-
Levitikọs 19:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 “‘Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị enwee mmekọahụ, ya abụrụ na nwaanyị ahụ na-ejere nwoke ọzọ ozi, ya abụrụkwa na e kenyela nwaanyị ahụ nwoke ọzọ, ma nwoke ahụ agbarabeghị ya ma ọ bụkwanụ na nwaanyị ahụ enwerebeghị onwe ya, a ga-ata ha ahụhụ. Ma, a gaghị egbu ha n’ihi na nwaanyị ahụ enwerebeghị onwe ya. 21 Nwoke ahụ ga-ewetara Jehova àjà ikpe ọmụma ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ya bụ, ebule a ga-eji chụọ àjà ikpe ọmụma.+
-
-
Ọnụ Ọgụgụ 6:12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Ọ ga-ewepụta onwe ya ọzọ ka ọ bụrụ onye Naziraịt nke Jehova n’oge niile ọ ga-abụ ya. Ọ ga-akpụta ebule na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà ikpe ọmụma. Ma, a gaghị agụnye oge ndị gara aga n’ihi na o merụrụ onwe ya n’oge ọ bụ onye Naziraịt.
-