ISI MBỤ
È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
1. N’ihi gịnị ka ezinụlọ ndị siri ike ji dị mkpa n’ọha mmadụ?
EZINỤLỌ bụ ndokwa kasị ochie n’elu ala, ọ na-ekerekwa òkè dị mkpa n’ọha mmadụ. N’akụkọ ihe mere eme nile, ezinụlọ ndị siri ike enyewo aka iguzobe ọha mmadụ ndị siri ike. Ezinụlọ bụ ndokwa kasị mma maka ịzụlite ụmụaka ịghọ ndị okenye tozuru okè.
2-5. (a) Kọwaa ụdị mmetụta ịnọ ná ntụkwasị obi nke nwata na-enwe n’ime ezinụlọ obi ụtọ. (b) Nsogbu ndị dị aṅaa ka a na-akọ akụkọ ha n’ezinụlọ ụfọdụ?
2 Ezinụlọ obi ụtọ bụ ebe mgbaba nke nchebe na ịnọ ná ntụkwasị obi. Chetụ echiche banyere ezinụlọ nke bụ ihe nlereanya. N’oge nri anyasị ha, nne na nna na-ahụ n’anya na-esoro ụmụ ha nọkọọ ma tụlee ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ. Ụmụaka ji obi ụtọ ekwu okwu ka ha na-akọrọ nne na nna ha ihe mere n’ụlọ akwụkwọ. Oge izu ike e nwekọrọ ọnụ na-enye onye ọ bụla ume ọhụrụ maka ụbọchị ọzọ n’ụwa nke dị n’èzí.
3 N’ezinụlọ obi ụtọ, nwata na-amata na nne na nna ya ga-elekọta ya mgbe ọ dara ọrịa, ikekwe na-anọnyere ya n’abalị, otu onye nọtụ nke ọzọ anọtụkwa. Ọ maara na ya pụrụ iji nsogbu nke ndụ nwata ya jekwuru nne ma ọ bụ nna ya ma nweta ndụmọdụ na nkwado. Ee, nwata ahụ na-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe, n’agbanyeghị otú ụwa nke dị n’èzí pụrụ isi jupụta ná nsogbu.
4 Mgbe ụmụaka tolitere, ha na-alụkarị di ma ọ bụ nwunye ma nwee ezinụlọ nke aka ha. “Mmadụ na-aghọta ụzọ o siri jiri ndị mụrụ ya ụgwọ mgbe o nwere nwa nke aka ya,” ka otu ilu Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-ekwu. Ná mmetụta miri emi nke obi ekele na ịhụnanya, ụmụaka ndị toworo eto na-agbalị ime ezinụlọ ndị nke aka ha obi ụtọ, ha na-elekọtakwa ndị mụrụ ha na-eme agadi ugbu a, bụ́ ndị ọ na-amasị isoro ụmụ ụmụ ha nọkọọ.
5 Ikekwe ị na-eche ugbu a, sị: ‘Ahụrụ m ezinụlọ m n’anya, ma ọ dịghị ka nke a kọwapụrụ ugbu a. Mụ na onye òtù ọlụlụ m na-arụ ọrụ ná nhazi oge dịrịtara iche, ọ na-esikwa ike ịhụ onwe anyị anya. Ihe anyị na-ekwurịtakarị banyere ya bụ nsogbu ego.’ Ka ị̀ na-asị, ‘Ụmụ m na ụmụ ụmụ m bi n’obodo ọzọ, anaghịkwa m ahụ ha anya ma ọlị’? Ee, n’ihi ihe ụfọdụ ndị o metụtara na-apụghị ịchịkwa ọtụtụ mgbe, ọtụtụ ndụ ezinụlọ adịghị otú o kwesịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, ụfọdụ na-ebi ndụ ezinụlọ obi ụtọ. N’ụzọ dị aṅaa? È nwere isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ? Azịza ya bụ ee. Ma tupu a na-atụle ihe ọ bụ, anyị kwesịrị ịza otu ajụjụ dị mkpa.
GỊNỊ BỤ EZINỤLỌ?
6. Ụdị ezinụlọ dịgasị aṅaa ka a ga-atụle n’akwụkwọ a?
6 Ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ihe mejupụtara ihe ka n’ezinụlọ bụ nna, nne, na ụmụaka. Ndị nne na nna ochie pụrụ ibi n’ụlọ nke aka ha ruo ogologo oge ha nwere ike. Ọ bụ ezie na a ga-anọgide na-eso ndị ikwu ka dị anya na-enwe mmekọrịta, a kpaara ibu ọrụ n’ebe ndị a nọ ókè. N’ụzọ bụ isi, nke a bụ ezinụlọ anyị ga-atụle n’akwụkwọ a. Otú ọ dị, ezinụlọ ndị ọzọ na-aghọwanye ihe a na-ahụkarị n’afọ ndị a—ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna, ezinụlọ ebe a lụgharịrị di ma ọ bụ nwunye, na ezinụlọ ebe nne na nna na-ebikọghị ọnụ n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ.
7. Gịnị bụ ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ?
7 Ihe na-adịkarị n’ụfọdụ ọdịbendị bụ ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ. Ná ndokwa nke a, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ụmụ na-ekere òkè n’ilekọta ndị nne na nna ochie, ihe nkekọ ndị chiri anya na ibu ọrụ na-agbasapụkwa ruo ndị ikwu dị anya. Dị ka ihe atụ, ndị òtù ezinụlọ pụrụ inye aka ịkwado, ịzụlite, na ọbụna ịkwụ ụgwọ maka agụmakwụkwọ nke ụmụ nwanne ha nwanyị, ụmụ nwanne ha nwoke, ma ọ bụ ndị ikwu ka dị anya. Ụkpụrụ ndị a ga-atụle n’akwụkwọ a metụkwara ezinụlọ ndị gbasapụrụ agbasapụ.
EZINỤLỌ NỌ N’OKPURU NRỤGIDE
8, 9. Nsogbu ndị dị aṅaa ná mba ụfọdụ na-egosi na ezinụlọ na-agbanwe?
8 Taa ezinụlọ na-agbanwe—ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị gaa n’ụzọ ka mma. A na-ahụta otu ihe atụ n’India, ebe nwunye pụrụ ibi n’ezinụlọ nke di ya ma na-arụkwa ọrụ n’okpuru nduzi nke ndị ezinụlọ di ya. Otú ọ dị, taa, a na-ahụkarị ka ndị nwunye bụ́ ndị India na-achọ ọrụ n’èzí. Ma o doro anya na a ka na-atụkwa anya n’aka ha imezu òkè dịịrị ha n’ụlọ dị ka ọdịnala si dị. Ajụjụ na-ebilite n’ọtụtụ ala bụ, N’iji ya tụnyere ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ, ókè ọrụ ha aṅaa ka e kwesịrị ịtụ nwanyị na-arụ ọrụ n’èzí anya ịrụ n’ụlọ?
9 N’ọha mmadụ nile n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, nkekọ ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ siri ike bụ ọdịnala. Otú ọ dị, n’okpuru mmetụta nke ụdị onye na nke ya nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na nrụgide nke nsogbu akụ̀ na ụba, ezinụlọ gbasapụrụ agbasapụ nke ọdịnala na-aghọ ihe na-adịkwaghị ike. Ya mere, ọtụtụ na-ele nlekọta nke ndị òtù ezinụlọ meworo agadi anya dị ka ibu arọ kama ile ya anya dị ka ibu ọrụ ma ọ bụ ihe ùgwù. A na-emejọ ụfọdụ ndị nne na nna meworo agadi. N’ezie, a na-ahụta mmejọ na nleghara anya nke ndị agadi n’ọtụtụ mba taa.
10, 11. Eziokwu dịgasị aṅaa na-egosi na ezinụlọ na-agbanwe n’ala ndị Europe?
10 Ịgba alụkwaghịm na-aghọwanye ihe a na-ahụkarị. Na Spain, ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịgba alụkwaghịm rịrị elu ruo 1 n’ime alụmdi na nwunye 8 ná mmalite nke afọ iri ndị ikpeazụ nke narị afọ nke 20—oké ịrị elu site na 1 n’ime 100 nanị n’afọ 25 gara aga. Britain, nke a kọrọ na o nwere ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ịgba alụkwaghịm na Europe (a na-atụ anya na 4 n’ime alụmdi na nwunye 10 ga-ada), ahụwo ịrị elu mberede nke ọnụ ọgụgụ ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna.
11 Ọtụtụ na Germany yiri ka ha na-agbahapụ ezinụlọ ọdịnala kpam kpam. Afọ ndị 1990 hụrụ 35 pasent nke ezinụlọ nile na Germany ịbụ nke otu onye mejupụtara, 31 pasent bụkwa nke nanị mmadụ abụọ mejupụtara. Ndị France n’otu aka ahụ adịghị alụkarịkwa di na nwunye, ndị na-alụkwa na-agba alụkwaghịm ngwa ngwa karịa ka ọ na-adịbu na mbụ. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu na-ahọrọ ibikọta ọnụ n’enweghị ibu ọrụ nke alụmdi na nwunye. A na-ahụ ihe a pụrụ iji tụnyere nke a n’ebe nile n’ụwa.
12. Olee ụzọ ụmụaka si ata ahụhụ n’ihi mgbanwe n’ezinụlọ nke oge a?
12 Gịnị banyere ụmụaka? Na United States na ọtụtụ ala ndị ọzọ, a na-amụ ọtụtụ ụmụ tupu a gbaa akwụkwọ, ụfọdụ nye ndị ka banyere n’afọ iri na ụma (ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu). Ọtụtụ ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma nwere ụmụaka sitere ná nna dị iche iche. Akụkọ a na-enweta na gburugburu ụwa na-akọ banyere ọtụtụ nde ụmụaka na-enweghị ebe obibi ndị na-awagharị n’okporo ụzọ; ọtụtụ na-agbapụ n’ezinụlọ ebe a na-emetọ ha ma ọ bụ bụrụ ndị ndị ezinụlọ na-apụkwaghị ịkwado ha chụpụrụ.
13. Olee nsogbu ndị jupụtara ebe nile bụ́ ndị na-anapụ ezinụlọ obi ụtọ?
13 Ee, ezinụlọ nọ n’ọgba aghara. Tinyere ihe ndị a kpọtụwororị uche na ha, nnupụisi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma, mmetọ ụmụaka, ime ihe ike nke di ma ọ bụ nwunye, aṅụrụma, na nsogbu ndị ọzọ na-emebi ihe na-anapụ ọtụtụ ezinụlọ obi ụtọ. Nye ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka na ndị meworo okenye, ezinụlọ abụtụghị ebe nchebe.
14. (a) Dị ka ụfọdụ na-ekwu, gịnị bụgasị ihe na-akpata ọgba aghara ezinụlọ? (b) Olee ụzọ otu ọkàiwu nke narị afọ mbụ si kọwaa ụwa nke taa, mmetụta dịkwa aṅaa ka mmezu nke okwu ya nweworo ná ndụ ezinụlọ?
14 Gịnị mere e ji nwee ọgba aghara ezinụlọ? Ụfọdụ na-ata mbanye ndị inyom banyere n’ụlọ ọrụ ụta. Ndị ọzọ na-arụ aka ná ndakpọ omume. A na-ehotakwa ihe ndị ọzọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, otu ọkàiwu a ma ama buru amụma na ọtụtụ nrụgide ga-adakwasị ezinụlọ, mgbe o dere, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghi ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-4) Ònye ga-agbagha na okwu ndị a na-emezu taa? N’ụwa nke nwere ọnọdụ ndị dị otú a, ọ̀ bụ ihe ijuanya na ọtụtụ ezinụlọ nọ n’ọgba aghara?
ISI IHE NA-AKPATA OBI ỤTỌ EZINỤLỌ
15-17. N’akwụkwọ a, ikike dị aṅaa ka a ga-arụtụ aka dị ka nke nwere isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ?
15 A na-esi n’akụkụ nile enye ndụmọdụ banyere ụzọ a pụrụ isi nweta obi ụtọ n’ime ezinụlọ. N’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, ọnụ ọgụgụ a na-apụghị ịgụta ọnụ nke akwụkwọ na magazin ndị e ji akụziri onwe onye ihe na-enye okwu ndụmọdụ. Nsogbu bụ na ndị ndụmọdụ bụ́ mmadụ na-emegiderịta onwe ha, a pụkwara ile ndụmọdụ a na-anakwere taa anya dị ka ihe na-adịghị irè echi.
16 Ya mere, olee ebe anyị pụrụ ile anya maka nduzi ezinụlọ a pụrụ ịtụkwasị obi? Ị̀ pụrụ ilegara akwụkwọ e dechara ihe dị ka 1,900 afọ gara aga anya? Ka ị̀ ga-eche na akwụkwọ dị otú ahụ aghaghị ịbụ ihe oge ya gafeworo nnọọ? Eziokwu bụ na a na-ahụta isi ihe bụ ezie nke na-akpata obi ụtọ ezinụlọ n’isi iyi dị nnọọ otú ahụ.
17 Isi iyi ahụ bụ Bible. Dị ka ihe àmà nile na-egosi, o sitere n’obi Chineke n’onwe ya. N’ime Bible anyị na-achọta okwu ndị na-esonụ: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” (2 Timoti 3:16) N’ime akwụkwọ a anyị ga-agba gị ume ịtụle ụzọ Bible pụrụ isi nyere gị aka ‘ime ka uche guzozie’ mgbe ị na-achịkwa nrụgide na nsogbu ndị na-eche ezinụlọ ihu taa.
18. Gịnị mere o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ịnakwere Bible dị ka ihe nwere ikike n’ịdụ ọdụ banyere alụmdi na nwunye?
18 Ọ bụrụ na ị na-enwekarị echiche nke ileghara ikwe omume nke na Bible pụrụ inye aka ime ka ezinụlọ nwee obi ụtọ anya, tụlee nke a: Onye Bible sitere n’obi ya bụ Onye Mmalite nke ndokwa alụmdi na nwunye. (Jenesis 2:18-25) Bible na-asị na aha ya bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Ọ bụ Onye Okike na ‘Nna Onye e sitere na Ya gụọ eriri nna nile aha.’ (Ndị Efesọs 3:14, 15) Jehova ekiriwo ndụ ezinụlọ eri mmalite nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ maara nsogbu ndị pụrụ ibilite, o nyewokwa ndụmọdụ maka ịgwọta ha. N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị jiworo ezi obi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ezinụlọ ha chọtara obi ụtọ ka ukwuu.
19-21. Ahụmahụ ndị dị aṅaa nke oge a na-egosi ike nke Bible n’idozi nsogbu nke alụmdi na nwunye?
19 Dị ka ihe atụ, otu nwunye na-anọ n’ụlọ n’Indonesia bụ onye ịgba chaa chaa riri ahụ. Ruo ọtụtụ afọ o leghaara ụmụ atọ ya anya ma na-esesa di ya okwu mgbe nile. E mesịa ọ malitere ịmụ Bible. Nwayọọ nwayọọ nwanyị ahụ bịara kweta ihe Bible kwuru. Mgbe o tinyere ndụmọdụ ya n’ọrụ, ọ ghọrọ nwunye ka mma. Mgbalị ya nile, na-adabere n’ụkpụrụ Bible, wetaara ezinụlọ ya dum obi ụtọ.
20 Otu nwunye na-anọ n’ụlọ na Spain kwuru, sị: “Anyị ka lụrụ di na nwunye nanị otu afọ mgbe anyị malitere inwe nsogbu siri oké ike.” Ya na di ya adịghị ekwekọrịta n’ọtụtụ ihe, ha adịghị ekwukebekwa okwu e wezụga mgbe ha na-arụrịta ụka. N’agbanyeghị inwe otu obere nwa nwanyị, ha kpebiri inweta nkewa nke iwu kwadoro. Otú ọ dị, tupu nke ahụ emee, a gbara ha ume ileba anya n’ime Bible. Ha mụrụ ndụmọdụ ya maka ndị di na nwunye ma malite itinye ya n’ọrụ. N’oge na-adịghị anya, ha pụrụ ikwurịta okwu n’udo, e jikwa obi ụtọ jikọta obere ezinụlọ ha.
21 Bible na-enyekwara ndị meworo okenye aka. Dị ka ihe atụ, tụlee ahụmahụ nke otu di na nwunye bụ́ ndị Japan. Di ahụ na-ewe iwe ọkụ, mgbe ụfọdụkwa na-eme ihe ike. Mbụ, ụmụ ndị nwanyị nke di na nwunye ahụ malitere ịmụ Bible, n’agbanyeghị mmegide ndị mụrụ ha. E mesịa, di ahụ sonyeere ụmụ ya ndị nwanyị, ma nwunye ahụ nọgidere na-emegide emegide. Otú ọ dị, n’afọ ndị na-agafenụ, ọ hụtara mmetụta dị mma nke ụkpụrụ Bible na-enwe n’ahụ ezinụlọ ya. Ụmụ ya ndị nwanyị lekọtara ya nke ọma, di ya ghọkwara onye dịkwu nro nke ukwuu. Ụdị mgbanwe dịgasị otú a kwaliri nwanyị ahụ ileba anya n’ime Bible n’onwe ya, o nwekwara otu ụdị mmetụta ahụ dị mma n’ahụ ya. Nwanyị a meworo agadi kwuru ugboro ugboro, sị: “Anyị ghọrọ di na nwunye n’ezie.”
22, 23. Olee ụzọ Bible si enyere ndị si ná mba nile aka ịchọta obi ụtọ ná ndụ ezinụlọ ha?
22 Ndị a so n’etiti oké ìgwè mmadụ ndị mụtaworo isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ. Ha anabatawo ndụmọdụ Bible ma tinye ya n’ọrụ. N’eziokwu, ha na-ebi n’otu ụwa ahụ nke jupụtara n’ime ihe ike, omume rụrụ arụ, na nke nrụgide akụ̀ na ụba dị ka ndị ọzọ nile. Ọzọkwa, ha ezughị okè, ma ha na-achọta obi ụtọ n’ịgbalị ime uche Onye Mmalite nke ndokwa ezinụlọ. Dị ka Bible na-asị, Jehova Chineke bụ “Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.
23 Ọ bụ ezie na e dechara Bible n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, ndụmọdụ ya dị irè n’ezie ruo oge a. Ọzọkwa, e dere ya maka mmadụ nile. Bible abụghị akwụkwọ ndị America ma ọ bụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa. Jehova ‘si n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ,’ Ọ makwaara banyere ụzọ e si mee mmadụ n’ebe nile. (Ọrụ 17:26) Ụkpụrụ Bible na-arụ ọrụ maka onye ọ bụla. Ọ bụrụ na i tinye ha n’ọrụ, gị onwe gị kwa ga-abịa mụta isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ.