Inye Jehova Ihe Kasị Mma Anyị Nwere
1 Iwu Jehova nyere ụmụ Izrel kapịrị ya ọnụ na ụmụ anụmanụ ndị a ga-eji chụọrọ ya àjà aghaghị ịbụ ndị ahụ́ “zuru okè.” Ọ naraghị anụ ndị nwere nkwarụ. (Lev. 22:18-20; Mal. 1:6-9) Ọzọkwa, mgbe ọ bụla a chụrụ àjà, abụba ya nile—akụkụ kasị mma—na-abụ nke Jehova. (Lev. 3:14-16) Dị ka Nna na Onye Nwe Izrel, Jehova kwesịrị inweta ihe kasị mma.
2 Dị ka ọ dịịrị n’oge ochie, Chineke na-arịba ọdịdị nke onyinye ndị anyị na-enye ya taa ama. Ozi anyị na-eje kwesịrị igosipụta nsọpụrụ ofufe kwesịrị ekwesị n’ebe Jehova nọ. N’ezie, ọnọdụ ndị mmadụ dịgasị iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enyocha onwe anyị nke ọma iji jide n’aka na anyị na-enye ya ihe kasị mma anyị nwere.—Efe. 5:10.
3 Ozi E Ji Obi Dum Na-eje: Ka ozi anyị wee bụrụ nke na-ewetara Jehova nsọpụrụ ma bụrụ nke na-eru n’obi ndị na-ege anyị ntị, ọ gaghị abụ nke a na-eje iji mezuo iwu. Ihe ndị anyị na-ekwu banyere Chineke anyị na nzube ya ndị dị ebube, kwesịrị isite n’obi jupụtara n’ekele. (Ọma 145:7) Nke a na-egosi mkpa ọ dị ịnọgide na-enwe usoro ọgụgụ na ọmụmụ Bible onwe onye dị mma.—Ilu 15:28.
4 Inye Jehova ihe kasị mma anyị nwere na-agụnyekwa iṅomi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. (Efe. 5:1, 2) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-akwali anyị ịgbalị ime ka ozi eziokwu ahụ na-enye ndụ ruo ọtụtụ ndị ntị ruo n’ókè o kwere mee. (Mak 6:34) Ọ na-akpali anyị igosi mmasị onwe onye n’ebe ndị anyị na-agwa okwu nọ. Ọ na-eme ka anyị nọgide na-eche banyere ha mgbe anyị letasịrị ha ná nke mbụ ya, na-akwalikwa anyị ịga letaghachi ha. Ọ na-akpali anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime iji nyere ha aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.—Ọrụ 20:24; 26:28, 29.
5 “Àjà Otuto”: Ụzọ ọzọ anyị si enye Jehova ihe kasị mma anyị nwere bụ site n’ịdị uchu n’ozi. Mgbe anyị haziri ihe omume anyị nke ọma ma lekwasị anya n’ọrụ anyị ji n’aka, anyị pụrụ ịrụzu ihe kasị mma n’oge anyị nwere. (1 Tim. 4:10) Ezi nkwadebe na-eme ka anyị nwee ike ikwu okwu n’ụzọ doro anya nakwa n’ụzọ ga-eme ka mmadụ kwenye, wee si otú ahụ mụbaa ohere e nwere na ndị mmadụ ga-ege ntị. (Ilu 16:21) Ka anyị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ, ihe ndị sitere anyị n’obi anyị na-ekwu pụrụ ịbụ nke a ga-akpọ, n’ụzọ ziri ezi, “àjà otuto.”—Hib. 13:15.