Mkpughe E Kpugheere Jọn
5 Ahụrụ m otu akwụkwọ mpịakọta e dere ihe ihu na azụ,* nke Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ ji n’aka nri ya. E jikwa ihe asaa e ji aka ihe akara mechisie ya ike. 2 Ahụkwara m otu mmụọ ozi dị ike, nke ji oké olu na-asị: “Ònye ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta a na ịtọpụ ihe ndị a e ji aka ihe akara e ji mechie ya?” 3 Ma, ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma ọ bụ ile anya n’ime ya, ma n’eluigwe ma n’ụwa ma n’okpuru ala. 4 M wee malite ibe ezigbo ákwá n’ihi na a hụghị onye ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ ma ọ bụ ile anya n’ime ya. 5 Ma otu n’ime ndị okenye ahụ sịrị m: “Kwụsị ibe ákwá. Ọdụm nke si n’ebo Juda,+ bụ́ mgbọrọgwụ+ Devid,+ emeriela.+ N’ihi ya, o ruru eru imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ na ihe asaa ahụ e ji aka ihe akara e ji mechie ya.”
6 Ahụkwara m nwa atụrụ+ nke guzo n’etiti ocheeze ahụ na n’etiti ndị mmụọ ozi anọ ahụ* na n’etiti ndị okenye ahụ+ dị ka à ga-asị na e gburu ya egbu.+ O nwere mpi asaa na anya asaa. Anya asaa ndị a pụtara mmụọ asaa nke Chineke,+ ndị o zigara n’ụwa niile. 7 Nwa Atụrụ ahụ wee gaa ozugbo nara akwụkwọ mpịakọta ahụ n’aka nri Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ.+ 8 Mgbe ọ naara ya, ndị mmụọ ozi anọ ahụ na ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ+ dara n’ala n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Onye nke ọ bụla jikwa otu ụbọ akwara na efere ọlaedo insens* juru. (Insens a pụtara ekpere ndị nsọ.)+ 9 Ha na-abụkwa abụ ọhụrụ,+ sị: “I ruru eru ịnata akwụkwọ mpịakọta ahụ na imeghe ihe ndị e ji aka ihe akara e ji mechie ya, n’ihi na e gburu gị egbu, i jikwa ọbara gị zụtara Chineke ndị mmadụ+ n’ebo niile, n’asụsụ niile, n’agbụrụ niile nakwa ná mba niile.+ 10 I mekwara ka ha bụrụ ndị eze+ na ndị nchụàjà ga na-ejere Chineke anyị ozi.+ Ha ga na-achịkwa+ ụwa.”
11 Ahụrụ m ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara ocheeze ahụ na ndị mmụọ ozi anọ ahụ* na ndị okenye ahụ gburugburu, nụkwa olu ha. Ha dị iri puku kwuru iri puku, na puku kwuru puku.+ 12 Ha ji oké olu na-asị: “Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu+ ruru eru ka e nye ya ikike na akụnụba na amamihe na ume. O ruru eru ka a na-asọpụrụ ya, na-eto ya ma na-aja ya mma.”+
13 Anụkwara m ka ihe niile e kere eke ndị dị n’eluigwe na n’ụwa na n’okpuru ala+ na n’oké osimiri, na ihe niile dị n’ime ha, na-asị: “Ka a na-asọpụrụ Chineke, onye dị ike, nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ na Nwa Atụrụ ahụ,+ onye dị ike, ka a na-ajakwa ha mma+ ma na-eto ha ruo mgbe niile ebighị ebi.”+ 14 Ndị mmụọ ozi anọ ahụ na-asịkwa: “Amen!” Ndị okenye ahụ na-adakwa n’ala kpọọrọ Chineke isiala.