Ozi Ọma Jọn Dere
13 Tupu Ememme Ngabiga eruo, Jizọs ma na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola.+ Ebe ọ bụ na ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya, ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.+ 2 Ha nọ na-eri nri anyasị, ma Ekwensu etinyela n’obi Judas Iskarịọt,+ nwa Saịmọn, ka ọ rara Jizọs nye.+ 3 Ebe ọ bụ na Jizọs ma na Nna ya enyefeela ya ihe niile n’aka, marakwa na ya si n’ebe Chineke nọ bịa, na-alakwurukwa Chineke,+ 4 o biliri ka ha na-eri nri anyasị ahụ ma chịsa uwe elu ya n’akụkụ. O wee chịrị ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù.+ 5 Ọ gbanyeziri mmiri n’efere malite ịsa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa ákwà ahụ o kere n’úkwù na-ehicha ha ụkwụ. 6 Mgbe o rutere n’ebe Saịmọn Pita nọ, ọ sịrị ya: “Onyenwe anyị, ị̀ na-achọ ịsa m ụkwụ?” 7 Jizọs zara ya, sị: “Ugbu a, ị gaghị aghọta ihe m na-eme. Ma e mechaa, ị ga-aghọta ya.” 8 Pita sịrị ya: “E nweghị ihe ga-eme ka ị saa m ụkwụ.” Jizọs wee sị ya: “Ọ bụrụ na asaghị m gị ụkwụ,+ e nweghị ihe jikọrọ mụ na gị.” 9 Saịmọn Pita sịziri ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama ị ga-asakwu aka m na isi m.” 10 Jizọs wee sị ya: “Onye ọ bụla sara ahụ́ dị ọcha, e kwesịghịkwa ịsa ya ebe ọzọ ma e wepụ ụkwụ ya. Unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu niile.” 11 Ọ ma onye na-arara ya nye.+ Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.”
12 Mgbe ọ sachara ha ụkwụ ma yiri uwe elu ya, ọ nọdụrụ ala ọzọ na tebụl, sị ha: “Ùnu ma ihe m meere unu? 13 Unu na-akpọ m ‘Onye Ozizi’ na ‘Onyenwe anyị.’ Ihe unu na-akpọ m ziri ezi maka na ọ bụ ihe m bụ.+ 14 N’ihi ya, ọ bụrụ na mụnwa, bụ́ Onye Ozizi na Onyenwe unu, sara ụkwụ unu,+ unu kwesịkwara* ịsa ụkwụ ibe unu.+ 15 N’ihi na m na-egosi unu ihe unu ga na-eme, ka unu wee na-eme otú m meere unu.+ 16 N’eziokwu, ana m asị unu na ohu anaghị aka nna ya ukwu, onye ozi anaghịkwa aka onye zitere ya. 17 Ọ bụrụ na unu ma ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma unu na-eme ha.+ 18 Anaghị m ekwu banyere unu niile. Ama m ndị m họọrọ. Kama ọ bụ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo, nke sịrị:+ ‘Onye na-eri nri m na-emegidezi m.’*+ 19 Ugbu a, ana m agwa unu ihe a tupu ya emee, ka unu wee kwere na ọ bụ m bụ ya mgbe ọ ga-eme.+ 20 N’eziokwu, ana m asị unu na onye na-anabata onye ọ bụla m zitere na-anabata m.+ Onye na-anabatakwa m na-anabata Onye zitere m.”+
21 Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, obi jọrọ ya njọ.* O wee gbaa àmà, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+ 22 Ndị na-eso ụzọ ya malitere ilerịta ibe ha anya n’ihi na ha amaghị onye ọ na-ekwu maka ya.+ 23 Otu n’ime ha, onye Jizọs hụrụ n’anya,+ nọ Jizọs nso* na-eri ihe. 24 N’ihi ya, Saịmọn Pita kweere onye a n’isi, sị ya: “Gwa anyị onye ọ na-ekwu maka ya.” 25 Onye a wee dalaa azụ dabere n’obi Jizọs ma sị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ onye?”+ 26 Jizọs zara, sị: “Ọ bụ onye m ga-enye ibé achịcha m na-esuru.”+ Mgbe o suuru achịcha ahụ, o weere ya nye Judas, nwa Saịmọn Iskarịọt. 27 Mgbe Judas natachara ya ibé achịcha ahụ, Setan banyere n’ime ya.+ Jizọs wee sị ya: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” 28 Ma, o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị nọ na tebụl ma ihe mere o ji gwa ya ihe a. 29 N’eziokwu, ụfọdụ chere na ebe ọ bụ Judas na-eji igbe ego,+ na Jizọs na-agwa ya ka ọ zụta ihe ndị dị ha mkpa maka ememme ahụ ma ọ bụ ka o nye ndị ogbenye ihe. 30 Mgbe Judas natachara ibé achịcha ahụ, ọ pụrụ ozugbo. Ọ bụkwa n’abalị.+
31 Mgbe ọ pụrụ, Jizọs sịrị: “Ugbu a, e meela ka Nwa nke mmadụ dị ebube,+ e meekwala ka Chineke dị ebube n’ihi Okpara ya. 32 Chineke ga-eme ka ọ dị ebube,+ ọ ga-emekwa ka ọ dị ebube ozugbo. 33 Ụmụntakịrị, mụ na unu ga-anọkwu obere oge. Unu ga-achọ m. Ma ihe m gwara ndị Juu, ka m na-agwakwa unu ugbu a, sị, ‘Unu enweghị ike ịbịa n’ebe m na-aga.’+ 34 Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu hụ ibe unu n’anya. Otú m hụrụ unu n’anya,+ hụnụ ibe unu n’anya otú ahụ.+ 35 Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”+
36 Saịmọn Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-aga?” Jizọs zara, sị: “I nweghị ike iso m ugbu a gaa ebe m na-aga, ma ị ga-eso m ma e mechaa.”+ 37 Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, gịnị mere na enweghị m ike iso gị ugbu a? M ga-enye ndụ* m n’ihi gị.”+ 38 Jizọs wee sị ya: “Ị̀ ga-enye ndụ* gị n’ihi m? N’eziokwu, ana m asị gị na oké ọkpa agaghị akwa ruo mgbe ị gọnahụrụ m ugboro atọ.”+