5 Ozi dị nsọ ha na-eje bụ ihe atụ, ọ nọchikwara anya+ ihe ndị dị n’eluigwe.+ Ihe gosiri nke a bụ ihe Chineke nyere Mosis n’iwu mgbe ọ chọrọ ịrụ ụlọikwuu ahụ. Chineke sịrị ya: “Hụ na ị rụrụ ihe niile ka ha dị ka ihe ndị e gosiri gị n’ugwu.”+
10Iwu ahụ* nọchiri anya+ ihe ọma ndị na-abịa abịa,+ ma ọ bụghị ya bụ ihe ọma ndị ahụ. N’ihi ya, o nweghị* ike iji àjà ndị a na-achụ mgbe niile kwa afọ mee ka ndị na-abịakwute Chineke zuo okè.+