Levitikọs
11 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 2 “Gwanụ ndị Izrel, sị, ‘Ihe a bụ anụmanụ ndị unu nwere ike iri+ n’ime anụmanụ ndị na-agagharị n’ala: 3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọ bụla na-atagharị ọnụ, nke ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti.
4 “‘Ma unu agaghị eri anụmanụ ndị a n’ime anụmanụ ndị na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ọbụ ụkwụ ha kebiri abụọ: kamel bụ́ anụ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+ 5 Unu erikwala ewi nkume+ n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 6 Unu erikwala ùrúrù* n’ihi na ọ na-atagharị ọnụ ma ọbụ ụkwụ ya ekebighị abụọ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 7 Unu erikwala ézì+ n’ihi na ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ, gbawaakwa n’etiti, ma ọ naghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. 8 Unu erila anụ ha ọ bụla. Unu emetụkwala ozu ha aka. Ha bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.+
9 “‘Ihe a bụ ihe ndị unu nwere ike iri n’ime ihe ndị bi na mmiri: Unu nwere ike iri+ ihe ọ bụla nwere nku* na akpịrịkpa, ma ò bi n’oké osimiri ma ò bi n’iyi. 10 Ma ihe ọ bụla na-enweghị nku* na akpịrịkpa nke bi n’oké osimiri nakwa n’iyi n’ime obere ụmụ anụmanụ* niile nakwa n’ime ihe* ọ bụla ọzọ bi na mmiri, unu ga na-asọ ya oyi. 11 Unu ga na-asọ ha oyi. Unu erikwala anụ ha ọ bụla.+ Unu ga na-asọkwa ozu ha oyi. 12 Unu ga na-asọ ihe ọ bụla bi na mmiri nke na-enweghị nku* na akpịrịkpa oyi.
13 “Unu ga na-asọ anụ ndị a na-efe efe oyi, e kwesịghịkwa iri ha eri: ugo,+ ugo na-eri azụ̀, udele ojii,+ 14 égbé uhie na ụdị égbé ojii ọ bụla, 15 ụdị ugoloọma ọ bụla, 16 enyí nnụnụ, ikwiikwii, nnụnụ mmiri, ụdị agụ nkwọ ọ bụla, 17 ikwiikwii nta, nnụnụ mmiri a na-akpọ kọmọrant, ikwiikwii ntị ogologo, 18 ọbọgwụ mmiri, okwolo, udele, 19 ụgbala ọcha,* ụdị ụgbala mmiri ọ bụla, nnụnụ a na-akpọ huupu, na ụsụ. 20 Obere ụmụ anụmanụ* ọ bụla nwere nku bụ́ ndị na-eji ụkwụ anọ ha agagharị, unu ga na-asọ ha oyi.
21 “‘N’ime obere ụmụ anụmanụ* nwere nku bụ́ ndị na-eji ụkwụ anọ ha agagharị, unu nwere ike iri naanị ndị nke nwekwara ụkwụ ogologo abụọ ọzọ ha ji esi n’ala amali. 22 Unu nwere ike iri ndị a: ụdị igurube dị iche iche na-esi otu ebe efere n’ìgwè gaa ebe ọzọ, igurube ndị ọzọ a na-eri eri,+ mbụzụ,* na ụkpara. 23 Obere ụmụ anụmanụ niile ọzọ nwere nku, nweekwa ụkwụ anọ, unu ga na-asọ ha oyi. 24 Ihe ndị a ga-eme ka unu ghara ịdị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 25 Onye ọ bụla tụtụụrụ nke ọ bụla nwụrụ anwụ n’ime ha kwesịrị ịsụ uwe ya.+ Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
26 “‘Anụmanụ ọ bụla ọbụ ụkwụ ya kebiri abụọ ma ọ gbawaghị agbawa n’etiti, ọ naghịkwa atagharị ọnụ, ọ bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ nke ọ bụla n’ime ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.+ 27 Anụmanụ ọ bụla ji ọbụ ụkwụ na ọbụ aka ya eje ije n’ime anụmanụ ndị na-eji ụkwụ anọ agagharị bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha. Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 28 Onye ọ bụla buuru ozu ha kwesịrị ịsụ uwe ya.+ Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ Ha bụụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.
29 “‘N’ime obere ụmụ anụmanụ* ndị na-agagharị n’ala, ndị a ga-abụrụ unu anụ na-adịghị ọcha: nkapị, òké,+ ụdị ngwere ọ bụla, 30 agụ ụlọ,* nnukwu ngwere ndị yiri agụ iyi, ngwere mmiri, ngwere ájá, na ogwumagala. 31 Obere ụmụ anụmanụ ndị a ga-abụrụ unu anụ na-adịghị ọcha.+ Onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+
32 “‘Ihe ọ bụla ozu ha dasara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha, ma ọ̀ bụ arịa osisi, uwe, akpụkpọ anụ, ma ọ̀ bụ ákwà iru uju. Ụdị arịa ọ bụla e ji eme ihe nke ozu ha dasara, a ga-etinye ya n’ime mmiri. Ọ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha ruo mgbede. E mechaa, ọ ga-adị ọcha. 33 Ọ bụrụ na ha dabara n’ite ụrọ, unu ga-akụri ya. Ihe ọ bụla dị n’ite ahụ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 34 Nri ọ bụla nke mmiri dị n’ite ahụ wụsara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ dị n’ite ahụ ga-abụkwa ihe na-adịghị ọcha. 35 Ihe ọ bụla ozu ha dasara ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Ma ọ̀ bụ nnukwu ekwú ma ọ̀ bụ obere ekwú, a ga-akụri ya. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha. Ha ga na-abụkwara unu ihe na-adịghị ọcha. 36 Ma ọ bụrụ na ha adanye n’iyi ma ọ bụ n’olulu mmiri, iyi ahụ na olulu mmiri ahụ ka ga-adị ọcha, ma onye ọ bụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 37 Ọ bụrụ na ozu ha adaa n’elu mkpụrụ ọ bụla a ka ga-akụ akụ, mkpụrụ ahụ dị ọcha. 38 Ma ọ bụrụ na a wụsara mmiri ná mkpụrụ, ya enwee otú ozu ha si dasa na ya, mkpụrụ ahụ ga-abụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.
39 “‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu na-eri eri anwụọ, onye ọ bụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ 40 Onye ọ bụla riri ihe ọ bụla n’anụ ahụ nwụrụ anwụ kwesịrị ịsụ uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.+ Onye bupụrụ ozu ya kwesịrị ịsụ uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 41 Unu ga na-asọ obere anụmanụ* ọ bụla na-adịghị ọcha na-agagharị n’ala oyi.+ A gaghị eri ya eri. 42 Unu erila anụ ọ bụla na-akpụ afọ n’ala ma ọ bụ obere anụmanụ* ọ bụla na-eji ụkwụ anọ agagharị ma ọ bụ obere anụmanụ ọ bụla nwere ọtụtụ ụkwụ, n’ihi na ha bụ ihe a na-asọ oyi.+ 43 Unu ekwela ka nke ọ bụla n’ime obere ụmụ anụmanụ* mee ka unu* bụrụ ndị a na-asọ oyi. Unu ejikwala ha merụọ onwe unu, ha ewee mee ka unu bụrụ ndị na-adịghị ọcha.+ 44 N’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu ga-edokwa onwe unu nsọ ma dị nsọ+ n’ihi na adị m nsọ.+ Unu ejila obere anụmanụ* ọ bụla na-agagharị n’ala mee onwe unu ka unu ghara ịdị ọcha. 45 N’ihi na abụ m Jehova, onye dupụtara unu n’Ijipt, iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Unu ga-adị nsọ,+ n’ihi na adị m nsọ.+
46 “‘Ihe a bụ iwu banyere anụmanụ, anụ ndị na-efe efe, ihe ọ bụla na-agagharị na mmiri, nakwa banyere obere anụmanụ* ọ bụla na-agagharị n’ala, 47 ka e wee mee ka e nwee ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha nakwa n’anụ ndị e nwere ike iri eri na ndị a na-agaghị eri eri.’”+