Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Nyere Ndị Òtù Ọlụlụ Na-abụghị Ndịàmà Aka?
1 Ọtụtụ ndị ohu Jehova lụrụ ndị nwere omume enyi n’ebe Ndịàmà nọ ma nwee mmasị n’ebe ọgbakọ dị kama ha na-ala azụ ịghọ ndị ohu Chineke. Otu di kwetara, sị: “Echiche nke ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ nnukwute ihe mgbochi nye m.” Ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ na-akpa àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, bụ́ ndị ọ ga-adị mkpa ka ha kwụsị, ma ọ bụ ha pụrụ iche na ha apụghị ịgbaso usoro ihe omume ọchịchị Chineke chiri anya nke onye òtù ọlụlụ ha na-agbaso. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ha aka?
2 Gosi Mmasị Onwe Onye: Inwe mmasị onwe onye n’ebe ndị ọzọ nọ nakwa ilebara nchegbu ha anya pụkwara ime ka ha nakwere eziokwu nke Bible. (Fil. 2:4) Ndị ha na onye òtù ọlụlụ ha na-adịbughị ekpe otu okpukpe na-ekwukarị banyere mmasị ịhụnanya nke ndị ọzọ gosiri ha. “José, bụ́ okenye n’ọgbakọ, zụlitere mmasị pụrụ iche n’ebe m nọ,” ka di ahụ e hotara ihe o kwuru ná mmalite kọwara. “Echere m na ọ bụ agbamume ya mesịrị mee ka m malite ịmụsi ihe ike.” Di ọzọ na-echeta na ụmụnna ndị na-eleta ya mere mgbalị iso ya kwurịta ihe ndị na-amasị ya. “M malitere ịhụ okpukpe [nwunye m] site n’ụzọ ile ihe anya dịwagara iche,” ka o kwuru. “Ndị enyi ya bụ ndị nwere nnọọ ọgụgụ isi dị elu, nwee ike ikwurịta okwu n’ụdị isiokwu dị iche iche.”—1 Kọr. 9:20-23.
3 Nye Nkwado A Na-ahụ Anya: Ndị òtù ọlụlụ na-abụghị Ndịàmà pụkwara ịbụ ndị enyemaka obiọma e gosiri ha kpaliri mmasị ha. (Ilu 3:27; Gal. 6:10) Mgbe obere ụgbọala nke otu di na-ekweghị ekwe mebiri, otu Onyeàmà na-eto eto nyeere ya aka. “Nke ahụ metụrụ m nnọọ,” ka ọ na-echeta. Otu nwanna ọzọ nọrọ site n’ụtụtụ ruo uhuruchi na-enyere di na-ekweghị ekwe nke otu nwanna nwanyị aka ịgba ụlọ ya ogige. Mgbe ha na-arụ ọrụ ma na-ekwurịta okwu, ha ghọrọ ndị enyi. Mgbe izu abụọ gasịrị, nwoke ahụ bịakwutere nwanna ahụ ma kwuo, sị: “Oge eruola mgbe m ga-eme mgbanwe ụfọdụ ná ndụ m. Ị̀ ga-amụrụ m Bible?” O nwere ọganihu dị ngwa, ọ bụzi Onyeàmà e mere baptizim.
4 Ka anyị na-aga n’ihu n’ịchọpụta ndị kwesịrị ekwesị n’ókèala anyị, ka anyị nọgide na-enyere ndị lụrụ ndị kwere ekwe ibe anyị aka.—1 Tim. 2:1-4.