4N’ihi ya, mụnwa a tụrụ mkpọrọ+ maka Onyenwe anyị na-arịọ unu ka unu na-eje ije otú kwesịrị+ òkù ahụ a kpọrọ unu. 2 Dịrịnụ umeala n’obi.+ Na-adịnụ nwayọọ mgbe niile. Na-enwenụ ndidi.+ Na-edirinụ ibe unu ihe n’ihi na unu hụrụ ha n’anya.+
13 Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam+ ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.+ Jehova* gbaghaara unu kpamkpam, unu kwesịkwara ịna-emere ibe unu otú ahụ.+