-
Mkpughe 1:5, 6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Ka Jizọs Kraịst, “Onye Àmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi,”+ “onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ,”+ na “Onye Na-achị ndị eze nke ụwa,”+ meere unu amara, meekwa ka udo dịrị unu.
Jizọs hụrụ anyị n’anya,+ jirikwa ọbara ya napụta anyị n’aka mmehie anyị.+ 6 O mekwara ka anyị bụrụ otu alaeze+ na ndị nchụàjà+ nke Chineke ya, bụ́ Nna ya. Ọ dị ebube, dịrịkwa ike ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
-