Ọ̀ Bụ na Anyị Anụbeghị nke ahụ Mbụ?
1 N’ezie anyị anụla ya! Jehova na-ekwughachi ọtụtụ ihe dị n’Okwu ya maka abamuru nke ndị ya. Ọtụtụ mgbe Jisọs kwughachiri ihe ndị ọ kụziri banyere akụkụ dị iche iche nke Alaeze ahụ. Ndị ozi ya nọgidere soro ndị kwụsiri ike n’eziokwu ahụ na-atụleghachi ihe ime mmụọ.—Rom 15:15; 2 Pita 1:12, 13; 3:1, 2.
2 N’oge anyị, ọgbakọ Jehova emewo ndokwa ka a tụleghachi isiokwu ndị dị mkpa ugboro ugboro ná nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ. A mụwo akwụkwọ ụfọdụ ugboro ugboro. Ee, ọ dị mkpa ịnụ ihe ndị anyị nụworo mbụ!
3 Ikwughachi Ihe Na-egbo Oké Mkpa: Ihe ncheta Jehova na-eme ka anyị nwekwuo nghọta, na-eme ka ụzọ anyị si ele ihe anya sakwuo mbara ma na-eme ka mkpebi anyị ịnọgide na-aga ije n’ụzọ ime mmụọ sikwuo ike. (Abụ Ọma 119:129) Ịtụleghachi ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke yiri ile anya n’enyo. Ọ na-enyere anyị aka inyocha onwe anyị ma na-egbochi àgwà nke ịbụ “onye na-anụ anụ nke na-echezọ.”—Jes. 1:22-25.
4 Ọ bụrụ na anyị anọgideghị na-echetara onwe anyị eziokwu ahụ, ihe ndị ọzọ ga-agbanwe obi anyị. Ihe ncheta Chineke na-enye na-ewusi anyị ike iguzogide mmetụta ndị na-emetọ emetọ nke ụwa Setan. (Abụ Ọma 119:2, 3, 99, 133; Fil. 3:1) Ihe ncheta ndị anyị na-anụ mgbe mgbe banyere mmezu nke nzube dị iche iche nke Chineke na-akpali anyị ịdị ‘na-eche nche.’ (Mak 13:32-37) Ikwughachi eziokwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighi ebi.—Abụ Ọma 119:144.
5 Ụzọ Anyị Onwe Anyị Pụrụ Isi Rite Uru: Anyị aghaghị ‘iwezụga obi anyị iche ihe ncheta nile nke Chineke ihu.’ (Abụ Ọma 119:36) Mgbe a ga-atụle isiokwu anyị ma nke ọma ná nzukọ ọgbakọ, anyị kwesịrị ịkwadebe tupu oge eruo, gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha, ma tụgharịa uche n’otú anyị pụrụ isi jiri ihe ọmụma ndị ahụ mee ihe. Ka anyị ghara ịhapụ ịkwadebe maka ntụleghachi odide a na-enwe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na-eche na ọ dịghị mkpa. (Luk 8:18) Ya adịla mgbe anyị ga-ahapụ ịṅa ntị n’ihi na a na-ekwughachikarị eziokwu ndị bụ́ isi ná nzukọ anyị.—Hib. 5:11.
6 Ka anyị nwee omume yiri nke ọbụ abụ ahụ: “N’ụzọ [ihe ncheta, NW] Gị nile ka obi na-atọ m ụtọ, dị ka ọ ga-atọ m ụtọ banyere akụ̀ nile.” (Abụ Ọma 119:14) Ee, anyị anụwo ihe ndị a bara oké uru mbụ, o yikwara ka anyị ga-anụ ha ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova maara na ọ dị anyị mkpa ịnụ ha!