Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Kọlọsi
2 Achọrọ m ka unu mata otú m si na-agbasi mbọ ike maka ọdịmma unu nakwa maka ọdịmma ndị bi na Leodisia+ na ndị niile na-ahụtụbeghị m.* 2 M na-agba mbọ a iji kasie unu niile obi,+ ka unu dịrị n’otu, hụkwa ibe unu n’anya,+ si otú ahụ nweta ezigbo akụ̀. Akụ̀ a bụ na unu ga-amata nnọọ ihe nzuzo dị nsọ gbasara Chineke, ghọtakwa ya nke ọma. Ihe nzuzo a bụ Kraịst.+ 3 Ọ bụ n’ime ya ka e zoro amamihe na ihe niile bara ezigbo uru a na-amụta amụta.+ 4 Ana m ekwu ihe a ka onye ọ bụla ghara iji ire ụtọ duhie unu. 5 Ọ bụ eziokwu na mụ na unu anọghị, obi m dị ebe unu nọ.* M na-aṅụrịkwa ọṅụ ka m na-ahụ otú unu si na-eme ihe n’usoro,+ nakwa otú okwukwe unu nwere na Kraịst si sie ike.+
6 N’ihi ya, ebe ọ bụ na unu na-eso ụzọ Onyenwe anyị Kraịst Jizọs, na-eruberenụ ya isi. 7 Na-emenụ ka okwukwe unu nwere na ya sie ike+ ka osisi gbanyesiri mgbọrọgwụ ike+ n’ala. Na-agbarịtanụ ibe unu ume otú ọ chọrọ. Kwụrụnụ chịm, na-ekelekwanụ Chineke mgbe niile.+ Ihe ndị a ka a kụziiri unu.
8 Na-echenụ nche ka a ghara inwe onye ga-eji amamihe ụwa na ihe ndị na-abụghị eziokwu mata unu n’ọnyà.*+ Ihe ndị a esighị na Kraịst, kama ha si n’ọdịnala ndị mmadụ nakwa n’otú ụwa si ele ihe anya.* 9 Ma, Kraịst nwere àgwà niile Chineke nwere.+ 10 Ọ bụ yanwa mere na o nweghị ihe kọrọ unu. Ọ bụkwa onyeisi ọchịchị niile na ikike niile.+ 11 E biri unu úgwù n’ihi na unu kweere na Kraịst. Ma, e bighị unu úgwù a otú ndị mmadụ si ebi úgwù, kama unu jụrụ ime ihe anụ ahụ́ unu chọrọ.+ Ọ bụkwa otú a ka e si ebi ndị na-eso ụzọ Kraịst úgwù.+ 12 E likọrọ unu na ya n’ihi na unu mere ụdị baptizim o mere.+ A kpọlitekwara unu na ya n’ọnwụ+ n’ihi na unu na ya dị ná mma, unu nwekwara okwukwe n’ihe niile e ji ike Chineke rụọ. Ọ bụ Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ.+
13 Ọ bụkwa eziokwu na unu nwụrụ anwụ n’ihi mmehie unu na-eme, nakwa n’ihi úgwù a na-ebighị unu n’anụ ahụ́, Chineke mere ka unu na Kraịst dịrị ndụ.+ Ọ gbaghaara anyị mmehie anyị niile,+ 14 hichapụkwa iwu ahụ+ e ji aka dee,+ nke na-emegide anyị.+ Ọ bụ ọnwụ Kraịst nwụrụ n’osisi ịta ahụhụ* ka Chineke ji hichapụ iwu ahụ.+ 15 O ji osisi ịta ahụhụ* a gbaa ọchịchị na ikike dị iche iche ọtọ, gosi n’ihu ọha na o meriri ha emeri,+ na-edukwa ha agagharị iji gosi na o meriela ha.
16 N’ihi ya, unu ekwela ka onye ọ bụla kpee unu ikpe maka ihe unu na-eri na ihe unu na-aṅụ+ ma ọ bụ maka ememme ma ọ bụ ememme ọnwa ọhụrụ+ ma ọ bụkwanụ ụbọchị izu ike.+ 17 Ihe ndị ahụ nọchiri anya ihe ndị gaje ịbịa,+ ma onye ihe ndị ahụ ga-emezu n’isi ya bụ Kraịst.+ 18 Ụfọdụ ndị na-eme ka hà dị umeala n’obi, na-efekwa ndị mmụọ ozi. Ma unu ekwela ka ha mee ka unu ghara inweta ụgwọ ọrụ+ a ga-akwụ unu. Naanị ihe ha na-ejidesi aka ike bụ ihe ha ji anya ha hụ. Ha na-ejikwa ihe na-enweghị ihe ọ bụ anya isi n’ihi na uche ha niile dị n’ihe gbasara anụ ahụ́. 19 Ha anaghịkwa ejidesi onye bụ́ isi aka ike,+ onye na-enye ahụ́ niile ihe niile na-akpa ya, na-ejikọkwa ihe niile dị n’ahụ́, onye Chineke na-esikwa n’aka ya eme ka ahụ́ niile na-eto eto.+
20 Unu na Kraịst nwụrụ n’ihi na unu anaghị ele ihe anya otú ụwa si ele ihe anya.+ Gịnịzi mere unu ji na-ebi ndụ ka à ga-asị na unu ka bụ nke ụwa? Gịnịkwa mere unu ji na-erube isi n’iwu ndị a:+ 21 “Ewela ihe a, edetụla ihe a ire, ebitụla ihe a aka”? 22 Iwu ndị a bụ gbasara ihe ndị na-ala n’iyi ma e rie ha ma ọ bụ ma a ṅụọ ha. Ha bụ iwu ndị mmadụ na-enye na ihe ha na-akụzi.+ 23 Iwu ndị a yiri ihe na-eme ka mmadụ mara ihe, ma ha anaghị eme ka mmadụ ghara ịna-eme ihe na-agụ ya agụụ. Ndị mmadụ na-edebekwa iwu ndị a n’ihi na ha chọrọ iji aka ha na-ekpebi otú ha ga na-esi efe Chineke. Ha na-ata onwe ha ahụhụ+ n’ihi na ha chọrọ ka ndị mmadụ chee na ha dị umeala n’obi.