Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka
5 Ụmụnna anyị, ọ dịghị mkpa ka e detara unu ihe ọ bụla banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-eme. 2 N’ihi na unu ma nke ọma na ụbọchị Jehova*+ ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.+ 3 Mgbe ọ bụla ha na-asị, “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” a ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya,+ otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Ha agaghị agbanahụ ya. 4 Ma ụmụnna anyị, unu anọghị n’ọchịchịrị. N’ihi ya, ụbọchị ahụ agaghị abịa unu na mberede otú chi si abọkwute ndị ohi, 5 n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè na nke ehihie.+ Anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ nke ọchịchịrị.+
6 N’ihi ya, ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra otú ndị ọzọ na-ehi,+ kama ka anyị mụrụ anya+ ma na-eche echiche nke ọma.+ 7 N’ihi na ndị na-ehi ụra na-ehi ya n’abalị, ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbiga ya ókè n’abalị.+ 8 Ma anyị ndị bụ́ ụmụ nke ehihie, ka anyị na-eche echiche nke ọma ma yiri ihe e ji echebe obi bụ́ okwukwe na ịhụnanya, kpurukwa okpu agha bụ́ olileanya nzọpụta+ 9 n’ihi na Chineke họọrọ anyị, ọ bụghị ka o wesa anyị iwe, kama ka o si n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst zọpụta anyị.+ 10 Jizọs nwụrụ maka anyị,+ ka anyị na ya wee dịkọọ ndụ,+ ma ànyị mụ anya ma ànyị na-ehi ụra.* 11 N’ihi ya, na-agbanụ ibe unu ume* ma na-emenụ ka ibe unu dị ike,+ otú unu na-eme n’eziokwu.
12 Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-eduzi unu n’ọrụ Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ. 13 Anyị na-arịọkwa unu ka unu jiri ha kpọrọ ihe ma na-ahụ ha n’anya nke ukwuu n’ihi ọrụ ha.+ Unu na ibe unu na-adị n’udo.+ 14 Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-adọ ndị na-enupụ isi aka ná ntị,+ na-agụgụ ndị dara mbà, na-enyere ndị na-adịghị ike aka, na-enwekwara mmadụ niile ndidi.+ 15 Hụnụ na e nweghị onye ji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+
16 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile.+ 17 Na-ekpenụ ekpere mgbe niile.+ 18 Na-ekelenụ Chineke maka ihe niile.+ Ihe a bụ ihe Chineke chọrọ ka unu na-eme ebe unu bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 19 Unu akwụsịla ọrụ mmụọ nsọ na-arụ n’ime unu.*+ 20 Unu eledala amụma anya.+ 21 Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile;+ jidesienụ ihe dị mma aka ike. 22 Gbaaranụ ụdị ajọ omume niile ọsọ.+
23 Ka Chineke nke udo mee ka unu dị nsọ otú zuru ezu. Ụmụnna anyị, ka e meekwa ka àgwà ọma* unu na ndụ* unu na ahụ́ unu ghara inwe ntụpọ ọ bụla n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 24 Onye na-akpọ unu na-emezu ihe o kwuru. N’eziokwu, ọ ga-eme ya.
25 Ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere.+
26 Susuonụ ụmụnna niile ọnụ mgbe unu na-ekele ha.*
27 Eji m aha Onyenwe anyị na-agwasi unu ike ka unu hụ na a gụụrụ ụmụnna niile akwụkwọ ozi a.+
28 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst meere unu amara.