22 N’ihi otú unu si na-eme ihe okwu Chineke bụ́ eziokwu kwuru, unu asachaala onwe unu,* unu hụkwara nnọọ ibe unu n’anya ka ụmụnne.+ Ugbu a, jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.+
14 Anyị ma na ọ dịbu ka ànyị nwụrụ anwụ, ma anyị dị ndụ ugbu a,+ n’ihi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.+ Onye na-ahụghị ụmụnna ya n’anya dị ka onye nwụrụ anwụ.+