Ndị Inyom Bụ́ Ndị Kraịst Kwesịrị Nsọpụrụ na Nkwanye Ùgwù
“Ndị bụ́ di, . . . sonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.”—1 PITA 3:7.
1, 2. (a) Mkparịta ụka Jisọs na nwanyị Sameria ahụ n’akụkụ olulu mmiri kpaliri nchegbu dị aṅaa, n’ihi gịnịkwa? (Leekwa nkọwa ala ala peji.) (b) Site n’ikwusara nwanyị Sameria ahụ ozi ọma, gịnị ka Jisọs gosipụtara?
N’OLULU mmiri ochie ahụ dị nso obodo Saịka n’otu ehihie ka 30 O.A. na-achọ ịgwụsị, Jisọs kpughere uche ya banyere ụzọ e kwesịrị isi mesoo ndị inyom. O jiwo ụkwụ gaa njem ụtụtụ nile gabiga mba Sameria ahụ bụ ugwu ugwu ma rute n’olulu mmiri ahụ n’ike ọgwụgwụ, agụụ, na n’akpịrị ịkpọ nkụ. Ka ọ nọdụrụ ala n’akụkụ olulu mmiri ahụ, otu nwanyị Sameria bịara ikurutụ mmiri. “Nye m mmiri ka m ṅụọ,” ka Jisọs gwara ya. Nwanyị ahụ aghaghị imoropụwo anya na-ele ya n’ijuanya. Ọ jụrụ, sị: “Gị onwe gị si aṅaa arịọ mmiri n’aka m ka Ị ṅụọ, ebe Ị bụ Onye Juu, ma mụ bụ nwanyị Sameria?” E mesịa, mgbe ndị na-eso ụzọ ya si n’ịga zụta ihe oriri lata, ha nwere ijuanya, na-achịgharị n’uche ihe mere Jisọs “na nwanyị na-ekwurịta okwu.”—Jọn 4:4-9, 27.
2 Gịnị kpaliri ajụjụ nwanyị a na nchegbu ndị na-eso ụzọ ahụ? Ọ bụ onye Sameria, ndị Sameria na ndị Juu adịghịkwa emekọ ihe. (Jọn 8:48) Ma ihe àmà na-egosi na e nwere ihe ọzọ kpatara nchegbu. N’oge ahụ, ọdịnala ndị rabaị kụdara ndị ikom aka ikwunyere ndị inyom okwu n’ihu ọha.a Ma, Jisọs kwusaara nwanyị a nwere ezi obi ozi ọma n’ihu ọha, ọbụna na-ekpughere ya na ya bụ Mesaịa ahụ. (Jọn 4:25, 26) Jisọs si otú ahụ gosi na ọdịnala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, gụnyere ndị wedara ndị inyom ala, agaghị ejichi ya. (Mak 7:9-13) N’ụzọ megidere nke ahụ, site n’ihe o mere na site n’ihe o ziri, Jisọs gosipụtara na e kwesịrị imeso ndị inyom n’ụzọ nsọpụrụ na n’ụzọ dị ùgwù.
Ụzọ Jisọs Si Mesoo Ndị Inyom
3, 4. (a) Olee otú Jisọs si zaghachi nwanyị ahụ meturu uwe ya aka? (b) Olee otú Jisọs si setịpụrụ ndị ikom bụ́ ndị Kraịst, karịsịa ndị nlekọta, ihe nlereanya ọma?
3 E gosipụtara obi ebere dị nro nke Jisọs maka ndị mmadụ n’ụzọ o si mesoo ndị inyom. N’otu oge otu nwanyị nke nọworo na-ata ahụhụ oruru ọbara ruo afọ 12 chọgharịrị Jisọs n’etiti ìgwè mmadụ. Ọnọdụ ya mere ka ọ ghara ịdị ọcha dị ka usoro ihe omume ha si dị, ya mere o kwesịghị ịnọworị n’ebe ahụ. (Levitikọs 15:25-27) Ma ọ dị ya ọkụ n’obi nke na o gbebatara n’azụ Jisọs. Mgbe o metụrụ uwe Jisọs aka, a gwọrọ ya ozugbo ahụ! Ọ bụ ezie na ọ na-aga n’ụlọ Jaịrọs, onye nwa ya nwanyị nọ n’ọnụ ọnwụ, Jisọs kwụsịrị. Ebe o nweworo mmetụta na ike pụrụ ya n’ahụ, o legharịrị anya maka onye metụworo ya aka. N’ikpeazụ, nwanyị ahụ bịara daa n’ala n’ihu ya na-ama jijiji. Jisọs ọ̀ ga-abara ya mba n’ihi ịnọ n’etiti ìgwè mmadụ ahụ ma ọ bụ n’ihi imetụ uwe ya aka n’anataghị ikike ya? N’ụzọ megidere nke ahụ, nwanyị ahụ hụrụ na ọ bụ onye ịhụnanya na obi ọma. “Nwa m nwanyị,” ka ọ sịrị, “okwukwe gị azọpụtawo gị.” Nke a agwụla oge Jisọs kpọrọ nwanyị kpọmkwem “nwa m nwanyị.” Lee ka okwu ahụ na-aghaghị isiwo mee ka obi ya jụrụ!—Matiu 9:18-22; Mak 5:21-34.
4 Jisọs lere anya gabiga ihe e dere n’Iwu ahụ. Ọ hụrụ mmụọ dị na ya na mkpa nke obi ebere na ọmịiko. (Tụlee Matiu 23:23.) Jisọs rịbara ọnọdụ siri ike nke nwanyị ahụ nọ n’ọrịa ama ma buru n’uche na ọ bụ okwukwe kpaliri ya. O si otú ahụ setịpụrụ ndị ikom bụ́ ndị Kraịst, karịsịa ndị nlekọta, ezi ihe nlereanya. Ọ bụrụ na nwanna nwanyị onye Kraịst na-eche nsogbu onwe onye ma ọ bụ ọnọdụ siri oké ike ma ọ bụ nke na-etinye mmadụ n’ule ihu, ndị okenye kwesịrị ile anya gabiga okwu ma ọ bụ omume ndị a na-ahụ anya, ma tụlee ọnọdụ na ihe mkpali ndị dịnụ. Nghọta dị otú ahụ pụrụ igosipụta na ndidi, izuzu, na ọmịiko dị mkpa kama ndụmọdụ na mgbazi olu.—Ilu 10:19; 16:23; 19:11.
5. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ọdịnala ndị rabaị gbochiri ndị inyom? (Lee nkọwa ala ala peji.) (b) Olee ndị bụ ndị mbụ hụrụ ma gbaa akaebe banyere mbilite n’ọnwụ Jisọs?
5 N’ịbụ ndị ọdịnala dị iche iche nke ndị rabaị gechibidoro, e gbochiri ndị inyom dị ndụ mgbe Jisọs nọ n’ụwa ije ozi dị ka ndị akaebe n’ikpe.b Tụlee ihe mere ngwa ngwa Jisọs bilitesịrị n’ọnwụ n’ụtụtụ Nisan 16, 33 O.A. Olee ndị ga-abụ ndị mbụ ga-ahụ Jisọs bilitere n’ọnwụ ma gbaa akaebe nye ndị ọzọ na-eso ụzọ na a kpọlitewo Onyenwe ha? Ọ dabara na ọ bụ ndị inyom ndị nọgideworo n’ebe ha ga-anọ na-ahụ mkpọgide n’elu osisi ahụ ruo mgbe ọ nwụrụ.—Matiu 27:55, 56, 61.
6, 7. (a) Gịnị ka Jisọs gwara ndị inyom ahụ bịara n’ili ahụ? (b) Olee otú ndị ikom na-eso ụzọ Jisọs si buru ụzọ meghachi omume n’akaebe ndị inyom ahụ, gịnịkwa ka a pụrụ ịmụta site na nke a?
6 N’isi ụtụtụ n’ụbọchị mbụ nke izu ahụ, Meri Magdalini na ndị inyom ọzọ ji ihe ndị na-esi ísì ụtọ gaa n’ili ahụ ite ahụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ na ili ahụ tọgbọ chakoo, Meri gbapụrụ ịga gwa Pita na Jọn. Ndị inyom ndị ọzọ nọgidere. N’isi nso, mmụọ ozi gosiri ha onwe ya ma gwa ha na a kpọlitewo Jisọs. “Gaakwanụ ọsọ ọsọ, [gwa] ndị na-eso ụzọ Ya,” ka mmụọ ozi ahụ nyere ntụziaka ya. Mgbe ndị inyom a ji ọsọ ịga kpọsaa akụkọ ahụ, Jisọs gosiri ha onwe ya. “Jeenụ kọọrọ ụmụnna m,” ka ọ gwara ha. (Matiu 28:1-10; Mak 16:1, 2; Jọn 20:1, 2) N’amaghị banyere nleta mmụọ ozi ahụ nakwa n’ịbụ onye iru újú rikpuru, Meri Magdalini laghachitere n’ili ahụ tọgbọ chakoo. Jisọs gosiri ya onwe ya n’ebe ahụ, mgbe Meri mesịkwara mata onye ọ bụ, Jisọs sịrị: “Gakwuru ụmụnna m, sị ha, Ana m arịgo lakwuru Nna m na Nna unu, na Chineke m na Chineke unu.”—Jọn 20:11-18; tụlee Matiu 28:9, 10.
7 Jisọs gaara ebuwo ụzọ gosi Pita, Jọn, ma ọ bụ otu n’ime ndị ikom ndị ọzọ na-eso ụzọ onwe ya. Kama nke ahụ, ọ họọrọ imere ndị inyom a afọ ọma site n’ime ha ndị mbụ ji anya ha hụ mbilite n’ọnwụ ya na site n’inye ha ọrụ ịgba akaebe banyere ya nye ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị ikom. Olee otú ndị ikom ahụ si meghachi na mbụ? Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Okwu ndị a wee dị ka okwu efu n’anya ha; ha ekweghịkwa ha.” (Luk 24:11) Ọ̀ pụrụ ịbụ na akaebe ahụ siiri ha ike ịnakwere n’ihi na o sitere n’ọnụ ndị inyom? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe oge na-aga ha nwetara ihe àmà bara ụba na a kpọlitewo Jisọs site ná ndị nwụrụ anwụ. (Luk 24:13-46; 1 Ndị Kọrint 15:3-8) Taa, ndị ikom bụ́ ndị Kraịst na-eme ihe n’ụzọ amamihe mgbe ha chebaara nchọpụta dị iche iche nke ụmụnna ha nwanyị n’ime mmụọ echiche.—Tụlee Jenesis 21:12.
8. Site n’ụzọ o si mesoo ndị inyom, gịnị ka Jisọs kpughere?
8 Ọ bụ ihe obi ụtọ n’ezie ịrịba ama ụzọ Jisọs si mesoo ndị inyom. Na-adị ọmịiko ma na-anọ n’ezi nguzo n’ụzọ zuru ezu mgbe nile n’imeso ndị inyom ihe, o bulighị ha elu ma ọ bụ wetuo ha ala. (Jọn 2:3-5) Ọ jụrụ ọdịnala ndị rabaị nile bụ́ ndị na-anapụ ha ùgwù ha ma na-emekwa ka Okwu Chineke ghara ịdị irè. (Tụlee Matiu 15:3-9.) Site n’ịsọpụrụ na ịkwanyere ndị inyom ùgwù, Jisọs kpughere kpọmkwem otú Jehova Chineke chere na e kwesịrị isi mesoo ha. (Jọn 5:19) Jisọs setịpụkwaara ndị ikom bụ́ ndị Kraịst ọmarịcha ihe nlereanya ha ga-eṅomi.—1 Pita 2:21.
Ihe Ndị Jisọs Ziri Banyere Ndị Inyom
9, 10. Olee otú Jisọs si gbaghaa ọdịnala dị iche iche nke ndị rabaị banyere ndị inyom, gịnịkwa ka o kwuru mgbe ndị Farisii welitere ajụjụ banyere ịgba alụkwaghịm?
9 Jisọs gbaghara ọdịnala dị iche iche nke ndị rabaị ma bulie ùgwù ndị inyom ọ bụghị nanị site n’ihe omume ya kama site n’ihe ndị ọ kụzikwara. Tụlee, dị ka ihe atụ, ihe ọ kụziri banyere ịgba alụkwaghịm na ịkwa iko ndị di ma ọ bụ nwunye.
10 Banyere ịgba alụkwaghịm, a jụrụ Jisọs ajụjụ a: “Ò ziri ezi n’iwu ka nwoke hapụ nwunye ya n’ihi ihe nile ọ bụla?” Dị ka ihe ndekọ Mak na-ekwu, Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya [ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko]; lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko megide ya: ọ bụrụkwa na nwanyị onwe ya ahapụ di ya, lụrụkwa di ọzọ, ọ na-akwa iko.” (Mak 10:10-12; Matiu 19:3, 9) Okwu ndị ahụ e kwuru n’ụzọ dị mfe sọpụụrụ ịdị ùgwù ndị inyom. N’ụzọ dị aṅaa?
11. Okwu Jisọs bụ́ “ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko” na-egosi gịnị banyere ihe nkekọ alụmdi na nwunye?
11 Nke mbụ, site n’okwu ndị bụ́ “ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko” (nke a na-achọta n’ihe ndekọ Oziọma Matiu), Jisọs gosiri na a gajeghị ile ihe nkekọ alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị nta ma ọ bụ gbubie ya n’ụzọ dị mfe. Ihe na-ewu ewu ndị rabaị na-akụzi nyere ohere maka ịgba alụkwaghịm n’ihi ihe ndị na-enweghị isi dị ka nwunye isijọ nri ma ọ bụ ikwunyere nwoke a na-amaghị ama okwu. Leenụ, e nyedịrị ohere maka ịgba alụkwaghịm ma ọ bụrụ na di achọta nwanyị ka na-adọrọ anya ya! Otu onye mmụta Bible rịbara ama sị: “Mgbe Jisọs kwuru ihe ahụ o kwuru ọ . . . na-agbachitere ndị inyom site n’ịgbalị iweghachi alụmdi na nwunye n’ọnọdụ o kwesịrị ịnọ.” N’ezie, alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ njikọ na-adịgide adịgide ebe nwanyị pụrụ ịnọ ná ntụkwasị obi.—Mak 10:6-9.
12. Site n’okwu bụ́ “na-akwa iko megide ya,” olee echiche Jisọs na-ewebata?
12 Nke abụọ, site n’okwu ahụ bụ́ “na-akwa iko megide ya,” Jisọs webatara echiche nke a na-anabataghị n’ụlọ ikpe ndị rabaị—echiche nke di ịkwa iko megide nwunye ya. Akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible Commentary na-akọwa, sị: “N’okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị, nwanyị site n’ekwesịghị ntụkwasị obi pụrụ ịkwa iko megide di ya; nwoke kwa, site n’iso nwunye nwoke ọzọ nwee mmekọahụ, pụrụ ịkwa iko megide nwoke ahụ. Ma nwoke apụghị ịkwa iko megide nwunye ya, ihe ọ sọrọ ya mee. Jisọs, site n’itinye di n’okpuru otu ibu ọrụ omume ahụ nwunye ya nọ, buliri ọkwá na ùgwù nke ndị inyom.”
13. Banyere ịgba alụkwaghịm, olee otú Jisọs si gosi na n’usoro ndị Kraịst, a ga-enwe otu ụkpụrụ maka ma ndị ikom ma ndị inyom?
13 Nke atọ, site n’ahịrị okwu bụ́ “ahapụ di ya,” Jisọs nabatara ikike nwanyị nwere ịgba di na-ekwesịghị ntụkwasị obi alụkwaghịm—omume nke o yiri ka a maara ma ọ dịghị emekebe n’okpuru iwu ndị Juu n’oge ahụ.c E kwuru na “a pụrụ ịgba nwanyị alụkwaghịm ma ò kwere ma ọ bụ na o kweghị, ma nwoke bụ nanị ma o kwe.” Ma, dị ka Jisọs kwuru, n’usoro ndị Kraịst, otu ụkpụrụ ahụ ga-adịrị ma ndị ikom ma ndị inyom.
14. Site n’ihe ndị ọ kụziri, gịnị ka Jisọs gosipụtara?
14 Ihe ndị Jisọs kụziri kpughere n’ụzọ doro anya nchegbu dị omimi maka ọdịmma ndị inyom. Ya mere, o sighị ike ịghọta ihe mere ndị inyom ụfọdụ ji nwee ịhụnanya dị ukwuu maka Jisọs nke na ha gboro mkpa ya site n’ihe ndị ha nwere. (Luk 8:1-3) “Ozizi m abụghị nke m,” ka Jisọs sịrị, “kama ọ bụ nke Onye zitere m.” (Jọn 7:16) Site n’ihe ọ kụziri, Jisọs gosipụtara nchebara echiche dị nro nke Jehova maka ndị inyom.
“Na-ekenye Ihe Bụ Nwanyị Nsọpụrụ”
15. Gịnị ka Pita onyeozi dere banyere ụzọ ndị bụ́ di kwesịrị isi mesoo ndị nwunye ha?
15 Pita onyeozi kiriri n’onwe ya ụzọ Jisọs si mesoo ndị inyom. Ihe dị ka 30 afọ n’ihu, Pita nyere ndị bụ nwunye ndụmọdụ ịhụnanya, wee dezie, sị: “Ndị bụ di, otú ahụ, sonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ́ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Gịnị ka Pita bu n’uche n’okwu ndị ahụ bụ́ “na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ”?
16. (a) Gịnị ka mkpọaha Grik a sụgharịrị “nsọpụrụ” pụtara? (b) Olee otú Jehova si nye Jisọs nsọpụrụ n’oge nnwogha ahụ, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?
16 Dị ka otu onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru, mkpọaha Grik a sụgharịrị “nsọpụrụ” (ti·meʹ) pụtara “ọnụ ahịa, uru, nsọpụrụ, ùgwù.” A sụgharịrị ụdị dị iche iche nke okwu Grik a “onyinye” na “ihe dị oké ọnụ.” (Ọrụ 28:10, NW; 1 Pita 2:7, NW) Anyị na-enweta nghọta nke ihe ọ pụtara ịsọpụrụ mmadụ ma ọ bụrụ na anyị enyochaa ojiji Pita jiri otu ụdị nke otu okwu ahụ mee ihe na 2 Pita 1:17. N’ebe ahụ o kwuru banyere nnwogha Jisọs, sị: “Ọ natara nsọpụrụ na ebube n’aka Chineke, bụ́ Nna, mgbe Ebube ahụ nke kwesịrị ịdị ukwuu mere ka olu dị otú a daara Ya, sị, Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị Mụ onwe m ezi mma.” Ná nnwogha Jisọs, Jehova nyere Ọkpara ya nsọpụrụ site n’ikwupụta na ihe Jisọs dị ya ezi mma, Chineke mekwara otú ahụ ná ntị ndị ọzọ. (Matiu 17:1-5) Ya mere, nwoke nke na-asọpụrụ nwunye ya adịghị ewetu ya ala ma ọ bụ lelịa ya. Kama nke ahụ, ọ na-egosi site n’okwu ya na n’omume ya—na nzuzo na n’ihu ọha—na o ji ya kpọrọ oké ihe.—Ilu 31:28-30.
17. (a) N’ihi gịnị ka nwunye bụ́ onye Kraịst ji ruo eru ịnata nsọpụrụ? (b) N’ihi gịnị ka nwoke na-ekwesịghị iji chee na ya dị mkpa n’anya Chineke karịa nwanyị?
17 Nsọpụrụ nke a, ka Pita kwuru, kwesịrị ịbụ nke ndị Kraịst bụ di ‘kenyere’ nwunye ha. A gaje inye ya, ọ bụghị dị ka afọ ọma, kama dị ka ihe ruuru nwunye ha n’iwu. N’ihi gịnị ka ndị nwunye ji kwesị ịnata nsọpụrụ dị otú ahụ? N’ihi na “unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ́ ndụ,” ka Pita na-akọwa. Na narị afọ mbụ O.A., ndị ikom na ndị inyom natara akwụkwọ ozi Pita bụcha ndị a kpọrọ ịbụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe. (Ndị Rom 8:16, 17; Ndị Galetia 3:28) Ha enweghị otu ibu ọrụ ndị ahụ n’ọgbakọ, ma ha ga-emesịa kerịta òkè n’iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Mkpughe 20:6) Taakwa, mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Chineke nwere olileanya elu ụwa, ọ ga-abụ ajọ ihie ụzọ ka nwoke ọ bụla bụ́ onye Kraịst chee na n’ihi ihe ùgwù ndị ọ pụrụ inwe n’ọgbakọ, na ya dị mkpa n’anya Chineke karịa ndị inyom. (Tụlee Luk 17:10.) Ndị ikom na ndị inyom nwere nguzo ime mmụọ hà nhata n’anya Chineke, n’ihi na ọnwụ ịchụàjà Jisọs megheere ma ndị ikom ma ndị inyom otu ohere ahụ—nke ịbụ ndị a tọhapụrụ site n’amamikpe nke mmehie na ọnwụ, na-enwe olileanya ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.
18. Olee ihe dị ike Pita kwuru mere nwoke ga-eji sọpụrụ nwunye ya?
18 Pita kwuru ihe ọzọ dị ike mere di kwesịrị iji nye nwunye ya nsọpụrụ, “ka e wee ghara igbochi ekpere [ya].” Okwu ahụ bụ́ “igbochi” sitere ná ngwaa Grik (en·koʹpto) nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịwabanye.” Dị ka akwụkwọ An Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine na-ekwu, “e jiri [ya] mee ihe banyere ịdọghachi ndị mmadụ azụ site n’igwuwasị ụzọ, ma ọ bụ site n’idebe ihe mgbachi kpọmkwem n’okporo ámá ahụ.” Ya mere, di nke hapụrụ ikenye nwunye ya nsọpụrụ pụrụ ịchọpụta na e nwere ihe mgbachi ụzọ n’etiti ekpere ya na ntị Chineke. Nwoke ahụ pụrụ inwe mmetụta nke erughị eru ijekwu Chineke, ma ọ bụ Jehova nwere ike ọ gaghị achọ ịṅa ntị. N’ụzọ doro anya, Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’ụzọ ndị ikom si emeso ndị inyom.—Tụlee Abụ Ákwá 3:44.
19. Olee otú ndị ikom na ndị inyom n’ọgbakọ pụrụ isi jekọọ ozi n’ịkwanyererịta ùgwù?
19 Ibu ọrụ nke igosi nsọpụrụ adịghị nanị n’isi ndị bụ di. Ọ bụ ezie na di kwesịrị ịsọpụrụ nwunye ya site n’imeso ya n’ụzọ ịhụnanya na n’ụzọ dị ùgwù, nwunye kwesịrị ịsọpụrụ di ya site n’ido onwe ya n’okpuru na igosi nkwanye ùgwù dị omimi. (1 Pita 3:1-6) Ọzọkwa, Pọl gwara ndị Kraịst okwu ịdọ aka ná ntị ka ha ‘sọpụrụ ibe ha.’ (Ndị Rom 12:10) Nke a bụ òkù a na-akpọ ndị ikom na ndị inyom n’ọgbakọ ijekọ ozi ọnụ n’ịkwanyererịta ùgwù. Mgbe mmụọ dị otú ahụ juru ebe nile, ndị inyom bụ́ ndị Kraịst agaghị ekwu okwu n’ụzọ na-ebelata ikike nke ndị na-edu ndú. Kama nke ahụ, ha ga-akwado ndị okenye ma na-ekwenyere ha. (1 Ndị Kọrint 14:34, 35; Ndị Hibru 13:17) N’akụkụ nke ha, ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta ga-emeso “ndị inyom, ndị bụ okenye, dị ka ndị bụ nne; ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne nwanyị, n’ịdị ọcha nile.” (1 Timoti 5:1, 2) N’ụzọ amamihe, ndị okenye ga-eji obi ọma chebara okwu ụmụnna ha nwanyị n’ime Kraịst echiche. Ya mere, mgbe nwanna nwanyị gosiri nkwanye ùgwù ya maka ịbụisi ọchịchị Chineke ma jiri nkwanye ùgwù jụọ ajụjụ ma ọ bụ ọbụna kwupụta ihe kwesịrị ka e lebara ya anya, ndị okenye ga-eji obi ụtọ lebara ajụjụ ma ọ bụ nsogbu ya anya.
20. Dị ka ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ na-egosi, olee otú e kwesịrị isi mesoo ndị inyom?
20 Eri mbata nke mmehie n’Iden, e wezụgawo ndị inyom n’ọtụtụ ọdịbendị gaa n’ọnọdụ nke enweghị nsọpụrụ. Ma nke ahụ abụghị ụdị mmeso Jehova bụ n’uche na mbụ mbụ na ha ga-enwe. N’agbanyeghị echiche ọdịbendị ndị pụrụ ịdị na-ewu ewu banyere ndị inyom, ihe ndekọ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik nke Ndị Kraịst na-egosi n’ụzọ doro anya na e kwesịrị imeso ndị inyom na-asọpụrụ Chineke n’ụzọ nsọpụrụ na nkwanye ùgwù. Ọ bụ ihe ruuru ha nke Chineke dokwara.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a The International Standard Bible Encyclopedia na-akọwa, sị: “Ndị inyom adịghị eso ndị ọbịa bụ́ ndị ikom erikọ nri, a kụdakwara ndị ikom aka ikwunyere ndị inyom okwu. . . . Iso nwanyị kparịta ụka n’ebe ọha mmadụ nọ na-akpalitekarị akụkọ ọjọọ.” Akwụkwọ The Mishnah nke ndị Juu, nchịkọta nke nkụzi ndị rabaị, dụrụ ọdụ, sị: “Ekwunyerela nwanyị okwu nke ukwuu. . . . Onye na-ekwunyere nwanyị okwu nke ukwuu na-ewetara onwe ya ihe ọjọọ ma na-eleghara ihe ọmụmụ nke Iwu ahụ anya, n’ikpeazụkwa ọ ga-eketa Gehena.”—Aboth 1:5.
b Akwụkwọ bụ́ Palestine in the Time of Christ na-asị: “N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-edebe nwanyị n’ọkwá fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ohu. Dị ka ihe atụ, ọ pụghị ịgba akaebe n’ụlọ ikpe, ọ gwụla n’ịgba àmà banyere ọnwụ di ya.” Na-ezo aka na Levitikọs 5:1, The Mishnah na-akọwa, sị: “[Iwu banyere] ‘iyi nke akaebe’ dịịrị ndị ikom ma ọ bụghị ndị inyom.”—Shebuoth 4:I.
c Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Josephus kọrọ na Salomi bụ́ nwanne nwanyị Eze Herọd zigaara di ya “akwụkwọ na-atọsa alụmdi na nwunye ha, bụ́ nke na-ekwekọghị n’iwu ndị Juu. N’ihi na ọ bụ (nanị) nwoke ka anyị kwere ka o mee nke a.”—Jewish Antiquities, XV, 259 [vii, 10].
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi na Jisọs mesoro ndị inyom ihe n’ụzọ nsọpụrụ na nkwanye ùgwù?
◻ Olee otú ihe ndị Jisọs kụziri si sọpụrụ ịdị ùgwù ndị inyom?
◻ N’ihi gịnị ka di kwesịrị iji kenye nwunye ya bụ́ onye Kraịst nsọpụrụ?
◻ Ibu ọrụ dị aṅaa nke inye nsọpụrụ ka ndị Kraịst nile nwere?
[Foto dị na peeji nke 17]
Dị ka ihe obi ụtọ nye ha, ndị inyom na-asọpụrụ Chineke bụ ndị mbụ hụrụ Jisọs e si n’ọnwụ kpọlite, bụ́ onye mere ka ha gbaa akaebe nye ụmụnna ya