Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt
6 Anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ,+ Chineke mekwaara unu amara. Ma, unu ejikwala amara a o meere unu egwu egwu.+ 2 Chineke sịrị: “Mgbe oge ruru ka m meere gị amara, m mere ihe ị rịọrọ m. N’ụbọchị m na-azọpụta ndị mmadụ ka m nyeere gị aka.”+ Ugbu a bụ oge Chineke na-emere anyị amara karịchaa. Ugbu a bụ ụbọchị Chineke na-azọpụta anyị.
3 O nweghị onye anyị na-emejọ, ka e wee ghara ikwu okwu ọjọọ gbasara ozi anyị.+ 4 Kama, anyị na-eme ka a mata na anyị bụ ndị ozi Chineke n’ihe niile.+ Anyị na-edi ọnwụnwa, mkpagbu, ihe isi ike na nsogbu dị iche iche.+ 5 E tiri anyị ihe. A tụrụ anyị mkpọrọ.+ Ndị tigbuo zọgbuo mesiri anyị ike. Anyị rụsiri ọrụ ike. E nwere abalị ndị anyị na-ehighị ụra, nweekwa oge ndị anyị na-erighị nri.+ 6 Anyị na-ebi ndụ dị ọcha. Anyị na-ebi ndụ otú gosiri na anyị ma eziokwu. Anyị na-enwe ndidi.+ Anyị dị obiọma.+ Anyị na-ekwe ka mmụọ nsọ na-edu anyị. Anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, ma ọ bụghị n’elu ọnụ.+ 7 Anyị na-ekwu eziokwu. Anyị tụkwasịrị ike Chineke obi,+ anyị na-ejikwa ngwá ọgụ nke ezi omume+ ma n’aka nri ma n’aka ekpe. 8 A na-eto anyị, na-emenyekwa anyị ihere. A na-akọ ma akụkọ ọjọọ ma akụkọ ọma banyere anyị. E weere na anyị na-eduhie ndị mmadụ, ma anyị na-ekwu eziokwu. 9 Ndị mmadụ amaghị anyị, ma Chineke ma anyị. Ọ fọrọ obere ka anyị nwụọ,* ma anyị dị ndụ.+ A tara anyị ahụhụ,* ma e gbughị anyị egbu.+ 10 Ndị mmadụ chere na anyị na-eru uju, ma anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile. Ha chere na anyị dara ogbenye, ma anyị na-eme ọtụtụ ndị ọgaranya. Ha chekwara na anyị enweghị ihe ọ bụla, ma anyị nwere ihe niile.+
11 Ndị Kọrịnt, anyị ezoroghị unu ọnụ. Anyị hụrụ unu n’anya n’eziokwu.* 12 Anyị ji obi anyị niile hụ unu n’anya,+ ma unu ejighị obi unu niile hụ anyị n’anya. 13 M na-agwa unu okwu ka ụmụ m, mesonụ anyị otú anyị si emeso unu. Jirinụ obi unu niile hụ anyị n’anya.+
14 Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ n’ihi na unu na ha abụghị otu. Gịnị jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Gịnịkwa jikọrọ ìhè na ọchịchịrị?+ 15 Olee otú Kraịst na Bilial* ga-esi nwee otu olu?+ Gịnịkwa jikọrọ onye kwere ekwe* na onye na-ekweghị ekwe?+ 16 Gịnị jikọrọ arụsị na ụlọ nsọ Chineke?+ Anyị bụ ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ,+ otú ahụ Chineke kwuru, sị: “Mụ na ha ga-ebi.+ M ga-anọnyere ha. M ga-abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”+ 17 Jehova* kwukwara, sị: “N’ihi ya, sinụ ebe ha nọ pụọ, nọrọkwanụ iche. Unu emetụzila ihe na-adịghị ọcha aka,+ m ga-akpọbatakwa unu.”+ 18 Jehova,* Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, sịkwara: “M ga-abụ nna unu,+ unu ga-abụkwa ụmụ m ndị nwoke na ụmụ m ndị nwaanyị.”+