Na-enwe Ọganihu Ime Mmụọ n’Ozi Gị
1 Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha bụrụ ndị nkwusa nke ‘ozi ọma alaeze’ ahụ. (Mat. 24:14) Ọtụtụ ndị nkwusa nke ozi ọma a bụtụ ndị ọhụrụ, ahụmahụ ha nwere n’ozi pụkwara ịdị ntakịrị. Ị̀ bụ otu n’ime ha? Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi nwee ọganihu iji “jezuo ozi gị”?—2 Tim. 4:5.
2 Nwee Àgwà Ziri Ezi: Na-ele ọrụ ime nkwusa anya dị ka “akụ̀,” ihe ùgwù. (2 Kọr. 4:7) Mgbe anyị na-ekere òkè n’ozi, anyị na-egosi ịhụnanya anyị, iguzosi ike n’ihe anyị, na ikwesị ntụkwasị obi anyị nye Jehova. Anyị na-egosipụtakwa ezi mmasị anyị nwere n’ebe ndị agbata obi anyị nọ. (Luk 10:27) Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Nlereanya anyị, lere ọrụ ime nkwusa anya n’ụzọ dị mma. O nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ ma dị njikere mgbe nile inye aka. (Mat. 8:3) N’iṅomi Jisọs Kraịst, i kwesịrị ịbụ onye a kpaliri ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a ruo n’ókè ahụ ike gị na ọnọdụ gị nyere gị ohere ya.
3 Merie Ime Ihere: Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị na-eto eto na ndị nkwusa ọhụrụ nke ozi ọma aghaghị ịlụso ime ihere ọgụ. Ma a pụrụ imeri ime ihere. Otu onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru n’otu oge banyere onwe ya, sị: “Mgbe m ruru afọ iri na ụma, aghọrọ m nwa okoro na-emewanye ihere nke na-adịghị eso ndị ọzọ akpakọrịta. Ime ihere a ghọọrọ m nnukwute ihe mgbochi n’ọtụtụ ụzọ, ma, ọ ghọrọ ya karịsịa mgbe a bịara n’igosipụta okwukwe m site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ.” Olee otú o si merie nsogbu a? “O nweghị mgbe Jehova na-agwa onye ọ bụla n’ime anyị ka o mee ihe ọ maara na anyị agaghị emeli,” ka o kwuru. “Otú ọ dị, ọ bụ nanị site n’ike ya ka anyị ga-enwe ike ime ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ọzọkwa—ọ bụrụ na ị hụrụ ụmụnna gị ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ n’anya n’ezie, ha ga-enyere gị aka ma kwado gị.” N’ezie, iso ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ, bụ́ ndị nwere ahụmahụ, na-arụkọ ọrụ mgbe nile bụ nnukwute ihe enyemaka n’imeri nsogbu ime ihere.
4 Meziwanye Nkà Gị n’Ime Nkwusa: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi na-enye ọzụzụ dị mma na nke a. Itinye ihe ị na-amụta ná nzukọ ndị a n’ọrụ pụrụ ime ka i nwekwuo ọganihu ngwa ngwa n’ozi ahụ. Ọtụtụ mgbe, nzukọ ndị a atụwo aro ka anyị nwee nnọkọ mmụgharị ihe iji kwadebe maka ozi. Mmụgharị ihe dị otú a ga-eme ka i nwee ike ịdị na-ekwu okwu n’ụzọ na-aga were were karị, mee ka ị dị irè karị n’ime nkwusa, meekwa ka i nwekwuo obi ike. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụrụ na anyị abụrụ ndị ruru eru karị n’ozi, ọ ga na-atọ anyị ụtọ karị, anyị ga na-arụpụtakwa ihe karị.
5 Kpegara Jehova Ekpere: Ngwa ngwa anyị mere ihe nile anyị nwere ike ime iji merie ihe ndị na-egbochi ọganihu ime mmụọ, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka mmụọ Jehova nyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma. (1 Jọn 5:14, 15) Ọ na-enye anyị ọkịka nke ike.—2 Kọr. 4:7.
6 Ee, ọganihu ị na-enwe ga-enyere gị aka ọ bụghị nanị ịnọgide na-enwe ọṅụ na obi ụtọ ugbu a kamakwa inwe ọnọdụ e ji n’aka n’ime ụwa ọhụrụ Chineke, bụ́ ebe ị ga-enwe ike ịnọgide na-enwe ọganihu ruo mgbe ebighị ebi n’okpuru Alaeze eluigwe ya.