Ụzọ Ndị Òtù Ezinụlọ Si Emekọ Ihe Ọnụ Iji Kere Òkè Zuru Ezu—n’Ọmụmụ Bible
1 Eziokwu ahụ na-eme ka ndụ ezinụlọ nwekwuo ezi nzube, ma a dịghị anọkata nwee ihe ịga nke ọma n’ijere Jehova ozi. Ọ na-ewe oge na mgbalị iji wulite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ. E nwere mkpa dị ukwuu maka ndị òtù ezinụlọ imekọ ihe ọnụ n’ụzọ chiri anya na mgbalị a. Isiokwu mbụ a n’usoro isiokwu nwere akụkụ atọ ga-elekwasị anya n’ụzọ ezinụlọ pụrụ isi mekọọ ihe ọnụ n’ịzụlite àgwà dị mma banyere ịmụ ihe.
2 Site n’Ịdị Na-agụ Bible Kwa Ụbọchị: Ilu 24:5 na-ekwu na “onye nwere ihe ọmụma na-eme ka ike nwee ume.” Ihe ọmụma e nwetara site n’ịgụchi Okwu Chineke anya na-enye mmadụ ume dị mkpa iji guzogide mwakpo Setan na-awakpo ọnọdụ ime mmụọ ya. (Abụ Ọma 1:1, 2) Ùnu na-agụkọ Bible ọnụ dị ka ezinụlọ kwa ụbọchị? Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nwere “Usoro Ọgụgụ Bible Ntụkwasị” maka izu ọ bụla dị n’ime afọ a. Ịgbaso ya chọrọ nanị ihe dị ka minit iri n’oge ezinụlọ kwa ụbọchị. Họrọ oge ga-adịrị unu mma, dị ka n’oge nri ụtụtụ, mgbe e risịrị nri abalị, ma ọ bụ tupu a laba ụra, ịgụ Bible ma tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị site n’akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ. Mee ka nke a bụrụ akụkụ nke ihe ezinụlọ gị na-eme kwa ụbọchị.
3 Site n’Ịmụkọ Ihe Ọnụ Kwa Izu: Ọmụmụ Bible ezinụlọ kwesịrị ịbụ ihe kasị ezinụlọ mkpa n’izu. Onye òtù ezinụlọ ọ bụla kwesịrị ịkwado ya site n’ịdị njikere ikere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ. Onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịtụle mkpa ezinụlọ mgbe ọ na-ahọta ihe a ga-amụ na ụbọchị, oge, na oge ọmụmụ ihe ahụ ga-ewe. Tinye ọmụmụ ihe ezinụlọ n’ọnọdụ mbụ n’usoro ihe omume nke izu. Ekwela ka ihe ndị na-adịchaghị mkpa gbochie ya.—Fil. 1:10, 11.
4 Otu nna na-enwetakarị òkù fon n’ụlọ ya banyere achụmnta ego na-akwụpụ eriri telifon n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ. Ọ bụrụ na ndị ahịa ya abịa n’ụlọ ya, ọ na-akpọ ha ka ha sonye n’ọmụmụ ihe ahụ ma ọ bụ chere ruo mgbe ha mechiri. Nna ahụ kpebiri na ọ dịghị ihe ga-egbochi ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ. Nke a nwere mmetụta dị ukwuu n’ebe ụmụ ya nọ, ma banyere achụmnta ego ya, ọ gara nke ọma.
5 Lee ka o si enye obi ụtọ mgbe ndị òtù ezinụlọ mekọrọ ihe ọnụ n’ihe ime mmụọ! Ikwesị ntụkwasị obi ná mgbalị anyị ikere òkè zuru ezu n’ọmụmụ Bible ezinụlọ ga-eweta ngọzi Jehova.—Abụ Ọma 1:3.