Ì Nwere Ekele Maka Ndidi Jehova?
1 A sị na Jehova enweghị ndidi ruo afọ 10, 20, na karịa, gara aga, na-enye ohere ka a gbaa àmà sara mbara, ị̀ gaara amụta eziokwu ahụ? Lee ekele anyị nwere na o kwewo ka ọtụtụ ndị ọzọ “bịaruo nchegharị.” Ma, oké ụbọchị ikpe Jehova “ga-abịa dị ka onye ohi.” (2 Pita 3:9, 10) N’ihi ya, e kwesịghị ịghọtahie ndidi Chineke ịbụ igbu oge n’iweta usoro ihe a ná njedebe.—Hab. 2:3.
2 Nwee Obi Ebere n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ: Ogologo ntachi obi Jehova karịrị nnọọ nghọta anyị. Anyị ekwesịghị ichefu nzube nke ntachi obi ahụ. (Jona 4:1–4, 11) Jehova na-ahụ ọnọdụ dị mwute nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya, o nwekwara ọmịiko n’ebe ha nọ. Jisọs nwekwara otu mmetụta ahụ. N’imere ìgwè mmadụ o kwusaara ozi ọma ebere, ọ chọrọ ka ọrụ izisa ozi ọma ahụ gbasaa, ka ọtụtụ ndị ọzọ wee nwee ike inwe ohere nke inweta ndụ ebighị ebi.—Mat. 9:35-38.
3 Mgbe e nwere ọdachi, ọ̀ bụ na anyị adịghị emere ndị na-amaghị eziokwu ahụ ebere? Ndị mmadụ taa dị ka “atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha” ka ha na-agbalị ịnagide na ịghọta ihe kpatara ọgba aghara dị n’ụwa. (Mak 6:34) Site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, anyị na-akasi ndị nwere obi eziokwu obi ma na-egosipụta ekele anyị nwere maka ndidi Jehova.—Ọrụ 13:48.
4 Ọrụ Anyị Dị Ngwa: N’afọ gara aga, e mere mmadụ 323,439 baptism, ihe karịkwara 14,000,000 bịara Ememe Ncheta. Lee ohere e nwere maka ọtụtụ ndị ọzọ ịlanarị mbibi nke ajọ usoro ihe a! Anyị amaghị otú “oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-aharu. (Mkpu. 7:9) Anyị amaghị ogologo oge ọrụ nkwusa ahụ ga-adịru. Ma Jehova maara. A ga-ekwusa ozi ọma ahụ ruo n’ókè juru ya afọ, “mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Mat. 24:14.
5 Oge fọdụrụnụ dị mkpụmkpụ, ụbọchị Chineke dịkwa nso. (1 Kọr. 7:29a; Hib. 10:37) N’enweghị obi abụọ ọ bụla, “nzọpụta anyị dị nso karịa mgbe anyị kwere na mbụ.” (Ndị Rom 13:11) Ka nzube nke ndidi Chineke ghara ifunahụ anyị. Kama nke ahụ, ka anyị kwusaa ozi ọma ahụ ngwa ngwa ka ndị ọzọkwa agụụ ezi omume na-agụsi ike wee nwee ike inweta ebere dị ukwuu nke Jehova.