Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/1 p. 4-7
  • Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Ka Ụta Dịịrị?
  • “Mgbe na Ihe Ndapụta”
  • Mmetụta Ndị Na-ebibi Ihe nke Ezughị Okè
  • Nkweta n’Akara Aka —Mmetụta Ya Ndị Na-ebibi Ihe
  • Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi Nye Mmekọrịta Anyị na Chineke?
  • Onye A Tọhapụrụ Pụọ n’Aka Ike nke Akara Aka
  • Ọ̀ Bụ Akara Aka Ka Ọ Bụ Nanị Ihe Ndabara?
    Teta!—1999
  • Akara Aka Ọ̀ Na-achịkwa Ndụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ikwere n’Akara Aka Ọ̀ Na-achị Ndu Gi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ihe Ọghọm—Akara Aka Ka Ọ̀ Bụ Ihe Ndabara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/1 p. 4-7

Bible Ọ̀ Na-akụzi Nkweta n’Akara Aka?

OKWU NKATỌ! NKWUTỌ! Mgbe onye obodo bụ́ onye a na-akwanyere ùgwù chere na e mebiwo aha ọma ya site n’akụkọ ụgha, ọ na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a rụgidere idozi okwu ahụ. Ọ pụrụ ọbụna ịgba ndị ahụ kwuru okwu nkatọ akwụkwọ.

Nkwenkwe akara aka bụ n’ezie nkwutọ megide Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ozizi ahụ na-ekwu na Chineke kpatara n’onwe ya ọdachi na ihe ndabara ọjọọ nile na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. Ọ bụrụ na i kwere n’akara aka, ị pụrụ iche n’echiche na Eze Eluigwe na Ala edekọwo ihe omume nke na-agụ dị ka ihe na-esonụ: ‘Taa, a ga-emerụ John ahụ n’ihe ọghọm ụgbọala, ịba ga-arịa Fatou, oké ifufe ga-ebibi ụlọ Mamadou’! À pụrụ ịkpali gị n’ezie ijere Chineke dị otú ahụ ozi?

‘Ma ọ bụrụ na ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ ndị dabaara anyị, ọ̀ bụ onyezi?’ ka ndị kwere n’akara aka na-ajụ. Ousmane, nwa okorobịa ahụ a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ, chere banyere nke a n’onwe ya. Ma ọ dịghị ya mkpa ịkọ nkọ iji rute n’eziokwu. Ọ mụtara na Chineke ewepụwo nkwutọ a n’ahụ onwe ya site n’ozizi ndị dị n’Okwu Ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. (2 Timoti 3:16) Mgbe ahụ, ka anyị tụlee ihe Bible na-ekwu n’isiokwu a.

Ònye Ka Ụta Dịịrị?

Idei mmiri, oké ifufe, ala ọma jijiji—a na-akpọkarị ọdachi ndị dị otú ahụ ọrụ aka Chineke. Ma Bible adịghị egosi na Chineke na-akpata ụdị ọdachi ndị ahụ. Tụlee ọdachi nke mere ọtụtụ narị afọ gara aga n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Bible na-agwa anyị na nanị onye lanarịrị ọdachi a kọrọ, sị: “Ọkụ nke Chineke [okwu Hibru nke na-apụtakarị àmụ̀mà] esiwo n’eluigwe daa, rechapụ ìgwè ewu na atụrụ, na ndị na-ejere gị ozi, ripịa ha.”—Job 1:16.

Ọ bụ ezie na nwoke a ụjọ ji aka pụrụ icheworị na Chineke kpatara ọkụ ahụ, Bible na-egosi na ọ bụghị Ya ka ụta dịịrị. Gụọ Job 1:7-12 n’onwe gị, ị ga-amatakwa na onye kpatara àmụ̀mà ahụ abụghị Chineke, kama Onye Na-ebu Iro megide ya—Setan bụ́ Ekwensu! Ọ bụghị na ihe ndabara ọjọọ nile bụ nke Setan ji aka ya kpata. Ma n’ụzọ doro anya, e nweghị ihe mere a ga-eji taa Chineke ụta.

N’ezie, mgbe ihe gahiere a ga-atakarị ndị mmadụ ụta. Ọdịda n’ụlọ akwụkwọ, n’ọrụ, ma ọ bụ ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya pụrụ ịbụ n’ihi etinyeghị mgbalị na enweghị ezi ọzụzụ ma ọ bụ eleghị anya site n’echebaraghị ndị ọzọ echiche. N’otu aka ahụ, nrịanrịa, ihe ọghọm, na ọnwụ pụrụ ịbụ n’ihi nleghara anya. Leenụ, nanị iyiri belt ụgbọala mgbe mmadụ na-akwọ ụgbọala na-ebelata nke ukwuu mmadụ ịbụ onye nwere ike ịnwụ n’ihe ọghọm ụgbọala. Belt ụgbọala agaghị egbochi ya ime ma ọ bụrụ na “akara aka” a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nọ n’ọrụ. Nlekọta ahụ ike kwesịrị ekwesị na ịdị ọcha na-ebelatakwa nke ukwuu ọnụ ọgụgụ nke ọnwụ nnwụchu. Ọbụna ụfọdụ ọdachi ndị a a na-asịkarị na ọ bụ “ọrụ aka Chineke” bụ, n’ezie, ọrụ aka mmadụ—ihe nketa dị mwute nke nlekọta mmadụ na-adịghi elekọtazi ụwa.—Tụlee Mkpughe 11:18.

“Mgbe na Ihe Ndapụta”

N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe dị mwute ndị ihe kpatara ha na-apụtachaghị ìhè. Otú ọ dị, rịba ama ihe Bible na-ekwu n’Eklisiastis 9:11: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere e nweghị ihe mere a ga-eji ekwere na Onye Okike na-akpata ihe ọghọm ma ọ bụ na a na-enye ndị nwere ihe ọghọm ntaramahụhụ n’ụzọ ụfọdụ.

Jisọs Kraịst n’onwe ya rụrụ ụka megide echiche akara aka. N’izo aka n’otu ọdachi nke ndị na-ege ya ntị maara nke ọma, Jisọs jụrụ, sị: “Mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị ụlọ elu dị na Saịloam dakwasịrị ha, wee gbuo ha, ùnu na-eche na ndị ahụ bụ ndị ji ụgwọ karịa mmadụ nile ndị bi na Jerusalem? Asị m unu, Ee e.” (Luk 13:4, 5) O doro anya na Jisọs gosiri na “mgbe na ihe ndapụta” kpatara ọdachi ahụ, ọ bụghị ntinye aka Chineke.

Mmetụta Ndị Na-ebibi Ihe nke Ezughị Okè

Otú ọ dị, gịnị banyere ọnwụ na nrịanrịa ndị a na-akọwaghị ihe kpatara ha? Bible nyere nkọwa a na-ezoghị ọnụ banyere ọnọdụ ụmụ mmadụ, sị: “Ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam.” (1 Ndị Kọrint 15:22) Ọnwụ etiwo ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti kemgbe nna nna anyị bụ́ Adam nupụrụ isi. Dị nnọọ ka Chineke dọworo aka ná ntị, Adam hapụụrụ ụmụ ya ihe nketa nke ọnwụ. (Jenesis 2:17; Ndị Rom 5:12) Ya mere, mee elu mee ala, a pụrụ ịsị na ọ bụ nna ochie anyị nile bụ́ Adam wetara nrịanrịa nile. Adịghị ike nile anyị ketara eketa nwekwara ihe dị ukwuu jikọrọ ya na ndakpọ olileanya na ọdịda ndị anyị na-enweta ná ndụ.—Abụ Ọma 51:5.

Tụlee nsogbu ịda ogbenye. Nkweta n’akara aka agbawo ndị dara ogbenye ume ọtụtụ mgbe ịghara ime ihe ọ bụla banyere ịdị adị ha siri ike. ‘Nke a bụ akara aka anyị,’ ka ha kwere. Otú ọ dị, Bible na-egosi na ezughị okè mmadụ, ọ bụghị akara aka, ka ụta dịịrị. Ụfọdụ na-ada ogbenye mgbe ha ‘ghọọrọ mkpụrụ ha kụrụ’ site n’umengwụ ma ọ bụ elekọtaghị ihe onwunwe nke ọma. (Ndị Galetia 6:7; Ilu 6:10, 11) Ọtụtụ nde ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ bi n’ọnọdụ ogbenye n’ihi na ndị anyaukwu nọ n’ọchịchị mesiri ha ike. (Tụlee Jemes 2:6.) “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya,” ka Bible na-ekwu. (Eklisiastis 8:9) Ọ dịghị ihe àmà dịnụ maka ịsị na Chineke ma ọ bụ akara aka na-akpata ịda ogbenye nile.

Nkweta n’Akara Aka —Mmetụta Ya Ndị Na-ebibi Ihe

Ma ịrụ ụka ọzọ siri ike e nwere megide nkweta n’akara aka bụ mmetụta nke nkwenkwe akara aka pụrụ inwe n’ahụ ndị kwere na ya. Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ.” (Matiu 7:17) Ka anyị tụlee otu “mkpụrụ” nke nkwenkwe akara aka—ụzọ ọ na-esi emetụta echiche ibu ọrụ nke ndị mmadụ.

Ezi echiche ibu ọrụ nke onwe onye dị mkpa. Ọ bụ otu n’ime ihe ndị na-akpali ndị nne na nna inye ezinụlọ ha ihe na-akpa ha, ndị ọrụ iji nlezianya rụọ ọrụ ha, ndị na-emepụta ihe imepụta ihe ndị dị mma. Nkweta n’akara aka pụrụ ịkụnwụ echiche ahụ. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche na ụgbọala mmadụ nwere nsogbu n’ihe e ji anya ya. Ọ bụrụ na o nwere echiche dị nkọ nke ibu ọrụ ya, ọ ga-emezi ya n’ihi nchegbu maka ndụ nke ya na ndụ nke ndị o bu. N’aka nke ọzọ, onye kwere n’akara aka pụrụ ileghara ihe ize ndụ ahụ anya, na-eche na mmebi ga-ewere ọnọdụ nanị ma ọ bụrụ na ọ bụ ‘uche Chineke’!

Ee, nkweta n’akara aka pụrụ n’ụzọ dị mfe ịkwalite akpachapụghị anya, umengwụ, ịghara ịnakwere ihe mmadụ mere, na ọtụtụ àgwà ndị ọzọ na-adịghị mma.

Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi Nye Mmekọrịta Anyị na Chineke?

Nke kasị emerụ ahụ, nkweta n’akara aka pụrụ ịbịanyụ echiche mmadụ nke ịza ajụjụ, ma ọ bụ ibu ọrụ, nye Chineke. (Eklisiastis 12:13) Onye ọbụ abụ ahụ na-agba ihe nile a kpọrọ mmadụ ume ka ha ‘detụ ire, hụ na Jehova dị mma.’ (Abụ Ọma 34:8) Chineke setịpụrụ ụfọdụ ihe ndị ọ chọrọ n’aka ndị ga-enweta ịdị mma ya.—Abụ Ọma 15:1-5.

Otu n’ime ihe ahụ ọ chọrọ bụ nchegharị. (Ọrụ 3:19; 17:30) Nke ahụ gụnyere ịnakwere ihie ụzọ anyị nile na ime mgbanwe ndị dị mkpa. Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị nile nwere ọtụtụ ihe ọ dị mkpa ka anyị si n’ime ha chegharịa. Ma ọ bụrụ na mmadụ ekwere na ya bụ onye na-apụghị imeli ihe ọ bụla akara aka na-achịkwa, o siri ike inwe mmetụta nke ịdị mkpa ichegharị ma ọ bụ ịnakwere njehie ya.

Onye ọbụ abụ ahụ kwuru banyere Chineke, sị: “Ebere Gị dị mma karịa ndụ.” (Abụ Ọma 63:3) Ma, nkweta n’akara aka emewo ka ọtụtụ nde kwere na Chineke bụ onye haziri nhụsianya ha. Dị ka o si adịkarị, nke a emewo ka ọtụtụ nwee obi ilu n’ebe ọ nọ, na-emechi ụzọ nke ha inwe ezi mmekọrịta chiri anya n’ebe Onye Okike ahụ nọ. E kwuwerị, olee otú ị ga-esi nwee ịhụnanya maka onye i lere anya dị ka onye na-akpata nsogbu na ọnwụnwa gị nile? Nkwenkwe akara aka si otú a guzobe ihe mgbochi n’etiti Chineke na mmadụ.

Onye A Tọhapụrụ Pụọ n’Aka Ike nke Akara Aka

Nwa okorobịa bụ́ Ousmane, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, bụbu onye nkweta n’akara aka ji n’ohu. Otú ọ dị, mgbe Ndịàmà Jehova nyeere ya aka iji Bible nyochaa echiche ya, a kpaliri Ousmane ịgbahapụ okwukwe o kwere n’akara aka. Ihe ndị si na ya pụta bụ echiche ukwuu nke inwe ahụ efe na echiche ọhụrụ, nke ziri ezi banyere ndụ. Nke ka mkpa, ọ bịawo mara Jehova dị ka Chineke “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.”—Ọpụpụ 34:6.

Ousmane abịawokwa ghọta na Chineke, ọ bụ ezie na ọ dịghị atụ ụkpụrụ ihe nile banyere ndụ anyị, nwere nzube maka ọdịnihu.a Pita nke Abụọ 3:13 na-asị: “Dị ka nkwa Ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” Ndịàmà Jehova enyeworo ọtụtụ nde aka ịzụlite olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi dị ka akụkụ nke “ụwa ọhụrụ” a e kwere ná nkwa. Ọ ga-amasịkwa ha inyere gị aka.

Ka ị na-eto n’ezi ihe ọmụma nke Bible, ị ga-abịa ghọta na ọdịnihu gị adabereghị n’akara aka e bu ụzọ kpebie nke ị na-apụghị ịchịkwa. Okwu nke Mosis gwara ndị Israel oge ochie dabakwara nke ọma: “Ọ bụ ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ Ya.” (Deuterọnọmi 30:19, 20) Ee, ị pụrụ ịhọrọ ihe ọdịnihu gị ga-abụ. Ọ dịghị n’aka akara aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Maka ntụle zuru ezu nke ike Chineke nke ịma ihe tupu ha emee, lee Ụlọ Nche, January 15, 1985, peji nke 3-7.

[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]

Ọdachi ndị a abụghị ‘ọrụ aka Chineke’

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

U.S. Coast Guard photo

WHO

UN PHOTO 186208 /M. Grafman

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya