Isi 55
Ọtụtụ Ndị Na-eso Ụzọ Akwụsị Iso Jisọs
JISỌS nọ na-ezi ihe n’otu ụlọ nzukọ dị na Kapanaum banyere ọrụ ya dị ka ezi nri ahụ nke si n’eluigwe rịdata. Ihe àmà gosiri na okwu ya nke a bụ n’ịga n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ malitere mgbe ndị ahụ hụrụ ya, ka ha si n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galili lọghachi, bụ́ ebe ha riworo achịcha na azụ ndị ahụ e wepụtara n’ụzọ ọrụ ebube.
Jisọs gara n’ihu n’okwu ya, na-asị: “Nri nke mụ onwe m ga-enyekwa bụ anụ ahụ m, n’ihi ndụ nke ụwa.” Nanị afọ abụọ tupu mgbe ahụ, n’oge opupu ihe ubi nke afọ 30 O.A., Jisọs gwararịị Nikọdimọs na Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a na o nyere Ọkpara ya dị ka Onye Nzọpụta. Otú a, Jisọs na-egosi ugbu a na onye ọ bụla n’ime ụwa nke riri anụ ahụ ya n’ụzọ ihe atụ site n’igosi okwukwe n’àjà ọ gaje ịchụ n’oge na-adịghị anya, pụrụ inweta ndụ ebighị ebi.
Otú ọ dị, ndị ahụ sụrụ ngọngọ n’okwu Jisọs. Ha na-ajụ sị, ‘Onye a, si aṅaa nwee ike inye anyị anụ ahụ ya ka anyị rie?’ Jisọs chọrọ ka ndị na-ege ya ntị ghọta na iri anụ ahụ ya ga-abụ n’ụzọ ihe atụ. Ya mere, iji mesie nke a ike, o kwuru ihe ọzọ nke ga-akpasukwu ha iwe ma ọ bụrụ na a ghọta ya n’ụzọ nkịtị.
Jisọs na-ekwu sị, “Ọ bụrụ na unu erighị anụ ahụ nke Nwa nke mmadụ, ọ bụrụkwa na unu aṅụghị ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu. Onye na-eri anụ ahụ m, nke na-aṅụkwa ọbara m, o nwere ndụ ebighị ebi; mụ onwe m ga-emekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. N’ihi na anụ ahụ m bụ ihe oriri n’ezie, ọbara m bụkwa ihe ọṅụṅụ n’ezie. Onye na-eri anụ ahụ m, nke na-aṅụkwa ọbara m, ọ na-anọgide n’ime m, mụ onwe m kwa n’ime ya.”
N’eziokwu, ọ bụrụ na ihe Jisọs na-atụ aro ya n’ebe a bụ iri anụ mmadụ, ozizi ya ga-abụ ihe mkpasu iwe. Ma, o doro anya na Jisọs adịghị akwado iri anụ mmadụ ma ọ bụ ịṅụ ọbara n’ụzọ nkịtị. Ihe ọ na-eme bụ nanị imesi okwu ahụ ike nke bụ na ndị nile na-anara ndụ ebighị ebi aghaghị igosi okwukwe n’àjà ahụ nke ọ gaje ịchụ mgbe o nyere ahụ mmadụ ya zuru okè, wụpụkwa ọbara ndụ ya. Ma, ọbụna ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya emeghị mgbalị ọ bụla ịghọta ozizi ya, wee si otú a jụ, na-asị: “Okwu a dị ike; ònye pụrụ ịnụ ya?”
Ebe ọ matara na ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya na-atamu ntamu, Jisọs na-asị: “Ọ̀ bụ nke a na-eme ka unu ma n’ọnyà? Ùnu agaghị amakarịkwa n’ọnyà ma ọ bụrụ na unu ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-arịgo n’ebe ọ nọrịị mbụ? . . . Okwu nke mụ onwe m gwaworo unu, ha bụ mmụọ, bụrụkwa ndụ. Ma ụfọdụ ndị na-ekweghị dị n’etiti unu.”
Jisọs gara n’ihu, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka m sịworo unu, na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na e nyeghị ya site n’aka Nna m.” Na nke ahụ, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ ya wee kwụsị iso ya. Jisọs wee chigharịkwuru ndị ozi 12 ahụ, na-ajụ, sị: “Unu onwe unu ọ̀ na-achọkwa ịla?”
Pita zara, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-ejekwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi. Ọzọ, anyị ekwerewo marakwa na gị onwe gị bụ Onye Nsọ ahụ nke Chineke.” Lee nnọọ ezi ngosipụta nke iguzosi ike n’ihe nke a bụ, ọ bụrịị ezie na ọ pụrụ ịbụ na Pita na ndị ozi ndị ọzọ ahụ aghọtachaghị ozizi Jisọs n’okwu a!
Ọ bụ ezie na nzaghachi Pita masịrị ya, Jisọs kwuru, sị: “Ọ́ bụghị mụ onwe m họpụtara unu, bụ́ ndị ozi iri na abụọ, ma otu onye n’ime unu bụ nwa Ekwensu [“onye nkwutọ,” NW].” Ọ na-ekwu banyere Judas Iskarịọt. Ọ pụrụ ịbụ na n’oge a, Jisọs hụtara n’ime Judas, “mmalite” ma ọ bụ mbido nke ụzọ ọjọọ.
Ọ dịbeghị anya Jisọs ka kụdasịrị ndị mmadụ obi site n’ịjụ mgbalị ha mere ime ya eze, ha pụkwara ịdị na-eche sị, ‘Olee otú onye a ga-esi bụrụ Mesaịa ahụ ma ọ bụrụ na ọ gaghị anara ọnọdụ kwesịrị Mesaịa ahụ?’ Nke a ga-abụkwa okwu ka dị ọhụrụ n’uche ndị ahụ. Jọn 6:51-71; 3:16.
▪ N’ihi ole ndị ka Jisọs nyere anụ ahụ ya, oleekwa ụzọ ndị a ga-esi ‘rie anụ ahụ ya’?
▪ Okwu ndị ọzọ dị aṅaa Jisọs kwuru wụrụ ndị ahụ ibubo n’ahụ, ma gịnị ka ọ na-emesi ike?
▪ Mgbe ọtụtụ ndị kwụsịrị iso Jisọs, gịnị bụ nzaghachi Pita?