Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 1/15 p. 21-25
  • Jiri Mkpụrụ Obi Dum Na-achụrụ Jehova Àjà

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Mkpụrụ Obi Dum Na-achụrụ Jehova Àjà
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OTÚ ANYỊ SI ACHỤ ÀJÀ KWA ỤBỌCHỊ
  • OTÚ O SI GBASA NDỤ GỊ
  • OTÚ ANYỊ SI ACHỤ ÀJÀ N’OFUFE ANYỊ NA-EFE JEHOVA
  • INYE IHE NA ỊNARA IHE
  • GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ
  • Mụta Ihe ‘n’Ụkpụrụ nke Eziokwu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Àjà Otuto Ndị Na-eme Jehova Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ịchụ Àjà Ndị Na-amasị Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ị̀ Ga-eji Ihe Ndị I Nwere Na-ejekwuru Chineke Ozi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 1/15 p. 21-25

Jiri Mkpụrụ Obi Dum Na-achụrụ Jehova Àjà

“Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-eme ya dị ka ọ̀ bụ Jehova.”—KỌL. 3:23.

1-3. (a) Ọnwụ Jizọs nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ ò mere ka Jehova gharazie ịchọ ka anyị na-achụ ụdị àjà ọ bụla? Kọwaa. (b) Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ banyere àjà anyị na-achụ taa?

NA NARỊ afọ mbụ O.A., Jehova mere ka ndị ohu ya mara na àjà mgbapụta Jizọs mere ka Iwu Mozis gharazie ịdị mkpa. (Kọl. 2:13, 14) Ọ dịghịzi mkpa ka a na-achụ àjà ndị Juu chụwara kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọ baghịzikwa uru. Iwu ahụ arụchaala ọrụ o ji bụrụ “onye nduzi anyị nke na-eduru anyị gakwuru Kraịst.”—Gal. 3:24.

2 Nke ahụ apụtaghị na o nweghịzi ihe jikọrọ Ndị Kraịst na ịchụ àjà. Kama nke ahụ, Pita onyeozi kwuru na anyị kwesịrị ‘isite n’aka Jizọs Kraịst na-achụ àjà ime mmụọ ndị Chineke na-anabata.’ (1 Pita 2:5) Ihe ọzọkwa bụ na Pọl onyeozi mere ka o doo anya na ihe niile gbasara ndụ Onye Kraịst ọ bụla raara onwe ya nye Chineke dị ka “àjà.”—Rom 12:1.

3 N’ihi ya, otú Onye Kraịst si achụrụ Jehova àjà bụ inye ya ihe ụfọdụ ma ọ bụ ikwo maka ya hapụ ihe ụfọdụ ọ na-eme. Olee otú ihe anyị maara banyere àjà ụmụ Izrel chụụrụ Chineke ga-esi enyere anyị aka ịchụrụ Jehova àjà ọ ga-anabata taa?

OTÚ ANYỊ SI ACHỤ ÀJÀ KWA ỤBỌCHỊ

4. Olee ihe anyị kwesịrị icheta banyere ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?

4 O nwere ike isiri anyị ike ịghọta otú ihe anyị na-eme n’ụbọchị si gbasa ịchụrụ Jehova àjà. O nwere ike ịdị anyị ka o nweghị ihe jikọrọ ofufe anyị na-efe Jehova na ọrụ anyị na-arụ n’ụlọ, ọrụ anyị na-arụ n’ụlọ akwụkwọ, ọrụ ego anyị, ihe ndị anyị na-azụ n’ahịa, na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma, ọ bụrụ na ị rarala ndụ gị nye Jehova, ma ọ bụkwanụ na i bu n’obi ime otú ahụ n’oge na-adịghị anya, mara na o nwere ihe jikọrọ ihe ndị a na ofufe ị na-efe Jehova. Anyị kwesịrị icheta na anyị bụ Ndị Kraịst mgbe niile. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ. Ọ bụ ya mere Pọl ji gbaa anyị ume, sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-eme ya dị ka ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emere ya, ọ bụghị ndị mmadụ.”—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:18-24.

5, 6. Gịnị ga-enyere anyị aka ikpebi otú anyị ga-esi na-akpa àgwà na otú anyị ga-esi na-eji ejiji kwa ụbọchị?

5 Ihe Onye Kraịst na-eme maka onwe ya kwa ụbọchị esoghị n’ozi ọ na-ejere Jehova. Ma, na Pọl gbara anyị ume ka anyị ‘jiri mkpụrụ obi dum na-arụ ọrụ ka ọ̀ bụ Jehova’ ka anyị na-arụrụ ya ga-eme ka anyị chebara ihe niile anyị na-eme ná ndụ echiche. N’ihi ya, olee otú anyị nwere ike isi mee ihe a Pọl kwuru? Ànyị na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị ma na-eji ejiji dị mma mgbe niile? Anyị mewe ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, ọ̀ na-eme anyị ihere ime ka a mata na anyị bụ Ndịàmà Jehova n’ihi otú anyị si akpa àgwà ma ọ bụ otú anyị si eji ejiji? Ekwekwala ka nke a mee! Ndị Jehova agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ kọchawa aha Chineke.—Aịza. 43:10; 2 Kọr. 6:3, 4, 9.

6 Ka anyị tụlee otú anyị ga-esi gosi na anyị chọrọ ‘iji mkpụrụ obi dum na-arụ ọrụ ka ọ̀ bụ Jehova ka anyị na-arụrụ ya’ n’ihe dị iche iche anyị na-eme ná ndụ. Ka anyị na-atụle nke a, cheta na n’oge ụmụ Izrel, Jehova chọrọ ka àjà niile ha na-achụrụ ya bụrụ ihe kacha mma ha nwere.—Ọpụ. 23:19.

OTÚ O SI GBASA NDỤ GỊ

7. Olee ihe Onye Kraịst raara onwe ya nye Chineke kwesịrị ịna-eme?

7 Mgbe ị raara onwe gị nye Jehova, i ji obi gị dum kpebie ime otú ahụ, ọ́ bụghị ya? Ihe ọ pụtara bụ na i kwere nkwa na ị ga-ebute Jehova ụzọ n’ihe ọ bụla ị na-eme ná ndụ. (Gụọ Ndị Hibru 10:7.) Ihe a i kpebiri ime dị mma. O doro anya na ị chọpụtala na ihe na-agaziri gị mgbe ị gbara mbọ chọpụta ihe bụ uche Chineke banyere ihe ị chọrọ ime ma mee ihe kwekọrọ n’uche ya. (Aịza. 48:17, 18) Ihe mere ndị Chineke ji dị nsọ ma na-enwe ọṅụ bụ n’ihi na ha na-eṅomi Onye na-akụziri ha ihe.—Lev. 11:44; 1 Tim. 1:11.

8. Olee ihe mere anyị ji kwesị icheta na Jehova weere àjà ụmụ Izrel na-achụrụ ya ka ihe dị nsọ?

8 Jehova weere àjà ụmụ Izrel na-achụrụ ya ka ihe dị nsọ. (Lev. 6:25; 7:1) Okwu Hibru a sụgharịrị “ịdị nsọ” pụtara ido ihe iche, ma ọ bụ ido ihe nsọ maka Chineke. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova nabata àjà anyị na-achụrụ ya, anyị agaghị na-etinye aka n’ihe ọ bụla rụrụ arụ e ji mara ụwa a. Anyị agaghị na-ahụ ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị n’anya. (Gụọ 1 Jọn 2:15-17.) O doro anya na nke a pụtara na anyị ga-ezere onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla nke ga-eme ka Chineke lewe anyị anya ka ndị rụrụ arụ. (Aịza. 2:4; Mkpu. 18:4) Ọ pụtakwara na anyị agaghị na-ele ihe ndị rụrụ arụ, ma ọ bụ na-ele ndị na-eme omume rụrụ arụ, anyị agaghịkwa na-eche banyere ha.—Kọl. 3:5, 6.

9. Olee ihe mere otú anyị si emeso ndị ọzọ ihe ji dị mkpa?

9 Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Unu echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.” (Hib. 13:16) Nke a na-egosi na ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ọma ma na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị mma, Jehova na-ewere ya ka àjà dị mma. Ihe e ji ama ezigbo Ndị Kraịst bụ na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya.—Jọn 13:34, 35; Kọl. 1:10.

OTÚ ANYỊ SI ACHỤ ÀJÀ N’OFUFE ANYỊ NA-EFE JEHOVA

10, 11. Olee otú Jehova si ele ozi ọma anyị na-ekwusa na ofufe anyị na-efe ya anya, oleekwa ihe nke a kwesịrị ime ka anyị mee?

10 Otu n’ime ụzọ ndị kachanụ anyị bụ́ Ndị Kraịst si emere ndị ọzọ ihe ọma bụ ‘ikwupụta olileanya anyị n’ihu ọha.’ Ị̀ na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ agbara ndị ọzọ àmà? Pọl kpọrọ ọrụ a dị ezigbo mkpa Onye Kraịst kwesịrị ịrụ “àjà otuto . . . ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha [Chineke] n’ihu ọha.” (Hib. 10:23; 13:15; Hos. 14:2) Anyị kwesịkwara ichebara oge anyị ji ekwusa ozi ọma na otú anyị si ekwusa ya echiche. Ọtụtụ ihe omume a na-eme ná Nzukọ Ije Ozi ga-enyere anyị ime nke a. Ihe a na-ekwu bụ na ịga ozi ọma na izi ozi ọma mgbe a na-anọghị n’ozi bụcha “àjà otuto,” ya bụ, ha so n’otú anyị si efe Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na ihe anyị ji achụ àjà bụ ihe kacha mma anyị nwere. Ọ bụ eziokwu na otú ihe si dịrị anyị niile abụghị otu, oge anyị na-ewepụta iji kwusaa ozi ọma na-egosikarị otú anyị jiruru ihe ndị gbasara ofufe Jehova kpọrọ ihe.

11 Ndị Kraịst na-ewepụtakarị oge efe Jehova ma n’ụlọ ha ma n’ọgbakọ. Jehova chọrọ ka anyị na-eme otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghịzi edebe iwu Ụbọchị Izu Ike ma ọ bụkwanụ na-aga Jeruselem maka ememme ndị a na-eme n’oge ochie, a ka nwere ihe anyị ga-amụta n’ihe ndị ha mere n’oge ahụ. Chineke ka chọrọ ka anyị hapụ ọrụ dị iche iche nwụrụ anwụ ma na-amụ Okwu ya, na-ekpe ekpere, na-agakwa ọmụmụ ihe. Ndị isi ezinụlọ, bụ́ Ndị Kraịst, kwesịrị iwepụta oge na-eduzi ofufe ezinụlọ ha. (1 Tesa. 5:17; Hib. 10:24, 25) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya sị, ‘Olee otú m nwere ike isi mee ka otú m si efe Jehova kakwuo mma?’

12. (a) Olee ihe a na-eme taa nke e nwere ike iji tụnyere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-esure n’oge ochie? (b) Olee otú anyị nwere ike isi kpee ekpere Chineke ewere ya ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ?

12 Eze Devid bụkuru Jehova abụ, sị: “Ka ekpere m bụrụ ihe a kwadebere n’ihu gị dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” (Ọma 141:2) Chebagodịrị ugboro ole ị na-ekpe ekpere na ihe ndị ị na-ekpe n’ekpere echiche. N’akwụkwọ Mkpughe, e ji “ekpere ndị nsọ” tụnyere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. Nke a pụtara na ekpere Jehova na-anụ na-adị ya ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. (Mkpu. 5:8) N’Izrel oge ochie, a na-elezi anya akwadebe ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-esurere Jehova. Naanị oge Jehova na-anabata ya bụ mgbe e surere ya otú o kwuru ka e si suree ya. (Ọpụ. 30:34-37; Lev. 10:1, 2) Ọ bụrụkwa na anyị ana-ekpe ekpere otú Chineke chọrọ ka anyị si na-ekpe ya, Jehova ga-anụ ekpere anyị.

INYE IHE NA ỊNARA IHE

13, 14. (a) Olee ihe Epafrọdaịtọs na ndị Filipaị meere Pọl, oleekwa otú ihe ahụ ha mere dị Pọl? (b) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Epafrọdaịtọs na ndị Filipaị?

13 E nwere ike iji ego anyị na-enye iji kwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile tụnyere àjà, ma ego anyị nyere ọ̀ dị obere ma ò hiri nne. (Mak 12:41-44) Na narị afọ mbụ, ọgbakọ dị na Filipaị zigara Epafrọdaịtọs Rom ka o wegara Pọl ihe ndị na-akpa ya. Ọ ga-abụkwa na ego ọgbakọ ahụ tụkọtara so n’ihe ndị o wegaara Pọl. Nke a abụghị mbụ ndị Filipaị zigaara Pọl ihe ndị dị ya mkpa. Ha zigaara ya onyinye ndị a ka ọ ghara ichegbuwe onwe ya banyere ego ọ ga-eji na-egbo mkpa ya, kama, ka o nwee ike wepụtakwuo oge na-ekwusa ozi ọma. Olee otú onyinye a ha nyere Pọl dị ya? Ọ kpọrọ ya “ihe na-esi ìsì ụtọ, àjà a na-anara nke ọma, nke na-atọ Chineke ụtọ.” (Gụọ Ndị Filipaị 4:15-19.) N’eziokwu, obi tọrọ ma Pọl ma Jehova ụtọ maka ihe a ndị Filipaị meere Pọl.

14 Taa, onyinye anyị na-enye iji kwado ọrụ a na-arụ n’ụwa niile na-emekwa Jehova obi ụtọ. Ihe ọzọ bụ na o kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-eme ihe ndị gbasara Alaeze Chineke ná ndụ anyị, ọ ga-enyere anyị aka ka okwukwe anyị sie ike, nyekwa anyị ihe ndị na-akpa anyị.—Mat. 6:33; Luk 6:38.

GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ

15. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ị na-ekele Jehova maka ha?

15 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-ekele Jehova. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-ekele ya kwa ụbọchị maka ndụ o nyere anyị? Ọ na-enye anyị ihe oriri, uwe, ụlọ, nakwa ikuku anyị na-ekuru, bụ́ ihe ndị na-enyere anyị aka ịna-adị ndụ. Ihe ọzọkwa bụ na okwukwe anyị nwere n’ihi ihe anyị mụtara na Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya. Anyị kwesịrị ịna-efe Jehova ma na-achụrụ ya àjà otuto n’ihi onye ọ bụ na ihe ndị o meere anyị.—Gụọ Mkpughe 4:11.

16. Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà mgbapụta Kraịst?

16 Dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, onyinye kacha dịrị oké ọnụ ahịa Chineke nyere ụmụ mmadụ bụ àjà mgbapụta Kraịst. Ọ bụ otú kachanụ Chineke si gosi na ya hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:10) Olee ihe anyị kwesịrị ime maka nke a? Pọl kwuru, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị, n’ihi na ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile; . . . ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.” (2 Kọr. 5:14, 15) Ihe Pọl nọ na-ekwu bụ na ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka obiọma na-erughịrị anyị nke Chineke gosiri anyị, anyị ga na-ebi ndụ otú na-egosi na anyị na-asọpụrụ Chineke na Ọkpara ya. Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ Chineke na Kraịst n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ha meere anyị bụ irubere ha isi na ịchọsi ike ikwusa ozi ọma nakwa inyere ndị ọzọ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst.—1 Tim. 2:3, 4; 1 Jọn 5:3.

17, 18. Olee otú ụfọdụ ndị sirila mee ka àjà otuto ha na-achụrụ Jehova hikwuo nne? Nye ihe atụ.

17 Ị̀ ga-enwe ike ime ka àjà otuto ị na-enye Chineke ka mma? Ọtụtụ ndị ahazigharịala ihe ndị ha na-eme ma wepụtakwuo oge na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma ọ bụkwanụ na-arụ ọrụ ndị ọzọ gbasara Alaeze Chineke mgbe ha chebachaara ihe ọma niile Jehova meere ha echiche. Ụfọdụ na-arụdị ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa kwa afọ, ebe ndị ọzọ ghọrọ ndị ọsụ ụzọ oge niile. E nwekwara ndị sorola wuo ụlọ dị iche iche a na-anọ eme ihe ndị gbasara Alaeze Chineke. Ọ̀ bụ na ihe ndị a abụghị ụzọ ndị magburu onwe ha anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova meere anyị? Ọ bụrụ na anyị eburu ezigbo ihe n’obi na-eme nke a, ya bụ, iji gosi na obi dị anyị ụtọ, Chineke ga-anabata ozi ndị a dị nsọ anyị na-ejere ya.

18 E nweela ọtụtụ Ndị Kraịst gosirila na obi dị ha ụtọ maka ihe Jehova meere ha. Morena so ná ndị merela otú a. Ọ na-aga Katọlik kemgbe a mụrụ ya, ma, o nwere ọtụtụ ajụjụ ọ chọrọ ịjụ banyere Chineke nakwa ihe mere e ji kee anyị. Ọ gbalịala ma à ga-aza ya ajụjụ ndị a na chọọchị Katọlik ọ na-aga ma ọ bụkwanụ na nkà ihe ọmụma ndị Eshia. Ma, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a zara ya ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụ naanị mgbe ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl ka a zara ya ajụjụ ndị ahụ. Morena chọrọ iji ume ya dum na-ejere Jehova ozi iji gosi na obi dị ya ụtọ n’ihi ihe ndị ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ nakwa n’ihi otú ihe ndị ahụ si mee ka ndụ ya nwee isi. Ozugbo e mechara ya baptizim, ọ malitere ịsụ ụzọ inyeaka mgbe niile, ka oge na-agakwa, ọ malitere ọrụ ịsụ ụzọ oge niile ozugbo o kwere ya mee. Morena arụọla ọrụ ịsụ ụzọ oge niile afọ iri atọ ugbu a, ọ ka bụkwa ọsụ ụzọ oge niile.

19. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka àjà anyị na-achụrụ Jehova hikwuo nne?

19 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị otú ihe si dịrị ha na-ekwebeghị ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. N’agbanyeghị ihe anyị nwere ike ime n’ozi anyị na-ejere Jehova, anyị niile nwere ike ịchụrụ ya àjà ọ ga-anabata. Anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà na-egosi na anyị ma na anyị na-anọchite anya Jehova mgbe niile. Okwukwe anyị nwere na Jehova ga-eme ka anyị tụkwasị ya obi anyị dum na ọ ga-emezu ihe ndị o zubere. Anyị ga na-arụ ọrụ ọma, ya bụ, iso na-ekwusa ozi ọma. Ka obi ụtọ anyị nwere n’ihi ihe ọma niile Jehova meere anyị mee ka anyị jiri mkpụrụ obi dum na-achụrụ ya àjà.

LEE MA Ị̀ GA-AZALI AJỤJỤ NDỊ A:

․․․․․

Olee otú anyị nwere ike isi na-asọpụrụ Jehova n’ihe ọ bụla anyị na-eme kwa ụbọchị?

․․․․․

Olee àjà ndị anyị na-achụ n’ofufe anyị na-efe Chineke?

․․․․․

Olee otú anyị nwere ike isi nye Jehova ihe ndị anyị nwere?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]

Ihe ọma Jehova meere gị, ọ̀ na-eme ka ị na-achụrụ ya àjà dị mma?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ agbara ndị ọzọ àmà?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya