Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/99 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka February

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka February
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite February 1
  • Izu Na-amalite February 8
  • Izu Na-amalite February 15
  • Izu Na-amalite February 22
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 2/99 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka February

Izu Na-amalite February 1

Abụ nke 154

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi maka January.

17 min: “Nyefee Ndị Nọ n’Afọ Ndụ Nile Akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ.” Onye okenye esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru kwurịta isiokwu ahụ. Lekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ bụ́ inyere ndị ọzọ aka ịmata na isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ bụ ịgbaso ndụmọdụ Bible. (Lee Obi Ụtọ Ezinụlọ, peji nke 9-12.) Mee ihe ngosi nke otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu a tụrụ aro ha. Gosi ụzọ isi mee atụmatụ maka nletaghachi.

18 min: “Yikwasị Mmadụ Ọhụrụ Ahụ.” Okwu, nke na-akọwa Ndị Efesọs 4:20-24. (Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1993, peji nke 14-18, paragraf nke 4-17.) Kọwaa otú anyị si eyipụ mmadụ ochie ma na-eyikwasị nke ọhụrụ. Tụlee àgwà ụfọdụ nke ndị mezuworo nke a na-egosipụta.

Abụ nke 4 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 8

Abụ nke 12

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Anyị Ritere Uru Site ná Mgbakọ ‘Ụzọ Ndụ nke Chineke.’” Ajụjụ na azịza. Gosi akwụkwọ na broshuọ ọhụrụ ahụ, ma kọwapụta ụzọ ndị anyị pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ụzọ dị mma.

Abụ nke 42 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 15

Abụ nke 40

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Akụkọ Ọchịchị Chineke.

18 min: Olee Otú Anyị Si Erite Uru Site n’Ideba Aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke? Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee nke onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi. Inye ọzụzụ maka ikwu okwu n’ihu ọha abụghị nanị nzube nke ụlọ akwụkwọ ahụ. E nwere ụzọ ndị ọzọ anyị si erite uru kpọmkwem. (Lee Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ, peji nke 13-15.) Anyị na-amụta otú e si eso ndị ọzọ ekwurịta okwu n’ụzọ ka mma. A na-akụziri anyị ikwu okwu n’ụzọ doro anya, ahụ iru ala, na inwe obi ike onwe onye. Anyị na-aghọ ndị nwere nkà karị n’ịza ajụjụ banyere nkwenkwe anyị na ịkọwa mkpebi anyị ndị dabeere na Bible. Ihe ọmụma anyị nwere banyere Bible na-ebuwanye ibu, na-enyere anyị aka ịdị irè karị n’ịgba àmà nye ndị ọzọ. Anyị na-amụta ịnakwere adịghị ike anyị na ịnara ndụmọdụ, bụ́ nke na-eme ka anyị na-emeso ndị ọzọ n’ụzọ udo karị. Ọzụzụ ụlọ akwụkwọ ahụ na-enye anyị n’ozuzu ya na-enyere anyị aka ịnọgide na-abụ ndị ‘ruru eru’ dị ka ndị ozi Chineke.—2 Kọr. 3:5, 6.

17 min: “Ụzọ Ndị Òtù Ezinụlọ Si Emekọ Ihe Ọnụ Iji Kere Òkè Zuru Ezu—N’Ọmụmụ Bible.” Nkwurịta okwu otu ezinụlọ ga-enwe. Ha atụlee otú ha si etinye aro ndị a tụrụ banyere ọgụgụ Bible ezinụlọ na ọmụmụ ihe n’ọrụ bụ́ ndị dị n’Ụlọ Nche nke May 15, 1996, peji nke 14-15, na Ụlọ Nche nke October 15, 1992, peji nke 16-17.

Abụ nke 57 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 22

Abụ nke 170

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Ịgba Àmà n’Ihe Owuwu Ndị Nwere Ọtụtụ Ụlọ na Ụlọ Ndị E Nwere Ndị Nche na Ha. (Ọ bụrụ na e nwekebeghị ihe owuwu ndị nwere ọtụtụ ụlọ ma ọ bụ ụlọ ndị e nwere ndị nche na ha n’ókèala unu, tụlee isiokwu bụ́ “Gịnị Mere A Ga-eji Nwee Ihe Ndekọ nke Ndị Na-anọghị n’Ụlọ?” dị n’Ozi Alaeze Anyị nke May 1995.) Nkwurịta okwu a ga-eso ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ nwee. O siri ike ịgba àmà nye ndị bi n’ihe owuwu ndị nwere ọtụtụ ụlọ bụ́ ebe mkparịta ụka a pụrụ inwe bụ nanị ihe ndị a pụrụ ikwu n’ígwè ozi intercom. O sikwara ike n’ebe ị ga-ahụ nanị onye nche, o kweghịkwa ka ị hụ ndị bi n’ụlọ ahụ. Tụlee ụzọ isi kpalie mmasị. N’ụzọ enyi, kọwaa onwe gị dị ka onye agbata obi; jiri aha onye nwe ụlọ mee ihe ma ọ bụrụ na ọ dị n’akwụkwọ telifon; kwuo isiokwu kwesịrị ekwesị ị chọrọ ịtụle, ma ọ bụ gụpụta otu okwu mmeghe kpọmkwem site n’akwụkwọ nta ahụ bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, peji nke 2-7; kọwaakwa na ị chọrọ inye ya otu traktị, magazin, ma ọ bụ broshuọ zara otu ajụjụ dị mkpa, kwuokwa ajụjụ ọ bụ. N’ebe a na-enwekebeghị ike ịhụ ihu na ihu, degara ndị bi ebe ahụ akwụkwọ ozi ma ọ bụ gbaa àmà nye ha n’okporo ámá ka ha na-agafe. N’ihe banyere ndị nche, nye ha akwụkwọ ma gwa ha ka ha gosi ya onye nwe ụlọ ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya, gwakwa ya ụtụ ya. Mee ihe ngosi nke ụzọ e si agba àmà nye ndị bi n’ihe owuwu nwere ọtụtụ ụlọ n’ógbè unu bụ́ nke rụpụtaworo ezigbo ihe.

20 min: Otú E Si Achọta Ọṅụ n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke February 15, 1996, peji nke 19-22.

Abụ nke 91 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya