Ibu Ụzọ Mee Atụmatụ Maka Ndị Anyị Hụrụ n’Anya
AKỤKỌ dị mwute nke Annie pụtara n’otu akwụkwọ akụkọ Africa na nso nso a. Di Annie bụ onye ọchụ nta ego. Ọ nwụrụ na 1995, na-ahapụ ụgbọala 15; ọtụtụ ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀; ihe dị ka $4,000 (U.S.) n’ego nkịtị; otu ụlọ ahịa; otu ụlọ mmanya; na otu ụlọ nwere ọnụ ụlọ atọ. Ihe ọ na-ahapụghị bụ ékpé.
A kọrọ na nwanne di Annie jichiri ihe onwunwe na ego ahụ ma manye ya na ụmụ ya isii isi n’ụlọ ha pụọ. N’atọgbọghị ihe ọ bụla, ya na ụmụ ya bizi n’ụlọ nwanne ya nwoke. Anọ n’ime ụmụ ya aghaghị ịkwụsị akwụkwọ, ebe ego na-adịghị maka ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ma ọ bụ uwe akwụkwọ.
Annie gbara akwụkwọ n’ụlọikpe dị elu, bụ́ nke kpebiri na e kwesịrị inyeghachi ya ụfọdụ ihe onwunwe, tinyere otu ụgbọala. Ma o nweghị ihe e weghachiri. Ọ ghaghị ijeghachi n’ụlọikpe iji nweta iwu ịmanye nwanne di ya ime ihe ụlọikpe ahụ dị elu kpebiri.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chee Banyere Ọnwụ?
Akụkọ Annie na-egosi ihe pụrụ ime mgbe onye isi ezinụlọ na-emeghị atụmatụ maka a dịghị ama ama ọ nwụọ. N’ọnwụ, mmadụ nile ‘na-ahapụrụ ndị ọzọ akụ̀ ha.’ (Abụ Ọma 49:10) Ọzọkwa, ndị nwụrụ anwụ enweghị ikike ọ bụla n’ihe e ji ihe onwunwe ha mee. (Eklisiastis 9:5, 10) Iji nwee ọnụ okwu n’ihe ga-eme ihe onwunwe ya, mmadụ aghaghị ịhazi ihe tupu ọ nwụọ.
Ọ bụ ezie na anyị nile maara na anyị pụrụ ịnwụ na mberede, ọtụtụ adịghị ebu ụzọ mee ndokwa maka ndị ha hụrụ n’anya dị ndụ. Ọ bụ ezie na ntụle anyị ga-elekwasị anya n’ìgwè ọdịnala ụfọdụ n’Africa, nsogbu yiri ndị a dị n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.
Ma ị ga-eme atụmatụ ụfọdụ banyere nkesa nke ihe onwunwe gị ma ọ bụrụ na ọnwụ adabata bụ okwu dịịrị onwe onye. (Ndị Galetia 6:5) Ma, mmadụ pụrụ ịjụ sị, ‘N’ihi gịnị ka mmadụ ga-eji hụ nwunye na ụmụ ya n’anya ma lekọta ha mgbe ọ dị ndụ ma ghara ime ndokwa maka ọdịmma ha ma ọ bụrụ na ọ nwụọ?’ Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ na-akpata ya bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime anyị adịghị achọ iche echiche banyere ikwe omume na anyị pụrụ ịnwụ, ka ọ fọdụkwa ime atụmatụ maka ọnwụ. N’ezie, anyị apụghị ibu ụzọ hụ ụbọchị ọnwụ anyị, dị ka Bible na-asị: “Unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi. . . . N’ihi na unu bụ alụlụ, nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya.”—Jemes 4:14.
Ime atụmatụ maka a dịghị ama ama anyị nwụọ bara uru. Ọ na-egosikwa nchegbu ịhụnanya maka ndị dị ndụ. Ọ bụrụ na anyị edokwaghị ihe omume anyị, ndị ọzọ ga-eme otú ahụ. Ikekwe ndị anyị na-ezutebeghị ga-eme mkpebi banyere ihe onwunwe na ndokwa olili anyị. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ná mba ụfọdụ, Ọchịchị na-ekpebi onye ga-enweta ego na ihe onwunwe anyị. N’ebe ndị ọzọ, ndị ikwu na-ekpebi, esemokwu nke na-akpalite obi ilu n’ime ezinụlọ na-esokarịkwa mkpebi ndị a. Ọzọkwa, ihe ndị e kpebiri pụrụ ịdị nnọọ iche n’ihe anyị gaara achọ.
Ịzọkọrọ Ihe Onwunwe
Nwanyị na-atakarịsị ahụhụ mgbe di ya nwụrụ. Tinyere iru újú nke di ya ịnwụnahụ ya, ọ na-abụkarị onye a na-azọkọrọ ihe onwunwe ya. A kọwara nke a na mbụ n’ihe banyere Annie. Otú a pụrụ isi na-ewere ndị nwunye so n’ihe mere e ji azọkọrọ ihe onwunwe. Ná mba ụfọdụ, a dịghị ele nwunye mmadụ anya dị ka akụkụ nke ezinụlọ ya. N’otu ụzọ, ọ bụ onye ala ọzọ nke pụrụ ịlaghachi n’ezinụlọ ya ma ọ bụ lụgharịa di banye n’ezinụlọ ọzọ n’oge ọ bụla. N’ụzọ megidere nke ahụ, ka a na-eche, ụmụnne na nne na nna nwoke agaghị ahapụ ya mgbe ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ nwụọ, ezinụlọ ya kwere na ihe bụ nke ya bụ nke ha, ọ bụghị nke nwunye ya na ụmụ ya.
Ndị bụ di na-adịghị ekpughere nwunye ha izu nzuzo na-akwalite echiche dị otú ahụ. Mike na-eso nanị ụmụnna ya ekwurịta banyere achụmnta ego ya. Ha maara ihe ihe onwunwe ya bụ, ma nwunye ya maara nnọọ ihe dị nta. Mgbe ọ nwụrụ, ụmụnna ya bịakwutere ya ma kwuo ka o nye ha ego di ya nọ na-atụ anya ya. Ọ maghịdị banyere ya. Ha jichiziri ígwè photocopier na typewriter ndị di ya zụtaara ya. E mesịa, ụmụnna di ya weghaara ụlọ ha na ihe nile dị n’ime ya. A manyere nwanyị a di ya nwụrụ na obere nwa ya nwanyị ịhapụ ụlọ, na-achịrị nanị ákwà ha.
“Ha Abụọ Ewee Ghọọ Otu Anụ Ahụ”
Ndị Kraịst bụ́ di na-ahụ nwunye ha n’anya ma were ha dị ka ndị kwesịrị ka a tụkwasị obi. Ndị ikom dị otú ahụ na-eburu n’uche ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya.” Ndị ikom a kwenyekwara n’okwu ndị ahụ e kwuru n’ike mmụọ nsọ Chineke: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya; ha abụọ ewee ghọọ otu anụ ahụ.”—Ndị Efesọs 5:28, 31.
Ndị bụ́ di na-atụ egwu Chineke na-ekwenyekwara onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) N’ikwekọ n’ụkpụrụ a, ọ bụrụ na onye Kraịst bụ́ di emee atụmatụ ime ogologo njem, ọ ga-ahụ na e lekọtara ezinụlọ ya n’oge ahụ ọ na-anọghị ya. N’otu aka ahụ, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na ọ ga-eme ndokwa maka nwunye na ụmụ ya a dịghị ama ama ya nwụọ? Ọ bụghị nanị na ọ bara uru kamakwa ọ bụ ịhụnanya ijikere maka ọdachi a na-atụghị anya ya.
Omenala Olili Ozu
Nye ndị Kraịst bụ́ di, e nwere akụkụ ọzọ nke okwu a ịtụle. Tinyere iru újú nke di ya ịnwụnahụ ya, mfu nke ihe onwunwe, na ma eleghị anya ọbụna ụmụ ya, ndị ụfọdụ na-amanye nwanyị di ya nwụrụ ime ememe iru újú ọdịnala. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian nke Nigeria kwara arịrị na n’ebe ụfọdụ, ọdịnala ga-achọ ka nwanyị rahụ n’otu ọnụ ụlọ ahụ gbara ọchịchịrị ebe ozu di ya dọ. N’ebe ndị ọzọ, a dịghị ekwe ka ndị inyom di ha nwụrụ hapụ ụlọ ha n’oge iru újú nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa isii. N’oge ahụ, ha agaghị asa ahụ, ọbụnakwa na a machibidoro ịkwọ aka tupu ma ọ bụ mgbe e risịrị nri.
Ọdịnala ndị dị otú ahụ na-eweta nsogbu, karịsịa nye ndị Kraịst di ha nwụrụ. Ọchịchọ ha ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na-akpali ha izere omenala ndị na-ekwekọghị n’ozizi Bible. (2 Ndị Kọrint 6:14, 17) Otú ọ dị, n’ihi erubeghị isi n’omenala ndị a, nwanyị di ya nwụrụ pụrụ inweta mkpagbu. Ọbụna na ọ pụrụ ịgba ọsọ maka ndụ ya.
Iwere Nzọụkwụ Ndị Iwu Kwadoro
Bible kwuru n’ụzọ amamihe dị na ya, sị: “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru.” (Ilu 21:5) Atụmatụ ndị dị aṅaa ka onye isi ezinụlọ pụrụ ime? N’ihe ka n’ọtụtụ ebe ọ na-ekwe omume ike ékpé ma ọ bụ ide akwụkwọ nke na-akọwa otú a ga-esi kee ihe onwunwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nwụọ. Ọ pụrụ ịgụnye nkọwa sara mbara banyere ndokwa olili ozu. Akwụkwọ ahụ pụkwara ịkapị ọnụ ihe di ma ọ bụ nwunye ga-eme (ma ọ bụ na-agaghị eme) n’ihe metụtara olili ozu na omenala iru újú.
Di otu nwanyị aha ya bụ Leah nwụnahụrụ ya na 1992. Ọ na-asị: “Enwere m ụmụ ise—ụmụ nwanyị anọ na otu nwoke. Di m rịara ọrịa ruo oge ụfọdụ tupu ọ nwụọ. Ma ọbụna tupu ọ daa ọrịa, o depụtara ná mpempe akwụkwọ na-ekwu na ọ chọrọ ka mụ na ụmụ anyị were ihe onwunwe ya nile. Nke a gụnyere ego inshọransị, ala ubi, ụmụ anụmanụ a na-akpa akpa, na otu ụlọ. Ọ bịanyere aka n’ékpé ahụ ma nye m ya. . . . Mgbe ọnwụ di m gasịrị, ndị ikwu ya chọrọ iketa n’ihe nketa ya. Agwara m ha na di m ji ego nke aka ya zụta ala ubi ahụ nakwa na ha enweghị ikike ọ bụla ịzọrọ ihe ọ bụla. Mgbe ha hụrụ ékpé ahụ e dere ede, ha nakweere ya.”
Isoro Ezinụlọ Kwurịta Okwu
Nsogbu pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na mmadụ adịghị agwa ezinụlọ ya banyere nkwenkwe na ọchịchọ ya. Tụlee banyere otu nwoke onye ndị ikwu ya siri ọnwụ na olili ya ga-ewere ọnọdụ n’obodo ha n’ụzọ kwekọrọ n’omenala ógbè ahụ. Mgbe e yiri ndụ ha egwu, a manyere nwunye ya na ụmụ ya ịhapụrụ ezinụlọ ha gbasapụrụ agbasapụ ozu ya. Ọ kwara arịrị, sị: “Ọ bụrụ na di m gwara ọbụna otu n’ime ụmụnne ya otú ọ chọrọ ka e si lie ya, ezinụlọ ahụ agaraghị esi ọnwụ n’ememe ili ozu ọdịnala ha.”
N’ebe ụfọdụ, nkwekọrịta e kwuru n’ọnụ na-adị irè ka akwụkwọ e dere ede. Nke a bụ ọnọdụ dị n’akụkụ ụfọdụ nke Swaziland, ebe ọtụtụ ndị nwere nkwenkwe ndị na-akwado usoro olili ozu na iru újú ọdịnala. N’ịmara nke a, otu nwoke bụ́ onye Kraịst aha ya bụ Isaac kpọrọ nzukọ nke ndị ikwu ya, bụ́ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, ma kwurịta ihe ọ chọrọ ka e mee mgbe ọ nwụrụ. Ọ gwara ha onye ga-enweta ihe onwunwe nke ọ bụla, ọ kọwakwara n’ụzọ doro anya otú a ga-esi lie ya. Mgbe ọ nwụrụ, ihe weere ọnọdụ dị ka ọchịchọ ya si dị. E liri Isaac n’ụzọ ndị Kraịst, e lekọtakwara nwunye ya anya nke ọma.
Chebe Ezinụlọ Gị
Ihe ị ga-eme iji chebe ezinụlọ gị ma ọ bụrụ na ị nwụọ bụ okwu aka gị, ma otu onye Kraịst aha ya bụ́ Edward na-ekwu, sị: “Enwere m ụkpụrụ inshọransị ndụ ga-abara ndị òtù asatọ nke ezinụlọ m uru. Nwunye m so abịanye aka n’ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ m. Ya mere ọ bụrụ na mụ anwụọ, ọ pụrụ ịdọrọ ego site n’ihe ndekọ ego ahụ. . . . Ekere m ékpé ịbara ezinụlọ m uru. Ọ bụrụ na mụ anwụọ, ihe ọ bụla m hapụrụ ga-abụ nke nwunye m na ụmụ m. Ekere m ékpé m afọ ise gara aga. Ọ bụ onye ọkàiwu dere ya, nwunye m na diọkpara m nwekwara otu ibe ya. N’akwụkwọ ike ékpé m, akapịrị m ya ọnụ na ezinụlọ m gbasapụrụ agbasapụ ekwesịghị itinye aka n’ili ozu m. Anọ m n’ime nzukọ Jehova. Ya mere ọ bụrụgodị nanị otu ma ọ bụ Ndịàmà abụọ nọ ya ili ozu m, nke ahụ ga-ezu. Esorowo m ezinụlọ m gbasapụrụ agbasapụ kwurịta nke a.”
N’otu ụzọ, ime ndokwa dị otú ahụ bụ onyinye nye ezinụlọ gị. N’ezie, ime atụmatụ a dịghị ama ama ị nwụọ adịghị ka onyinye nke swiiti ma ọ bụ ùkwù okooko osisi. Ma, ọ na-egosi ịhụnanya gị. Ọ na-egosi na ị chọrọ ‘ichere ndị ezinụlọ nke aka gị ihe na-akpa ha’ ọbụna mgbe gị na ha na-anọkwaghị.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]
Jisọs Cheere Nne Ya
“Ma nne Ya, na nwanne nne Ya nke nwanyị, Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalini, na-eguzo [osisi ịta ahụhụ, NW] Jisọs nso. Ya mere mgbe Jisọs hụrụ nne Ya, na onye ahụ nke na-eso ụzọ Ya, onye Ọ hụrụ n’anya, ka ọ na-eguzo nso, Ọ sị nne Ya, Nwanyị, lee, nwa gị nwoke! Mgbe ahụ Ọ sị onye ahụ nke na-eso ụzọ Ya, Lee, nne gị! Site n’oge hour ahụ onye ahụ nke na-eso ụzọ Ya [Jọn] wee kuru ya laa n’ụlọ nke aka ya.”—Jọn 19:25-27.
[Foto dị na peeji nke 22]
Ọtụtụ ndị Kraịst na-eji ezi uche eme ihe n’ụzọ iwu iji chebe ezinụlọ ha