Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/99 p. 2
  • Usoro Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite December 6
  • Izu Na-amalite December 13
  • Izu Na-amalite December 20
  • Izu Na-amalite December 27
  • Izu Na-amalite January 3
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 12/99 p. 2

Usoro Nzukọ Ije Ozi

IHE ỊRỊBA AMA: Malite ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị, Usoro Nzukọ Ije Ozi ga na-enwe ndepụta maka Nzukọ Ije Ozi mbụ a ga-enwe n’ọnwa na-eso ya. A na-eme mgbanwe a iji mee ihe maka oge ọ pụrụ igbutụ iji nweta Ozi Alaeze Anyi.

Izu Na-amalite December 6

Abụ nke 207

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit.” Maa ọkwa ụbọchị a ga-enwe mgbakọ sekit ọzọ. Gbaa ndị ọhụrụ ume iche echiche banyere ịbụ ndị e mere baptism. Gbaa mmadụ nile ume ịnọ ya ná nnọkọ nke ọ bụla.

15 min: “Ṅomie Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu nke Jehova.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Kọwaa ihe eleghị mmadụ anya n’ihu pụtara, otú Jehova si egosipụta ya, na otú anyị pụrụ isi gosipụta nke a n’ozi anyị.—Lee akwụkwọ Insight, Mpịakọta nke 1, peji nke 1192, paragraf nke 4-7.

20 min: “Ọ̀ Bụ na Anyị Anụbeghị nke ahụ Mbụ?” Okwu na ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ otú ikwughachi ihe siworo nyere ha aka ịghọta na inwe ekele maka eziokwu ahu karị.—Lee Ụlọ Nche nke July 15, 1995, peji nke 21-22, na nke August 15, 1993, peji nke 13-14, paragraf nke 10-12.

Abụ nke 218 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 13

Abụ nke 39

IHE ỊRỊBA AMA: Anyị edokwaghị ihe omume ọ bụla n’usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi maka izu a. Nke a bụ n’ihi na a na-eme atụmatụ inwe ihe omume pụrụ iche maka izu a. A ga-enye nkọwa zuru ezu banyere nke a ka oge na-aga. A na-agba mmadụ nile ume ịnọ ya maka ihe omume ahụ pụrụ iche. Ọgbakọ ndị nwere mgbakọ distrikti ha n’izu a kwesịrị ịtụle ihe ọmụma ahụ n’izu na-esonụ.

Abụ nke 8 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 20

Abụ nke 219

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụọ aro ụzọ a pụru isi jiri akọ zaghachi ekele oge ememe. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu ma ọ bụ Onye-Ozizi Uku, gosi ụzọ a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ozi n’ụzọ dị irè n’oge ememe Kristmas.

13 min: Ịzaghachi Okwu Ndị Pụrụ Igbochi Nkwurịta Okwu. Nkwurịta okwu a ga-eso ndị na-ege ntị nwee na ihe ngosi. Gụpụta “Nkọwa” dị na peji nke 7-8 nke akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible. Họrọ ‘okwu abụọ ma ọ bụ atọ ndị na-egbochi nkwurịta okwu’ site na peji nke 8-12, ma ọ bụ jiri ndị ọzọ a na-anụkarị n’ókèala unu mee ihe. Tụleghachi ụfọdụ n’ime nzaghachi ndị a tụrụ aro ha, kọwaakwa ihe mere ha pụrụ iji dị irè n’ókèala unu. Mee ihe ngosi dị mkpirikpi banyere ole na ole n’ime ha. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ nzaghachi ndị ha jiworo mee ihe na ihe ndị dị mma si na ha pụta.

17 min: Èkwesịrị M Ịnara Ọrụ Metụtara Nzukọ Okpukpe? Okwu okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke April 15, 1999, peji nke 28-30. Ụfọdụ ndị anarawo ọrụ ndị dị otú ahụ ma mesịa chọpụta na ihe ha na-eme ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible. Tụlee ajụjụ ndị ọ dị mkpa ka anyị chebara echiche mgbe anyị na-eme mkpebi ma ànyị ga-arụ ọrụ ego metụtara okpukpẹ. Gbaa mmadụ nile ume ịgbaso ụzọ ga-eme ka ha nwee ọnọdụ dị mma n’ihu Jehova.—2 Kọr. 6:3, 4, 14-18.

Abụ nke 109 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 27

Abụ nke 166

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka December.

10 min: “Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọ̇chịchị Chineke Maka 2000.” Okwu onye nlekotạ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-ekwu. Tụlee mgbanwe ndị na-esonụ e mere n’usoro ihe omume maka afọ ọhụrụ. Ihe Omume nke 3 ga-adabere ‘n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu (Mbipụta nke 1998).’ Ihe Omume nke 4 ga-anọgide na-esite ‘n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu.’ N’ebe akara a (#) dị n’akụkụ ihe omume a, ọ ga-akasị mma ka nwanna nwoke mee ya. Gbaa mmadụ nile ume ka ha na-agụzu ọgụgụ Bible ha kwa izu, nakwa ka ha dị uchu n’ime ihe omume ha n’ụlọ akwụkwọ.

15 min: “Gịnị Ka Ị Ga-agwa Onye Na-ekweghị na Chineke?” Ajụjụ na azịza. Tụlee ihe dị iche iche mere na ọtụtụ ndị enwekwaghị okwukwe na Chineke. Tụọ arọ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gakwuru ha iji nyere ha aka ịhụ ezi uche dị n’ịmata na Chineke dị adị. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ dị nkenke. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ Reasoning, peji nke 145-151, na Mankind’s Search for God, isi nke 14.

15 min: Inyefe Akwụkwọ Ndị mere Ochie Karị na January. Okwu na ihe ngosi dị iche iche. Gosi akwụkwọ abụọ ma ọ bụ atọ mere ochie karị ndị nwere peji dị 192 ọgbakọ nwere, bụ́ ndị e biri tupu 1986, gbaakwa ndị nkwusa ume inweta ụfọdụ maka iji jee ozi ubi. (Ọ bụrụ na ọ dịghị nke dịnụ, tụlee akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe na January.) Kọwaa ihe mere akwụkwọ ndị a mere ochie karị ka ji dị irè n’ịzụlite mmasị na Bible. Mee ka isi ihe ndị a pụrụ iji nwee nkwurịta okwu na ihe osise ndị a pụrụ iji mee ihe n’ụzọ dị mma n’ịmalite mkparịta ụka bụ́ ndị dị n’akwụkwọ nke ọ bụla pụta ìhè. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. Ebe e gosiri mmasị, a pụrụ iji broshuọ Na-achọ malite ọmụmụ ihe.

Abụ nke 224 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 3

Abụ nke 10

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Mara Ụzọ Isi Zaghachi. (Kọl. 4:6) Okwu na ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Akwụkwọ Reasoning bụ ihe inyeaka magburu onwe ya n’ime ka e nwee ike isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible. Mgbe onye nwe ụlọ kwuru na ya ekwenyeghị n’otu n’ime nkwenkwe anyị, ikekwe anyị pụrụ iji akụkụ bụ́ “Ọ bụrụ na Mmadụ Ekwuo, Sị-” nke dị ná ngwụsị nke akụkụ na-ekwu banyere nkwenkwe mee ihe. Tụlee ihe ndị a na-ekwu banyere Bible bụ́ ndị e depụtara na peji nke 64-68, tụleekwa ihe mere nzaghachi ndị ahụ a tụrụ aro ha pụrụ iji dị irè.

25 min: “Mee Ka Ndụ Gị Hiwe Isi n’Ozi Jehova.” Ajụjụ na azịza. Gbaa otu onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwanyị na otu onyeisi ezinụlọ bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịnọgide na-agachi ozi ubi anya kwa izu ajụjụ ọnụ. Kwee ka ha kwuo nhazi onwe onye ndị dị mkpa iji bute ọdịmma ime mmụọ ụzọ.

Abụ nke 119 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya