1 Ndị Tesalonaịka
5 Ụmụnna anyị, ọ dịghị unu mkpa ka e detara unu ihe ọ bụla banyere oge na mgbe a kara aka.+ 2 N’ihi na unu onwe unu maara nke ọma na ụbọchị Jehova+ na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị.+ 3 Mgbe ọ bụla ha+ na-asị: “Udo+ na obi iru ala!” mgbe ahụ ka mbibi mberede+ ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya dị nnọọ ka ihe mgbu nke na-abịakwasị nwaanyị dị ime;+ ha agaghịkwa agbanahụ ya ma ọlị.+ 4 Ma unu onwe unu, ụmụnna anyị, anọghị n’ọchịchịrị,+ nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi,+ 5 n’ihi na unu niile bụ ụmụ nke ìhè+ na ụmụ nke ehihie.+ Anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ ụmụ nke ọchịchịrị.+
6 Ya mere, ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra+ dị ka ndị ọzọ na-ehi,+ kama ka anyị mụrụ anya+ ma nwee uche ziri ezi.+ 7 N’ihi na ihi ụra n’abalị+ maara ndị na-ehi ụra ahụ́,+ ndị na-aṅụbigakwa mmanya ókè na-aṅụbigakarị mmanya ókè n’abalị. 8 Ma anyị onwe anyị ndị bụ́ ụmụ nke ehihie, ka anyị nwee uche ziri ezi ma yiri ihe mgbochi obi+ bụ́ okwukwe+ na ịhụnanya, kpurukwa olileanya nke nzọpụta+ dị ka okpu agha;+ 9 n’ihi na Chineke họọrọ anyị, ọ bụghị ka o weso anyị iwe,+ kama ka anyị nwee nzọpụta+ site n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 10 Ọ nwụrụ n’ihi anyị,+ ka anyị na ya wee dịkọọ ndụ,+ ma ànyị mụ anya ma anyị na-arahụ ụra. 11 Ya mere, na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu,+ dị nnọọ ka unu na-eme.+
12 Ụmụnna anyị, anyị na-arịọ unu ka unu na-akwanyere ndị na-arụsi ọrụ ike n’etiti unu ùgwù, bụ́ ndị na-elekọta+ unu n’ime Onyenwe anyị ma na-adụ unu ọdụ; 13 jirinụ ịhụnanya na-asọpụrụ ha nke ukwuu n’ụzọ pụrụ iche n’ihi ọrụ ha.+ Ka unu na ibe unu na-adị n’udo.+ 14 N’aka nke ọzọ, anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, na-adụnụ ndị na-adịghị agazi agazi ọdụ,+ na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà,+ na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi+ n’ebe mmadụ niile nọ. 15 Hụnụ na ọ dịghị onye ji ihe ọjọọ na-akwụ onye ọ bụla ọzọ ụgwọ ihe ọjọọ,+ kama na-emerenụ ibe unu na ndị ọzọ niile ihe ọma mgbe niile.+
16 Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile.+ 17 Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.+ 18 Na-ekelenụ Chineke banyere ihe ọ bụla.+ N’ihi na nke a bụ uche Chineke n’ebe unu nọ site n’aka Kraịst Jizọs. 19 Unu emenyụla ọkụ nke mmụọ nsọ.+ 20 Unu eledala okwu amụma anya.+ 21 Na-achọpụtanụ ihe niile;+ jisiekwanụ ihe dị mma aka ike.+ 22 Zerenụ ụdị ajọ omume niile.+
23 Ka Chineke nke udo+ doo unu nsọ n’ụzọ zuru ezu.+ Ebe unu gbasiri ike n’ụzọ niile, ka mmụọ na mkpụrụ obi na ahụ́ unu bụ́ ụmụnna anyị bụrụ nke e chebere n’ụzọ na-enweghị ihe ịta ụta n’oge ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 24 Onye ahụ nke na-akpọ unu kwesịrị ntụkwasị obi, ọ ga-emekwa ya.
25 Ụmụnna anyị, na-ekpenụ ekpere maka anyị.+
26 Jirinụ nsusu ọnụ dị nsọ kelee ụmụnna niile.+
27 Eji m aha Onyenwe anyị na-enyesi unu iwu ike ka a gụọrọ ụmụnna niile akwụkwọ ozi a.+
28 Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ+ dịnyere unu.