Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite January 12
  • Izu Na-amalite January 19
  • Izu Na-amalite January 26
  • Izu Na-amalite February 2
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 1/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite January 12

Abụ nke 224

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke January. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 15 na Teta! nke February 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke February 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, mee ka akụkụ ụfọdụ dị ire n’ihe ngosi ahụ pụta ìhè.

15 min: “Abamuru Na-enweghị Atụ nke Amamihe Sitere n’Aka Chineke.”a Ruo ókè oge nyere ohere ya, mee ka ndị na-ege ntị kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

20 min: “Nọrọsienụ Ike na Nche n’Otú Unu Si Eji Oge Eme Ihe.”b Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha na-eme ka ihe ndị na-adịchaghị mkpa ghara igbochi nchụso ha na-achụso ihe ime mmụọ.

Abụ nke 106 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 19

Abụ nke 95

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.” Maa ọkwa maka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na-abịanụ, gbaakwa mmadụ nile ume ịga ya. Ọ bụrụ na a ga-enwe mgbakọ ahụ n’ime ọnwa ole na ole na-abịanụ, kwuo na ndị chọrọ ka e mee ha baptizim kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

15 min: “Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Nyere Ndị Òtù Ọlụlụ Na-abụghị Ndịàmà Aka?”c Gbaa otu onye ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị ghọrọ ndị ohu Jehova n’ihi ezi ihe nlereanya nke di ma ọ bụ nwunye ya nke buru ụzọ nata eziokwu setịpụrụ.

Abụ nke 73 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 26

Abụ nke 158

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke January. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 1 na Teta! nke February 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke February 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú ị pụrụ isi nyefee onye agbata obi gị magazin ndị ahụ.

15 min: Na-eṅominụ Pọl Dị Ka O Si Ṅomie Kraịst. (1 Kọr. 11:1) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Dị ka Jizọs, Pọl jiri ohere ndị dapụtaranụ gbaa àmà nye “ndị ọ dabara na ọ hụrụ.” (Ọrụ 17:17) Olee ohere ndị a ga-eji mee nke a n’ókèala anyị? Olee ndị anyị ‘na-ahụ’ mgbe anyị gara ahịa, mgbe anyị gara ọrụ ma ọ bụ akwụkwọ, ma ọ bụ mgbe anyị banyere n’ụgbọ njem ọha na eze? Olee ndị anyị pụrụ ịhụ mgbe anyị nọ n’ụlọ? Jụọ ndị na-ege ntị ahụmahụ ndị ha nweworo ka ha na-agbara ndị ha zutere àmà mgbe ha na-eme ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị.

18 min: Isoro Ndị Kwere Ekwe Ibe Anyị Na-eme Enyi. (Ilu 18:24; 27:9) Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke dabeere n’Ụlọ Nche nke December 1, 2000, peeji nke 22-23. Otu n’ime uru ndị a na-erite n’ezi ofufe bụ ohere nke imeta ezi ndị enyi. Anyị iso ndị ọzọ na-akpakọrịta ná nzukọ, n’ozi ubi, nakwa n’oge ndị ọzọ na-eme ka anyị nweta agbamume dị ukwuu. Olee otú anyị pụrụ isi meta ndị enyi n’ọgbakọ? Tụleghachi igbe bụ́ “Nzọụkwụ Isii Ndị Na-eduga n’Ọbụbụenyi Na-adịgide Adịgide,” ma jụọ ndị na-ege ntị otú anyị pụrụ isi tinye isi ihe nke ọ bụla n’ọrụ mgbe anyị na ụmụnna anyị na-emekọrịta ihe.

Abụ nke 177 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 2

Abụ nke 204

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na February. Tụleghachi “Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Ndị A Tụrụ Aro Ha Maka Bịaruo Jehova Nso.”

20 min: Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị Anyị Nwere Obi Ụtọ Inweta! Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Obi dị anyị ụtọ inweta akwụkwọ ọhụrụ abụọ e wepụtara ná mgbakọ distrikti “Nye Chineke Otuto.” ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ pụrụ iche n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible anyị nwere. Na peeji nke ọ bụla ị sapere, ị ga-ahụ akụkụ dị iche nke Ala Nkwa ahụ. Mee ka ihe ụfọdụ dị na map ndị ahụ pụta ìhè. Tụọ aro ụzọ ndị dị irè a pụrụ isi jiri akwụkwọ a mee ihe. Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ga-ewusikwu ụmụ anyị ike n’ụzọ ime mmụọ. Kwuo ụfọdụ n’ime isiokwu ndị a tụlere n’akwụkwọ ahụ, na-egosi otú ndị mụrụ ụmụ na ndị na-eto eto pụrụ isi rite uru. Jụọ ndị na-ege ntị otú ha si na-eji akwụkwọ ọhụrụ ndị a eme ihe n’ụzọ dị irè.

15 min: Na-etinye Okwu Chineke n’Ọrụ ná Ndụ Gị Kwa Ụbọchị. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gbaa mmadụ nile ume iji Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2004 na-eme ihe nke ọma. Tụlee nkọwa dị n’okwu mmalite, peeji nke 3-4. Jụọ ndị na-ege ntị oge kasị mma ha na-eji atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị. Soro ọgbakọ tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke taa na nkọwa ya. Jụọ ndị na-ege ntị otú anyị pụrụ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè. Gbaa mmadụ nile ume ichetụ echiche kwa ụbọchị banyere otú ha pụrụ isi tinye ihe ha tụlere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ọrụ.

Abụ nke 150 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya