-enye unu n’iwu.”—Jọn 15:10-14; 1 Jọn 5:3.
5, 6. (a) Gịnị ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ime nke ga-eme ka a mata ha? (b) N’echiche dị aṅaa ka nke a ji bụrụ iwu ọhụrụ?
5 Ezi ndị Kraịst si otú a nwee ibu ọrụ ịhụ ndị ọzọ n’anya, karịsịa ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst nọ ná mba nile. (Ọrụ 10:34; Ndị Galetia 6:10; 1 Jọn 4:20, 21) N’ezie, ndị Kraịst aghaghị ime ‘ka ịhụnanya ahụ ha na-ahụrịta onwe ha dị ike.’ (1 Pita 4:8) Udị ịhụnanya ahụ gburugburu ụwa na-aka ha akara dị ka ndị na-efe ezi ofufe, n’ihi na Jisọs sịrị: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:34, 35.
6 Gịnị mere ka iwu ahụ bụrụ nke ọhụrụ? Ọ̀ bụ na e nyeghị ndị Juu nọ n’okpuru Iwu Moses iwu, sị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị”? (Levitikọs 19:18) Ee, ma Jisọs gosipụtara ihe dị ọhụrụ mgbe o kwuru, sị, “Dị ka m hụrụ unu n’anya.” Ịhụnanya ya gụnyere ntọgbọ ọ tọgbọrọ ndụ ya maka ndị ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya aghaghịkwa ịdị njikere ime otu ihe ahụ. (Jọn 15:13) Nke ahụ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke ịhụnanya, ebe ọ bụ na a chọghị ịchụ àjà dị otú ahụ n’Iwu Moses.
7. Olee okpukpe nke rubeworo isi n’iwu ịhụnanya ahụ n’ime narị afọ nke a?
7 N’ime narị afọ anyị, olee okpukpe nke rubeworo isi n’iwu nke a nke ịhụnanya? N’ezie ọ bụghị okpukpe nile nke Krisendọm, n’ihi na ha ejiwo ọtụtụ iri nde gburịta onwe ha n’agha ụwa abụọ nakwa n’esemokwu ndị ọzọ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bụ ndị rubeworo isi n’iwu ịhụnanya ahụ n’ụwa nile. Ha ejigidewo nnọpụiche siri ike n’agha nile nke mba dị iche iche, n’ihi na Jisọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya agaghị abụ “akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16, NW) Ọtú a, ha pụrụ ikwu, dị ka Pọl, na ha dị “ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị.” Dị ka ihe atụ, rịba ama okwu mmalite nke otu nkwupụta okwu ndị ohu Jehova mere ná mgbakọ Washington, D.C, na November 27, 1921:
“Dị ka ndị Kraịst na-agbasi mbọ ike ịgbaso ozizi nile nke Kraịst Jisọs bụ́ Onyenwe anyị na Ndị Ozi ya, anyị na-ekwu: na agha bụ omume mgbe ochie nke amaghị ihe, nke na-ebibi omume ọma ma na-eweta nkọcha nye ndị Kraịst; na ukpụrụ ndị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kuziri na-egbochi ndị Kraịst dị nsọ itinye aka n’agha, ịwụsi ọbara ma ọ bụ ime ïhe ïke n’ụdị ọ bụla.”
8. Gịnị ka ihe ndekọ akụkọ mere eme na-ekwu banyere Ndịàmà Jehova n’oge Agha Ụwa nke Abụọ?
8 Olee otú e si tinye echiche dị otú ahụ n’ọrụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ? N’agha ahụ kasị dị njọ n’akụkọ nile mere eme nke mmadụ, e gburu ihe dị ka 50 nde ndị mmadụ. Ma ọ dịghị otu onye e gburu site n’aka otu n’ime Ndịàmà Jehova! Dị ka ihe atụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị ndú okpukpe nile nke Germany kwadoro ọchịchị Nazi n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị ìhè. N’ụzọ dị iche, Ndịàmà Jehova n’okpuru ọchịchị Nazi jigidere nnọpụiche siri ike ma jụ ikele Hitler ma ọ bụ isonye n’òtù ndị agha ya. N’ụzọ dị otú a, ha egbughị onye ọ bụla n’ime ụmụnna ime mmụọ ha nke mba ndị ọzọ, ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ. Ndịàmà Jehova nọkwa ná mba ndị ọzọ nọpụkwara iche.
9. Gịnị mere Ndịàmà Jehova na Germany na Austria n’okpuru ọchịchị Nazi?
9 Ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova enyewo ndụ ha n’ihi ndị enyi ha n’irube isi n’iwu nke ịhụnanya. Ọtu ntụleghachi e mere n’akwụkwọ ahụ bụ Kirchenkampf in Deutschland (Ọgụ nke Chọọchị dị iche iche lụrụ na Germany), nke Friedrich Zipfel dere, kwuru banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Pasenti iri itoolu na asaa nke ndị so n’obere òtù okpukpe nke a bụ ndị òtù National Socialist [Nazi] kpagburu. E gburu otu ụzọ n’ime ụzọ atọ n’ime ha, ma ọ bụghị site ná mgbagbu, omume ihe ike ndị ọzọ, agụụ, ọrịa, ọ bụrụ site n’ọrụ ịgba ohu. Ọtú mmekpọ ọnụ nke a si sie ike enweghị atụ, ọ bụkwa n’ihi ọjụjụ ha jụrụ ịhapụ okwukwe ha bụ́ nke a na-apụghị ijikọta ya na nkwenye nke òtù National Socialist.” N’Austria, 25 pasenti nke Ndịàmà Jehova bụ ndị a gbagburu agbagbu, ndị e tigburu etigbu, ma ọ bụ ndị nwụrụ site n’ọrịa ma ọ bụ ike ọgwụgwụ n’ogige ndị Nazi.
10. Obi ike dị aṅaa ka ndị ahụ nwere bụ́ ndị nwụrụ maka irube isi n’iwu ịhụnanya ahụ?
10 Ndị ahụ e gburu maka okwukwe ha n’ihi na ha rubere isi n’iwu ịhụnanya nwere obi ike na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ [ha] na ịhụnanya ahụ [ha] gosiri n’ebe aha ya dị.” (Ndị Hibru 6:10) Ha maara na “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ha nwere olileanya e ji n’aka nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ inweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 5: 28, 29; Ọrụ 24:15.
11. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị ohu Jehova si pụọ iche, amụma dịkwa aṅaa na-emezu n’ebe ha nọ?
11 Ndị ohu Jehova pụrụ iche n’irube isi n’ụkpụrụ ahụ Pita na ndị ozi ndị ọzọ kwu-pụtara gwa otu ụlọikpe ukwu: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karị mmadụ.” (Ọrụ 5:29) N’ihi na Ndịàmà Jehova na-eme nke a, “mmụọ nsọ . . . [bụ́ nke, NW] Chineke nyere ndị na-ekwenyere ya” na-akwado ha. (Ọrụ 5:32) Ọ bụ ikike ahụ na-eme ka ha nwee ike imezu amụma ahụ dị n’Aịsaịa 2:2-4. O buru n’amụma na n’oge anyị a a ga-eguzobeghachi ezi ofufe, na ndị mmadụ sitere ná mba nile nakwa n’okpukpe nile ga-enubata na ya. Otu ihe ọ ga-arụpụta bụ: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” N’ihi na ndị ohu Jehova na-akwadebe maka ndụ n’ime ụwa ọhụrụ nke udo, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ. Ha na-amụta iwu nke ịhụnanya.—Jọn 13:34, 35.
12. Gịnị ka ndị ahụ na-erube isi n’iwu ịhụnanya na-aghaghị imere ndị ọzọ?
12 Ebe ọ bụ na ịhụnanya ndị Kraịst na-agụnye ‘ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị,’ ndị ohu Chineke apụghị ịchọ nanị ọdịmma onwe ha n’ihe banyere ihe ha maara. (Matiu 22:39) A ka nwere ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị ga-achọ ijere Chineke ozi ma bie n’ime ụwa ọhụrụ ya. Ebe a ka nwere oge, ọ dịkwa ndị a mkpa ịmụ banyere iwu ịhụnanya ahụ nakwa ọtụtụ eziokwu ndị ọzọ metụtara Okaaka Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke. A ghaghị izi ha na ọ bụ nanị Jehova kwesịrị inweta ofufe anyị nakwa otú a ga-esi fee ofufe ahụ. (Matiu 4:10; Mkpughe 4:11) Ndị ahụ mụtawororị ihe ndị a ji ụgwọ ịgwa ndị ọzọ banyere ha ka ha onwe ha wee nwee ike ịnata ihu ọma nke Jehova. —Ezikiel 33:7-9, 14-16.
Ikpughe Onye ahụ Na-emebi Iwu
13. Dị ka akụkụ nke ịgba àmà anyị zuru ụwa ọnụ, gịnị ka anyị na-aghaghị ime ka a mara, n’ihi gịnịkwa?
13 Jisọs sịrị na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Dị ka akụkụ nke ịgba àmà nke a zuru ụwa ọnụ, ndị ohu Chineke jikwa ụgwọ ime ka a mara ikpe ya megide okpukpe ụgha, karịsịa ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. Ndị a ka ụta kasị dịrị n’anya Chineke n’ihi na ha na-ekwu na ha bụ ndị Kraịst. A ghaghị ikpughe ha ka ndị ahụ bụ́ ndị chọrọ ife Chineke nwee ike inwere onwe ha pụọ ná mmetụta ha ma nwee ike ime ihe ndị kwesịrị ekwesị iji lanarị. Dị ka Jisọs kwuru: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.
14. Ozi doro anya dị aṅaa ka a na-aghaghị ịkpọsa banyere okpukpe ụgha?
14 Otú a, Ndịàmà Jehova aghaghị ime ka a mara ozi nke a si n’ike mmụọ nsọ banyere okpukpe ụgha: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile. N’ihi na mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile. . . . N’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na ọ dị ike, bụ́ [Jehova, NW] Chineke, onye kpere ya ikpe.”—Mkpughe 18:4-8.
15. Olee otú afọ 1914 si kere òkè n’ọgụgụ oge nke Jehova, gịnịkwa mere mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị?
15 Amụma Bible dị iche iche na-egosi na “mgbe ikpeazụ” maka usoro ihe nke a malitere n’afọ ahụ dị oké mkpa bụ́ 1914. (2 Timoti 3: 1-5, 13; Matiu 24:3-13) Eri afọ ahụ, anyị anọwo n’ime “mgbe ọgwụgwụ.” (Daniel 12:4) Ozugbo Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị, n’ụzọ kwekọrọ n’ọgụgụ oge Jehova, ndị ohu ya malitere n’ụzọ siri ike ịmụba nkwupụta ha nke Alaeze Chineke dị ka e buru n’amụma na Matiu 24:14. Ha malitekwara ikpughe okpukpe ụgha n’ụzọ siri ike karị, karịsịa òtù ndị ụkọchukwu na-emebi iwu nke Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ.
16. Olee otú mkpughe nke onye mmebi iwu ahụ siworo biri ọkụ eri ihe karịri 70 afọ?
16 Ruo ihe karịrị 70 afọ ugbu a, site n’ikike na-adịwanye ukwuu, ndị ohu Chineke emewo ka ndị mmadụ mara omume nduhie nke onye mmebi iwu ahụ. E nwere nanị puku Ndịàmà ole na ole na-eme nke a mgbe Agha Uwa nke Mbụ gasịrị. Ma ugbu a ha aghọwo “mba nwere ume” nke ihe karịrị nde atọ na ọkara ndị ozi na-arụsi ọrụ ike a haziri gaa n’ihe karịrị 60,000 ọgbakọ n’elu ụwa nile. (Aịsaịa 60:22) N’ọ̀tụ̀tụ̀ na-amụba amụba, ndị ohu Chineke ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ, nakwa, n’otu oge ahụ, na-ekpughe ndị ụkọchukwu dị ka ihe ha bụ n’ezie—onye nduhie nke na-emebi iwu.
N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Ike?
17. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova jiworo kpughee onye mmebi iwu ahụ n’ụzọ dị ike?
17 N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova jiworo kpughee onye mmebi ahụ n’ụzọ dị ike n’afọ ndị a nile? N’ihi na ọtụtụ nde nke oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ Jehova ndị nọ ugbu a n’ụzọ ahụ na-eduga ná nzọpụta aghaghị ịbụ ndị e chebere pụọ n’ụwa Setan na okpukpe ụgha ya. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9-14) Ọzọkwa, ma ọ̀ bụghị na e kpughere ndị ụkọchukwu ahụ, ndị mmadụ obi ha ziri ezi bụ́ ndị na-esonyerebeghị ìgwè atụrụ Chineke agaghị ama otú ha ga-esi zere ụzọ ọjọọ. Ya mere a ghaghị ime ka ha mara, dị ka Jisọs mere ka ndị mmadụ mara mgbe o kwuru banyere ndị ndú okpukpe ihu abụọ nke oge ya, sị: “Ha bụ ndị ndú kpuru ísì. Ma ọ bụrụ na onye ísì duo onye ísì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”—Matiu 15:14; leekwa 2 Ndị Kọrint 4:4; 11:13-15.
18. Gịnị ka ọ dị ndị na-achọ eziokwu mkpa ịmara?
18 Ndị ụkọchukwu bụ akụkụ nke ụwa Setan. (Jọn 8:44) Ma ọ bụ ụwa nke Chineke ga-etipịa n’oge na-adịghị anya, mee ka ọ ghara ịdịkwa. (2 Pita 3:11-13; 1 Jọn 2:15-17) Ya mere Okwu Chineke dọrọ aka ná ntị, sị: “Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onyeiro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Ndị ụkọchukwu leghaara ịdọ aka ná ntị ahụ anya ma nọgide na-etinye aka n’ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-agwa ndị na-eso ha na ụwa ka mma ga-abịa site ná mgbalị nile nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma nke ahụ bụ olileanya ụgha, ebe ọ bụ na ụwa nke a nọ n’okpuru Setan na-eru ọgwụgwụ ya. Ya mere a na-arafu ndị na-elegara ụwa nke a anya maka olileanya. Ọ dị mkpa ka a gwa ha eziokwu banyere ebe ụwa na-etinye isi na ihe ga-eweghara ọnọdu ya.—Ilu 14:12; 19:21; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:4, 5.
19. Olee otú e siworo kpughee ibi ndụ ụwa nke ụfọdụ ndị ụkọchukwu n’ụlọ mgbasa ozi n’oge ndị na-adịghị anya gara aga?
19 Ibi ndụ ndị ụwa nke ụfọdụ ndị ụkọchukwu abụwo nke e kpughere ọbụna n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi n’oge ndị na-adịbeghị anya, dị ka ihe atụ ndụ rụrụ arụ na nke okomoko nke ụfọdụ n’ime ndị ụkọchukwu TV. Otu onye na-ede abụ n’oge a dere otu abụ nke isiokwu ya bụ: “Jisọs Ọ̀ Ga-eyi [klọkụ] Rolex [ọnụ ego ya bụ $10,000] n’Ihe Ngosi Telivishọn Ya?” Abụ ahụ gara n’ihu ikwu: “Jisọs ọ̀ ga-abụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma Ọ bịa n’ụwa ọzọ, nwee ụlọ Ya nke abụọ [mabigara mma ókè] na Palm Springs ma gbalịa izochi ihe ókè akụ Ya haruru?” Ọzọkwa, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-anabata ma na-enwe mmekọahụ nwoke na nwoke na nwanyị na nwanyị. Ọbụna ugbu a Chọọchị ndị Katọlik na United States na-akwụ ọtụtụ nde naịra n’ihi ihe ndị e mebiri iji mee ka obi jụọ ndị mmadụ oyi maka ndị ụkọchukwu ikpe idina ụmụaka mara.—Ndị Rom 1:24-27; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
20. Gịnị mere na ndị ohu Chineke aghaghị ịnọgide na-ekpughe onye mmebi iwu ahụ?
20 Ndị ohu Chineke apụghị ileghara ajọ omume dị otú ahụ anya kama a ghaghị ikpughe ha maka abamuru nke ndị ọzọ. A ghaghị ichebe oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ọzọ pụọ n’aka ndị ahụ ga-agbalị iduba ha n’imebi iwu nile nke Chineke. Ọ dịkwa mkpa ịchọpụta ndị ahụ “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme” ma chịkọta ha ná nduzi na-enye nchebe nke Ọnye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke, na “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” bụ́ Kraịst Jisọs.—Ezikiel 9:4; Jọn 10:11; Ilu 18:10.
21. Gịnị ka Ndịàmà ga-anọgide na-akpọsa?
21 Ya mere, ndị Chineke agaghị ala azụ n’ịkpọsa ịbọ ọ́bọ̀ ya megide akụkụ nile nke ụwa Setan, tinyere onye mmebi iwu ya, bụ́ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. Ha ga-eji ume dị ike kpọsaa ozi onye mmụọ ozi ahụ nke Mkpu-ghe 14:7: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto; n’ihi na oge awa nke ikpe ya abịawo.” Ha ga-etinyekwa ná mkpọsa nke a ịdọ aka ná ntị ahụ dị oké ngwa nke Mkpughe 18:4 banyere okpukpe ụgha: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.”
Ajụjụ maka Ntụleghachi:
◻ Gịnị ga-abụ ọdịnihu dị njọ nke onye mmebi iwu ahụ, n’ihi gịnịkwa?
◻ Ụgwọ dị aṅaa ka ndị ohụ Jehova ji n’ihe banyere ndị ọzọ?
◻ Olee otú ndị Jehova siworo nwere onwe ha pụọ n’ọbara nke mmadụ nile?
◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime banyere Babilọn Ukwu ahụ?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nọgide n’ozi anyị dị ike banyere onye mmebi iwu ahụ?
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị ozi gwara otu ụlọikpe ukwu, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karị mmadụ”
[Foto dị na peeji nke 24]
Ọ dị ndị mmadụ obi ha ziri ezi mkpa ịmara ebe ụwa na okpukpe ya nile na-etinye isi