Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/99 p. 1
  • Yikwasị Mmadụ Ọhụrụ Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Yikwasị Mmadụ Ọhụrụ Ahụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-ejegharịnụ Dị Ka Ụmụ Nke Ìhè”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Eyipụla “Àgwà Ọhụrụ” Mgbe I Mechara Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ị Ga-eyipụli “Àgwà Ochie” Ahụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • “Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 2/99 p. 1

Yikwasị Mmadụ Ọhụrụ Ahụ

1 Ndị Kraịst nwere ekele maka ịmata eziokwu ahụ! Anyị amụtawo otú anyị ga-esi bie ndụ iji zere ụzọ ndụ nke ndị nọ n’ụwa. Ebe ha bụ “ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị,” ha ‘nọ n’ọchịchịrị n’echiche uche ha.’ (Efe. 4:18) A kụziworo anyị ịgbanwe uche anyị pụọ n’echiche ụwa site n’iyipụ mmadụ ochie na iyikwasị nke ọhụrụ.—Efe. 4:22-24.

2 Mmadụ ochie na-eduga n’ịnọgide na-adaba n’omume rụrụ arụ, na-akpata mmerụ na ọnwụ. Ya mere, anyị na-akpọku ndị ga-aṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ ka ha yipụ iwe, ọnụma, ihe ọjọọ, nkwulu, na okwu ihere nile. Ndị chọrọ inweta ihu ọma Chineke aghaghị iyipụchasị mmadụ ochie ahụ kpam kpam—otú ha ga-esi yipụ uwe ruru unyi.—Kọl. 3:8, 9.

3 Ike Ọhụrụ nke Na-achịkwa Uche: Iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ na-agụnye ịbụ onye e mere ka ọ dị ọhụrụ n’ike nke na-achịkwa uche anyị. (Efe. 4:23, NW) Olee otú mmadụ si eme ka ike, ma ọ bụ echiche uche ahụ dị ọhụrụ, iji bụrụ nke e chere ihu n’ebe kwesịrị ekwesị? A na-eme nke a site n’iji ịdị uchu na-amụ Okwu Chineke mgbe nile na ịtụgharị uche n’ihe ọ pụtara. Mgbe ahụ ụzọ ọhụrụ nke iche echiche na-amalite, onye ahụ na-ahụkwa ihe otú Chineke na Kraịst si ahụ ya. Ndụ mmadụ na-agbanwe ka ọ na-eyikwasị onwe ya ọtụtụ àgwà yiri nke Kraịst, gụnyere obi ebere, obiọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi, na ịhụnanya.—Kọl. 3:10, 12-14.

4 Site n’iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, anyị na-ekewapụ onwe anyị iche pụọ n’ụwa. Ụzọ ndụ anyị na-eme ka anyị dị iche. Anyị na-ekwu eziokwu ma na-eji okwu dị mma ewuli ndị ọzọ elu. Anyị na-achịkwa iwe anyị, obi ilu, iti mkpu, nkwulu, na ihe ọjọọ nile ma na-eji àgwà ezi omume, nke nsọpụrụ Chineke edochi ihe ndị a. Anyị na-eme ihe karịrị ihe a na-achọkarị n’aka anyị n’ịgbaghara mmehie. Anyị na-eme ihe a nile site n’obi anyị nile.—Efe. 4:25-32.

5 Ya adịla mgbe ị ga-eyipụ mmadụ ọhụrụ ahụ. Anyị apụghị ijere Jehova ozi n’ụzọ ọ ga-anabata ma e wezụga ya. Kwee ka o nye aka dọta ndị mmadụ n’ebe eziokwu ahụ dị, kweekwa ka o too Jehova, bụ́ Onye Okike nke mmadụ ọhụrụ anyị magburu onwe ya.—Efe. 4:24.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya