25 Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya+ otú ahụ Kraịst hụkwara ọgbakọ ya n’anya ma nwụọ maka ya,+26 iji doo ya nsọ, jirikwa mmiri nke okwu Chineke saa ya, ya adị ọcha.+
5 (ọ bụghị maka ọrụ ezi omume ọ bụla anyị rụrụ,+ kama ọ bụ n’ihi ebere ya),+ o si n’ahụ́ ọ sara anyị nke mere ka anyị dị ndụ+ nakwa mmụọ nsọ o ji mee ka anyị dị ọhụrụ zọpụta anyị.+
22 ka anyị jiri ezi obi na-abịa Chineke nso ma nwee okwukwe siri ezigbo ike, ebe ọ bụ na e meela ka obi anyị dị ọcha ka anyị ghara inwe akọnuche ọjọọ,+ e jirikwa mmiri dị ọcha sachaa ahụ́ anyị.+