Anyị Ritere Uru ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke”
1 Nanị ọnwa ole na ole gara aga, anyị nọ na-eme atụmatụ ịga Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998. Ugbu a ha aghọwo ihe omume kwesịrị ncheta n’akụkọ ọchịchị Chineke nke nzukọ a. Ụba nri ime mmụọ anyị nwetara ná mgbakọta ndị ahụ pụrụ iche tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu.
2 Mgbakọ ndị bụ́ nke mba nile ná mgbakọ nke afọ 1998 bụ n’ezie ndị na-akpali akpali. Ma ndị ozi ala ọzọ na ndị si ala ọzọ hà bịara ma ọ bụ na ha abịaghị, anyị nile nụrụ ahụmahụ ndị mara mma n’ihe omume ehihie Friday nke a kpọrọ “Ije Ozi n’Ubi Ala Ọzọ.” “Akụkọ Banyere Ọganihu nke Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ” site na gburugburu ụwa bụ́ ndị a gụrụ kwa ụbọchị bụ nnọọ oké ihe agbamume.
3 Ihe Ọhụrụ Ndị E Wepụtara Bụ́ Ịgba: Okwu ikpeazụ e kwuru na Friday zara ajụjụ ọtụtụ ndị na-amaghị eziokwu jụworo: “À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?” Okwu ahụ na-akpali nnọọ mmasị jiri mwepụta nke broshuọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, mechie. Ka ọ dị ugbu a ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị agụsịwo ya wee hụ uru ọ ga-aba n’inyere ndị mmadụ aka ịmata ihe bụ eziokwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na n’iji olileanya nke mbilite n’ọnwụ kasie ndị mmadụ nwụnahụrụ obi.
4 Usoro ihe omume ehihie Saturday ji okwu bụ́ “Onye Okike—Àgwà Ya na Ụzọ Ya Nile” mechie. O duuru anyị n’ụzọ ezi izu dị na ya gaa ná nkwubi okwu bụ́ na a ghaghị inwe Onye Okike. Iji nyere anyị aka inyere ndị ọzọ aka ịghọta eziokwu a, e wepụtara akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ekele anyị nwere maka ụdị onye ọ bụ na ụzọ ya nile bukwuo ibu, e dere akwụkwọ ahụ maka ndị, ọ bụ ezie na ha ma nke a na-akọ n’ihe ụwa, pụrụ ịbụ na ha ekweghị na Chineke.
5 Mkpebi Sitere n’Obi: Okwu ikpeazụ ná mgbakọ ahụ mesiri ike mkpa ọ dị ka anyị nile “Nọgide Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova.” Lee ka o si kwesị ekwesị na e kwupụtara nzube anyị zubesiri ike n’otu n’otu ịrapara, ịkwado, na ịkwalite ịka elu nke ụzọ ndụ nke Chineke n’ihu ọha n’ime mkpebi ahụ! (Aịsa. 30:21) Ugbu a anyị aghaghị ikpebisi ike ịdị ndụ kwekọrọ ná mkpebi ndị a. Lee mwuli elu ime mmụọ anyị nwetara site n’ịga Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke”!