Levitikọs
7 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà ikpe ọmụma:+ Ọ bụ ihe kacha nsọ. 2 Ha ga na-egbu anụ e ji achụ àjà ikpe ọmụma n’ebe a na-egbu anụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ. A ga-efesakwa ọbara ya+ n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 3 Ọ ga-eweta abụba ya niile,+ ya bụ, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba ndị kpuchiri eriri afọ ya, 4 nakwa akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha bụ́ ndị dị n’akụkụ úkwù ya. Ọ ga-ewepụta abụba kpuchiri imeju ya, wepụtakwa akụrụ ya abụọ.+ 5 Onye nchụàjà ga-esu ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.+ Ọ bụ àjà ikpe ọmụma. 6 Nwoke ọ bụla so ná ndị nchụàjà ga-eri ya.+ A ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya. Ọ bụ ihe kacha nsọ.+ 7 Iwu na-achị àjà mmehie ga na-achịkwa àjà ikpe ọmụma. Ọ bụ onye nchụàjà nke ga-eji ya kpuchie mmehie nwe anụ ya.+
8 “‘Ọ bụrụ na onye nchụàjà ejiri anụ mmadụ wetara chụọ àjà a na-esu ọkụ maka onye ahụ, akpụkpọ anụ+ ahụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ ga-abụ nke onye nchụàjà chụrụ àjà ahụ.
9 “‘Achịcha ọ bụla e wetara ka e jiri chụọ àjà ọka, bụ́ nke e mere n’ekwú ma ọ bụ n’ite e ji eme achịcha ma ọ bụ n’ite dị mbadamba,+ ga-abụ nke onye nchụàjà chụrụ ya n’àjà. Ọ ga-abụ nke ya.+ 10 Ma àjà ọka ọ bụla ọzọ, ma ọ̀ bụ nke a gwara mmanụ+ ma ọ̀ bụ nke ọkpọọ,+ ga-abụ nke ụmụ Erọn ndị nwoke niile. Ihe ha niile ga-eketa ga-aha.
11 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà udo+ mmadụ nwere ike iwetara Jehova: 12 Ọ bụrụ na o wetara ya iji kelee Chineke,+ ihe ndị ọ ga-eweta ya na àjà ekele ahụ bụ ogbe achịcha ndị na-ekoghị eko dị okirikiri a gwara mmanụ, achịcha ndị dị fere fere na-ekoghị eko a wụrụ mmanụ, nakwa ogbe achịcha ndị dị okirikiri e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, bụ́ ndị a gwara mmanụ nke ọma. 13 Mgbe ọ na-eweta àjà udo ya, bụ́ àjà o ji ekele Chineke, ọ ga-eweta ya na ogbe achịcha ndị koro eko dị okirikiri. 14 Ọ ga-esi na ha niile were otu otu ka ọ bụrụ òkè dị nsọ ọ ga-enye Jehova. Ọ ga-abụ nke onye nchụàjà fesara ọbara anụ ahụ e ji chụọ àjà udo n’elu ebe ịchụàjà.+ 15 A ga-eri anụ o ji chụọ àjà udo, bụ́ àjà o ji ekele Chineke, n’ụbọchị ọ chụrụ ya n’àjà. Ọ gaghị edofọ nke ọ bụla ruo ụtụtụ.+
16 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ ihe o kwere ná nkwa+ ma ọ bụ ihe si ya n’obi ka o wetara ka a chụọ n’àjà,+ a ga-eri ihe ahụ o wetara n’ụbọchị ọ chụrụ ya n’àjà. E nwekwara ike iri ihe fọrọ na ya n’echi ya. 17 Ma ihe ọ bụla fọrọ n’anụ ahụ a chụrụ n’àjà ruo n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọ ya ọkụ.+ 18 Ma ọ bụrụ na e rie ihe ọ bụla fọrọ n’anụ e ji chụọ àjà udo n’ụbọchị nke atọ, Chineke agaghị anabata onye wetara àjà ahụ. Àjà ahụ agaghị abara ya uru. Ọ bụ ihe rụrụ arụ. Onye* riri nke ọ bụla n’ime ya ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.+ 19 A gaghị eri anụ ọ bụla metụrụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha. A ga-akpọ ya ọkụ. Onye ọ bụla dị ọcha nwere ike iri anụ dị ọcha.
20 “‘Ma onye* ọ bụla na-adịghị ọcha nke riri anụ e ji chụọ àjà udo, bụ́ nke Jehova, a ga-egbu ya.*+ 21 Ọ bụrụ na mmadụ* emetụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha aka, ma ọ̀ bụ ihe na-adịghị ọcha si n’ahụ́ mmadụ+ ma ọ̀ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha+ ma ọ̀ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha na-asọ oyi,+ ma rie ụfọdụ n’ime anụ e ji chụọ àjà udo, bụ́ nke Jehova, a ga-egbu ya.’”*
22 Jehova gwakwara Mosis, sị: 23 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Unu erila abụba ọ bụla,+ ma ọ̀ bụ nke oké ehi ma ọ̀ bụ nke ebule ma ọ̀ bụ nke ewu. 24 E nwere ike iji abụba anụ nwụrụ anwụ na abụba anụ a dọgburu adọgbu mee ihe ọ bụla ọzọ, ma unu erila ya eri.+ 25 N’ihi na onye ọ bụla riri abụba si n’anụ o ji chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, a ga-egbu ya.*
26 “‘Unu erila ọbara ọ bụla+ n’ebe ọ bụla unu bi, ma ọ̀ bụ nke nnụnụ ma ọ̀ bụ nke anụmanụ ọzọ. 27 Onye* ọ bụla riri ọbara ọ bụla, a ga-egbu ya.’”*+
28 Jehova wee gwa Mosis, sị: 29 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Onye ọ bụla chọrọ ịchụrụ Jehova àjà udo ga-ewetara Jehova ụfọdụ n’ime anụ ọ ga-eji chụọ àjà udo ahụ.+ 30 Ọ ga-eji aka ya weta abụba+ anụ ahụ na okpuru afọ* ya ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a ga-achụrụ Jehova. Ọ ga-efegharị ya ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova. 31 Onye nchụàjà ga-esu abụba ahụ ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà,+ ma okpuru afọ* anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị nwoke.+
32 “‘Unu ga-enye onye nchụàjà ụkwụ aka nri anụ ahụ ka ọ bụrụ òkè dị nsọ si n’àjà udo unu.+ 33 Ọ bụ nwa Erọn nke wetara ọbara anụ e ji chụọ àjà udo n’ihu Chineke ma chụọ abụba ya n’àjà ga-eketa ụkwụ aka nri ya.+ 34 N’ihi na m na-anara ndị Izrel okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ anụ bụ́ òkè dị nsọ nke si n’àjà udo ha. M na-ewerekwa ha nye Erọn onye nchụàjà na ụmụ ya ndị nwoke ka ọ bụrụ iwu ga-adịgide adịgide ndị Izrel ga na-edebe.+
35 “‘Ihe a bụ òkè si n’àjà a na-esu ọkụ a chụụrụ Jehova, nke e wepụtaara ndị nchụàjà, ya bụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, n’ụbọchị ọ họpụtara ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà Jehova.+ 36 Jehova nyere ndị Izrel iwu ka a na-ekenye ha òkè a malite n’ụbọchị o tere ha mmanụ.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ ha niile ga na-edebe.’”
37 Ihe a bụ iwu ga na-achị àjà a na-esu ọkụ,+ àjà ọka,+ àjà mmehie,+ àjà ikpe ọmụma,+ àjà e ji ahọpụta ndị nchụàjà,+ na àjà udo,+ 38 otú Jehova nyere Mosis n’iwu n’Ugwu Saịnaị+ n’ụbọchị o nyere ndị Izrel iwu n’ala ịkpa Saịnaị ka ha na-achụrụ Jehova àjà.+