34 Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu hụ ibe unu n’anya. Otú m hụrụ unu n’anya,+ hụnụ ibe unu n’anya otú ahụ.+35 Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.”+
22 N’ihi otú unu si na-eme ihe okwu Chineke bụ́ eziokwu kwuru, unu asachaala onwe unu,* unu hụkwara nnọọ ibe unu n’anya ka ụmụnne.+ Ugbu a, jirikwanụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.+