Ile Anya Gabiga “Udo na Ntụkwasị” nke Mmadụ Guzobere
Eziokwu bụ na ụmụ mmadụ apụghị iweta ezi udo nke na-adịgide adịgide. N’ihi gịnị? N’ihi na ụmụ mmadụ abụghị ndị ahụ na-emebi udo n’ezie, ọ bụrịị ezie na ụta dịkwara ha n’ihi akụkọ ihe mere eme ha nke jupụtara ná mwụfu ọbara. Onye ahụ na-emebi udo n’ezie karịrị mmadụ ike. Ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụghị Setan Ekwensu, onye a kọwara na Bible dị ka “onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9.
BIBLE na-asị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ [Setan].” (1 Jọn 5:19) N’ihi nke a, inweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide aghaghị ịgụnye iwepụ Setan na usoro ihe ụwa nke o wuliteworo, nke o dokwara anya na ọ bụ ya na-eduzi. (Tụlee Aịsaịa 48:22; Ndị Rom 16:20.) Ụmụ mmadụ apụghị ime nke a.
Mgbe ahụ, olee otú a pụrụ isi nweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi? Ọ bụ site n’ike nke Onye ahụ nke siri ike n’ụzọ a na-akparaghị ókè karịa Setan. Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile enwewo oge a kara aka iji kwụsị ihe omume Setan n’etiti agbụrụ mmadụ. Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, ‘mbibi mberede’ ga-abịakwasị ụwa nke na-atọgbọrọ n’ikike Setan. (1 Ndị Tesalonaịka 5:3-7) Ihe àmà nile na-eduje ná nkwubi okwu bụ na nke a ga-eme n’isi nso.
Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ugbu A!
Ma, olee banyere ugbu a? Ókè ụfọdụ nke ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi kwere mee ọbụna n’oge a. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụghị dị ka ọtụtụ ndị ndú okpukpe nwaworo, site n’itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa nke a, kama nke ahụ, site n’ịgbaso iwu na ndụmọdụ Chineke.
Ụzọ dị otú a ọ̀ na-eweta udo n’ezie? Ee, ọ na-eweta. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova anwalewo ya ma chọpụta na o kwere mee n’ezie inwe ezi udo nakwa ókè ụfọdụ nke ịnọ ná ntụkwasị. Ịgbaso iwu Chineke dị ka e kpughere ha na Bible enyeworo ha aka izukọta n’otu dị ka nzukọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’udo n’agbanyeghị agbụrụ, mba, ma ọ bụ asụsụ ha.—Abụ Ọma 133:1.
N’irube isi nye iwu Chineke, ha ‘akpụgharịwo mma agha ha nile ka ha bụrụ mma oge, ha adịghị amụtakwa agha ọzọ,’ n’ụzọ ihe atụ. (Aịsaịa 2:2-4) Ha na-anọ ná ntụkwasị obi n’ime ịhụnanya Chineke ma na-enwe obi ike na ụmụnna ime mmụọ ha na-enwe mmasị n’ebe ha nọ. (Ndị Rom 8:28, 35-39; Ndị Filipaị 4:7) Ọ bụrụ na ị na-arụ ụka ma nke a ọ̀ bụkwa eziokwu, anyị na-akpọ gị òkù ịbịakwute ha n’otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma jiri anya gị hụ.
Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ
Otú ọ dị, nke a abụghị mmezu ikpeazụ nke amụma Bible banyere ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ nanị ihe na-egosi ihe ụwa nke a ga-abụ ma ọ bụrụ na mmadụ nile agbasoo iwu nile nke Chineke. N’oge na-adịghị anya, ihe ngosi nke a ga-emesị mee eme n’ezie.
Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla ha [ndị na-adịghị efe Chineke] na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, [na-eche na ha emesịwo n’ikpeazụ weta udo na ntụkwasị obi n’ụzọ nke ha] mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:3) Chineke ga-ekpebi na o zuworo Setan n’iduhie agbụrụ mmadụ. Mgbe ahụ, ọ ga-abụ oge iwepụ ya, ya na usoro ihe rụrụ arụ nke ụwa nke nọ n’okpuru ike ya. Mgbe ahụ ka oge ga-eru maka mmezu nke amụma Daniel: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
Nke a ọ̀ ga-abụ omume na-ezighị ezi n’akụkụ nke Chineke? Ọ dịghị ma ọlị. Mbibi mberede ga-abịakwasị nanị ndị o kwesịrị ịbịakwasị dị ka ikpe Chineke, ụkpụrụ nile nke Chineke, si dị. Ị̀ tụkwasịrị Onye Okike ahụ obi iji ikpe ziri ezi mee mkpebi n’okwu a. N’ezie, anyị pụrụ ịhapụ okwu ahụ n’aka ya ime ihe ziri ezi! Gịnị ga-esi n’ọrụ ikpe ya pụta? Ilu na-asị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:21, 22) Ọ̀ dị onye ọ bụla ga-eti aka n’obi n’ihi na ndị na-emebi iwu adịghịkwa?
Mgbe e wepụsịrị ndị na-emebi udo, ihe a kpọrọ mmadụ gburugburu ụwa ga-enweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi n’okpuru ọchịchị obi ọma nke Alaeze Chineke. “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Ì kwere ná nkwa nke a nke Bible? Obi ò siri gị ike na ihe ndị a ga-eme n’isi nso? Ọ bụrụ na i nwere ịrụ ụka ọ bụla, anyị na-agba gị ume ka i mekwuo ntụle n’okwu a. N’eziokwu, ụzọ nke Chineke bụ nanị ụzọ mmadụ ga-esi nweta ihe mgbaru ọsọ nke ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ọ nọgideworo na-achụso.
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ndị Jehova nwere ezi udo na ókè ụfọdụ nke ịnọ ná ntụkwasị obi taa